Gịnị Mere E Ji Enwe Ihe Nzuzo ahụ Nile?
“Ọ DỊGHỊ ihe dị oké arọ dị ka ihe nzuzo.” Ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ, otú ahụ ka otu ilu ndị France na-ekwu. Ọ̀ pụrụ ịbụ nke a mere anyị ji enwe obi ụtọ mgbe anyị maara otu ihe nzuzo ma mgbe ụfọdụ na-enwe ahụ mgbakasị mgbe anyị na-apụghị ịkọ ya? N’agbanyeghị nke ahụ, eri ọtụtụ narị afọ ndị mmadụ anabatawo ime ihe na nzuzo, na-ejikọta onwe ha ọnụ ịbụ ìgwè nzuzo dị iche iche ná nchụso nke otu nzube.
Ndị so ná ndị kasị bụrụ ndị mbụ n’ime òtù nzuzo ndị a bụ òtù ihe omimi ndị e nwere n’Ijipt, Gris, na Rom. Ka oge na-aga ụfọdụ n’ime ìgwè ndị a si ná mmetụta ha bụ nke okpukpe pụọ ma weghara ọdịdị nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọnọdụ akụ̀ na ụba, ma ọ bụ nke ọha mmadụ. Dị ka ihe atụ, mgbe e guzobere òtù dị iche iche na Europe nke mgbe ụwa na-emepechabeghị anya, ndị so na ya malitere izobe ihe n’ụzọ bụ isi n’ihi nchebe onwe onye n’ụzọ akụ̀ na ụba.
E hiwewo ìgwè nzuzo ndị dị n’oge a ọtụtụ ugboro n’ihi ihe ndị kwesịrị nnọọ ekwesị, ikekwe n’ihi “nzube ọha mmadụ na ime ihe ọma,” dị ka akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica si kwuo, na “iji rụọ ọrụ ebere na nke mmụta.” Ụfọdụ òtù ụmụnna, òtù ndị ntorobịa, òtù ọha na eze, na ìgwè ndị ọzọ bụkwa nke nzuzo, ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ bụrụtụ nke nzuzo. N’ozuzu ha, ìgwè ndị a na-ebu ihe dị mma n’obi, nanị na ndị òtù ya na-ahụ izobe ihe ịbụ ihe na-akpali akpali. Ihe omume nzuzo nke ịnabata mmadụ n’òtù nwere ihe ndọrọ mmetụta uche siri ike, ọ na-emekwa ka nkekọ nke ọbụbụenyi na ịdị n’otu sikwuo ike. Ndị òtù ahụ na-enwe mmetụta nke mmekọrịta chiri anya na nke otu nzube. Òtù nzuzo ndị dị ka nke a adịghị eyikebe ndị na-esoghị n’òtù ha egwu. Ndị na-esonyereghị ha adịghị enwe nsogbu n’ihi amaghị ihe nzuzo ndị ahụ.
Mgbe Izobe Ihe Na-agba Àmà Ihe Ize Ndụ
Ọ bụghị ìgwè nzuzo nile dị na nzuzo n’otu ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ. Ma ndị nwere “ihe nzuzo n’ime ihe nzuzo,” dị ka Encyclopædia Britannica si ekwu ya, bụ nnọọ ihe ize ndụ. Ọ na-akọwa na “site n’iji aha ndị pụrụ iche, ịṅụ iyi ma ọ bụ mkpughe” eme ihe, ndị òtù nọ n’ọkwá dị elu na-ejisi ike “edo onwe ha iche,” wee si otú ahụ na-akpali “ndị nọ n’ọkwá ka ala itinye mgbalị dị mkpa iji ruo n’ọkwá ndị dị elu.” Ihe ize ndụ dị n’ụdị ìgwè ndị ahụ doro anya. Ndị nọ n’ọkwá ndị ka ala nwere ike ghara ịma ma ọlị ihe bụ n’ezie ebumnobi nke òtù ahụ, ebe ọ bụ na ha erubeghị n’ọ̀tụ̀tụ̀ mkpughe dị otú ahụ. Ọ dị mfe isonye n’ìgwè ndị a na-amachaghị nnọọ ihe mgbaru ọsọ ha na ụzọ e si eru ha, n’eziekwa, ikekwe nke a na-akọwabeghị n’ụzọ zuru ezu. Ma onye a nabataworo n’ìgwè dị otú ahụ pụrụ imesịa hụ na o siri ike ikewapụ onwe ya; ọ na-abụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, onye e ji agbụ nke izobe ihe kee.
Otú ọ dị, izobe ihe na-agba àmà ihe ize ndụ ka ukwuu mgbe otu ìgwè na-achụso ihe mgbaru ọsọ ndị iwu megidere ma ọ bụ nke mpụ, n’ihi ya kwa na-anwa izobe ọbụna ịdị adị ya. Ma ọ bụ ọ bụrụ na a maara ịdị adị na nzube ya n’ozuzu ya, ọ pụrụ ịgbalị ime ka ịbụ onye òtù na atụmatụ ya ndị na-agaghị adịte anya bụrụ ihe nzuzo. Nke a bụ eziokwu banyere ìgwè na-eyi ọha egwu nke a na-akpali n’ụzọ dị ukwuu bụ́ ndị na-eji mwakpo iyi egwu ha na-eme ka ụwa kụjaa site n’oge ruo n’oge.
Ee, izobe ihe pụrụ ịdị ize ndụ, nye ma ndị mmadụ n’otu n’otu ma ọha mmadụ n’ozuzu ya. Chee echiche banyere òtù omempụ nke ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị ji aka ike na-awakpo ndị aka ha dị ọcha, òtù ime mpụ ndị dị ka òtù Mafia nzuzo, ìgwè ikike kasịnụ nke ndị ọcha dị ka Ku Klux Klan,a n’ekwughị banyere ọtụtụ ìgwè na-eyi ọha egwu dị gburugburu ụwa, bụ́ ndị nọgidere na-eme ka mgbalị ndị a na-eme iji nweta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ụwa kụọ afọ n’ala.
Gịnị Ka Ha Na-arụ Ugbu A?
N’afọ ndị 1950, dị ka ihe Agha Nzuzo ahụ kpatara, a haziri ìgwè nzuzo dị iche iche n’ọtụtụ mba Ọdịda Anyanwụ Europe ije ozi dị ka ihe ndabere maka òtù nguzogide ma ọ bụrụ na ndị Soviet anwaa mgbe ọ bụla imeri Ọdịda Anyanwụ Europe. Dị ka ihe atụ, dị ka magazin German bụ́ Focus si kọọ, e guzobere “ọdụ ngwá agha nzuzo 79” n’Austria n’ime oge a. Ọ bụghị mba Europe nile maara ọbụna banyere ìgwè ndị a. Otu magazin akụkọ kọrọ n’eziokwu ná mmalite afọ ndị 1990, sị: “Ihe a na-amabeghị bụ ụzọ ọtụtụ n’ime òtù ndị a siri dịgide taa na ihe ha pụrụ ịdị na-arụ n’oge na-adịbeghị anya.”
Ee, n’ezie. Ònye pụrụ n’ezie ịmara ìgwè nzuzo ole nwere ike ịdị na-eyi egwu dị ukwuu karịa ka onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ iche n’echiche?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ìgwè a dị na United States debere ụfọdụ n’ime ihe okpukpe nke òtù nzuzo nke oge gara aga site n’iji obe na-ere ọkụ eme ihe dị ka ihe nnọchiteanya ya. N’oge gara aga, ọ na-eme mwakpo n’abalị, ndị òtù ya na-eyikwa uwe mwụda na ákwà ọcha ma na-awụkwasị ọnụma ha n’ahụ ndị isi ojii, ndị Katọlik, ndị Juu, ndị ala ọzọ, na òtù ndị ọrụ.