Òtù Nzuzo—Gịnị Ka Ha Bụ?
FEBRUARY 28, 1993—ihe karịrị otu narị ndị ọrụ na-ahụ na e debere iwu wakporo otu èzí e nwere ụlọ ole na ole nke ọtụtụ ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka bi. Nzube ya bụ iji chọọ ngwá agha ndị a na-anataghị ikike maka ha ma jide otu omempụ a na-enyo enyo. Otú ọ dị, a wakwasịrị ndị ọrụ ahụ na mberede mgbe ìgwè mgbọ si n’ime ụlọ ndị ahụ na-awụta ebe ha nọ. Ha gbagwaara égbè.
Ọgụ a gburu mmadụ iri, merụọkwa ọtụtụ ndị ahụ. N’ime 50 ụbọchị na-esonụ, ọtụtụ narị ndị ọrụ gọọmenti ji égbè zuru ezu iji lụọ agha nta gbaa èzí ahụ gburugburu. Mmadụ 86 nwụrụ, gụnyere ma ọ dịkarịa ala ụmụaka 17, n’ọgụ ahụ.
Ma ònye bụ onye iro ahụ? Ìgwè ndị agha arụrụala nke òtù ndị na-azụ ahịa ọgwụ? Òtù ndị agha okpuru? Ee e. Dị ka ị pụrụ ịma, “onye iro” ahụ bụ ìgwè ndị na-ekpesi otu okpukpe ike, ndị nọ n’òtù nzuzo. Ihe ọghọm ha mere ka otu ógbè nta dị n’ala dị larịị nke etiti Texas, U.S.A., ghọọ ebe mba dị iche iche lekwasịrị anya. Usoro mgbasa ozi kwuru ọtụtụ ihe site n’ọtụtụ akụkọ, ntụle, na okwu nkọwa dị iche iche banyere ihe ize ndụ dị iche iche nke òtù nzuzo ndị na-anụbiga ọkụ n’obi ókè.
E chetaara ọha na eze ihe ndị mere n’oge gara aga ebe ndị òtù nzuzo bụ ndị ndị ndú ha dubara n’ọnwụ: ogbugbu ọchụ nke ndị Manson na 1969 na California; igbu onwe onye n’ìgwè na 1978 nke ndị òtù nzuzo na Jonestown, Guyana; nkwekọrịta igbu ọchụ na igbu onwe onye na 1987 nke onye ndú òtù nzuzo bụ́ Park Soon-ja nke Korea kpalitere, bụ́ nke kpatara ọnwụ 32 ndị òtù ya. N’ụzọ dị ịrịba ama, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị a na-azọrọ na ha bụ ndị Kraịst ma na-ekwu na ha kwere na Bible.
N’ụzọ a pụrụ ịghọta, ọtụtụ ndị na-akwanyere Bible ùgwù dị ka Okwu Chineke na-enwe ijuanya n’ihi ajọ ụzọ ndị òtù nzuzo ndị a si eji Akwụkwọ Nsọ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. N’ihi ya, n’ọtụtụ afọ na-agafenụ, e hibewo ọtụtụ narị òtù dị iche iche maka nzube nke ileru òtù nzuzo dị iche iche anya na ikpughe ihe ize ndụ ndị ha na-eme. Ndị ọkachamara banyere akparamagwa òtù nzuzo na-ebu amụma na nrute nke puku afọ ọhụrụ n’afọ ole na ole na-abịa pụrụ ịkpalite njupụta nke òtù nzuzo. Otu magazin akụkọ ụwa rịbara ama na dị ka òtù ndị na-emegide òtù nzuzo si kwuo, e nwere ọtụtụ puku òtù nzuzo “nọ ná njikere ịpụnara gị ahụ gị, chịkwaa uche gị, merụọ mkpụrụ obi gị. . . . Ole na ole nwere ngwá agha ma a na-ele ihe ka n’ọnụ ọgụgụ anya dị ka ndị dị ize ndụ. Ha ga-arafu gị ma gbaba gị aka, lụnye gị di ma ọ bụ nwunye, liekwa gị.”
Gịnị bụ Òtù Nzuzo?
Okwu ahụ bụ́ “òtù nzuzo” bụ nke ndị na-amatachaghị ihe ọ gụnyere pụrụ ịdị na-eji eme ihe òtù masịrị ha. Iji zere mgbagwoju anya, ụfọdụ ndị ọkà mmụta okpukpe na-ezere n’ezie iji okwu ahụ eme ihe.
Akwụkwọ The World Book Encyclopedia na-akọwa na “na mbụ, okwu ahụ bụ́ òtù nzuzo zoro aka n’ụdị ọ bụla nke ofufe ma ọ bụ ememe okpukpe.” Site n’ụkpụrụ nke a, a pụrụ ịkpọ òtù okpukpe nile òtù nzuzo. Otú ọ dị, n’usoro okwu a na-ejikarị eme ihe taa, okwu ahụ bụ́ “òtù nzuzo” nwere ihe dị iche ọ pụtara. Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ na-arịba ama na “kemgbe etiti afọ ndị 1900, mkpọsa banyere òtù nzuzo agbanwewo ihe okwu ahụ pụtara. Taa, a na-eji okwu ahụ eme ihe banyere ìgwè ndị na-agbaso otu onye ndú dị ndụ nke na-akwalite ozizi na omume ndị ọhụrụ na ndị na-ekwekọghị n’echiche ọha mmadụ.”
N’ikwenyere ụzọ e si ejikarị okwu ahụ eme ihe, magazin bụ́ Newsweek na-akọwa na òtù nzuzo “na-abụkarị ìgwè ndị dị nta, nwee echiche ndị gabigara ókè, ndị ndị òtù ha na-enweta ihe e ji mara ha na nzube ha site n’otu onye na-akpali mmetụta uche.” N’otu aka ahụ, magazin Asiaweek na-arịba ama na “okwu ahụ [òtù nzuzo] n’onwe ya dị inyoghị inyoghị, ma ọ na-egosikarị okwukwe okpukpe ọhụrụ nke e wuru gburugburu onye ndú na-akpali mmetụta uche, onye na-asịkarị na ya bụ Chineke n’onwe ya.”
Okwu e ji mee ihe ná nkwupụta e jikọrọ aka mee nke Nnọkọ nke 100 nke State of Maryland, U.S.A., na-enyekwa nghọta na-eweda n’ala nke okwu ahụ bụ́ òtù nzuzo. Nkwupụta ahụ na-asị na “òtù nzuzo bụ ìgwè ma ọ bụ òtù na-egosipụta nraranye gabigara ókè n’ebe otu onye ma ọ bụ echiche dị, na-ejikwa ụzọ ime ka e kwere n’ihe na inwe ike bụ́ ndị na-ekwekọghị n’ezi echiche, akwalite ihe mgbaru ọsọ ndị nke onye ndú ya.”
N’ụzọ doro anya, a na-aghọtakarị òtù nzuzo ịbụ òtù okpukpe ndị nwere echiche na omume ndị dịwagara iche bụ́ ndị na-emegide ihe a nakweere taa dị ka akparamagwa ziri ezi nke ọha mmadụ. Ha na-eduzikarị ihe omume okpukpe ha ná nzuzo. Ọtụtụ n’ime òtù nzuzo ndị a na-ewepụkarị onwe ha iche n’ógbè dị iche iche. Nrara ha raara onwe ha nye onye mere onwe ya onye ndú bụ́ mmadụ yikarịrị ka ọ ga-abụ nke a na-akparaghị ókè na nke na-enweghị nkewa. Ọtụtụ mgbe ndị ndú ndị a na-etu ọnụ na Chineke ahọpụtawo ha ma ọ bụ ọbụna ha inwe ọdịdị nke ndị bụ chi n’onwe ha.
Mgbe ụfọdụ, ndị na-emegide òtù nzuzo na ndị mgbasa ozi ezowo aka n’ebe Ndịàmà Jehova nọ dị ka òtù nzuzo. Ụfọdụ isiokwu akwụkwọ ndị ọhụrụ gụnyere Ndịàmà n’òtù okpukpe ndị a maara maka ihe omume ha ndị a na-enyo enyo. Ma ọ̀ ga-ezi ezi izo aka n’ebe Ndịàmà Jehova nọ dị ka ìgwè okpukpe dị nta? Ndị nọ n’òtù nzuzo na-ewepụkarị onwe ha n’ebe ndị enyi, ezinụlọ, na ọbụna n’ebe ọha mmadụ n’ozuzu ya nọ. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ? Ndịàmà hà na-eji ụzọ nghọgbu na ndị na-ekwekọghị n’echiche ọha mmadụ enweta ndị òtù?
A ma ndị ndú òtù nzuzo ama maka iji ụzọ aghụghọ iji chịkwaa uche ndị na-eso ha. È nwere ihe àmà ọ bụla na-egosi na Ndịàmà Jehova na-eme nke a? È ji ihe nzuzo kpuchie ofufe ha? Hà na-agbaso ma na-efe onye ndú bụ́ mmadụ ofufe? N’ikwu ya hoo haa, Ndịàmà Jehova hà bụ òtù nzuzo?
[Ebe e si nweta foto Dị na peeji 3]
Jerry Hoefer/Fort Worth Star Telegram/Sipa Press