“Nanị Otu n’Ime Ọtụtụ Ndụ Ndị I Metụtara”
LAA azụ na January 1996, Carol rịara ọrịa akpụ ụbụrụ. Ọ nọ n’afọ ndị nke 60 ya ma tupu mgbe ahụ ọ bụwo mgbe nile nwanyị obi ụtọ dị poko poko, onye na-enwe okwu na-agba ume maka onye ọ bụla. Ma ugbu a ndị dọkịta na-agba mbọ imeri uto ahụ na-egbu egbu. N’ime ọnọdụ ndọlị ya, Carol natara akwụkwọ ozi na-esonu:
“Ezigbo Carol:
“Enwere m nnọọ mwute banyere ahụ ike gị na-aka njọ. Ihe ọma mere na anyị nwere ezi olileanya nke Bible na-enyere anyị aka ịmata na inwe mmasị na ya. Olileanya a bụ maka Alaeze Jehova ịchị ụwa ka anyị wee nwee ike ibi n’ọnọdụ paradaịs, bụ́ oge anyị nile na-elepụ anya ịhụ.
“Achọrọ m ka ị mara na ọrụ nkwusa gị zọpụtara ọtụtụ mmadụ pụọ n’ọnwụ ebighị ebi. Abụ m otu n’ime ndị a. Ejighị m n’aka ma i chetara oge mbụ anyị zutere. N’oge ahụ adị m afọ 20. Enwere m ntutu ogologo, na-ere ọgwụ ọjọọ, ma na-eso ìgwè ndị na-akpa ike akwụgharị. Anyị nile na-ebu égbè, gharakwa inwe ezi ịhụnanya e wezụga maka onwe anyị.
“Gị na Onyeàmà ọzọ kụrụ aka n’ụlọ m ma nyefee m Ụlọ Nche na Teta! Agbalịrị m inye gị otu dollar ma kwuo na achọghị m magazin ndị ahụ. I mere ka m mara na ị pụtaghị nanị iji nweta onyinye. Ị gwara m na ị na-arụ ọrụ inyere ndị mmadụ aka ịgụ Bible. Ejighị m n’aka ma m naara magazin ndị ahụ ma ọ bụ gụọ ha. Otú ọ dị, ị kụnyere mkpụrụ nke eziokwu ahụ ná ndụ m.
“N’afọ ụfọdụ mgbe e mesịrị, Onyeàmà ọzọ, bụ́ Gary, bịara n’ụlọ mama m n’oge m nọ. Agwara m ya maka nleta i meworo n’afọ ụfọdụ gara aga. Gary mụụrụ m Bible ruo ogologo oge ruo mgbe e mesịrị mee m baptism na 1984. Ugbu a ana m akụziri ụmụ m eziokwu nke Alaeze Chineke.
“Eji m n’aka na m bụ nanị otu n’ime ọtụtụ ndụ ndị i metụtara n’afọ gị nile nke ije ozi ikwesị ntụkwasị obi. Otú ọ dị, site n’ebere ịhụnanya a, i mewo ka mụ na ezinụlọ m nwee ike ịbịa mara Chineke Ukwu ahụ, bụ́ Jehova, na Ọkpara ya, bụ́ Kraịst Jisọs. Ana m elepụ anya ịhụ ụbọchị mgbe m pụrụ ịhụ gị n’usoro ihe ọhụrụ ahụ mgbe Jehova ga-ehichapụ anya mmiri nile n’anya anyị, ọnwụ agaghị adịkwa.—Mkpughe 21:4.
“Ma mụ onwe m na ezinụlọ m, anyị nwere obi ụtọ na anyị nwere ohere ịmara gị na ịbụ akụkụ nke ọrụ ịgba àmà gị. I meela.
“Site n’ịhụnanya ụmụnna,
Peter”
Ka nrịanrịa ọnwa isii gasịrị, Carol nwụrụ na March 1996, ebe ọ kụworo ọtụtụ mkpụrụ nke eziokwu n’afọ 35 ya dị ka onye na-ekwusa ozi ọma na-anụ ọkụ n’obi. Ọ mụtara na mmadụ adịghị ama mgbe ihe ọkụkụ ga-amị mkpụrụ, ọbụna ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị.—Matiu 13:23.