Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 7/14 p. 14-15
  • Ọnwụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọnwụ
  • Teta!—2014
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ebee ka ndị nwụrụ anwụ nọ?
  • Gịnị na-eme ndị mmadụ ma ha nwụọ?
  • Ndị nwụrụ anwụ hà ga-adị ndụ ọzọ?
  • Gịnị n’Ezie Bụ Hel?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ndị Mmụọ Adịbeghị Ndụ n’Ụwa ma Nwụọ
    Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?
  • Ị̀ Pụrụ Inyere Ndị Nwụrụ Anwụ Aka?
    Teta!—2006
  • Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?
    Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2014
g 7/14 p. 14-15
Okooko osisi tụnwụrụ atụnwụ

IHE BAỊBỤL KWURU

Ọnwụ

Ebee ka ndị nwụrụ anwụ nọ?

“Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.”—Jenesis 3:19.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ na-aga eluigwe, ọkụ ala mmụọ, pọgatrị, ma ọ bụ Limbo. Ndị ọzọ kwetara na onye nwụrụ anwụ nwere ike ghọọ ọkụkọ ma ọ bụ ewu ma ọ bụkwanụ ihe ọzọ dị ndụ. E nwekwara ndị na-ekwu na onye nwụhaala, nke ya agaala.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ekliziastis isi itoolu amaokwu iri kwuru, sị: “Ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol, ebe ị na-aga.” Baịbụl kwukwara ihe na-eme ma mmadụ ma anụmanụ ma ha nwụọ. Ọ sịrị: “Ha niile na-aga n’otu ebe. Ọ bụ n’ájá ka ha niile si, ọ bụkwa n’ájá ka ha niile na-alaghachi.”—Ekliziastis 3:20.

Gịnị na-eme ndị mmadụ ma ha nwụọ?

“Mmụọ ya na-apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ, echiche ya na-ala n’iyi.”—Abụ Ọma 146:4.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ihe a kụziiri ọtụtụ ndị bụ na ọ bụ ihe mmadụ mere mgbe ọ nọ n’ụwa ga-ekpebi ebe ọ ga-aga ma ọ nwụọ. O mee ihe ọma, ọ gaa eluigwe; o mee ihe ọjọọ, ọ gaa ọkụ mmụọ. Ha na-ekwu na onye nwụọ, a ga-asachapụ ya njọ o mere tupu o nwee ike ịgakwu Chineke. Ndị a na-asachapụghị njọ ha agaghị enwe obi ụtọ ruo ebighị ebi.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ndị nwụrụ anwụ anaghị enwe obi ụtọ nke ha ji ata ahụhụ. Ebe ọ bụ na ha amaghị ihe ọ bụla, ha anaghị enyere ndị dị ndụ aka, ha anaghịkwa emerụ ha ahụ́. Ekliziastis 9:5, 6 sịrị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị . . . Ịhụnanya ha na ịkpọasị ha na ekworo ha alaworị n’iyi, ọ dịkwaghị òkè ha nwere ruo mgbe ebighị ebi n’ihe ọ bụla a ga-eme n’okpuru anyanwụ.”

Ndị nwụrụ anwụ hà ga-adị ndụ ọzọ?

“Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ pụrụ ịdị ndụ ọzọ? M ga-echere ruo ogologo oge niile a manyere m ichere, ruo mgbe a ga-eme ka m nwere onwe m.”—Job 14:14.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ndị mmadụ na-ekwu na onye e kpebiri na ọ ga-aga ọkụ mmụọ, nke ya agaala. Ha na-asị na a ga-atagide ya ahụhụ n’ọkụ mmụọ ruo ebighị ebi. Ha na-ekwukwa na ndị nke nọ na pọgatrị na-agawa eluigwe ma e jiri ọkụ sachapụchaa ha njọ ha.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na Ọkpara Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ka ha biri n’ụwa. Baịbụl sịkwara: “Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.” (Jọn 5:26, 28, 29) Ọ bụ ihe mmadụ mere mgbe o si n’ọnwụ bilie ga-ekpebi ma ọ̀ ga-adị ndụ ebighị ebi.a

a Ị chọọ ịmatakwu banyere ihe Baịbụl kwuru banyere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ, gụọ isi nke 7 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya