Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 34 p. 177-181
  • Gịnị Ga-eme Anyị Ma Anyị Nwụọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ga-eme Anyị Ma Anyị Nwụọ?
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jizọs Kpọlitere Lazarọs n’Ọnwụ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ihe Mere Jizọs Agaghị Ngwa Ngwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ezigbo Olileanya nke Dịịrị Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 34 p. 177-181

ISI NKE 34

Gịnị Ga-eme Anyị Ma Anyị Nwụọ?

DỊ KA ị maara ma eleghị anya, taa ndị mmadụ na-aka nká, na-arịa ọrịa, na-anwụkwa anwụ. Ọbụna ụfọdụ ụmụaka na-anwụ. Ì kwesịrị ịdị na-atụ ọnwụ ma ọ bụ onye ọ bụla nwụrụ anwụ ụjọ?— Ị̀ ma ihe na-eme mgbe anyị nwụrụ?—

Ọ dịghị onye dị ndụ taa nke nwụworonụ ma mesịa dị ndụ iji kọọrọ anyị. Ma, mgbe Jizọs bụ́ Onye Ozizi Ukwu ahụ nọ n’ụwa, e nwere otu nwoke nke nwụrụ ma mesịa dị ndụ. Anyị pụrụ ịmata ihe na-eme ndị nwụrụ anwụ site n’ịgụ banyere nwoke ahụ. Nwoke ahụ bụ enyi Jizọs, o bikwara na Betani, bụ́ ntakịrị obodo nke dị nso na Jeruselem. Aha ya bụ Lazarọs, o nwekwara ụmụnne nwanyị abụọ, aha ha bụ Mata na Meri. Ka anyị lee ihe Bible kwuru na o mere.

Otu ụbọchị, Lazarọs malitere ịrịasi ọrịa ike. N’oge ahụ, Jizọs nọ ebe dị anya. Ya mere, Mata na Meri zipụrụ otu onye ozi ka ọ gaa gwa Jizọs na nwanne ha nwoke, bụ́ Lazarọs, na-arịa ọrịa. Ha zipụrụ ozi n’ihi na ha ma na Jizọs nwere ike ịbịa ma mee ka ahụ́ dị nwanne ha nwoke mma. Jizọs abụghị dọkịta, kama o nwere ike sitere n’aka Chineke, nke mere na ọ pụrụ ịgwọ ụdị ọrịa ọ bụla.—Matiu 15:30, 31.

Otú ọ dị, tupu Jizọs agawa ịhụ Lazarọs, ọrịa Lazarọs kara njọ nke na ọ nwụrụ. Ma, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na Lazarọs na-arahụ ụra, nakwa na Ya ga-eje kpọtee ya. Ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe Jizọs na-ekwu. Ya mere, Jizọs gwara ha hoo haa, sị: “Lazarọs anwụwo.” Gịnị ka nke a na-egosi banyere ọnwụ?— Ee, na o yiri oké ụra. Ọ bụ ụra miri emi nke na onye ahụ anadịghị arọ nrọ.

Ugbu a, Jizọs na-aga ịhụ Mata na Meri. Ọtụtụ ndị, bụ́ ndị enyi ezinụlọ ha abịaworị. Ha bịara ịkasi ụmụnne nwanyị abụọ ahụ obi n’ihi ọnwụ nwanne ha nwoke. Mgbe Mata nụrụ na Jizọs na-abịa, ọ gawara izute ya. N’oge na-adịghị anya, Meri gawakwara ịga hụ Jizọs. Ọ nọ n’oké mwute ma na-ebe ákwá, ọ dakwara n’ala n’ụkwụ Jizọs. Ndị enyi ha ndị ọzọ ndị so Meri na-ebekwa ákwá.

Onye Ozizi Ukwu ahụ jụrụ ha ebe ha liri Lazarọs. Mgbe ọ jụrụ ha, ndị ahụ duuru Jizọs gaa n’ọgba ebe e liri Lazarọs. Mgbe Jizọs hụrụ ka mmadụ nile nọ na-ebe ákwá, ọ malitekwara ibe ákwá. Ọ ma otú ọ na-esi ewute mmadụ ma onye ọ hụrụ n’anya nwụọ.

Otu nkume dị n’ọnụ ụzọ ọgba ahụ, ya mere Jizọs sịrị: “Kwapụnụ nkume ahụ.” Hà kwesịrị ịkwapụ ya?— Mata echeghị na ọ dị mma ka a kwapụ ya. Ọ sịrị: “Onyenwe anyị, ka ọ dị ugbu a ọ ghaghị ịbụ na o siwela ísì, n’ihi na o meela ụbọchị anọ.”

Ma Jizọs sịrị ya: “Ọ̀ bụ na agwaghị m gị na ọ bụrụ na ị ga-ekwere, ị ga-ahụ ebube Chineke?” Ihe Jizọs na-ekwu bụ na Mata ga-ahụ ihe ga-eme ka e nye Chineke nsọpụrụ. Gịnị ka Jizọs ga-eme? Mgbe a kwapụrụ nkume ahụ, Jizọs kpegaara Jehova ekpere. O kpepụtara ekpere ahụ ekpepụta. Jizọs jizi oké olu kwuo, sị: “Lazarọs, pụta!” Ọ̀ ga-apụtanụ? Ọ̀ ga-enwe ike ịpụta?—

Ị̀ pụrụ ịkpọte onye na-ehi ụra?— Ee, ọ bụrụ na ị kpọọ ya òkù n’olu dara ụda, ọ ga-eteta. Ma, ị̀ ga-akpọteli onye nọ n’ụra ọnwụ?— Ee e. Otú ọ sọkwara gị kpọsie ya ike, onye nwụrụ anwụ agaghị anụ ya. Ọ dịghị ihe mụ ma ọ bụ gị ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ nọ n’ụwa taa pụrụ ime iji kpọtee onye nwụrụ anwụ.

[Foto dị na peeji nke 179]

Olee ihe Jizọs meere Lazarọs?

Ma Jizọs adịghị ka anyị. O nwere ike pụrụ iche nke sitere n’aka Chineke. Ya mere, mgbe Jizọs kpọrọ Lazarọs òkù, ihe dị ịtụnanya mere. Nwoke ahụ nke nwụrụ kemgbe ụbọchị anọ si n’ọgba ahụ pụta! E mere ka ọ dị ndụ ọzọ! Ọ pụrụ iku ume, ịga ije na ikwu okwu ọzọ! Ee, Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ.—Jọn 11:1-44.

Ugbu a, cheedị echiche: Gịnị mere Lazarọs mgbe ọ nwụrụ? Ọ̀ dị akụkụ ya ọ bụla—mkpụrụ obi ya ma ọ bụ mmụọ ya—nke hapụrụ ahụ́ ya jee biri ebe ọzọ? Mkpụrụ obi Lazarọs ọ̀ gara eluigwe? Ọ̀ dịrị ndụ ruo ụbọchị anọ n’eluigwe, ya na Chineke na ndị mmụọ ozi dị nsọ?—

Ee e, ọ dịghị. Cheta, Jizọs kwuru na Lazarọs nọ n’ụra. Olee otú ọ na-adị gị mgbe ị na-ehi ụra? Mgbe ị nọ n’ezigbo ụra, ị dịghị ama ihe na-eme gburugburu ebe ị nọ, ka ị̀ na-ama?— Mgbe i tetakwara, ị dịghị ama otú i hiteruru ụra aka ruo mgbe i lere anya na klọọkụ.

Otú ahụ ka ọ dị ndị nwụrụ anwụ. Ha adịghị ama ihe ọ bụla. Ha adịghị enwe mmetụta ọ bụla. Ha apụghịkwa ime ihe ọ bụla. Otú ahụ ka ọ dị Lazarọs mgbe ọ nwụrụ. Ọnwụ yiri oké ụra nke mmadụ na-adịghị echeta ihe ọ bụla na ya. Bible na-ekwu, sị: “Ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.”—Eklisiastis 9:5, 10.

[Foto dị na peeji nke 180]

Gịnị bụ ọnọdụ Lazarọs mgbe ahụ ọ nwụrụ anwụ?

Cheekwa echiche: Ọ bụrụ na Lazarọs nọ n’eluigwe ruo ụbọchị anọ ahụ, ọ̀ bụ na ọ garaghị ekwutetụ ihe ọ bụla banyere ya?— Ọ bụrụkwa na ọ nọ n’eluigwe, Jizọs ọ̀ gaara amanye ya isi n’ebe ahụ mara mma laghachite n’ụwa?— Ọ dịghị ma ọlị!

Ma, ọtụtụ ndị na-asị na anyị nwere mkpụrụ obi, ha na-asịkwa na mkpụrụ obi ahụ na-adịrị ndụ gaa n’ihu mgbe ahụ́ nwụsịrị. Ha na-asị na mkpụrụ obi Lazarọs dị ndụ n’ebe ọzọ. Ma, Bible ekwughị otú ahụ. Ọ na-ekwu na Chineke mere mmadụ mbụ bụ́ Adam ka ọ bụrụ “mkpụrụ obi dị ndụ.” Adam bụ mkpụrụ obi. Bible na-ekwukwa na mgbe Adam mehiere, ọ nwụrụ. Ọ ghọrọ “mkpụrụ obi nwụrụ anwụ,” ọ laghachikwara n’ájá ahụ e si mee ya. Bible na-ekwukwa na ụmụ Adam nile ketakwara mmehie na ọnwụ.—Jenesis 2:7; 3:17-19; Ọnụ Ọgụgụ 6:6, NW; Ndị Rom 5:12.

Ya mere, o doro anya na anyị enweghị mkpụrụ obi nke dị iche n’ahụ́ anyị. Onye ọ bụla n’ime anyị bụ mkpụrụ obi. Ebe ndị mmadụ ketawokwara mmehie site n’aka nwoke mbụ bụ́ Adam, Bible na-ekwukwa, sị: ‘Mkpụrụ obi nke na-emehie ga-anwụ.’—Ezikiel 18:4.

[Foto dị na peeji nke 181]

N’ihi gịnị ka ọ na-adịghị ihe mere a ga-eji na-atụ ndị nwụrụ anwụ egwu?

Ụfọdụ ndị na-atụ ndị nwụrụ anwụ egwu. Ha agaghị agaru nso n’ebe a na-eli ozu n’ihi na ha na-eche na ndị nwụrụ anwụ nwere mkpụrụ obi nke dị iche n’ahụ́ ha, nke pụrụ imerụ ndị dị ndụ ahụ́. Ma, onye nwụrụ anwụ ọ̀ pụrụ imerụ onye dị ndụ ahụ́?— Ee e, ọ pụghị.

Ụfọdụ ndị kwetara ọbụna na ndị nwụrụ anwụ pụrụ ịbịaghachi dị ka mmụọ ịbịa leta ndị dị ndụ. Ya mere, ha na-edebere ndị nwụrụ anwụ nri. Ma, ndị na-eme nke ahụ ekwetaghị n’ezie ihe Chineke kwuru banyere ndị nwụrụ anwụ. Ọ bụrụ na anyị kwere ihe Chineke kwuru, anyị agaghị na-atụ ndị nwụrụ anwụ egwu. Ọ bụrụkwa na anyị nwere ekele n’ezie nye Chineke maka ndụ anyị dị, anyị ga-egosipụta ya site n’ime ihe ndị dị Chineke mma.

Ma, ị pụrụ ịdị na-eche, sị: ‘Chineke ọ̀ ga-eme ka ụmụntakịrị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ? Ọ̀ chọrọ ime ya n’ezie?’ Ka anyị kwurịta ya n’isiokwu na-esonụ.

Ka anyị gụkwuo banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ nakwa banyere mmadụ ịbụ mkpụrụ obi n’ime Bible, n’Abụ Ọma 115:17; 146:3, 4; nakwa na Jeremaịa 2:34.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya