Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 10/8 p. 25-26
  • Nghọrị n’Aha Okpukpe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nghọrị n’Aha Okpukpe
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọtụtụ Akụkụ nke Aghụghọ Okpukpe
  • Ilekwasị Ndị Agadi Anya
    Teta!—1997
  • Ụzọ Ị Ga-esi Chebe Onwe Gị Pụọ n’Ịbụ Onye E Gwuru Wayo
    Teta!—2004
  • Kpachara Anya! Ndị Nghọrị Nọ n’Ọrụ
    Teta!—1997
  • Òtù Nzuzo—Gịnị Ka Ha Bụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 10/8 p. 25-26

Nghọrị n’Aha Okpukpe

Ọ BỤRỤ na nghọrị ndị a kpọtụworo uche wụrụ gị ibobo n’ahụ ma wute gị, ọ bụghị nanị gị. Ma e nwere ụdị nghọrị kwesịrị ịta ụta ọbụna karị—n’aha okpukpe. Otu n’ime ndị a kasị ahụ metụtara nkwenkwe nke na mkpụrụ obi na-anọgide ndụ mgbe a nwụsịrị nakwa na ndị dị ndụ pụrụ ịbara ndị nwụrụ anwụ uru. E dubawo ọtụtụ nde mmadụ obi ha ziri ezi n’ụwa nile n’ikwere na site n’ịkwụ ego buru ibu, ha pụrụ inyere ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ aka ma ọ bụ mee ka obi dajụọ ha.

Taa, ná mba ụfọdụ, a gbakwụnyewo ihe ọhụrụ na wayo a dịteworo aka. N’isi nso a na Japan, dị ka ihe atụ, e jidere ndị nchụàjà Buddha na-azọrọ inwe ike ime mmụọ n’ihi inyo ha enyo ịghọnara ndị ofufe ọtụtụ narị nde ego yen. Ndị e jidere emewo mkpọsa ije ozi ịgwọ ọrịa na inye ndụmọdụ. Ndị zaghachiri gụnyere ndị nwunye anọ na-anọ n’ụlọ bụ́ ndị a gwara na mmụọ ụmụ ha nwụrụ anwụ na-achụgharị ha. “A gwaziri ụmụ nwanyị ahụ ka ha kwụọ ngụkọta nke nde yen 10 [$80,000, U.S.] maka ememe akwamozu,” ka Mainichi Daily News kọrọ. Otu nwanyị dị afọ 64 nyere ihe karịrị nde yen 6.65 (ihe dị ka $53,000). Nwanyị ahụ ejekwuruwo ndị nchụàjà ahụ maka ahụ ike nwa ya. “A sịrị na ha gwara nwanyị ahụ na chi ọjọọ ga-adakwasị ya ma o meghị ememe pụrụ iche iji cheta mkpụrụ obi ndị nna nna ya na iji chụlaga ndị mmụọ,” ka The Daily Yomiuri kwuru.

Ezi ihe ọmụma nke Bible gaara azọpụtawo ndị a na-anọghị na nche pụọ n’ịbụ ndị a ghọrịrị. Ọ na-eme ka o doo anya na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. (Ezikiel 18:4) Ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla,” ka Eklisiastis 9:5 na-ekwu. Ya mere ndị nwụrụ anwụ apụghị imerụ ndị dị ndụ ahụ. Ndị dị ndụ apụghịkwanụ ịbara ndị nwụrụ anwụ uru.

Ọtụtụ Akụkụ nke Aghụghọ Okpukpe

N’ihi anyaukwu ha ụfọdụ na-adaba na wayo okpukpe. N’Australia otu nwoke chọrọ ka ego ya mụbaa nyere otu di na nwunye na-azọrọ na ha nwere ike karịrị nke mmadụ, na-enwe ikike ịgọzi ego ma mee ka ọ mụbaa, $100,000. A gwara ya ka o tinye ego ahụ n’otu igbe ma nyefee ya ha ka e “doo ya nsọ.” Di na nwunye ahụ buuru igbe ahụ banye n’ọnụ ụlọ na-esonụ ịga gọzie ya mgbe ọ na-echere. Mgbe ha lọghachiri, ha nyeghachiri ya igbe ahụ, na-adọ ya aka ná ntị ka ọ ghara ịnwa anwa mepee ya ihe ọ sọrọ ya mee ruo afọ 2000. O mepeekwanụ ya? A gwara ya na “majik ahụ ga-arụ, ọ ga-ekpukwa ìsì, ntutu ya ga na-adapụsị, ọ ga-arịa cancer, wee nwụọ site n’ahụ mkpọnwụ.” Otú ọ dị, mgbe izu abụọ gasịrị, nwoke ahụ malitere inyo ya enyo wee mepee igbe ahụ. Chaị! O jupụtara n’iberibe akwụkwọ. Ọ na-ata onwe ya ụta, ka akwụkwọ akụkọ na-akọ ihe ahụ merenụ kwuru, n’ụzọ na-ejukwa nnọọ anya, “ọ malitewo inwe isi nkwọcha.”

N’Itali nghọrị okpukpe nwere akụkụ ọhụrụ: Ndị ọkà wayo na-eme ka ha bụ ndị Katọlik ji okpukpe kpọrọ ihe aghọrịwo ụfọdụ ndị ụkọchukwu. Ndị nghọrị ahụ na-eji ọdịnala Katọlik nke ịkwụ ụgwọ maka Ụka ọnwụ nke onye nwụrụ anwụ eme ihe. Olee otú ha si eme ya? Magazin ndị Katọlik bụ́ Famiglia Cristiana na-akọwa na ndị ọkà n’aghụghọ a na-asị ka ha buru ụzọ kwụọ ụgwọ maka ọtụtụ Ụka ọnwụ na-eji akwụkwọ ndọrọ ego adịgboroja nke e denyere ego gabigara nnọọ ihe a na-ana nke ukwuu. Ha na-aghọgbu onye ụkọchukwu dị mfe nnweta inye ha ihe mara ya n’elu n’ego nkịtị. Ndị nghọrị ahụ na-enweta ego, ndị ụkọchukwu na-enwetakwa akwụkwọ ndọrọ ego a na-agaghị anakwere!

N’ime United States, òtù nzuzo ndị nke okpukpe bụ́ ndị na-achọ ndị ọhụrụ ha ga-eji na-ekpoju igbe ụtụ ha n’onyinye na-awakwasị ndị agadi mgbe mgbe n’akụkụ nile. “Gburugburu mba a, òtù nzuzo na-aṅa ntị n’ụkpụrụ nduzi ahụ bụ isi nke ahịa nile na-adabere ná ntụkwasị obi: Na-eso ego,” ka magazin bụ́ Modern Maturity dere. “Ná mgbanwere, ha na-ekwe nkwa ihe ọ bụla malite n’ahụ ike ruo ná mgbanwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị ruo n’alaeze eluigwe.” E hotara otu onye na-agbazigharị ndị nọbu n’òtù nzuzo dị ka onye kwuru, sị: “Ndị agadi bụụrụ òtù nzuzo bred na bọta.”

Ego ọ na-emetụta pụrụ ibu oké ibu. “Amaara m ọtụtụ ọnọdụ ebe ndị mmadụ daworo onwe ha ogbenye,” ka otu ọkàiwu na New York kwuru bụ́ onye hụworo maka ọtụtụ ikpe òtù nzuzo. “Ọ na-emetụta ụdị mmadụ nile malite ná ndị a sịrị ha nye onyinye ọtụtụ puku dollar ruo ná ndị na-enweghị ihe ọzọ inye e wezụga akwụkwọ ndọrọ ego Nchebe Ọha na Eze ha.” O kwukwasịrị: “Ọ na-emebi ihe—nye ma ndị ahụ ma ezinụlọ ha.”

Ya mere kpachara anya! Ndị nghọrị nọ n’ọrụ. Wayo ndozi ụlọ, wayo azụmahịa telifon, na nghọrị okpukpe bụ nanị ihe atụ ole na ole nke ụzọ ha si arụ ọrụ. O kweghị omume ịkpọtụ ụzọ ha nile aha, n’ihi na mgbe nile ha na-echepụta wayo ndị ọhụrụ. Ma ihe ịrụ ụka adịghị ya na ihe e depụtaworo n’ebe a ga-eme ka ị mụrụ anya ná mkpa ọ dị ịnọ na nche, ikekwe nke ahụ bụkwa ihe nchebe kasị mma i nwere. (Lee igbe dị na peji nke 8, “Ụzọ Isi Zere Ịbụ Onye A Ghọrịrị.”) Ịdọ aka ná ntị nke otu ilu Bible oge ochie kwesịrị nnọọ ekwesị: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.”—Ilu 14:15.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Ọtụtụ nde mmadụ kwenyere na site n’ịkwụ ego na ha pụrụ inyere ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ aka ma ọ bụ mee ka obi dajụọ ha

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya