Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • fg ihe ọmụmụ 6 ajụjụ 1-5
  • Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?
  • Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Gịnị Na-eme Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Gịnị Ga-eme Anyị Ma Anyị Nwụọ?
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Ezigbo Olileanya nke Dịịrị Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
fg ihe ọmụmụ 6 ajụjụ 1-5

ISI NKE 6

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?

1. Ndị nwụrụ anwụ hà ga-adị ndụ ọzọ?

Ebe Meri na Mata makụrụ Lazarọs mgbe o si n’ọnwụ bilie

Mgbe Lazarọs enyi Jizọs nwụrụ, ọ nọrọ abalị anọ n’ili tupu Jizọs erute obodo ya bụ́ Betani. Obodo a dị nso na Jeruselem. Mgbe o rutere, ya na Mata na Meri ụmụnne Lazarọs sooro gaa n’ebe e liri ya. Ozugbo ahụ, ndị mmadụ agbakọta ebe ahụ. Chegodị echiche otú obi si tọọ Mata na Meri ụtọ mgbe Jizọs kpọlitere Lazarọs nwanne ha n’ọnwụ.​—Gụọ Jọn 11:21-24, 38-44.

Mata mabu ama na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ọ ma na Jehova ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ha adịrịghachi ndụ n’ụwa a.​—Gụọ Job 14:14, 15.

2. Gịnị na-eme ndị mmadụ ma ha nwụọ?

Mgbe e kere Adam na mgbe ọ nwụrụ

Chineke gwara Adam, sị: “Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.”​—JENESIS 3:19.

Chineke ji ájá kpụọ mmadụ. (Jenesis 2:7; 3:19) Anyị abụghị ndị mmụọ nwere ahụ́ mmadụ, kama, anyị bụ mmadụ nkịtị. Mmadụ nwụọ, ihe niile dị n’ahụ́ ya anwụọ. Ụbụrụ onye ahụ na-akwụsịkwa ịrụ ọrụ, ọ bụ ya mere ọ naghị echeli echiche. N’ihi ya, mgbe a kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ, o nweghị ihe ọ kọọrọ ndị mmadụ na ya mere n’oge ahụ ọ nwụrụ n’ihi na ndị nwụrụ anwụ anaghị ama ihe ọ bụla.​—Gụọ Abụ Ọma 146:4; Ekliziastis 9:5, 6, 10.

Chineke ọ̀ na-ata ndị ọjọọ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ ma ha nwụọ? Ebe ọ bụ na Baịbụl kwuru na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, ọ pụtara na ndị na-akụzi na Chineke na-ata ndị nwụrụ anwụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ na-agha ụgha. Ha na-ekwutọ Chineke. Ịta ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ abatatụbeghị Chineke n’obi.​—Gụọ Jeremaya 7:31.

Lee vidio bụ́ Gịnị Na-eme Ndị Mmadụ Ma Ha Nwụọ?

3. Ndị nwụrụ anwụ hà nwere ike ịgwa anyị okwu?

Ndị nwụrụ anwụ enweghị ike ikwu okwu, ha enweghịkwa ike ịnụ ihe. (Abụ Ọma 115:17) Ma, ndị mmụọ ọjọọ dị arụrụala. Ha nwere ike iji olu onye nwụrụ anwụ gwa mmadụ okwu, ka onye ahụ chee na ọ bụ onye ahụ nwụrụ anwụ na-agwa ya okwu. (2 Pita 2:4) Jehova nyere iwu ka anyị ghara ịchọwa ụzọ anyị na ndị nwụrụ anwụ ga-esi kwurịta okwu.​—Gụọ Diuterọnọmi 18:10, 11.

4. Ole ndị ka a ga-akpọlite n’ọnwụ?

Ebe a na-akụziri onye si n’ọnwụ bilie banyere Chineke. Ebe nwoke ahụ a kpọlitere n’ọnwụ na-akụziri ndị ọzọ banyere Chineke.

Ọtụtụ nde mmadụ ndị nọ n’ili ga-ebilite n’ọnwụ dịrị ndụ n’ụwa a. A ga-akpọlitedị ụfọdụ ndị ajọ omume n’ọnwụ. Ndị a bụ ndị mere ihe ọjọọ n’ihi na ha amaghị iwu Jehova.​—Gụọ Luk 23:43; Ọrụ Ndịozi 24:15.

A ga-akụziri ndị a kpọlitere n’ọnwụ eziokwu banyere Chineke, kụziekwara ha otú ha ga-esi gosi na ha nwere okwukwe na Jizọs ma na-erubere ya isi. (Mkpughe 20:11-13) Ndị mewere ezi ihe mgbe a kpọlitechara ha n’ọnwụ ga-adịzi ndụ ebighị ebi n’ụwa.​—Gụọ Jọn 5:28, 29.

5. Gịnị ka ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ na-akụziri anyị banyere Jehova?

Ihe mere ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ ga-eji nwee isi bụ na Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ nwụchitere anyị ọnwụ. N’ihi ya, mkpọlite a ga-akpọlite ụmụ mmadụ n’ọnwụ gosiri na Jehova hụrụ anyị n’anya ma na-emetere anyị ebere. Ọ bụrụ na Chineke akpọlite ndị nwụrụ anwụ, olee onye ị ga-achọ ịhụ?​—Gụọ Jọn 3:16; Ndị Rom 6:23.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu ihe e kwuru n’isiokwu a, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?, isi nke 6, 7, na 10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya