Otú Ị ga-esi Jiri Ego Gị Na-eme Ihe Bara Uru
EGO batahaala anyị n’aka, e nwere ụzọ ihe atọ anyị nwere ike ime ya. Anyị nwere ike: (1) Jiri ya zụrụ ihe, (2) dewe ya, ma ọ bụkwanụ (3) jiri ya mee amara. Ka anyị burugodị ụzọ kwuo otú anyị nwere ike isi jiri ego anyị na-eme ihe bara uru.
Ihe isi ike a kpara ụwa niile aka ọjọọ ná nso nso a akụzierela onye ukwu na onye nta na ọ dị mma ịhazi otú anyị si emefu ego anyị na-akpata. Onye na-ahazi ego ya ahazi bụ onye na-anọdụ ala chee echiche otú ego ọ na-akpata kwa ọnwa hà, mara ihe ndị ọ ga-eji kobo ọ bụla dị na ya mee.
Ezinụlọ Kwesịrị Ịnọkọ Kpaa Ya Akpa
Olee otú unu ga-esi ahazi ego unu na-akpata? N’akwụkwọ Denise Chambers dere gbasara ịhazi ego, o kwuru, sị: “Onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ kwesịrị iso kpaa ya. Nke a ga-eme ka onye ọ bụla kpachara anya n’ihe o ji ego eme.” Unu gụrụ gụrụ, unu anọkọọ mara otú ihe unu kpara si na-aga. Ọ ga-aba ezigbo uru ma mmadụ niile nọ n’ezinụlọ soro kpaa ya n’ihi na ọ ga-eme ka onye ọ bụla ghara ikote ihe ezinụlọ na-agaghị emeli.
Ụfọdụ ndị na-eji kọmputa edepụta otú ha ga-esi emefu ego ha na-akpata. Ndị ọzọ na-eji mpempe akwụkwọ ede ego ole ha ga-akpata na ego ole ha ga-emefu. Ọ dịkwa mma ka mmadụ nwee ego ole ọ ga na-edewe iche kwa ọnwa, ka ọ ga-abụ afọ gwụ, ya enwee ego ọ ga-eji kwụọ ụgwọ ndị ọ na-akwụ kwa afọ, dị ka ụgwọ ụtụ isi. O nwekwara ike isi n’ego ahụ ọ na-edewe nweta ego ọ ga-eji aga ezumike n’afọ.
Ihe ọtụtụ ndị na-eme kemgbe ụwa bụ iji envelopu dị iche iche na-etinye ego ha ga-eji na-eme mkpa ha. N’elu envelopu ndị ahụ, ha na-ede ihe dị ka “Nri,” “Ụgwọ Ụlọ,” “Ime Njem,” “Ụgwọ Ọkụ,” “Ego Ụlọ Ọgwụ,” na ihe ndị ọzọ. Ọnwa gwụ, ha ewere ego ole ha kpebiri ịna-etinye n’envelopu nke ọ bụla tinye na ya. Ma, ọtụtụ ndị ugbu a na-asị na ọ ka mma idewe ego n’ụlọ akụ̀, e nwezie ihe a chọrọ iji ya mee, a gaa dọrọ ya.
E nwere di na nwunye bi na Saụt Afrịka, aha ha bụ Jonathan na Anne. Ha mụrụ ụmụ nwaanyị abụọ, ọ bụkwa envelopu ka ha na-ejikarị ahazi otú ha ga-esi emefu ego ha. Jonathan kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị na-etinye ego gị n’ụlọ akụ̀, ọ dị mkpa ka ị na-ejide onwe gị, ghara iji ego i dewere maka ihe a mee ihe ọzọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ego i wepụtara ị ga-eji azụ anụ agwụnahụ gị, agakwala dọrọ ego i dewere maka ihe ọzọ, jiri ya zụrụkwuo anụ.”
Jonathan nweburu ihe ọ na-eme o ji akpata ego. Ma ugbu a, ya na ezinụlọ ya kpebiri iso na-arụ ebe a na-anọ efe Chineke, o nweghịkwa ụgwọ ọ bụla a na-akwụ ha. Ebe ọ bụ na ha achọghị ịhapụ ọrụ a ha na-arụ, ha na-akpachapụ anya n’otú ha si emefu ego ha. Ya na ezinụlọ ya na-anọkọ mgbe niile kpaa otú ha na ego si aga, ha na-elebakwa anya n’ebe ha kwesịrị ịkpachakwuru anya n’ihe gbasara imefu ego.
Ihe Ka Enye Obi Ụtọ
A chọpụtala na ihe ka enye obi ụtọ ná ndụ bụ mmadụ iji oge ya, ike ya, ma ọ bụkwanụ ego ya enyere ndị ọzọ aka. N’ime ihe atọ ahụ e kwuru ná mmalite na mmadụ nwere ike iji ego ya mee, o nwere ike ịbụ nke a kacha mma. I nwere ike kpebie ịna-eji ihe i nwere enyere ndị ọzọ aka.
Otu onye na-ede akwụkwọ, aha ya bụ Chris Farrell, kwuru na mmadụ na-echekwa ego ya ka o nwee ike jiri ya mee ihe dị ya mkpa. Nwoke ahụ kwukwara, sị: “Otu n’ime ihe kacha baa uru mmadụ nwere ike iji ego ya mee bụ iji ya meere ndị ọzọ amara.a E kwuwedị ihe kacha dịrị mkpa n’ụwa a, ọ bụ mmadụ na ibe ya ịdị ná mma, ihe mmadụ mere ná ndụ, na otú mmadụ si nyere ibe ya aka, ọ bụghị ego ole mmadụ nwere ma ọ bụ ihe onwunwe ole ọ kwakọjuru.”
O yiri ka Michael Wagner, onye gụrụ gbasara ịhazi ego, ò kwetara ihe ahụ Chris kwuru. N’akwụkwọ o dere iji nyere ndị na-eto eto aka ịma otú ha ga-esi na-echekwa ego ha, o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na i wepụta onwe gị nyere ndị ihe na-esiri ike aka, e nwere ọtụtụ ụzọ ị ga-esi enweta ụgwọ ihe ọma ahụ i meere ha. Ma, nke kacha n’ime ha bụ na obi ga-atọ gị ụtọ na i nyeere mmadụ ibe gị aka.”
N’eziokwu, Baịbụl kwuru na mmadụ na-enweta obi ụtọ ma o nye mmadụ ibe ya ihe. Anyị kwuburu na e nwere ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl, ndị nwere ike inyere gị aka iji ego gị na-eme ihe bara uru. Anyị elebakwala ụfọdụ n’ime ha anya. Ugbu a, ka anyị lebazie anya na ndụmọdụ asaa ndị ọzọ ga-enyere gị aka.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụrụ na i nyere mmadụ onyinye, ma ọ bụ sie nri kpọọ ndị enyi gị ka ha soro ezinụlọ gị rie ya, e nwere ike ịsị na i ji ego gị mee amara.