Otu Ọkàiwu Eleba Anya n’Ihe Ndịàmà Jehova Kweere
OTU ọkàiwu, aha ya bụ Les Civin, onye nwere ọfịs ndị ọkàiwu na Saụt Afrịka, kwuru, sị: “O nwere oge m na-amachaghị ndị Ndịàmà Jehova bụ.” Gịnị mere o ji leba anya n’ihe Ndịàmà kweere? Gịnị ka ọ chọpụtara banyere ihe ndị ha kweere? Lekwa ihe ọ gwara Teta!
Olee okpukpe ị na-ekpebu?
Ndị mụrụ m bụ ndị Juu, ma ná mbido afọ ndị 1970, alụrụ m Carol, onye ndị mụrụ ya na-aga chọọchị Anglịkan. O nweghị mmasị n’okpukpe, o nweghịkwa ihe mụ na ya ji okpukpe kpọrọ n’oge ahụ. Ma, mgbe nwa anyị nwoke bụ́ Andrew gbara afọ asatọ, Carol bịara na-ekwu na anyị kwesịrị ime ka o nwee okpukpe ọ ga na-ekpe. Otu onye rabaị gwara m na ọ bụrụ na Carol ekpewe okpukpe ndị Juu, Andrew ga-aghọzi onye Juu. Ọ bụrụkwa na ọ gbaa afọ iri na atọ, a ga-emere ya ememme a na-akpọ Bar Mitzvah, bụ́ ememme ndị Juu na-eme iji gosi na mmadụ eruola ogo ikpebiri onwe ya ihe. N’ihi ya, anyị malitere ịga klas ebe a na-akụziri ndị chọrọ ikpe okpukpe ndị Juu ihe kwa izu n’ụlọ nzukọ ndị Juu.
Olee otú gị na Ndịàmà Jehova si mata?
Mgbe ọ bụla Ndịàmà bịara n’ụlọ anyị, anaghị m ekwe ka ha zie anyị ozi ọma. Ihe m na-agwa ha bụ, “Abụ m onye Juu, ekweghịkwa m n’Agba Ọhụrụ.” Ma otu ụbọchị, Carol gwara m na e nwere otu enyi ya bụ́ Onyeàmà nakwa na ọ ma Baịbụl nke ọma. Carol kwuru na ọ ga-adị mma ma anyị mụtụkwuo Baịbụl. N’ihi ya, ekwetara m ka mụ na Ndịàmà mụwa Baịbụl n’agbanyeghị na o sichaghị m n’obi.
Olee ihe i mere mgbe unu na-amụ Baịbụl?
Ana m eleda ndị ọzọ anya. N’ihi klas ahụ m na-aga n’ebe a na-akụziri anyị ihe ndị Juu kweere, abịara m lewe onwe m anya ka onye si n’agbụrụ Chineke ji aka ya họrọ. Ihe m chere n’obi m bụ, ‘Gịnị ka ndị a ma ha ga-akụziri m?’ N’oge mbụ anyị kwere ka Onyeàmà bịara n’ụlọ anyị zie anyị ozi ọma, agwara m ya, sị: “Abụ m onye Juu. Ekpebiri m na m ga na-ekpe okpukpe ndị Juu, m ga-anwụkwa na ya. O nweghị ihe ị ga-agwa m ga-eme ka m gbanwee okpukpe m.” Ọ gwara m na nsogbu adịghị. N’ihi ya, n’abalị Fraịdee na Mọnde ọ bụla, anyị na-aga klas a na-akụziri anyị ihe ndị Juu kweere, ma n’ụtụtụ Sọnde ọ bụla, anyị na Ndịàmà na-amụ ihe (ma ọ bụrụ na achọtalighị m ihe m ga-eji sị ha na enweghị m ohere). Ọ dabara na ha anaghị ana ndị mmadụ ego maka ịmụrụ ha Baịbụl otú e si ana anyị ego na klas ndị Juu.
Mgbe ọ bụla anyị na Ndịàmà na-amụ Baịbụl, m na-eji Baịbụl ndị Juu n’ihi na echere m na Ndịàmà nwere Baịbụl nke ha. Ma, o juru m anya ịhụ na Baịbụl nke ha na nke m na-ekwu otu ihe. Nke a medịrị ka m kpebisikwuo ike igosi Ndịàmà na ha amaghị ihe ha na-akọ.
Mgbe anyị gara klas ndị Juu ahụ ugboro ole na ole, Carol gwara m na ya echeghị na onye rabaị na-akụziri anyị ihe maara Baịbụl nke ọma. Ọ gwara m na ya ga-akwụsị ịga klas ahụ, nakwa na ya ka kweere na Jizọs bụ Kraịst. Ihe ahụ o kwuru were m ezigbo iwe nke na m chewere echiche ịgba ya alụkwaghịm. Ma, mgbe iwe ahụ pụrụ m n’obi, echepụtara m ihe ọzọ m ga-eme. Ekpebiri m iji amamihe onye ọkàiwu mee ka Carol ghọta na ihe ‘òtù iberiibe’ a na-akụzi abụghị eziokwu.
Ì meliri ya?
Otu onye rabaị nyere m akwụkwọ na-ekwu na amụma ndị e buru banyere Mesaya ahụ emezughị n’isi Jizọs. Mụ na Carol mụrụ akwụkwọ ahụ ruo otu afọ na ọnwa isii. Anyị na Ndịàmà nọgidekwara na-amụ Baịbụl kwa izu. Ma, ka anyị na-amụ akwụkwọ ahụ onye rabaị nyere m, obi anaghị eru m ala. Abịara m na-achọpụta na ihe ndị akwụkwọ ahụ kwuru iji gosi na Jizọs abụghị Mesaya ahụ abụghị eziokwu. Nke bụ́ eziokwu bụ na amụma niile kwuru banyere Mesaya ahụ na-atụ otu onye aka, ya bụ, Jizọs Kraịst. Ihe niile bịara doo m anya mgbe anyị gụrụ amụma ahụ dị na Daniel 9:24-27, bụ́ nke kwuru na Mesaya ahụ ga-apụta n’afọ 29 Oge Anyị.a Onyeàmà na-amụrụ anyị ihe wetara Baịbụl e dere n’asụsụ Hibru, nke e dekwara ihe okwu niile dị na ya pụtara n’asụsụ Bekee. Ebe ọ bụ na m ma agụ asụsụ abụọ ahụ, eji m aka m lebara okwu niile dị na ya anya, ma gbakọọ oge ndị e kwuru okwu ha n’amaokwu ndị ahụ. N’ikpeazụzi ihe m kwuru bụ: “O doola m anya na amụma ahụ na-atụ aka n’afọ 29 Oge Anyị. Oleezi otú nke ahụ si gbasa Jizọs?”
Onyeàmà ahụ kwuru, sị, “Ọ bụ n’afọ ahụ ka e mere Jizọs baptizim.”
O nyeghị m ọnụ okwu! O jukwara m anya otú amụma Baịbụl niile si bụrụ eziokwu nakwa otú ha na ibe ha si ekwekọ.
Gịnị ka ndị enyi gị mere mgbe ha matara na gị na Ndịàmà na-akpa?
Ụfọdụ n’ime ha meteweere mụ na nwunye m ebere ma gwa anyị na ha ga-akpọga anyị na nke ndị ga-egosi anyị na e duhiela anyị. Ma o nweghị onye duhiere anyị n’ihi na nnyocha anyị mere n’onwe anyị mere ka anyị kwenyesie ike na ihe Ndịàmà na-ekwu bụ eziokwu.
Gịnị mere i ji kpebie ịghọ Onyeàmà Jehova?
Ebu m ụzọ sowe nwunye m, onye ghọrọla Onyeàmà Jehova, na-aga ọmụmụ ihe ụfọdụ Ndịàmà na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha.b Ihe masịrị m bụ otú Ndịàmà si anabata onye ọ bụla na otú ha si hụ ibe ha n’anya n’agbanyeghị agbụrụ onye si. Ụdị ịhụnanya a adịghị n’okpukpe m na-ekpe. N’ihi ya, mgbe mụ na Ndịàmà mụkwuru Baịbụl ruo afọ atọ, e mere m baptizim.
Olee otú obi dị gị ugbu a ị ghọrọla Onyeàmà Jehova?
Ọ bụ ihe ùgwù na m bụ Onyeàmà Jehova. Ma m cheta otú m si kpọọ eziokwu dị na Baịbụl asị, ọ na-adị m ka erughị m eru inweta ọtụtụ ngọzi Jehova nyere m. O nweghị ihe ga-eme ka m kwaa mmakwaara na m ghọrọ Onyeàmà Jehova.
Olee ngọzi ndị i nwetarala?
Ha dị ọtụtụ. Otu n’ime ha bụ na enwere m ihe ùgwù ịbụ okenye, ma ọ bụ onye na-azụ atụrụ Chineke nakwa onye na-akụzi ihe, n’ọgbakọ anyị. Ihe ọzọkwa bụ na m na-enyere Ngalaba Okwu Iwu nke dị n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Saụt Afrịka aka. Ma o doro m anya na ngọzi kachanụ m nwetarala bụ ịmata onye Jehova na Ọkpara ya bụ nakwa ịghọta ihe ihe ndị na-eme n’ụwa taa na-egosi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 197, a kọwara amụma Daniel buru banyere Mesaya ahụ.
b Carol nwụrụ n’afọ 1994, ọ dịkwala anya Les Civin lụrụ nwaanyị ọzọ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]
O juru m anya otú amụma Baịbụl niile si bụrụ eziokwu nakwa otú ha na ibe ha si ekwekọ