Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g17 nke 3 p. 14-15
  • Ndị Mmụọ Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Mmụọ Ozi
  • Teta!—2017
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ole ndị bụ ndị mmụọ ozi?
  • Gịnị ka ndị mmụọ ozi mere n’oge ochie?
  • Gịnị ka ndị mmụọ ozi na-eme ugbu a?
  • Otú Ndị Mmụọ Ozi Pụrụ Isi Nyere Gị Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Olee Ndị Bụ Ndị Mmụọ Ozi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Gbasara Ndị Mmụọ Ozi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Ndị Mmụọ Ozi Otú Ha Si Emetụta Ndụ Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2017
g17 nke 3 p. 14-15
Mmụọ ozi apụta n’ihu Mozis n’osisi ogwu na-ere ọkụ

IHE BAỊBỤL KWURU

Ndị Mmụọ Ozi

Ihe gbasara ndị mmụọ ozi na-agbakarị n’akwụkwọ, ihe osise, na fim dị iche iche. Ma, ole ndị bụ ndị mmụọ ozi, gịnịkwa bụ ọrụ ha?

Ole ndị bụ ndị mmụọ ozi?

IHE BAỊBỤL KWURU

Tupu Chineke ekee eluigwe na ụwa na ụmụ mmadụ, o keelarị ndị mmụọ ozi. Ha dị ike karịa mmadụ, bụrụkwa ndị mmụọ otú ahụ Chineke bụ. Ọ bụ ya mere ndị mmadụ enweghị ike ịhụ ha anya. (Job 38:​4, 7) Baịbụl kpọrọ ndị a Chineke kere “ndị mmụọ” na “ndị mmụọ ozi.”​—⁠Abụ Ọma 104:⁠4.a

Ole ka ndị mmụọ ozi a dị? Ha ka nkụ. Baịbụl sịrị na ndị mmụọ ozi gbara ocheeze Chineke gburugburu dị “iri puku kwuru iri puku,” ma ọ bụ “puku kwuru puku.” (Mkpughe 5:11) Ọ bụrụ na e si otú e si agụ ọnụ ọgụgụ taa gụwa ya, ọ pụtara na ndị mmụọ ozi dị ọtụtụ narị nde.

“M wee hụ, . . . ọtụtụ ndị mmụọ ozi gbara ocheeze ahụ . . . , gburugburu, ha dịkwa iri puku kwuru iri puku, na puku kwuru puku.”​—⁠Mkpughe 5:⁠11.

Gịnị ka ndị mmụọ ozi mere n’oge ochie?

IHE BAỊBỤL KWURU

Ọtụtụ mgbe, Chineke na-edunye ha ozi ma ọ bụ si n’ọnụ ha kwuo okwu.b O nwekwara mgbe Baịbụl kwuru na Chineke ji ha rụọ ọrụ ebube. Chineke dunyere mmụọ ozi ya ka ọ gaa gọzie Ebreham ma gbochie ya iji nwa ya Aịzik chụọ àjà. (Jenesis 22:​11-18) Otu mmụọ ozi pụtakwara n’ihu Mozis n’ọkụ na-ere n’etiti osisi ogwu ma zie ya ozi gbanwere ndụ ụmụ Izrel. (Ọpụpụ 3:​1, 2) Mgbe a tụbara Daniel onye amụma n’ime olulu ọdụm, ‘Chineke zitere mmụọ ozi ya wee mechie ọnụ ọdụm ndị ahụ.’​—⁠Daniel 6:⁠22.

“Mmụọ ozi Jehova wee pụta ìhè n’ihu [Mozis] n’ire ọkụ n’etiti otu osisi ogwu.”​—⁠Ọpụpụ 3:⁠2.

Gịnị ka ndị mmụọ ozi na-eme ugbu a?

IHE BAỊBỤL KWURU

Anyị agaghị enwe ike ịmatacha ihe niile ndị mmụọ ozi na-eme taa. Ma, Baịbụl mere ka anyị mara na ha sokwa na-enyere ndị nwere ezi obi aka ịbịa fee Chineke.​—⁠Ọrụ Ndịozi 8:​26-35; 10:​1-22; Mkpughe 14:​6, 7.

Mgbe Jekọb nọ ná nrọ, ọ hụrụ ka ndị mmụọ ozi nọ na-arịgo ma na-arịdata “ubube” dị n’etiti eluigwe na ụwa. (Jenesis 28:​10-12) Ọ ga-abụ na nrọ a mere ka Jekọb kwubie ihe anyị gaakwara ekwubi ma ọ bụrụ anyị, na ọ ga-abụ na Chineke na-ezite ndị mmụọ ozi n’ụwa ịbịa nyere ndị Chineke aka.​—⁠Jenesis 24:40; Ọpụpụ 14:19; Abụ Ọma 34:⁠7.

“E nwere ubube e guzobere n’ala ma elu ya ruru eluigwe; leekwa! ndị mmụọ ozi Chineke nọ na-arịgo ma na-arịdata na ya.”​—⁠Jenesis 28:⁠12.

a Baịbụl gwara anyị na ụfọdụ ndị mmụọ a nupụụrụ ọchịchị Chineke isi, ma ghọọ “ndị mmụọ ọjọọ.”​—⁠Luk 10:​17-20.

b N’eziokwu, okwu Hibru na okwu Grik a sụgharịrị “mmụọ ozi” na Baịbụl pụtachara “onye ozi.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya