Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 3 p. 10-11
  • Otú Di na Nwunye Kwesịrị Isi Na-ekwurịta Nsogbu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Di na Nwunye Kwesịrị Isi Na-ekwurịta Nsogbu
  • Teta!—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE O JI ARA AHỤ́
  • IHE I KWESỊRỊ ỊMA
  • IHE I NWERE IKE IME
  • Otú Di na Nwunye Ga-esi Na-ekele Ibe Ha Maka Ihe Ọma Ha Mere
    Teta!—2017
  • Ndị Bụ́ Di Meenụ Ka Obi Na-eru Nwunye Unu Ala
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Otú Ị Ga-esi Na-akwanyere Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ùgwù
    Teta!—2016
  • Otú Gị na Nne na Nna Di Gị ma Ọ Bụ Nne na Nna Nwunye Gị Ga-esi Na-adị n’Udo
    Teta!—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2016
g16 nke 3 p. 10-11
Nwoke a na-ege nwunye ya ntị

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | DI NA NWUNYE

Otú Di na Nwunye Kwesịrị Isi Na-ekwurịta Nsogbu

IHE MERE O JI ARA AHỤ́

Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ekwurịta nsogbu, ùnu na-akpasu onwe unu iwe kama idozi nsogbu ahụ? Ọ bụrụ otú ahụ, unu ga-emeli ka ihe ka mma. Ihe ga-enyere gị aka bụ ibu ụzọ ghọta ihe ụfọdụ na-aka ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị mkpa ma ha kwurịtawa okwu.a

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Nwoke na-achọkarị ka e mewe emewe emewe, ma, ihe na-abụ mkpa nwaanyị bụ ka e gee ya ntị

Ụmụ nwaanyị na-adị achọ ka di ha nụchaa ihe bụ́ nsogbu ha tupu e kwuwe ihe a ga-eme. O nwedịrị mgbe naanị ịkọ nsogbu ha na-eme ka okwu bie.

Otu nwaanyị aha ya bụ Ngozib kwuru, sị: “Ọ na-akara m mma ma di m gee m ntị, ghọtakwa ihe m na-ekwu. M kwuchahaala ihe dị m n’obi, nsogbu m agwụla.”

Onyinyechi kwuru, sị: “Nsogbu m anaghị apụ m n’obi ma mụ akọrọghị di m otú ọ dị m. Ọ naghịzi enye m nsogbu n’obi ma m kọchaara ya.”

Oluchi kwukwara, sị: “Ọ na-abụ m na-akọ nsogbu m, mụ ana-echebara ya echiche ka m mara ihe kpatara ya.”

Ụmụ nwoke na-adị achọ ka e mewe emewe. Ihe mere ha ji eme otú ahụ bụ na ha na-ewere ya na ọ bụ ya ga-eme ka a ghọta na ha bụ nwoke. Ha na-echekwa na ọ bụ ya ga-eme ka nwunye ha na-abịa akọrọ ha nsogbu ọ bụla o nwere. Ọ bu ya mere ọ na-eji eju nwoke anya ma nwunye ya ekwetaghị ihe o kwuru a ga-eme maka ihe ọ kọọrọ ya. Otu nwoke kwuru na ya amaghị ihe mere nwunye ya ga-eji na-akọrọ ya nsogbu ya mgbe ọ na-achọghị ka ya gwa ya ihe a ga-eme maka nsogbu ahụ.

Ma, otu akwụkwọ e dere maka ndị di na nwunye kwuru, sị: “Mmadụ kwesịrị ibu ụzọ ghọta ihe a na-agwa ya tupu ya ekwuwe ihe a ga-eme. I kwesịrị igosi di gị ma ọ bụ nwunye gị na ị ghọtara ihe ọ kọọrọ gị nke ọma, gị emetekwara ya ebere, tupu gị agwawa ya ihe e nwere ike ime maka nsogbu ahụ. Mgbe ụfọdụ, ihe ọ chọrọ bụ naanị ka ị gee ya ntị nke ọma, ọ bụghị ka ị gwa ya ihe ọ ga-eme.”

IHE I NWERE IKE IME

Di kwesịrị ịna-ege nwunye ya ntị nke ọma. Otu nwoke aha ya bụ Ifeanyi kwuru na ya achọpụtala na ihe nwunye ya na-achọ mgbe ụfọdụ bụ naanị ka o gee ya ntị ma ghọta ihe ọ na-akọrọ ya n’agbanyeghị na e nwere mgbe ọ na-adị ya ka à ga-asị na naanị ige nwunye ya ntị agaghị eme ka ihe ka mma. Onye ọzọ aha ya bụ Ugochukwu kwuru na ya achọpụtakwala na obi na-adị nwunye ya mma ma ya gee ya ntị nke ọma, gharakwa ịnapụ ya okwu n’ọnụ. O kwukwara na ọ na-abụkarị nwunye ya kọchaara ya otú nsogbu ya dị ya n’obi, okwu ebie.

Megodị ihe a: Nwunye gị kọwara gị nsogbu ya, ya adịkwala gị ọkụ n’obi ịgwawa ya ihe ọ ga-eme maka ya. Na-ele ya anya ma ọ na-akọrọ gị ya, kweekwa n’isi ma ihe o kwuru daba n’ihe i chere. Kwughachi ihe ọ bụla gbara ọkpụrụkpụ o kwuru iji gosi ya na ị ghọtara ya. Otu nwoke aha ya bụ Chijioke kwuru na ihe na-abụ mkpa nwunye ya mgbe ụfọdụ bụ yanwa ịghọta ihe ọ na-akọrọ ya nke ọma ma gosi ya na ya kwụ ya n’azụ.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Jems 1:19.

Nwunye kwesịrị ịna-agwa di ya ihe ọ chọrọ ka o meere ya ma ọ kọwara ya nsogbu ya. Otu nwaanyị kwuru, sị: “Nwaanyị nwere ike iche na di ya ma ihe dị ya mkpa, ma, ọ na-aka mma mgbe ụfọdụ ma o jiri ọnụ ya gwa di ya ihe ọ chọrọ ka o meere ya ma ọ kọwara ya nsogbu ya.” Nwaanyị ọzọ aha ya bụ Chinenye kwuru otú nwaanyị nwere ike isi agwa di ya ụdị ihe ahụ. O kwuru na onye ahụ nwere ike ịgwa di ya, sị: “E nwere ihe na-enye m nsogbu n’obi m chọrọ ịkọrọ gị. Ihe m chọrọ bụ ka i gee m ntị ma ghọta otú obi dị m, ọ bụghị ka ị gwawa m ihe m ga-eme.”

Megodị ihe a: Ọ bụrụ na di gị na-achọkarị ka e mewe emewe mgbe ị ka na-akọrọ ya nsogbu gị, echekwala na ọ chọghị iji ihe ị na-agwa ya kpọrọ ihe. Ọ ga-abụ na ọ chọrọ inyere gị aka. Otu nwaanyị aha ya bụ Nneoma kwuru na ya anaghị ewesawa di ya iwe ma o mee ụdị ihe ahụ. O kwukwara na ya na-ewere ya na ọ bụghị naanị ntị ka di ya chọrọ ige, kama na ihe ahụ metụrụ ya n’obi, ya achọkwa inyere ya aka.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Rom 12:10.

Di na nwunye kwesịrị ịna-emeso ibe ha otú ha chọrọ ka e si na-emeso ha. Ihe ga-eme ka ihe gaa siriri werere mgbe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akọrọ gị nsogbu ya bụ ibu ụzọ ghọta ihe ọ chọrọ ka i meere ya. (1 Ndị Kọrịnt 10:24) Otu nwoke kwuru, sị: “Di kwesịrị ịna-ege nwunye ya ntị. Nwunye kwesịkwara ịghọta na o nwere mgbe ụfọdụ di ya ga-achọ ịgwawa ya ihe a ga-eme ozugbo n’echeghị ka ọ kọchaara ya ihe niile. Ọ ga-abara ha abụọ uru ma ha buru ihe ndị a n’obi.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 1 Pita 3:8.

a Anyị anaghị ekwu na ụmụ nwoke niile na ụmụ nwaanyị niile na-akpa àgwà otú e kwuru n’isiokwu a. Ma, ihe ndị e kwuru ebe a ga-abara onye ọ bụla lụrụla di ma ọ bụ nwunye uru ma ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya na-ekwurịta okwu.

b Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

  • ‘Bụrụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa.’—Jems 1:19.

  • “N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.”—Ndị Rom 12:10.

  • “Nweenụ otu obi, ka ihe banyere onye ọzọ na-emetụ unu n’obi.”—1 Pita 3:8.

M̀ KWESỊRỊ IKWU IHE A UGBU A?

Baịbụl kwuru, sị: ‘Lee nnọọ ka okwu e kwuru n’oge ya si dị mma!’ (Ilu 15:23) Ọ pụtara na okwu e kwuru n’oge na-ekwesịghị ekwesị nwere ike imebi ihe.

Otu onye kwuru, sị: “Okwu agaghị agaliri mmadụ abụọ siriri werere ma ọ bụrụ na ha na-ekwurịta ya n’oge na-ekwesịghị ekwesị.”

Onye ọzọ kwuru na di na nwunye ekwesịghị ikwuwe ihe dị mkpa mgbe ike gwụrụ otu n’ime ha ma ọ bụ mgbe agụụ na-agụ ya.

Otu nwaanyị aha ya bụ Ugomma kwuru, sị: “O nwere otu ụbọchị di m lọtara, mụ ebido ozugbo kọwara ya nsogbu m. Ka m na-akọ ya, mụ akwụsịtụ ma chọpụta na ihe ahụ m na-akọ adịghị ya mma n’obi. Agwaziri m ya na m ga-akọchara ya ihe ahụ ma anyị richaa nri. Ihe ahụ m mere tọrọ ya ụtọ, ya ekelee m. Mgbe anyị mechara kwụrịtawa ya, obi ka ruo anyị ala, ya aghọtakwa m nke ọma.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya