Ihe I Nwere Ike Ime Ka Ị Ghara Inwe Ihe Ọghọm Mgbe Ị Na-anya Ụgbọala
Ọ BỤRỤ na ị nọtụla n’ụgbọala, ya enwee ihe ọghọm, ma ọ bụkwanụ na ị nọtụla nso mgbe ụgbọala nwere ihe ọghọm, o nwere ihe ụfọdụ mere n’ụbọchị ahụ ị na-agaghị echefu echefu. O nwere ike, i chetara otú taya ụgbọala ahụ si chie n’ala, otú ahụ́ ya si kpọkasịa, otú ugegbe ya si kụwasịa, na ákwá ndị nọ n’ụgbọala ahụ bere mgbe ihe ahụ mere. Ngalaba na-ahụ maka ahụ́ ike n’ụwa kwuru na ihe dị ka otu nde mmadụ na narị puku mmadụ abụọ na-anwụ kwa afọ n’ihe mberede okporo ụzọ. Ha kwukwara na ihe ruru nde mmadụ iri ise na-emerụ ahụ́ kwa afọ n’ihe mberede okporo ụzọ.
Ma, ọ bụrụ na ndị mmadụ ana-akpachapụ anya mgbe ha na-anya ụgbọala, a gaghị na-enwekarị ihe ọghọm n’okporo ụzọ. Legodị ụfọdụ ihe i nwere ike ime.
Agbala Ọnwụ Ọnwụ, Kee Belt Oche Ụgbọala Gị, Hapụ Ekwe Ntị Gị Aka
O nwere ụzọ ọ ga-abụ ị na-agba, gị ahụ na ókè iwu kwuru ka ndị na-anya ụgbọala na-agba n’ụzọ ahụ dị obere. Ma, ọ bụrụ na ị gbafee ya, ọ gaghị eme ka i ruo ebe ahụ ị na-aga ngwa ngwa otú ahụ i chere. Ka e were ya na ebe ị na-aga dị ihe karịrị kilomita iri ise nakwa na iwu kwuru ka ndị na-anya ụgbọala n’ụzọ ahụ na-agba kilomita iri itoolu n’otu awa. Ọ bụrụ na ị gbaa otu narị kilomita na kilomita iri n’otu awa n’ụzọ ahụ, ị ga-eru ebe ị na-aga, zuo ike ihe dị ka nkeji isii tupu ya eruo oge ị gaara eji eru ebe ahụ. Ị̀ ga-ekwo maka obere oge a gbaa ọnwụ ọnwụ, bụ́ nke nwere ike ime ka i nwee ihe mberede?
Ihe mere ndị rụrụ ụgbọala ji etinye belt n’oche ụgbọala bụ ka ọ zọọ mmadụ ndụ. Otu ụlọ ọrụ gọọmenti dị n’Amerịka kwuru na n’agbata afọ 2005 na 2009, belt oche ụgbọala zọrọ ihe karịrị puku mmadụ iri asaa na puku mmadụ abụọ ndụ ná mba ahụ. Ọ bụrụ na a rụnyere akpa ikuku [ya bụ, air bag] n’ụgbọala, ọ̀ pụtara na ọ dịghị mkpa ka onye nọ n’ụgbọala ahụ yiri belt oche ụgbọala? Mbanụ. Ihe mberede mee, akpa ikuku ụgbọala gị agaghị arụ ọrụ nke ọma ma ọ bụrụ na i yighị belt oche ụgbọala. Akpa ikuku ahụ nwedịrị ike merụọ gị ahụ́. N’ihi ya, gbalịa ka i yiri belt oche ụgbọala gị mgbe ọ bụla ị na-anya ụgbọala, gwakwa ndị i bu ka ha yiri nke ha. Ihe ọzọ bụ: Ị na-anya ụgbọala, azala onye kpọrọ gị n’ekwe ntị, akpọkwala mmadụ n’ekwe ntị, agụla ozi e ziteere gị n’ekwe ntị ma ọ bụkwanụ jiri ekwe ntị na-ezigara mmadụ ozi.
Na-elezi Ụgbọala Gị Anya, Kpachapụkwa Anya ma Ị Na-agba n’Ụzọ
Ala dịrị mmiri mmiri, taya ụgbọala anaghị esi ike n’ala. Ị na-agba n’ụdị ebe ahụ, jiri nwayọọ ka ọ ga-abụ i jie brek, ebe ahụ agaghị amịrị taya gị. I kwesịkwara ime otú ahụ ma ị na-agba ebe uzuzu, ájá ma ọ bụ kọnkịrị juru. Ọ bụrụ na ị na-anyakarị ụgbọala gị, hụ na ị na-agbanwe taya ya mgbe ọ bụla o riri. Nke a ga-eme ka taya ụgbọala gị na-anọsi ike n’ala.
Onye ọ bụla na-anya ụgbọala kwesịrị ịkpachapụ anya ma o ruo ebe ụzọ wara ngalaba. A na-etinye ọkụ na-eduzi ụgbọala n’ụfọdụ ebe ndị ahụ. Otu ọkachamara kwuru na ọ bụrụ na mmadụ anyara ụgbọala rute ebe ahụ, onye ahụ kwesịrị icheretụ tupu ọ gawa ebe ọ na-aga ma ọkụ ahụ chawa akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ. Onye ahụ cheretụ, ọ ga-eme ka ya na onye ọzọ jụrụ ịkwụsị ghara ịkụ.
Ị na-elezi ụgbọala gị anya, ọ ga-esi ike gị ejiri ya nwee ihe ọghọm. Chegodị ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na ị na-anya ụgbọala jie brek ma o kweghị njite. Ndị ụfọdụ na-eme ha gụrụ gụrụ, ha akpọ ndị ma ụgbọala arụzi nke ọma ka ha lebara ụgbọala ha anya. Ndị ọzọkwa na-eji aka ha arụzi ihe ụfọdụ n’ụgbọala ha. Ma ị̀ chọrọ ka onye ọzọ na-arụziri gị ya ma ị̀ chọrọ iji aka gị na-arụzi ya, gbaa mbọ hụ na ị na-eleru ụgbọala gị anya ma na-emezi ihe ndị ị chọpụtara mebirila na ya.
Aṅụla Mmanya Na-aba n’Anya Tupu Ị Nyawa Ụgbọala
Onye na-akpachapụ anya anya ụgbọala nwere ike ịnya ụgbọala ka onye ara ma ọ ṅụọ mmanya. N’afọ 2008, ihe karịrị puku mmadụ iri atọ na puku asaa nwuru n’ihe mberede okporo ụzọ n’Amerịka. E kee ndị ahụ nwụrụnụ ụzọ isii, ihe dị ka ụzọ abụọ n’ime ha nwụrụ n’ihi na ndị nyara ụgbọala ha nọ ji anya mmanya nyaa ha. Obere mmanya na-aba n’anya ị ṅụrụ nwedịrị ike ime ka ị ghara ịma ihe ị na-eme ma ị na-anya ụgbọala. Ọ bụ ya mere ụfọdụ ji kpebie na ha agaghị edetụ mmanya ọ bụla na-aba n’anya ọnụ ma ọ bụrụhaala na ha ga-anya ụgbọala.
Ọ bụrụ na ị naghị ada iwu na-achị okporo ụzọ, ị naghị aṅụ mmanya na-aba n’anya ma ị chọọ ịnya ụgbọala, ị na-eyi belt oche ụgbọala gị ma na-elezi ụgbọala gị anya, ị gaghị na-enwekarị ihe ọghọm mgbe ị na-anya ụgbọala. O nweghịkwa ihe ga-eme ndị i bu n’ụgbọala. Ihe ndị e kwuru n’isiokwu a ga-abara gị ezigbo uru ma ọ bụrụ na i mee ha.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 27]
ANYALA ỤGBỌALA MA ỤRA NA-ATỤ GỊ
Cheta na otú ahụ mmanya na-aba n’anya si eme ka onye na-anya ụgbọala ghara ịma ihe ọ na-anya ka ụra si emekwa. Nke a gosiri na onye ụra na-atụ ekwesịghị ịnya ụgbọala. Ihe ndị e dere ebe a bụ ihe ndị ọ ga-abụ ha mewe gị mgbe ị na-anya ụgbọala, gị amara na i kwesịrị ịkwụsị ụgbọala ị na-anya:a
● Anya na-agba gị itiri, gị ana-atabi anya n’ike n’ike
● Ọ na-esiri gị ike ilegide anya ebe ị na-aga
● Ị na-eghekarị ughere
● Ọ na-esiri gị ike icheta kilomita ole ị ka gbachara
● Ị na-agbafekarị ebe ndị i kwesịrị isi banye ebe ị na-aga ma ọ bụkwanụ ị naghịzi ahụ ihe ndị e dere n’ụzọ maka ndị na-anya ụgbọala
● Ị na-esi n’aka gị apụ, ị na-abịa ụgbọala nọ gị n’ihu ezigbo nso, ma ọ bụkwanụ ị na-agbapụ n’ụzọ
Ọ bụrụ na ihe ndị a mewe gị, gwa onye ọzọ ka ọ nyata ụgbọala ahụ ma ọ bụkwanụ gị akwụsị otú ebe, hitụ obere ụra. Ọ ka mma na i rughị ebe ị na-aga n’oge kama ịnyara ụgbọala gị na-aga.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ị chọọ ịmatakwu banyere ihe ndị a, gụọ akwụkwọ bụ́ Nigeria Highway Code.