ISI NKE 35
Anyị Pụrụ Isi n’Ọnwụ Bilie!
Ọ BỤRỤ na anyị anwụọ, Chineke ọ̀ ga-achọ ịkpọlite anyị n’ọnwụ, ya bụ, ime ka anyị dị ndụ ọzọ?— Ezi mmadụ ahụ bụ́ Job kwenyere na Chineke ga-achọ ime otú ahụ. Ya mere, mgbe Job chere na ya gaje ịnwụ, ọ sịrị Chineke: “Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa Gị.” Job kwuru na ọ ga-agụ Jehova Chineke agụụ, ma ọ bụ na ọ ga-achọsi ike, ịkpọlite ya n’ọnwụ.—Job 14:14, 15.
Jizọs dị nnọọ ka Nna ya, bụ́ Jehova Chineke. Jizọs chọrọ inyere anyị aka. Mgbe otu nwoke nke nwere ọrịa ekpenta sịrị ya, “ọ bụrụ nnọọ na ị chọọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha,” Jizọs sịrị ya: “Achọrọ m.” Ọ gwọkwara nwoke ahụ ahụ́ na-adịghị ekpenta na-arịa ya.—Mak 1:40-42.
Olee otú Jehova si gosi na ọ hụrụ ụmụaka n’anya?
Jizọs mụtara inwe ịhụnanya n’ebe ụmụaka nọ site n’aka Nna ya. Ugboro abụọ, n’ogologo oge gara aga, Jehova ji ndị ohu ya kpọlite ụmụaka n’ọnwụ. Ịlaịja rịọrọ Jehova ka ọ kpọlite nwa nwoke nke otu nwanyị, onye mesoro Ịlaịja omume obiọma, n’ọnwụ. Jehova kpọlitekwara ya n’ọnwụ. Jehova jikwa ohu ya bụ́ Ịlaịsha kpọlite otu nwatakịrị nwoke n’ọnwụ.—1 Ndị Eze 17:17-24; 2 Ndị Eze 4:32-37.
Ọ́ bụghị ihe magburu onwe ya ịma na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu?— Ọ naghị eche banyere anyị nanị mgbe anyị dị ndụ. Ọ na-echetakwa anyị mgbe anyị nwụrụ. Jizọs sịrị na Nna ya na-ewere ọbụna ndị nwụrụ anwụ ọ hụrụ n’anya dị ka ndị dị ndụ! (Luk 20:38) Bible na-ekwu na ‘ọnwụ ma ọ bụ ndụ ma ọ bụ ihe ndị dị ugbu a ma ọ bụ ihe ndị gaje ịbịa agaghị ekewapụli anyị n’ịhụnanya Chineke.’—Ndị Rom 8:38, 39.
Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o gosiri na ihe banyere ụmụaka na-emetụ Jehova n’obi. Ị ga-echeta na Jizọs wepụtara oge gwa ụmụaka banyere Chineke. Ma, ị̀ ma na Chineke nyere Jizọs ike ime ka ụmụaka si n’ọnwụ bilie?— Ka anyị kwuo banyere oge Jizọs kpọlitere otu nwatakịrị nwanyị dị afọ 12, bụ́ nwa otu nwoke aha ya bụ Jeirọs, n’ọnwụ.
Jeirọs na nwunye ya nakwa nanị otu nwa ha mụtara bi n’ebe dị nso n’Oké Osimiri Galili. Otu ụbọchị, nwatakịrị nwanyị ahụ malitere ịrịasi ọrịa ike, Jeirọs hụkwara na ọ gaje ịnwụ. Nwoke ahụ bụ́ Jeirọs, onye bụ́ ezigbo mmadụ malitere iche echiche banyere Jizọs. Ọ nụwo akụkọ banyere onye pụrụ ịgwọ ndị mmadụ. Ya mere, Jeirọs gawara ịga chọọ ya. Ọ hụrụ Jizọs n’ikpere Oké Osimiri Galili ka ọ nọ na-ezi ọtụtụ mmadụ ihe.
Jeirọs si n’etiti ìgwè mmadụ ahụ gafere wee daa n’ụkwụ Jizọs. Ọ sịrị Jizọs: ‘Ọrịa na-arịasi obere nwa m nwanyị ike. Biko bịa nyere ya aka. Biko bịa.’ Jizọs sooro Jeirọs gawa ozugbo. Ìgwè mmadụ ndị bịara ịhụ Onye Ozizi Ukwu ahụ sokwaara ha. Ma, mgbe ha nọ n’ụzọ na-aga, ndị ikom ụfọdụ si n’ụlọ Jeirọs bịa gwa ya, sị: “Nwa gị nwanyị anwụọla! N’ihi gịnị ka ị ka ji na-enye onye ozizi nsogbu?”
Jizọs nụpeere ka ndị ikom ahụ na-ekwu ya. Ọ ma otú o si na-ewute Jeirọs na nanị otu nwa ọ mụtara anwụọla. Ya mere, Ọ gwara ya, sị: ‘Atụla egwu. Nanị nwee okwukwe na Chineke, o nweghị ihe ga-eme nwa gị nwanyị.’ Ha nọgidere na-aga ruo mgbe ha rutere n’ụlọ Jeirọs. N’ebe a, ndị enyi ezinụlọ ahụ nọ na-ebe ákwá. Ọ na-ewute ha na obere enyi ha anwụọla. Ma, Jizọs sịrị ha: ‘Unu ebezila ákwá. Nwatakịrị ahụ anwụbeghị, kama ọ na-ehi ụra.’
Mgbe Jizọs kwuru nke a, ndị ahụ malitere ịchị ya ọchị, n’ihi na ha ma na nwatakịrị nwanyị ahụ anwụọla. Ya bụrụ otú ahụ, gịnịkwanụ ka i chere mere Jizọs ji sị na ọ na-ehi ụra?— Gịnị ka i chere ọ chọrọ ịkụziri ndị ahụ?— Ọ chọrọ ka ha mata na ọnwụ pụrụ iyi oké ụra. Ọ chọrọ ịkụziri ha na site n’ike Chineke na ya pụrụ ime ka onye nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ otú anyị pụrụ nnọọ isi kpọtee mmadụ n’ụra n’ụzọ dị mfe.
Gịnị ka anyị na-amụta site ná mkpọlite Jizọs kpọlitere ada Jeirọs n’ọnwụ?
Jizọs kwuru ka mmadụ nile si n’ụlọ ahụ pụọ, e wezụga ndịozi ya bụ́ Pita, Jems, na Jọn na papa nwatakịrị nwanyị ahụ na mama ya. Ọ banyeziri n’ebe nwata ahụ dina. O seere ya n’aka, wee sị: “Nwata nwanyị, bilie!” O bilikwara ozugbo wee malite ịga ije! Nne ya na nna ya nwere nnukwu ọṅụ.—Mak 5:21-24, 35-43; Luk 8:40-42, 49-56.
Ugbu a, cheedị echiche. Ebe ọ bụ na Jizọs nwere ike ime ka nwatakịrị nwanyị ahụ dị ndụ ọzọ, ọ̀ pụrụ imere ndị ọzọ otu ihe ahụ?— Ì chere na ọ ga-eme ya n’ezie?— Ee, ọ ga-eme ya. Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [m] wee pụta.”—Jọn 5:28, 29.
Ì chere na Jizọs chọrọ ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ?— Ihe atụ ọzọ nke dị n’ime Bible zara ajụjụ ahụ. Ihe mere otu ụbọchị n’otu ebe nke dịdewere obodo Nen na-egosi ụdị mmetụta Jizọs na-enwe maka ndị na-eru újú n’ebe a na-eli ozu.
Otu nwanyị so ndị bu ozu nwa ya nwoke na-aga ili mgbe ìgwè mmadụ ahụ si Nen na-apụ. Di ya anwụọla tupu mgbe ahụ, ugbu a kwa, nanị otu nwa ọ mụtara anwụọla. Lee ka o si na-eru újú! Ọtụtụ n’ime ndị obodo Nen so ha na-aga ka e bu ozu nwa ya nwoke na-apụ n’obodo ahụ. Nwanyị ahụ nọ na-ebe ákwá, ọ dịghịkwa ihe ndị ahụ pụrụ ime nke ga-akasi ya obi.
N’ụbọchị ahụ, ọ dabara na Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ na-abịa obodo Nen. N’ebe dịdewere ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, ha zutere ìgwè mmadụ ahụ na-aga ili nwa nwoke nke nwanyị ahụ. Mgbe Jizọs hụrụ nwanyị ahụ na-ebe ákwá, o nwere ọmịiko n’ebe ọ nọ. Oké iru újú nke nwanyị ahụ metụrụ ya n’obi. Ọ chọrọ inyere ya aka.
Ya mere, n’ụzọ dị nwayọọ nakwa n’obi ike nke mere ka nwanyị ahụ gee ntị, ọ sịrị: “Kwụsị ịkwa ákwá.” Otú o si na-ekwu okwu ma na-eme ihe mere ka mmadụ nile kiriwe ya iji hụ ihe ọ ga-eme. Ka Jizọs na-agaru nso n’ebe ozu nwa okoro ahụ dị, mmadụ nile aghaghị ịnọ na-eche ihe ọ gaje ime. Jizọs kwuru okwu, nye ya iwu, sị: “Nwa okorobịa, asị m gị, Bilie!” Ozugbo ahụ, o biliri! Ọ malitekwara ikwu okwu.—Luk 7:11-17.
Chee echiche otú obi na-aghaghị ịdịworị nwanyị ahụ! Olee otú obi ga-adị gị ịhụ onye ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ?—Ọ̀ bụ na nke a adịghị egosi na Jizọs hụrụ ndị mmadụ n’anya n’ezie ma chọọ inyere ha aka?— Cheedị echiche otú ọ ga-esi bụrụ ihe magburu onwe ya ịnabata ndị a kpọlitere n’ọnwụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke!—2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4.
Gịnị ka ịkpọlite nanị otu nwa nke nwanyị a mụtara n’ọnwụ na-egosi?
N’oge ahụ, ụfọdụ n’ime ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-abụ ndị anyị mabu, gụnyere ụmụaka. Anyị ga-ama ndị ha bụ dịkwa nnọọ ka Jeirọs matara nwa ya nwanyị mgbe Jizọs kpọlitere ya n’ọnwụ. Ndị ọzọ ga-abụ ndị nwụrụ ọtụtụ narị afọ ma ọ bụ ọtụtụ puku afọ gara aga. Ma, Chineke agaghị echefu ha nanị n’ihi na ọ dịla anya ha dịrị ndụ.
Ọ́ bụghị ihe magburu onwe ya ịmata na Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, hụrụ anyị n’anya nke ukwuu otú ahụ?— Ha chọrọ ka anyị dị ndụ, ọ bụghị nanị ruo afọ ole na ole, kama ruo mgbe ebighị ebi!
Banyere olileanya magburu onwe ya dị n’ime Bible banyere ndị nwụrụ anwụ, biko gụọ Aịsaịa 25:8; Ọrụ 24:15; nakwa 1 Ndị Kọrint 15:20-22.