Achịcha “Tapioca” Nri Ụtọ Ndị Brazil
Site n’aka onye edemede Teta! na Brazil
NA Brazil, e nwere ihe dịgasị iche iche e ji jiakpụ eme, bụ́ ndị a pụrụ ịkpọ tapioca. Otu n’ime ha bụ achịcha na-adị mbadamba nke a na-adịghị etinye ihe ọ bụla na ya. Achịcha a na-adị nnọọ mbadamba, a na-akpọkarịkwa ya achịcha tapioca. A na-eji akpụ a yọrọ ayọ ma gbaa n’anwụ ka ọ dị ntụ ntụ, bụ́ nke ndị Brazil na-akpọ polvilho doce ma ọ bụ goma, eme ya.
Mgbe a kwọsịrị jiakpụ ma pịa ya, mmiri na-acha ka mmiri ara ehi na-esi na ya apụta. A na-edebezi mmiri ahụ ka o doo, ka nke bụ́ akpụ wee nwee ike ịza n’ala. A na-akwafu mmiri ahụ, ma na-agbazi akpụ ahụ n’onwe ya n’anwụ.
Tapioca bụ nri e ji mara ụmụ amaala Brazil. Ka e mesịrị, ndị Portugal bi na Brazil bịara chọpụta na tapioca bụ ezigbo nri ha ga-eji dochie anya bred. Otú ọ dị, ọ ka bụ afọ ole na ole gara aga ka ndị Brazil bụ́ aka ochie n’isi nri matara banyere tapioca. Ha kpebikwara ime ka ọ ghọọ nri a ma ama ha ga na-ere n’ụlọ nri ha.
Ebe ọ bụ na ndị a bụ́ aka ochie n’isi nri chọrọ imeta ndị na-ahọkarị nri mma, ha chepụtara ụzọ ọhụrụ ha ga-esi na-akwadebe achịcha a, na-etinyekwu ihe n’otú ndị nwe ya si akwadebe ya. Taa, achịcha tapioca aghọọla nri a ma ama, na-eme ka ndị mmadụ nwewekwuo mmasị pụrụ iche n’ụzọ ndị Brazil si esi nri. Ihe mere e ji mara ọtụtụ ụlọ nri ama bụ n’ihi achịcha a ha na-eme.
Gbalịgodị ime achịcha a n’onwe gị. Ọ ga-amasị ezinụlọ na ndị enyi gị, ọ ga-esokwa ná nri ọzọ ha ma.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 26]
Ime Achịcha “Tapioca”
Ihe ndị e ji eme achịcha asatọ:
Iko polvilho doce atọ, otu iko mmiri na ọkara, na obere nnu.
Otú e si eme ya: Wụnye polvilho doce ahụ n’ime efere. Tinye ya nnu. Fesa mmiri n’elu ya ma jiri aka gị gwakọta ha. Na-etinyetụ ya mmiri obere obere ka i jikwa aka gị na-agwakọta ha. Nọgide na-eme ya otú ahụ ruo mgbe ọ ga-adị nro, mgbe ọ na-agaghịzi anya gị anya n’aka mgbe ị na-akpụ ya. Werezie ndị ahụ ị kpụrụ akpụ tinye na myọ̀. Pịa ya aka ka o si n’anya myọ ahụ na-apụta. Ọ pụtasịa n’anya myọ ahụ, ọ dịla mma i ji ya mee achịcha.
Sinye obere ite e ji eghe ihe, nke ihe na-adịghị anyagide na ya, n’ọkụ ka ọ dịtụ ọkụ. Kee ihe ahụ ụzọ asatọ. Tinye otu ụzọ n’ime ite ahụ ma were azụ ngaji gbasasịa ya nke ọma. Ghee ya minit abụọ ruo anọ, ma ọ bụ ruo mgbe ha jikọtara ọnụ ma dị mbadamba, mgbe ọ ga-enwe ike ịpụtara onwe ya ma ị chọọ iwepụta ya n’ite ahụ. Jiri mma tụgharịa ya ma ghee akụkụ ya nke ọzọ ruo otu minit. Gheekwa ndị nke fọrọ afọ otú ahụ. I ghesịa ha, dokọta ha nile ọnụ.
A pụrụ ime ka ihu achịcha tapioca na-adị iche site n’ịwụkwasị ihe ndị dịgasị iche iche n’elu ya. Ị chọọ iji ya mee nri ụtụtụ, tegodị ya bọta n’elu mgbe ọ ka dị ọkụ ma ghasa ngaji abụọ nke akị oyibo a kwọriri akwọri n’elu ya. Ma ọ bụkwanụ, ị pụrụ ịwụsa mmiri ara ehi dị ụtọ n’elu achịcha ahụ, tinye ya akị oyibo, pịachie achịcha ahụ apịachi, ma bupụtazie ya maka oriri.
[Foto dị na peeji nke 26]
Jiakpụ
[Foto dị na peeji nke 26]
Achịcha “tapioca” a wụsara akị oyibo na mmiri ara ehi n’elu ya