Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 6/1 p. 5-6
  • Izobe Ihe n’Aha Onyenwe Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Izobe Ihe n’Aha Onyenwe Anyị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ize Ndụ nke Ihe Nzuzo Okpukpe
  • Gịnị Mere E Ji Enwe Ihe Nzuzo ahụ Nile?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Ndị Dị na Teta! A
    Teta!—2018
  • Ihe Nzuzo Ndị Kraịst Na-agaghị Anwa Anwa Idebe!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ihe Nzuzo I Nwere Ike Ịkọrọ Ndị Ọzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 6/1 p. 5-6

Izobe Ihe n’Aha Onyenwe Anyị

MWAKPO e ji gas na-egbu egbu mee n’ụzọ okpuru ala dị na Tokyo, Japan, na March 1995 gburu mmadụ 12, mee ka ọtụtụ puku ọzọ daa ọrịa, ma nye aka kpughee otu ihe nzuzo. Otu ịrọ òtù okpukpe a ma dị ka Aum Shinrikyo (Eziokwu Kasịnụ) achịkọbawo na nzuzo nkwakọba nke sarin gas iji mee ihe ná nchụso nke nzube ndị dị omimi.

Otu ọnwa ka e mesịrị, otu bọmbụ gbawara tirisịrị otu ụlọ gọọmenti dị n’Oklahoma City, U.S.A., gbuokwa mmadụ 167. Ihe àmà yiri ka ọ na-egosi na e jikọrọ mwakpo ahụ n’ụzọ ụfọdụ n’omume ọgbasara m nke gọọmenti n’ihe banyere ịrọ òtù okpukpe bụ́ Ndị Alaka David na Waco, Texas, kpọmkwem afọ abụọ bu ụzọ. N’oge ahụ ihe dị ka ndị òtù nzuzo 80 nwụrụ. Mgbawa bọmbụ ahụ kpughekwara ihe bụụrụ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ ihe nzuzo: Ọtụtụ ìgwè ndị na-arụ ọrụ agha na-akpa ike ugbu a na United States, bụ́ ndị a na-enyo ma ọ dịghị ihe ọzọ ụfọdụ n’ime ha enyo maka iji nzuzo na-eme atụmatụ ihe na-emegide ọchịchị.

Ka oge na-aga, ka 1995 na-abịa ná njedebe, a hụrụ ozu mmadụ 16 a gbara ọkụ n’ebe ọhịa nke dị nso na Grenoble, France. Ha bụ ndị òtù nke Òtù nke Ụlọ Nsọ Ike Anyanwụ, bụ́ obere ịrọ òtù okpukpe nke a kọrọ n’akụkọ n’October 1994 na Switzerland na Canada mgbe 53 n’ime ndị òtù ya gburu onwe ha ma ọ bụ bụrụ ndị e gburu. Ma ọbụna mgbe ọdachi a gasịrị, òtù nzuzo ahụ anọgidewo na-akpa ike. Ruo taa ihe na-akwali ya na nzube ya anọgidewo bụrụ ndị e zobere ezobe.

Ihe Ize Ndụ nke Ihe Nzuzo Okpukpe

N’ihi ihe omume ndị dị otú ahụ, ọ̀ bụ ihe na-eju anya na ọtụtụ ndị na-enyo ọtụtụ òtù okpukpe enyo? N’ezie ọ dịghị onye ga-achọ ịkwado òtù nzuzo—nke okpukpe ma ọ bụ nke na-abụghị nke okpukpe—nke na-emebi ntụkwasị obi ya ma na-eme ka ọ chụsoo nzube ndị ọ na-adịghị ekwenyere. Otú ọ dị, gịnị ka ndị mmadụ pụrụ ime iji zere ịdaba n’ọnyà nke itinye aka n’òtù nzuzo ndị nwere ọdịdị a na-enyo enyo?

O doro anya na onye ọ bụla na-atụle isonye n’òtù nzuzo ga-abụ onye maara ihe ịchọpụta ihe bụ ebumnobi ya n’ezie. E kwesịrị iche nche megide nrụgide sitere n’aka ndị enyi ma ọ bụ ndị a maara, mkpebi kwesịkwara ịdabere ọ bụghị ná mmetụta uche kama n’ihe bụ ezie. Cheta, o yikarịrị ka ọ bụ onye ahụ n’onwe ya—ọ bụghị ndị ọzọ—ka a ga-akpọ ịta ahụhụ ihe ọ bụla pụrụ isi na ya pụta.

Ịgbaso ụkpụrụ Bible bụ ụzọ a kasị jide n’aka nke izere ìgwè ndị dị ize ndụ ndị ebumnobi ha na-ezighị ezi. (Aịsaịa 30:21) Nke a na-agụnye ịnọgide na-anọpụ iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, igosi ndị ọzọ ịhụnanya, ọbụna ndị iro, izere “ọrụ nile nke anụ ahụ,” na ịzụlite mkpụrụ nke mmụọ Chineke. Nke kasịnụ, ezi ndị Kraịst agaghị abụ akụkụ nke ụwa ma ọlị, ọbụna dị ka Jisọs na-abụghị, ụzọ a na-agụpụkwa iso n’òtù nzuzo ụwa.—Ndị Galetia 5:19-23; Jọn 17:14, 16; 18:36; Ndị Rom 12:17-21; Jemes 4:4.

Ndịàmà Jehova bụ ndị mmụta dị uchu nke Bible, ndị ji okpukpe ha kpọrọ ihe, na-agbalịkwa n’ụzọ onye ọ bụla na-ahụ ibi ndụ kwekọrọ na nke ahụ. N’ụwa nile, a maara ha nke ọma dị ka òtù okpukpe nke ‘na-achọ udo ma na-agbaso ya.’ (1 Pita 3:11) Akwụkwọ ha bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom na-ekwu n’ụzọ ziri ezi, sị: “Ndịàmà Jehova abụghị òtù nzuzo n’echiche ọ bụla. A na-akọwa nkwenkwe ha ndị dabeere na Bible n’ụzọ zuru ezu ná mbipụta ndị onye ọ bụla pụrụ inweta. Ọzọkwa, ha na-etinye mgbalị pụrụ iche iji kpọọ ọha mmadụ òkù ịga nzukọ ha ịhụ na ịnụrụ n’onwe ha ihe na-ewere ọnọdụ.”

Ezi okpukpe adịghị eme ihe na nzuzo n’ụzọ ọ bụla. A kụziworo ndị na-efe ezi Chineke ahụ ofufe ka ha ghara izo ndị ha bụ ma ọ bụ ikpuchi nzube ha dị ka Ndịàmà Jehova. Ndị na-eso ụzọ Jisọs nke oge mbụ ji ozizi ha mejupụta Jerusalem. Ha gbara onwe ha n’anwụ n’ihe banyere nkwenkwe na ọrụ ha. Otu ihe ahụ bụ eziokwu banyere Ndịàmà Jehova taa. N’ụzọ kwere nghọta, mgbe ọchịchị aka ike na-egbochi nnwere onwe ife ofufe n’ụzọ na-ezighị ezi, ndị Kraịst aghaghị iji akọ na obi ike gaa n’ihu n’ọrụ ha, ikwenyere “Chineke karịa mmadụ,” bụ́ ọnọdụ a manyere ha n’ime ya n’ihi àmà ihu ọha ha ji obi ike na-agba.—Ọrụ 5:27-29; 8:1; 12:1-14; Matiu 10:16, 26, 27.

Ọ bụrụ na ọ dịtụwo mgbe ọ batara gị n’uche na Ndịàmà Jehova nwere ike bụrụ òtù nzuzo, nke ahụ ga-abụ ma eleghị anya n’ihi na ị maara ihe dị oké nta banyere ha. Nke ahụ aghaghị ịbụworị ọnọdụ ọtụtụ ndị na narị afọ mbụ nọ na ya.

Ọrụ isi nke 28 na-agwa anyị banyere otu nzukọ Pọl onyeozi na “ndị bụ isi n’etiti ndị Juu” nwere na Rom. Ha gwara ya, sị: “Ọ dị anyị mma ịnụ n’ọnụ gị ihe ị tụkwasịrị uche gị na ha: n’ihi na ihe banyere ịrọ òtù a, anyị mazuru na a na-ekwugide ya ebe nile.” (Ọrụ 28:16-22) Ná nzaghachi, Pọl “kọọrọ [ha] akụkọ, na-ekwusi okwu alaeze Chineke ike,” “ụfọdụ wee kwere.” (Ọrụ 28:23, 24) N’ezie ọ bụ maka abamuru ebighị ebi ha ịmata ihe ndị bụ eziokwu banyere ezi Iso Ụzọ Kraịst.

N’ịbụ ndị raara onwe ha nye n’ozi ihu ọha a na-ezoghị ezo ha na-ejere Chineke, Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ ikpughe eziokwu ndị doro anya banyere ọrụ na nkwenkwe ha nye onye ọ bụla chọrọ ịma ihe ndị bụ eziokwu. Gịnị ma i mee nchọpụta n’onwe gị, wee si otú a nọrọ n’ọnọdụ inweta ihe ọmụma kwesịrị ekwesị banyere ihe ha kwere na ya?

[Foto dị na peeji nke 6]

Ndịàmà Jehova na-enwe obi ụtọ ikpughe ndị ha bụ na ihe ha na-eme

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya