Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 12/15 p. 21-23
  • N’ihi Gịnị Ka O Ji Adị Nnọọ Mfe Ikwu Okwu Ụgha?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ihi Gịnị Ka O Ji Adị Nnọọ Mfe Ikwu Okwu Ụgha?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndị Mere E Ji Agha Ụgha
  • Tụlee Mmetụta Ya
  • Ihe Mere O Ji dị Mfe Ịgha Ụgha
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-ekwu Eziokwu?
  • Ịgha Ụgha—Ọ̀ Dị Mgbe Ọ Pụrụ Ịbụ Ihe Ziri Ezi?
    Teta!—2000
  • Eziokwu Banyere Ịgha Ụgha
    Teta!—1997
  • Na-ekwu Eziokwu
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Eziokwu Ọ̀ Ka Dị Mkpa?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 12/15 p. 21-23

N’ihi Gịnị Ka O Ji Adị Nnọọ Mfe Ikwu Okwu Ụgha?

ỌDỊGHỊ onye na-enwe mmasị ka a ghaara ya ụgha. Ma, ndị mmadụ gburugburu ụwa na-aghara ibe ha ụgha n’ihi ihe dị iche iche. Nnyocha nke pụtara n’akwụkwọ The Day America Told the Truth, nke James Patterson na Peter Kim dere kpughere na 91 pasent ndị America na-agha ụgha oge nile. Ndị dere akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Ọ na-esiri ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị ike ịgabiga otu izu n’aghaghị ụgha—anyị na-ekwukwa banyere ụgha ndị a ma ụma ghaa, ndị a kpachaara anya ghaa.”

Ịgha ụgha bụ ihe a na-emekarị n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’akụkụ nile nke ndụ a na-adị n’oge a. Ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-aghara ndị ha na-achị na ibe ha ụgha. Site na mgbe ruo na mgbe ha apụtawo na telivishọn na-agọpụ onwe ha site ná njikọ akụkọ ihe ọjọọ ọ bụla bụ́ ndị aka ha dị n’ime ha n’ezie. Sissela Bok, n’akwụkwọ ya bụ́ Lying—Moral Choice in Public and Private Life, kwuru, sị: “N’iwu na n’ọrụ mgbasa ozi, n’ọchịchị na ná mmụta ihe banyere ọha na eze, a na-ewere nghọgbu n’ihe nkịtị mgbe ndị ghara ụgha ndị ahụ, bụkwa ndị na-anwa iguzobe ụkpụrụ, weere ya dị ka ihe a pụrụ ịnakwere.”

Ka ọ na-ezo aka n’ịgha ụgha ndọrọ ndọrọ ọchịchị na United States, Common Cause Magazine nke May/June 1989 kwuru, sị: “N’ezie Irikpọ ego ọha na agha Vietnam karịrị orire e resịrị Iran ngwá agha ná nzuzo n’ihe banyere aghụghọ ndị gọọmenti na irifu ihe ọha e tinyere ha n’aka. Ya mere, gịnị mere ka afọ ndị Reagan chịrị na ha bụrụ nke oké mgbanwe? Ọtụtụ ghara ụgha, ma ole na ole kwara ụta.” Ya mere, ọ bụ ezi ihe kpatara na ndị nkịtị adịghị atụkwasị ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha obi.

Ná mmekọrịta mba na mba, ọ na-esiri ndị ndú dị otú ahụ ike ịtụkwasị ibe ha obi. Onye ọkà ihe ọmụma Grik bụ́ Plato kwuru, sị: “A pụrụ inye ndị ọchịchị Steti . . . ohere ịgha ụgha maka ọdịmma nke Steti.” Ná mmekọrịta mba na mba ọ bụ dị ka amụma Bible kwuru na Daniel 11:27, sị: “N’otu table ka ha ga-ekwu okwu ụgha.”

N’ụwa azụmahịa, ịgha ụgha banyere ihe ndị e mepụtara na ije ozi dị iche iche bụ ihe ọha na-eme. Ndị na-azụrụ ihe aghaghị iji nlezianya mee nkwekọrịta, na-eji n’aka inyopụtacha ihe nile. Mba ụfọdụ nwere òtù nchịkwa dị iche iche n’ọchịchị iji chebe ndị mmadụ site ná mkpọsa azụmahịa ụgha, site n’azụmahịa na-emerụ ahụ nke e gosiri dị ka ihe bara uru ma ọ bụ nke na-adịghị emerụ ahụ, na site ná nghọgbu. N’agbanyeghị mgbalị ndị a, ndị mmadụ nọgidere na-ata ahụhụ n’ụzọ ego site n’aka ndị ahịa na-agha ụgha.

Nye ụfọdụ ndị, ịgha ụgha dị nnọọ mfe nke na ọ bụ àgwà ha. Ndị ọzọ na-ekwukarị eziokwu, ma mgbe ihe siri ike ha ga-agha ụgha. Ole na ole na-ajụ ịgha ụgha n’okpuru ọnọdụ ọ bụla.

A kọwara ụgha dị ka “1. okwu ma ọ bụ omume ụgha, karịsịa nke e bu ịghọgbu mmadụ n’uche mee . . . 2. ihe ọ bụla nke na-enye ma ọ bụ nke e bu n’uche ka o nye echiche na-abụghị ezie.” Ebumnuche ya bụ ime ka ndị ọzọ kwere ihe onye ụgha ahụ maara na ọ bụghị eziokwu. Site n’ụgha ma ọ bụ ihe ndị na-abụchaghị eziokwu, ọ na-agbalịsi ike iduhie ndị o ruuru ịma ihe bụ eziokwu.

Ihe Ndị Mere E Ji Agha Ụgha

Ndị mmadụ na-agha ụgha n’ihi ọtụtụ ihe. Ụfọdụ na-eche na ọ bụ iwu na ha ga-agha ụgha banyere ikike ha nwere iji gaa n’ihu n’ụwa nke a nke ịma aka. Ndị ọzọ na-anwa iji ụgha kpuchie ngahie ma ọ bụ ikpe ọmụma. Ndị ọzọkwa na-enye akụkọ ụgha iji mee ka o yie ka hà arụwo ọrụ ha na-arụbeghị. E nwekwara ndị na-agha ụgha iji mebie aha ọma onye ọzọ, iji zere mmechuihu, iji gosi izi ezi nke ụgha ndị a ghaburu, ma ọ bụ iji ghọnara ndị ọzọ ego ha.

Ihe a na-ekwukarị iji mee ngọpụ na ụgha a ghara ziri ezi bụ na ọ na-echebe onye ọzọ. ụfọdụ na-ele nke a anya ịbụ asị ọcha n’ihi na ha na-eche na ọ dịghị onye o merụrụ ahụ. Ma ihe ndị ahụ a kpọrọ asị ọcha ọ̀ bụ ezie na ha adịghị enwe mmetụta ọjọọ ọ bụla?

Tụlee Mmetụta Ya

Asị ọcha pụrụ iguzobe usoro nke na-eduga n’iji ụgha mere ọrụ bụ́ nke pụrụ ịgụnye okwu ndị siri ike karị. Sissela Bok kwuru, sị: “A pụghị nnọọ iwezụga ụgha nile a na-agọchitere dị ka nke ‘ọcha’ n’ụzọ dị mfe otú ahụ. Nke mbụ bụ na a na-arụsi ụka ike n’ụzọ ọjọọ megide emerụghị ahụ nke ụgha. Ihe onye ghara ụgha ahụ na-ele anya dị ka nke na-adịghị emerụ ahụ ma ọ bụ ọbụna nke bara uru nwere ike ọ gaghị adị otú ahụ n’anya onye a ghọgburu.”

Ụgha, n’agbanyeghị otú ha pụrụ isi yie ihe n’adịghị njọ, na-emebi ezi mmekọrịta mmadụ na ibe ya. A na-ebibi ịbụ onye eziokwu nke onye ụgha ahụ, a pụkwara nnọọ inwe ọdịda na-adịgide adịgide nke ntụkwasị obi. Onye edemede a ma ama bụ Ralph Waldo Emerson dere, sị: “Mmerụ ọ bụla nke eziokwu abụghị nanị otu ụdị nke igbu onwe onye nye onye ụgha ahụ, kama ọ bụ ịma ahụ ike nke ọhà mmadụ mma.”

Ọ dị mfe onye ụgha ikwu ihe na-abụghị ezie banyere onye ọzọ. Ọ bụ ezie na o nyeghị ihe nnwapụta ọ bụla, ụgha ya na-eweta ihe ịrụ ụka, ọtụtụ na-ekwerekwa ya n’enyochaghị nzọrọ ya. Otú a a na-emebi aha ọma onye ọ na-adịghị ihe o mere, ọ na-ebukwa ibu arọ nke igosi na aka ya dị ọcha. Ya mere, ọ bụ nke na-egbu mmụọ mgbe ndị mmadụ kweere onye ụgha kama ikwere onye aka ya dị ọcha, ọ na-emebikwa mmekọrịta onye ahụ aka ya dị ọcha na onye ụgha ahụ nwere.

Ọ pụrụ ịdịrị onye ụgha mfe ịzụlite àgwà nke ịgha ụgha. Otu ụgha na-edubakarị n’ọzọ. Thomas Jefferson, onye America ọnụ na-eru n’okwu n’oge gboo, kwuru, sị: “Ọ dịghị ụrụ dị obi ọjọọ, dị imere ebere, na-asọ oyi, dị ka ya; onye nyekwara onwe ya ohere ịgha ụgha otu ugbo na-ahụ ya dị ka ihe dị mfe karị ime ya nke abụọ na nke atọ, ruo mgbe ọ ga-aghọ àgwà ya.” Ọ bụ ụzọ na-eduga ná ndakpọ omume ọma.

Ihe Mere O Ji dị Mfe Ịgha Ụgha

Ịgha ụgha malitere mgbe mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi ghaara nwanyị mbụ ụgha, na-agwa ya na ọ gaghị anwụ ma o nupụrụ Onye Okike ya isi. Ọ rụpụtara mmerụ ahụ dị ukwuu nye agbụrụ mmadụ nile, na-eweta ezughị okè, ọrịa, na ọnwụ nye mmadụ nile.—Jenesis 3:1-4; Ndị Rom 5:12.

Malite n’oge Adam na Iv bụ́ ndị nupụrụ isi, mmetụta ọjọọ nke nna ụgha ahụ akpatawo ọnọdụ n’ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ nke na-akwalite ịgha ụgha. (Jọn 8:44) Ọ bụ ụwa nke retọrọ eretọ ebe eziokwu na-adabere n’ọnọdụ. Akwụkwọ bụ́ The Saturday Evening Post nke September 1986 kwuru na nsogbu nke ịgha ụgha “na-emetụta azụmahịa, gọọmenti, agụmakwụkwọ, ntụrụndụ, na mkpakọrịta nkịtị ndị a na-enwe kwa ụbọchị n’etiti ndị amaala na ndị agbata obi. . . . Anyị azụrụwo echiche nke bụ na eziokwu dabeere n’echiche nke ndị mmadụ n’otu n’otu, otu nnukwute ụgha nke na-ekwu na ọ dịghị ihe ndị bụ eziokwu kpam kpam.”

Nke ahụ bụ echiche ndị ụgha riri ahụ, ndị na-enweghị ọmịiko ọ bụla maka ndị ha na-eduhie. Ịgha ụgha na-adịrị ha mfe. Ọ bụ ụzọ ndụ ha. Ma ndị ọzọ ịgha ụgha na-eribeghị ahụ pụrụ ịgha ụgha n’egbughị oge n’ihi ụjọ—ụjọ nke mkpughepụ, ụjọ ntaramahụhụ, na ihe ndị ọzọ. Ọ bụ adịghị ike nke anụ ahụ na-ezughị okè. Olee otú a pụrụ isi jiri mkpebisi ike ikwu eziokwu dochie àgwà nke a?

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-ekwu Eziokwu?

Eziokwu bụ ụkpụrụ Onye Okike ukwu anyị setịpụụrụ mmadụ nile. Okwu ya e dere ede, bụ́ Bible, kwuru ná Ndị Hibru 6:18 na ‘Chineke apụghị ikwu okwu ụgha.’ Ọkpara ya bụ́ Jisọs Kraịst, onye bụ nnọchianya Chineke n’onwe ya n’elu ụwa, jigidere otu ụkpụrụ ahụ. Jisọs gwara ndị ndú okpukpe ndị Juu chọrọ igbu ya, sị: “Ugbu a unu na-achọ ụzọ igbu m, bụ́ mmadụ nke gwaworo unu eziokwu, nke m nụrụ n’ọnụ Chineke. . . . Ọ bụrụkwa na aga m asị, Amataghị m ya, m ga-eyi unu, bụrụ onye ụgha.” (Jọn 8:40, 55) O setịpụụrụ anyị ezi ihe ilereanya n’ihi na “ọ dịghị mmehie ọ bụla o mere, a hụghịkwa aghụghọ n’ọnụ ya.”—1 Pita 2:21, 22.

Onye Okike anyị, nke aha ya bụ Jehova, kpọrọ ụgha asị, dị ka Ilu 6:16-19 na-ekwu n’ụzọ doro anya, sị: “Ihe isii dị nke Jehova kpọrọ asị; ee, ihe asaa dị nke bụ ihe arụ nke mkpụrụ obi ya: anya dị elu, na ire okwu ụgha, na aka na-awụsi ọbara na-emeghị ihe ọjọọ; na obi nke na-echepụta echiche ajọ ihe, na ụkwụ na-eme ngwa ịgbaga n’ihe ọjọọ; na onye àmà okwu ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị iche iche dị ka ume, na onye na-ezisa iseokwu n’etiti ụmụnne.”

Chineke nke a na-ekwu eziokwu chọrọ n’aka anyị ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya nile iji nata nnwapụta ya. Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ na-enye anyị iwu, sị: “Unu ekwula okwu ụgha gwarịta ibe unu; ebe unu yipụchasịworo mmadụ ochie ahụ, ya na omume ya nile.” (Ndị Kọlọsi 3:9) Ọ dịghị anabata ndị jụrụ ịkwụsị àgwà nke ịgha ụgha; ha agaghị anata onyinye ya nke ndụ. N’ezie, Abụ Ọma 5:6 kwuru n’eziokwu na Chineke “ga-eme ka ndị nile na-ekwu okwu ụgha laa n’iyi.” Mkpughe 21:8 gakwara n’ihu ikwu na òkè nke “ndị ụgha nile” bụ “ọnwụ nke abụọ ahụ,” nke bụ mbibi ebighị ebi. Ya mere anyị ịnakwere echiche Chineke banyere ịgha ụgha na-enye anyị ihe siri ike anyị ga-eji na-ekwu eziokwu.

Ma gịnị ka e kwesịrị ime n’ọnọdụ ebe eziokwu pụrụ iweta ọnọdụ mmechuihu ma ọ bụ mmetụta ọjọọ? Ọ dịghị mgbe ịgha ụgha na-abụ ihe ngwọta ya, ma ịhapụ ikwu ihe ọ bụla mgbe ụfọdụ bụ ihe ngwọta ya. Gịnị mere ị ga-eji ghaa ụgha ndị nanị ihe ha ga-eme bụ imebi ịbụ onye eziokwu gị ma mee ka ị bụrụ onye Chineke jụrụ?

Site n’egwu na adịghị ike mmadụ, a pụrụ ịnwa mmadụ ọnwụnwa ịchọ ebe nzuzo n’ụgha. Nke ahụ bụ ụzọ ime ihe kasị mfe ma ọ bụ obi ọma hiere ụzọ. Pita onyeozi dabara n’ọnwụnwa dị otú ahụ mgbe ọ gọrọ ugbo atọ na ya amaghị Jisọs Kraịst. E mesịa, obi mara ya ikpe nke ukwuu n’ihi ịgha ụgha. (Luk 22:54-62) Ezi nchegharị ya kpaliri Chineke ịgbaghara ya, dị ka e gosiri ya ịbụ onye e mesịrị jiri ọtụtụ ihe ùgwù ije ozi gọzie. Nchegharị na mkpebi siri ike ịkwụsị ịgha ụgha bụ ụzọ nke na-eweta mgbaghara Chineke n’ihi ime ihe Chineke kpọrọ asị.

Ma kama ịchọ mgbaghara mgbe a ghasịrị ụgha, chebe ezi mmekọrịta gị na Onye Okike gị ma jigide ịbụ onye eziokwu gị n’ebe ndị ọzọ nọ site n’ịdị na-ekwu eziokwu. Cheta ihe Abụ Ọma 15:1, 2 na-ekwu: “Jehova, ònye ga-anọ dị ka ọbịa n’ụlọikwuu gị? ònye ga-ebi n’ugwu nsọ gị? Onye na-eje ije n’izu okè, nke na-arụkwa ọrụ ezi omume, nke na-ekwukwa eziokwu n’obi ya.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya