Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g01 10/8 p. 31
  • Nwa Gị Ọ̀ Nọ Ná Nchebe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nwa Gị Ọ̀ Nọ Ná Nchebe?
  • Teta!—2001
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ARO MAKA NCHEBE
  • ỊDỌ AKA NÁ NTỊ
  • Ihe I Nwere Ike Ime Ka Ị Ghara Inwe Ihe Ọghọm Mgbe Ị Na-anya Ụgbọala
    Teta!—2011
  • Chebe Nwa Gị Pụọ n’Ihe Ọghọm
    Teta!—1999
  • Otú Ị Ga-esi Chebe Ụmụ Gị
    Teta!—2007
  • Nyere Nwa Gị Aka Idi Ọnwụ Onye Ọ Hụrụ n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2001
g01 10/8 p. 31

Nwa Gị Ọ̀ Nọ Ná Nchebe?

Dị ka Ụlọ Ọrụ Mba Na-ahụ Maka Nchebe Ndị Njem n’Ụzọ Awara Awara nke United States (NHTSA) si kwuo, mkpọka ụgbọala bụ ihe kasị akpata ọnwụ n’etiti ụmụaka dị n’agbata afọ 5 na afọ 14. Ụlọ ọrụ NHTSA na-ekwu, sị: “Ihe karịrị ọkara nke ụmụaka ndị na-anwụ ná mkpọka ụgbọala bụ ndị [ihe ndị na-echebe mmadụ] na-ejideghị. Ọzọkwa, ụmụaka 4 n’ime ụmụaka 5 bụ ndị na-enweghị ihe njide ndị kwesịrị ekwesị.”

Ụlọ ọrụ NHTSA tụrụ ọtụtụ aro, nyekwa ọtụtụ ịdọ aka ná ntị banyere nchebe maka ndị na-ebu ụmụaka n’ụgbọala. Ọ bụ ezie na iwu na-adịgasị iche iche site ná mba gaa ná mba nakwa ọbụna site na steeti gaa na steeti, ụkpụrụ nduzi ndị a bụ ihe ọtụtụ ndị nne na nna na ndị na-elekọta ụmụaka kwesịrị ichebara echiche. Biko chọpụta ihe bụ́ iwu dị n’ógbè unu ma mee ihe ọ bụla ị pụrụ ime iji chebe ibu dị oké ọnụ ahịa i bu!

ARO MAKA NCHEBE

Ebe kasị dị nchebe maka ụmụaka nile bụ n’oche azụ.

1 E kwesịrị ikusa ụmụaka a mụrụ ọhụrụ n’oche ụmụaka nke chere ihu n’azụ nke dị n’oche azụ ụgbọala.

2 A pụrụ ikusa nwatakịrị dị ma ọ dịkarịa ala otu afọ, onye dịkwa kilogram itoolu n’arọ ma ọ dịkarịa ala, n’oche chere ihu n’ihu.

3 Mgbe nwatakịrị dị kilogram 18 n’arọ, nwa ahụ pụrụ ịnọdụ ‘n’oche a pụrụ ịtụkwasị n’elu oche ọzọ,’ bụ́ nke e ji otu n’ime belt oche ụgbọala nke na-ejide apata ụkwụ na nke na-ejide ubu jide.

4 Mgbe ọ dị ihe dị ka kilogram 36 n’arọ dịkwa ihe dị ka sentimita 140 n’ogo, nwatakịrị ahụ pụrụ ịmalite iji belt nke ndị toworo eto na-eme ihe.

ỊDỌ AKA NÁ NTỊ

Ụmụaka ekwesịghị ịnọ n’oche ihu ruo mgbe ha ruru ma ọ dịkarịa ala afọ 13. Akpa ikuku na-adị n’oche ihu pụrụ imerụ ụmụ ọhụru na obere ụmụaka ahụ nke ukwuu.

Mgbe e ji oche a pụrụ ịtụkwasị n’elu oche ọzọ mee ihe, nanị belt nke na-ejide apata ụkwụ agaghị ezu iji chebe ya ma ọ bụrụ na oche ahụ a pụrụ ịtụkwasị n’elu oche ọzọ enweghị ihe mgbochi.

Echekwala na nanị belt nke na-ejide ubu ga-echebe obere nwatakịrị; ọ bụrụ na ụgbọala akpọkaa, belt ahụ pụrụ ijide nwatakịrị ahụ n’olu, na-akpatara ya mmerụ ahụ dị ukwuu ma ọ bụ ọbụna ọnwụ.

Gbasochie ntụziaka e nyere anya mgbe ị na-etinye oche ụmụaka ma ọ bụ na-ekusa nwatakịrị na ya. Dị ka ụlọ ọrụ NHTSA si kwuo, “ọbụna oche ‘kasị dịrị nchebe’ nwere ike ọ gaghị echebe nwa gị ma ọ bụrụ na e jighị ya mee ihe n’ụzọ ziri ezi.”

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Itinye oche ụmụaka n’ụzọ kwesịrị ekwesị gụnyere ikechisi belt oche ike

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya