Kpachara Anya! Ndị Nghọrị Nọ n’Ọrụ
CHEEDỊ banyere ọnọdụ ahụ. Oké ifufe efesịwo. Ikuku ndị na-eweta mbibi akwụsịwo ajọ mwakpo ya, mmiri ndị na-ekwo ekwo abụkwaghị ihe ize ndụ. Ndị lanarịrịnụ kpoghepụrụ anya si n’ebe mgbaba ha dị iche iche na-apụtasị, ka ha nọ n’ebe dị nnọọ anya, ndị a kpọpụrụ bụ́ ndị ahụ na-erughị ala, egwu na-atụkwa ha, na-alọghachi ikiri otú ihe dị ka oké ifufe gasịrị. Elu ụlọ adịkwaghị n’ụlọ ndị ahụ; e fopụsịrị osisi, ha tụsasịkwara n’ime ụlọ ndị ahụ e kpughepụrụ elu ha bụ́ ndị dere mmiri. Usoro eletrik akwụsịwo ọrụ, na-eme ka ọ ghara ikwe omume ịkpọ òkù ma ọ bụ izi ozi mberede. Ụlọ ụfọdụ, ebe e nweburu ezinụlọ ndị nwere obi ụtọ, adịkwaghị—e bibiri ha n’enweghị mmekwata. Ihe bụbu ógbè dị jụụ ma dị n’udo bụ ugbu a ogige nke mbibi na obi nkoropụ.
Ógbè ahụ abanye ọrụ—jupụta ná mkpebisi ike iwuzigharị ihe. Ndị agbata obi ana-enyerịtara ibe ha aka; ụfọdụ tupu ugbu a amabughịdị onwe ha n’aha. Ndị ikom na-ekerịta ngwá ọrụ na nkà. Ndị inyom na-enye ndị na-arụ ọrụ nri ebe ụmụaka ndị toro eto na-elekọta ndị ntakịrị. Site ná mpụga ógbè ahụ, ụgbọala ndị ndị ọrụ ji ọchịchọ obi inye aka abịa gbarutere—ndị na-akụchi elu ụlọ, ndị na-ebupụ osisi, ndị kapịnta, ndị na-ete ágbá. Ma, ndị na-eso ndị a abịakwa bụ ndị nghọrị, dị njikere ịghọnara ndị lanarịrị ihe.
A chọrọ ka a kwụọ ụgwọ buru ibu tupu ọrụ ndozi ahụ. Ndị nwere ụlọ bụ́ ndị o ji ná njọ ana-enyefe ego ha, nanị ịchọpụta na ndị ọrụ ahụ ji ha gbafuo, na-adịghị mgbe a ga-ahụ ha anya ọzọ. Ndị na-akụchi elu ụlọ bụ́ ndị “na-emesi obi ike” banyere ọrụ ha akụjọọ mgbawara ndị e nwere, ndị a na-ehikwa mmiri aghara aghara mgbe mmiri mbụ zoro. N’aha ịgbazinye nnukwute ngwá ọrụ maka ọrụ echi, ndị na-ebupụ osisi na-aghọnara ndị dabara n’ọnyà ha ọtụtụ puku dollar tupu ịrụrụ ha ọrụ. Echi agwụ agwụ.
Gbakwụnyere mbibi na mfu ahụ obi mgbawa nke ndị nwere ụlọ bụ́ ndị kwụrụ ndị inshọransị na-enweghị ego ma ọ bụ ndị nke adịgboroja nnukwute ego bụ́ ndị jụrụ ugbu a ịkwụ ụgwọ maka ihe mebiri ma ọ bụ ndị a gbahapụworo ọfịs ha, ebe ndị nwe ha riworo ọsọ. Ndị ọ dabaara nke ọma inwe akwụkwọ ndọrọ ego inshọransị iji kwụọ ụgwọ ihe ndị e mebiri na-achọpụta na ọtụtụ mgbe nnọọ ndị ọrụ ngo na-enweghị ụkpụrụ na ndị na-amaghị ọrụ juru eju mgbe ole na ole maara ọrụ na-enweghị ike ịrụ ọrụ nile dịnụ. N’ihi ya, a na-arụjọ ọrụ, n’ụzọ na-ewetara ndị nwe ụlọ bụ́ ndị nọ n’obi ilu mwute.
A na-aghọrị ndị ọdachi dakwasịrị ugboro ugboro. Ihe na-amalite dị ka ógbè e tijasịrị etijasị nke na-abịakọta ọnụ maka ọdịmma mmadụ nile, na-aghọrọ ụfọdụ nrọ na-agbawa obi.
Mgbe otu ajọ ifufe gasịrị, n’otu ógbè otu mkpụrụ biskiiti rịrị elu ọjị ruo $4 na-ebu isi, nri ụmụ ọhụrụ fukwara ndị nne $6 maka otu mkpọ. N’otu ụlọ ahịa a pụghị inweta batịrị n’azụrụghị otu TV ma ọ bụ redio. Ndị na-ere ihe ndị e ji ewu ụlọ kpojuru ego n’igbe ego ha site n’ire ihe n’ọnụ ego e weliri oké elu. N’ọnọdụ ọzọ ndị a dọkpụgoro ụlọ ha n’ebe ka elu n’oge idei mmiri hụrụ ka e ji 600 pasent bulie ọnụ ahịa ya. Mgbe otu ala ọma jijiji gasịrị, otu nwanyị dị afọ 84 onye e bibiri ụlọ ya natara òkù sitere n’aka onye sị na ya bụ onye ọrụ gọọmenti. Nwanyị ahụ chere na akwụkwọ ndị o mesịrị bịanye aka na ha bụ akwụkwọ ịchọ enyemaka gọọmenti na tiketi nri. N’ezie, ha bụ maka iji ụlọ ya gbaziri $18,000 iji kwụọ ụgwọ maka ọrụ ndozi ihe were nanị ihe dị ka $5,000.
Wayo Azụmahịa Telifon
‘Mma mma oo, Oriakụ S——! I nwere chi ọma taa.’ Ndị a pụrụ ịbụ okwu mmeghe n’òkù telifon na-atụ n’anya. ‘Ọ bụ gị ritere nnukwute ihe nrite anyị nke . . .’ Ọtụtụ ndị anatawo òkù ndị dị otú ahụ na-ekwu na ha “emeriworị,” na ihe nrite ha bụ nke “e ji n’aka.” “Ihe nrite” mmeri ahụ pụrụ ịbụ ụgbọala ọhụrụ, ọ́bọ́ ihe ntụrụndụ n’ụlọ, ma ọ bụ ikekwe ọla diamọnd.
Ọ̀ dịwo mgbe ị natara òkù dị otú ahụ na-ama ọkwa na ọ bụ gị ga-enweta otu onyinye n’efu? Obi gị ọ̀ malitere itisi ike? Ò siiri gị ike ikweta? Ọ bụrụ na ị zara òkù dị otú ahụ, ọ̀ dị mgbe ị natara ihe nrite gị? Ka ị̀ bụ onye e ji azụmahịa telifon gwuo wayo? Ọ bụrụ na nke ahụ emeela gị, ọ bụghị nanị gị. Dị ka magazin bụ́ Consumers’ Research na-ekwu, na United States nanị, ndị azụmahịa telifon aghụghọ na-egwu mmadụ iri wayo kwa minit. Kwa afọ ndị wayo na-enweghị ụkpụrụ na-aghọnara ndị ahịa ijeri $10 ruo ijeri $40, ihe dị ka $7,500 kwa minit.
“Kwa afọ na Canada dum,” ka Reader’s Digest kọrọ, “ihe ruru mmadụ 150,000 na-aza òkù sitere n’aka ndị azụmahịa telifon wayo bụ́ ndị na-agwa ha na ha ‘emeriwo’ ma ọ bụ na a ‘họrọwo ha’ maka nnukwute ihe nrite. Kwa afọ kwa a na-eji òkù ndị a aghọrị ọtụtụ puku ndị Canada, na-emefu nkezi nke $2,000 maka otu onye iji nweta ihe nrite ha.” Otu onye ọrụ Ndị Uwe Ojii Ógbè Ontario kwuru, sị: “Wayo telifon so na wayo ndị kasịnụ n’akụkọ ihe mere eme nke Canada.” Ọ na-ekwukwasị: “Anyị maara na ọ na-efu ndị Canada ọtụtụ nde dollar n’otu afọ.” Ọnụ ọgụgụ ndị ahụ na-anọchitekarị anya ihe a kọọrọ ndị uwe ojii. Otú ọ dị, ebe a na-eme atụmatụ na nanị 10 pasent ndị ọ dabaara na-akọ mfu ha, o kweghị omume ikpebi ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu nke nsogbu ahụ n’izi ezi.
“Anyị na-agwa ndị mmadụ na ha emeriwo ka ha wee kwụsị ichezi echiche,” ka otu ọkà wayo kwetara. O kwukwasịrị: “Mgbe ahụ anyị na-arụgide ha izite ego, anyị agaghị agbakwa nkịtị ma ha sị mba.” Ozugbo e ji wayo ahụ ghọgbute mmadụ, a pụrụ iresị ụlọ ọrụ azụmahịa telifon ndị ọzọ aha ya ma tinye ya ná ndepụta ndị “mumu.” A pụrụ iresị ndị ọzọ aha ha bụ́ ndị, n’aka nke ha, ga-akpọ ha ugboro ugboro. “Mgbe anyị ji ndepụta ndị mumu na-eme ihe,” ka otu onye Toronto jibu telifon azụ ahịa kwuru, “anyị na-eme ka 75 pasent n’ime ndị ahụ zụrụ ihe n’òkù mbụ. Nke ahụ na-agbada ruo ihe dị ka 50 pasent mgbe ọ na-erule ugboro atọ anyị ji ndepụta ahụ mee ihe. Ma ozugbo a ghọgbutere ha, ụfọdụ ndị na-anọgide na-aga n’ihu; ha na-achụso ego ha.”
Ruo ókè hà aṅaa ka ndị ndị azụmahịa telifon aghụghọ a ghọgburu ga-eru n’ịchụso nrọ ha nke irite ihe nrite na-ebu isi? “Ọ dịwo mkpa na anyị so ndị ụlọ akụ̀ rụkọọ ọrụ iji jichie ihe onwunwe ndị agadi ka e wee ghara ịmịkpọ ha,” ka otu onye uwe ojii nchọpụta kwuru. Otu nwanyị di ya ka nwụrụ anwụ ka a chọpụtara na o zijeere ndị azụmahịa telifon 16 dị iche iche ego ugboro 36, na-agbakọta ihe karịrị $85,000. Dị ka ihe ọ zụtara, ọ natawo “ọla ndị na-abaghị uru juru ọkara ụlọ.”
Oké Wayo Maka Ndị Wara Anya
Otú ọ dị, ndị na-egwu wayo a adịghị akpa ókè. Ndị ha na-aghọrị na-esite n’ọkwá akụ̀ na ụba nile nke ọha mmadụ. Ọbụna na a ghọgbuwo ndị ọkà e chere na ha wara anya. Aghụghọ a haziri ahazi pụrụ ịdị na-adọrọ nnọọ adọrọ nke na a pụrụ inweta ọbụna onye ahịa kasị mụrụ anya. A pụrụ ịkpọsa ihe wayo ndị ọnụ ahịa ha ka elu bụ́ ndị e chere ihu n’ebe ndị wara anya nọ na telivishọn ma ọ bụ na broshuọ àgwà àgwà a na-ezite dị ka akwụkwọ ozi. Ha pụrụ ịgụnye ntinye ego n’atụmatụ ndị na-ekwe nkwa ọmụrụnwa ndị buru ibu—ntinye ego n’ogige nkiri sịnịma, ọlaedo na ebe a na-egwupụta ọlaedo, olulu mmanụ. Ndepụta ya anaghị agwụ agwụ. Otú ọ dị, ihe ndị ọ na-arụpụta bụ otú ihe ahụ—mfu ihe nile.
“Ọ̀tụ̀tụ̀ nghọgbu ha siri ike ikweta,” ka otu nwanyị gụrụ akwụkwọ a ghọgburu kwuru. “Dị ka onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ, echere m na m nwere ọgụgụ isi. . . . Nkwa a na-ekwe enweghị ọgwụgwụ.” Puku dollar iri abụọ funahụrụ ya na wayo ụlọ ọrụ ihe nkiri sịnịma.
Wayo azụmahịa telifon bụ nsogbu ụwa nile. Ndị nchọpụta na-eme atụmatụ na ọ “ga-aka njọ n’iri afọ a.” Ma, kpachara anya! E nwere ụdị ndị ọzọ nke nghọrị, ụfọdụ ndị ọkà wayo nwekwara ndị ha kasị elekwasị anya—ndị agadi.
[Foto dị na peeji nke 20]
Kpachara anya maka ndị nghọrị na-abịa ma oké ifufe fesịa!
[Foto dị na peeji nke 21]
“I ritewo otu ihe nrite n’efu!”—ma ọ̀ bụ eziokwu?