Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsịlata Imefu Ego?
“M chọpụtara na m na-achọkarị ịzụ ihe na-adịtụghị m mkpa, nke m na-ejighịkwa ego ya ma eleghị anya, nanị n’ihi na e gburu ya ná ntụ.”—Anna,a o si Brazil.
“Mgbe ụfọdụ, ndị enyi m na-akpọ m ka m soro ha nwee ntụrụndụ nke ga-efu ego buru ibu. Ana m achọ iso ndị enyi m nọkọọ, soro ha kporie ndụ. Ọ dịghị onye ọ na-atọ ụtọ ịsị, ‘Unu ewela iwe, m gaghị agali.’”—Joan, o si Australia.
Ọ̀ NA-ADỊ gị ka ọ dịtụbeghị mgbe i nwere ego zuuru gị ịzụ ihe ndị ị chọrọ ịzụ? Ị̀ na-adị eche, sị, A sị nnọọ na e welitekwuru aka n’ego mmachi akpa a na-enye m, m gaara enwe ego m ga-eji azụta ngwá egwuregwu ahụ m chọrọ ịzụ. A sị nnọọ na a na-akwụ m ego karịrị ihe a na-akwụ m ugbu a, m gaara enwe ike ịzụta akpụkpọ ụkwụ a “dị m mkpa.” Ma, kama ichegbuwe onwe gị banyere ego na-erubeghị gị aka, í cheghị na ọ ka mma ịmụta otú ị ga-esi na-achịkwa ụzọ i si emefu ego batara gị n’aka?
Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto nke ya na ndị mụrụ ya bi, i nwere ike ịsị ka i chere ruo mgbe ị hapụrụ ụlọ unu tupu ị mụta otú ị ga-esi kwụsịlata imefu ego. Ma, nke ahụ ga-adị ka mmadụ isi n’ụgbọelu wụpụ n’ebughị ụzọ mụta otú e si eji parachute eme ihe. Mgbe ọ chọrọ isi n’ụgbọelu ahụ wụpụ, ihe ọ ga-eme nwere ike ịgbata ya n’uche. Ma, lee ka ọ gaara esi aka mma ma a sị na ọ mụtara ụzọ bụ́ isi e si eji parachute ahụ eme ihe tupu ya eyiri ya wụpụ n’ụgbọelu ahụ!
N’otu aka ahụ, oge kasị mma iji mụta ịchịkwa ụzọ i si emefu ego bụ mgbe ị na-amalitebeghị inwe nsogbu ego ná ndụ. Eze Solomọn dere, sị: ‘Ego bụ ndo.’ (Eklisiastis 7:12) Ma ọ ga-abụrụ gị ndo nanị mgbe ị mụtara ịchịkwa ụzọ i si emefu ego. Ọ bụrụ na ị mụta ya, obi ga-esikwu gị ike, ndị mụrụ gị ga na-akwanyekwuru gị ùgwù.
Mụta Ụzọ Bụ́ Isi E Si Eme Ya
Ị̀ gwatụla ndị mụrụ gị ka ha kọọrọ gị ihe ilekọta ezinụlọ na-efu? Dị ka ihe atụ, ị̀ maara ego ole ọkụ eletrik na mmiri na-efu kwa ọnwa nakwa ego ole ilekọta ụgbọala, ịzụ ihe oriri, na ịkwụ ụgwọ ụlọ na-efu? I nwere ike iche na ịmata ihe ndị ahụ ga-agwụ gị ike. Ma, chetakwa na i so ná ndị a na-emefu ego ahụ n’isi ha. Ọzọkwa, mgbe ị gara biri na nke gị, ị ga-amalite ịkwụ ụgwọ ndị ahụ n’onwe gị. N’ihi ya, i kwesịrị ịma ego ole ihe ndị ahụ na-efu. Gwa ndị mụrụ gị ka ha gosi gị akwụkwọ ndị ha ji kwụọ ụgwọ ndị ahụ, ma gee ha ntị nke ọma mgbe ha na-akọrọ gị otú ha si hazie ụzọ ha si mefuo ego n’ihe ndị ahụ.
Otu Ilu Bible na-ekwu, sị: “Ka onye maara ihe wee nụ, wee tụkwasị ihe mmụta n’amamihe ya; ka onye nghọta wee nwetakwa ezi ndụmọdụ.” (Ilu 1:5) Anna, bụ́ onye a kpọrọ aha ya ná mmalite, na-ekwu, sị: “Nna m kụziiri m otú e si eme nhazi ma a bịa n’imefu ego, o mekwara ka m mara mkpa ọ dị ịhazi ihe nke ọma n’ihe banyere imefu ego ezinụlọ.” N’otu oge ahụ, nne Anna kụziiri ya ihe ndị ọzọ bara uru. Anna kwuru, sị: “O mere ka m mara uru ọ bara ikwe ihe ọnụ n’ebe dị iche iche tupu m zụwa ya.” O kwukwara, sị: “Mama m nwere ike iji obere ego zụta ihe ị na-atụghị anya na ọ ga-eji ego ole ahụ zụta.” Olee uru ihe ndị a Anna matara baara ya? O kwuru, sị: “Ugbu a, ana m eji aka m ahazi otú m ga-esi mefuo ego m. N’ihi otú a m si eji nlezianya ahazi ụzọ m si emefu ego, ahụ́ bịara na-eru m ala n’ihi na adịghịzi m eji ụgwọ na-enweghị isi.”
Chọpụta Ihe Ndị Mere O Ji Esiri Gị Ike
N’eziokwu, ọ dị mfe ikwu otú e si akwụsịlata imefu ego ekwu karịa ime ya eme, karịsịa ma ọ bụrụ na i bi n’ụlọ unu ma na-enweta ego mmachi akpa ma ọ bụ na-arụ ọrụ a na-akwụ gị ụgwọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ikekwe ọ bụ ndị mụrụ gị na-akwụ ọtụtụ n’ime ụgwọ ndị a na-akwụ akwụ. Ya mere, i nwere ike imefu ihe ka ukwuu n’ego gị otú i si chọọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na imefu ego na-atọ ụtọ. Paresh, bụ́ nwa okorobịa nọ n’India, kwetara, sị: “Ọ na-adịrị m mfe imefu ego, ọ na-atọkwa m ụtọ.” Otú ahụ ka ọ dịkwa Sarah, bụ́ onye si Australia. O kwuru, sị: “Ịzụ ihe na-atọ m ụtọ nke ukwuu.”
Ọzọkwa, ndị ọgbọ gị pụrụ ịrụgide gị imefu ego aghara aghara. Ellena, bụ́ onye dị afọ 21, kwuru, sị: “Ịzụ ihe aghọọla otu n’ime ihe ndị bụ́ isi na-eme ndị ọgbọ m obi ụtọ. Mụ na ha soro mee mkpapụ, ọ na-adị anyị ka ọ̀ bụ iwu na anyị ga-emefurịrị ego ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe obi ụtọ.”
Mmadụ ịchọ ime ihe ndị enyi ya mere adịghị njọ. Ma, jụọ onwe gị, sị, ‘Àna m eso ndị enyi m emefu ego n’ihi na m nwere ego, ka ọ̀ bụ n’ihi na m chere na m kwesịrị imefu ya?’ Ọtụtụ ndị na-emefu ego n’ihi na ha chọrọ ka ndị enyi ha kwanyewere ha ùgwù. Nke a pụrụ itinye gị ná nnukwu nsogbu ego, karịsịa ma ọ bụrụ na i nwere kaadị e ji azụ ihe n’aka. Suze Orman, bụ́ onye ndụmọdụ n’ihe banyere mmefu ego, dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na ị na-enwe mmasị iji ihe i nwere, kama iji ihe ị bụ dị ka mmadụ, eme ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ebe ị nọ, ị pụrụ ịba ná nnukwu ụgwọ n’ihi amaghị otú e si eji kaadị e ji azụ ihe n’aka eme ihe.”
Kama ịdị na-azụchapụ ego nile dị na kaadị i ji azụ ihe n’aka, ma ọ bụ na-emefu ego gị nile n’otu ụbọchị, í cheghị na ọ ka mma ịnwale ụzọ a Ellena si lagbụrụ? Ọ na-ekwu, sị: “Mgbe ọ bụla mụ na ndị enyi m chọrọ ime mkpapụ, ana m ebu ụzọ kpebie ego ole m ga-emefu tupu anyị agawa. A na-akwụnyere m ụgwọ ọnwa m n’ụlọ akụ̀, n’ihi ya, nanị ihe m na-adọrọ bụ ego ole ahụ m kpebiri imefu ná mkpapụ ahụ. Achọpụtakwara m na ọ bụ ihe amamihe dị na ya na ndị m ga na-eso aga ahịa ga-abụ nanị ndị enyi m na-adịghị emefusị ego ha, bụ́kwa ndị ga-agba m ume ikwe ọnụ ọtụtụ ebe tupu mụ azụwa kama ịzụ ihe n’ebe mbụ m kwere ọnụ.”—Ilu 13:20.
Mụta Ihe Mgbe A Sị Gị Mba
Ọ bụrụgodị na a dịghị enye gị ego mmachi akpa ma ọ bụ na ị dịghị akpata ego, i nwekwara ike ịmụta ihe ndị bara uru banyere ego mgbe ị ka nọ n’ụlọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị rịọ ndị mụrụ gị ka ha nye gị ego ma ọ bụ gwa ha ka ha zụtara gị ihe ụfọdụ, ha pụrụ ịsị gị mba. N’ihi gịnị? Otu ihe kpatara ya pụrụ ịbụ na, n’ihi ego ole ihe ahụ na-ada, ọ bụrụ na ha azụta ya, ha ga-emefu ego karịrị ihe ha mere atụmatụ imefu. N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị mụrụ gị asị gị mba mgbe ị rịọrọ ha ihe—ọ bụ ezie na ọ gaara amasị ha ịzụtara gị ihe ahụ—ha na-akụziri gị otú e si enwe njide onwe onye. Ka mmadụ wee ghara ịdị na-emefusị ego, ọ dịkwa ya oké mkpa ịdị na-enwe njide onwe onye.
Ka e weregodị ya na ịzụta ihe ahụ ị rịọrọ agaghị ebu ndị mụrụ gị aka. N’agbanyeghị nke ahụ, ha ka nwekwara ike ịsị gị mba. Ị pụrụ iche na ha dị aka ike. Ma, tụlee nke a: O nwere ike ịbụ na ha na-achọ ịkụziri gị otu ihe dị mkpa nke bụ́ na ọ bụghị inweta ihe ọ bụla ị chọrọ ga-eme ka i nwee obi ụtọ. Banyere nke a, Bible na-ekwu, sị: “Onye na-ahụ ego n’anya, ego agaghị eju ya afọ; ọzọ onye na-ahụ inwe ihe bara ụba n’anya, ihe omume agaghị eju ya afọ.”—Eklisiastis 5:10.
Ahụmahụ nke ọtụtụ ndị na-eto eto, bụ́ ndị ndị mụrụ ha na-azụtara ihe ọ bụla ha chọrọ, gosiri na nke a bụ eziokwu. Ndị ahụ na-eto eto na-emesị chọpụta na ha adịghị enwe afọ ojuju n’ezie. Otú ọ sọkwara sị zụkọjuoro ha ihe, ọ ga na-adị ha mgbe nile ka sị zụtakwuoro ha otu ihe ọzọ. Ka oge na-aga, ha nwere ike itolite ma ghọọ ndị na-enweghị ekele. Solomọn dọrọ aka ná ntị, sị: “Onye zụtọworo ohu ya [ma ọ bụ nwa ya] site na nwata, n’ikpeazụ ya ohu [nwa] ahụ ga-aghọkwa nwa [onye na-enweghị ekele, NW].”—Ilu 29:21.
Ego Bụ Oge
N’obodo ụfọdụ, ndị mmadụ na-ekwukarị, sị, Oge bụ ego. Ihe okwu a na-emesi ike bụ na mmadụ ga-ejirịrị oge kpata ego, mmadụ igbu oge bụ mmadụ imefusị ego. Ọ bụrụ na ị sụgharịa okwu ahụ isi—ego bụ oge—ọ ka bụkwa eziokwu. Ọ bụrụ na i mefusịa ego, ọ bụ oge i ji kpata ego ahụ ka ị na-egbu. Ọ bụrụ na ị mụta ka ị ga-esi kwụsịlata imefu ego, ọ bụ ya bụ na ị mụtala ka e si eji oge eme ihe nke ọma. Olee otú nke a si bụrụ eziokwu?
Tụlee ihe Ellena kwuru. O kwuru, sị, “Mgbe m na-achịkwa otú m si emefu ego, ọ bụkwa ego ole m kwesịrị ịdị na-akpata ka m na-achịkwa. Ebe ọ bụ na ahaziela m otú m ga-esi na-emefu ego m, ma na-agbasochi ya anya, ọ naghịzi adị m mkpa ịrụ ọrụ ruo ọtụtụ awa iji kwụọ nnukwu ụgwọ ndị m ji. Ana m achịkwazi oge m na ndụ m.” Ị́ gaghị achọ ịdị na-achịkwa ndụ gị otú ahụ?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a A gbanweela aha ndị a.
IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE
◼ Ọ̀ na-esiri gị ike ịkwụsịlata imefu ego? Gịnị kpatara ya?
◼ Olee ihe mere i ji kwesị izere ịhụ ego n’anya?—1 Timoti 6:9, 10.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]
Ọ̀ BỤ INWETAKWU EGO GA-EME KA Ị GHARAZIE INWE NSOGBU EGO?
Ọ̀ bụ inwetakwu ego ga-eme ka ị gharazie inwe nsogbu ego? Suze Orman, bụ́ onye ndụmọdụ n’ihe banyere ego, kwuru, sị: “Anyị nile na-eche na ọ bụrụ na ego anyị na-enweta ebukwuo ibu, nsogbu ego anyị na-enwe ga-akwụsị, ma ihe a na-ahụ bụ na nke ahụ adịkebeghị abụ eziokwu.
Iji maa atụ: Ọ bụrụ na ị na-anya ụgbọala ma ị dịghị achịkwa ya achịkwa, ma ọ bụ na ị na-adị emechi anya gị ma ị nyawa ụgbọala, itinyekwu mmanụ ụgbọala na ya ọ̀ ga-eme ka ahụ́ rukwuo gị ala? Ọ̀ dị gị ka ị ga-eru ebe ị na-aga n’udo n’ihi mmanụ ahụ i tinyekwuru na ya? N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị mụtaghị otú ị ga-esi kwụsị imefusị ego gị, inwetakwu ego agaghị eme ka ị gharazie inwe nsogbu ego.
[Igbe/Chaatị dị na peeji 15]
MỤTA ỊCHỊKWA YA
Ego ole ka i mefuru n’ọnwa gara aga? Gịnị ka i ji ya zụọ? Ì chefuola? N’okpuru, e depụtara otú ị ga-esi na-achịkwa ụzọ i si emefu ego ka i wee ghara ịba ná nsogbu ego.
◼ Na-enwe ihe ndekọ. Detuo ego ole i nwetara na akara ụbọchị i nwetara ha, ọ dịkarịa ala n’otu ọnwa. Depụta ihe ọ bụla ị zụrụ na ego ole ị zụrụ ya. Ọnwa ahụ gwụ, gbakọọ ego ole i nwetara na ego ole i mefuru.
◼ Hazie otú ị ga-esi emefu ego gị. Kpaa laịn abụọ ndị ga-esi n’elu gbadaa ala ná mpempe akwụkwọ a na-edeghị ihe na ya. Nke a ga-eme ka e nwee oghere atọ ndị ị pụrụ ide ihe na ha. N’oghere nke mbụ, detuo ego nile ị na-atụ anya inweta n’ime otu ọnwa. N’oghere nke abụọ, detuo otú ị chọrọ isi mefuo ego ahụ; hụ na ị na-agbaso ihe i dere n’akwụkwọ ahụ. Ka ọnwa ahụ na-aga, na-edetu n’oghere nke atọ ahụ, ego ole i mefuru na nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ i mere atụmatụ imefu ego na ha. Detuokwa ego ole i mefuru n’ihe ndị ị na-emebughị atụmatụ ịzụ.
◼ Hazigharịa ya. Ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ na-efu gị ego karịa ihe ị tụrụ anya ya, na-emekwa ka ị na-eji ụgwọ, hazigharịa otú ị ga-esi na-emefu ego. Kwụọ ụgwọ ndị i ji. Nọgide na-ahụ na ị na-achịkwa ụzọ i si emefu ego.
[Chaatị]
Chakapụta nke a ma jiri ya mee ihe!
Otú M Ga-esi Na-emefu Ego n’Ọnwa
Ego m ga-akpata Ihe ndị m ga-eji ya mee Ego m mefuru na ya
ego mmachi akpa nri
ọrụ nwa oge uwe
ihe ndị ọzọ fon
ntụrụndụ
onyinye
ego e chekwara echekwa
ihe ndị ọzọ
Ngụkọta Ngụkọta Ngụkọta
₦ ₦ ₦
[Foto]
Cheta na ọ bụrụ na ị na-emefusị ego, ị na-egbu oge i jiri kpata ego ahụ