Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/15 p. 10-11
  • Ihe Ị Ga-eme ma Nwa Gị Na-agha Ụgha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ị Ga-eme ma Nwa Gị Na-agha Ụgha
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE BỤ́ NSOGBU
  • Otú Ị Ga-esi Chebe Ụmụ Gị
    Teta!—2007
  • Otú Ị Ga-esi Na-akwụsi Ike n’Ihe I Kwuru
    Teta!—2014
  • N’ihi Gịnị Ka O Ji Adị Nnọọ Mfe Ikwu Okwu Ụgha?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Eziokwu Banyere Ịgha Ụgha
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2015
g 1/15 p. 10-11
Ebe obere nwa na-agọ na ọ bụghị ya kụwara ihe e ji tinye okooko

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Ihe Ị Ga-eme ma Nwa Gị Na-agha Ụgha

IHE BỤ́ NSOGBU

Ka e were ya na e nwere otu nwaanyị nwa ya dị afọ ise. Ka nwa ahụ nọ n’ime ụlọ na-egwu egwu, nwaanyị ahụ nụrụ ka ihe dara n’ala kụwaa. Mgbe ọ batara, ọ hụrụ ebe nwa ahụ kwụ n’akụkụ ihe ahụ. Otú ihu ya dị agwala ya na ọ bụ ya kụwara ya.

Ya ejiri iwe jụọ ya, sị: “Ònye kụwara ihe a?”

Ya azaa ya ozugbo, sị: “Amaghị m.”

Ihe a abụghị nke mbụ ọ na-agha ụgha. Ọ bụrụ na ọ bụ gị mụrụ nwa ahụ, ì chere na ọ gaghị akwụsịli ịgha ụgha?

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

E nweghị ụgha dị mma. Baịbụl kwuru na Jehova Chineke kpọrọ “ire na-agha ụgha” asị. (Ilu 6:16, 17) Dị ka ihe atụ, Iwu Mozis kwuru ahụhụ a ga-ata onye ghọrọ mmadụ ibe ya aghụghọ.—Levitikọs 19:11, 12.

Ma, e nwere ụgha ndị ka ibe ha njọ. E nwere ụfọdụ ụgha jọgburu onwe ha. A na-agha ha iji mebie aha mmadụ ma ọ bụ mesie mmadụ ike. Ma, ụfọdụ ndị na-agha ụgha mgbe ha nọ ná nsogbu. O nwere ike ịbụ ka a ghara ịta ha ahụhụ ma ọ bụ ka a ghara imenye ha ihere. (Jenesis 18:12-15) N’agbanyeghị na e nweghị ụgha nke dị mma, e nwere ndị ka ibe ha njọ. Nwa gị ghaa ụgha, mata ihe mere o ji ghaa ya, burukwa afọ ole ọ dị n’obi.

Nyere nwa gị aka mgbe ọ ka dị obere. Otu nwoke aha ya bụ David Walsh kwuru na ụmụaka kwesịrị ịmụta ịna-ekwu eziokwu, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ọ gaghị adịrị ha mfe. Mmadụ kwesịrị ịtụkwasị onye ya na ya dị ná mma obi. Ma ọ bụrụ na onye ahụ na-aghakarị ụgha, ọ gaghị atụkwasịli ya obi.

Echela na nwa gị agaghị agbanweli. Na nwa gị tụrụ asị apụtaghị na ọ ghọọla ajọ nwa. Cheta na Baịbụl sịrị na e kekọtara nzuzu na obi nwata. (Ilu 22:15) Otú ụfọdụ ụmụaka si egosi nzuzu nke ha bụ ịtụ asị. Ha nwere ike iche na ọ ga-eme ka a ghara ịta ha ahụhụ. N’ihi ya, i kwesịrị ilezi anya mara ihe ị ga-eme ya.

IHE I NWERE IKE IME

Chọpụta ihe mere nwa gị ji agha ụgha. Ọ̀ bụ ụjọ ihe a ga-eme ya na-atụ ya, ka ọ̀ bụ na ọ chọghị ime ihe ga-ewe gị iwe? Ọ bụrụ na nwa gị na-akọrọ ndị enyi ya ihe na-abụghị eziokwu ka ha ghara ileda ya anya, ihe mere o ji akọrọ ha ya ọ̀ bụ maka na ọ ghọtabeghị otú ihe si dị n’ụwa? Ọ bụrụ na ị mata ihe mere nwa gị ji agha ụgha, ị ga-enwe ike ịma otú ị ga-esi enyere ya aka.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 1 Ndị Kọrịnt 13:11.

Gwa ya ihe o mere, kama ịjụ ya ajụjụ. N’ihe atụ ahụ e nyere ná mbido isiokwu a, o doro nwaanyị ahụ anya na ọ bụ nwa ya kụwara ihe ahụ. Ma, ọ jụrụ ya, sị: “Ònye kụwara ihe a?” O nwere ike ịbụ na ihe mere nwa ahụ ji sị na ya amaghị bụ na ọ hụrụ na iwe ji mama ya. Ma, kama ịjụwa ya ajụjụ, mama ya gaara asị ya: “Hei, ị kụwaala ihe a.” Ọ bụrụ na ọ gwa nwa ya ihe o mere kama ịjụ ya ajụjụ, nwa ahụ agaghị atụ asị, kama ọ ga-enyere ya aka ịmụta ịna-ekwu eziokwu.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Kọlọsi 3:9.

Nwa gị kwuo eziokwu, jaa ya mma. Ụmụaka na-achọkarị ime ihe ga-atọ mama ha na papa ha ụtọ. N’ihi ya, mee ka nwa gị mata na obi ga-atọ gị ụtọ ma ọ na-ekwu eziokwu. Kụziere ya na ezinụlọ unu ejighị ikwu eziokwu eti epele nakwa na ị chọrọ ka ọ na-ekwu eziokwu mgbe niile.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Hibru 13:18.

Mee ka nwa gị ghọta na a naghị atụkwasị onye ụgha obi nakwa na a kwụsị ịtụkwasị mmadụ obi, ọ na-esi ike tupu a malite ịtụkwasị onye ahụ obi ọzọ. Mgbe ọ bụla o kwuru eziokwu, jaa ya mma. Ime otú a ga-eme ka ọ na-agba mbọ na-ekwu eziokwu. Dị ka ihe atụ, o kwuo eziokwu, i nwere ike ịsị ya, “Obi dị m ụtọ na ị na-ekwu eziokwu.”

Na-ekwu eziokwu. O doro anya na ị gaghị atụ anya na nwa gị ga na-ekwu eziokwu ma ọ bụrụ na gịnwa anaghị ekwu eziokwu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ị na-achọghị ịhụ achọrọ gị bịa, gị agwa nwa gị ka ọ gwa ya na ị nọghị ya, ị na-akụziri ya ịtụ asị.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Jems 3:17.

Kụziere ya ihe Baịbụl kwuru. Ihe ndị dị na Baịbụl na akụkọ ndị a kọrọ na ya gosiri na Chineke chọrọ ka anyị na-ekwu eziokwu. Akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara nke aha ya bụ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ ga-enyere gị aka ịkụziri nwa gị ihe ndị dị na Baịbụl. Isiokwu nke 22 bụ “Ihe Mere Anyị Na-ekwesịghị Iji Na-agha Ụgha.” (Gụọ ihe ụfọdụ si n’isiokwu a n’igbe bụ́ “Akwụkwọ Ga-enyere Nwa Gị Aka.”) Akwụkwọ

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

  • ‘Mgbe m bụ nwa ọhụrụ, m na-ele ihe anya dị ka nwa ọhụrụ.’—1 Ndị Kọrịnt 13:11.

  • “Unu adịla na-aghara ibe unu ụgha.”—Ndị Kọlọsi 3:9.

  • “Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.”—Ndị Hibru 13:18.

  • ‘Amamihe nke si n’elu adịghị ihu abụọ.’—Jems 3:17.

AKWỤKWỌ GA-ENYERE NWA GỊ AKA

“Ị pụrụ imebi otu ihe, ọ bụ ezie na i zubeghị ime otú ahụ. Ọ bụrụ na a jụọ gị onye mebiri ya, ì kwesịrị ịsị na ọ bụ nwanne gị? Ka ì kwesịrị ime dị ka a ga-asị na ị maghị otú o si mee? . . . Ihe ọ sọkwara anyị mee, mgbe niile, ịgha ụgha ga-eme ka ọ ka njọ, anyị ekwesịghịkwa ọbụna ikwu ihe na-abụchaghị eziokwu. Baịbụl na-ekwu, sị: ‘Na-ekwunụ eziokwu.’ Ọ na-ekwukwa, sị: ‘Unu adịla na-aghara ibe unu ụgha.’ Jehova na-ekwu eziokwu mgbe niile, ọ na-atụkwa anya ka anyị na-eme otú ahụ.—Ndị Efesọs 4:25; Ndị Kọlọsi 3:9.”

Ihe a si n’akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya