Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 11/15 p. 4-7
  • Otú Ndị Mmụọ Ozi Pụrụ Isi Nyere Gị Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ndị Mmụọ Ozi Pụrụ Isi Nyere Gị Aka
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nzute Ndị E Zutere Ndị Mmụọ Ozi
  • Ànyị Kwesịrị Ịkpọku Ndị Mmụọ Ozi Maka Enyemaka?
  • Ịkpọku Chineke
  • Ndị Mmụọ Ozi na Ụkpụrụ Omume
  • Ndị Mmụọ Ozi Na-eche Nche
  • Ozi Ndị Mmụọ Ozi Na-ezi
  • Ndị Mmụọ Ozi Otú Ha Si Emetụta Ndụ Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ndị Mmụọ Ozi Bụ “Ndị Mmụọ Na-ejere Ọha Mmadụ Ozi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Olee Ndị Bụ Ndị Mmụọ Ozi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Otú Ndị Mmụọ Ozi Si Enyere Gị Aka
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 11/15 p. 4-7

Otú Ndị Mmụọ Ozi Pụrụ Isi Nyere Gị Aka

OKWU Chineke na-akwado ịdị adị nke ndị mmụọ ozi. Ọ na-agwa anyị na e nwere ọtụtụ nde ndị mmụọ a e kere eke. Ohu Jehova Chineke bụ́ Daniel hụrụ ọhụụ nke ihe ndị dị n’eluigwe bụ́ ndị o dere banyere ha sị: “[Ọtụtụ puku ndị ozi] na-ejere [Chineke] ozi, [puku iri ụzọ puku iri], na-eguzokwa ọtọ n’ihu Ya.”—Daniel 7:10.

Rịba ama na okwu Daniel na-eme ihe karịrị ịgwa anyị na e nwere ọtụtụ ndị mmụọ ozi. Ọ na-egosikwa na ndị mmụọ ozi na-ejere Chineke ozi. Ha bụ ndị ohu ya. N’ikwekọ na nke a, ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Gọzienụ Jehova, ndị mmụọ ozi Ya, unu ndị dike dị ike, ndị na-eme okwu Ya, n’ige ntị olu nke okwu Ya. Gọzienụ Jehova, usuu ndị agha Ya nile; unu ndị na-ejere Ya ozi, ndị na-eme ihe na-atọ Ya ụtọ.”—Abụ Ọma 103:20, 21.

Bible na-akọwakwa na ndị mmụọ ozi amaliteghị ndụ ha dị ka ụmụ mmadụ n’elu ụwa. Jehova kere ndị mmụọ ozi n’eluigwe ọbụna tupu o kee ụwa. Mgbe Chineke ‘tọrọ ntọala ụwa, ụmụ Chineke nile bụ́ ndị mmụọ ozi tisiri mkpu ọṅụ ike.’—Job 38:4-7.

Ndị mmụọ ozi bụ́ ndị mmụọ e kere eke—ndị a na-adịghị ahụ anya, ndị dị ike, ndị nwere ọgụgụ isi. N’ime Bible, a na-asụgharị okwu Hibru bụ́ mal·ʼakhʹ na okwu Grik bụ́ agʹge·los ịbụ “mmụọ ozi” mgbe a na-ekwu banyere mmụọ e kere eke. Okwu ndị a pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro 400 n’ime Bible. Ha abụọ pụtara otu ihe, ya bụ, “onye ozi.”

Nzute Ndị E Zutere Ndị Mmụọ Ozi

Ndị mmụọ ozi bụ ndị ozi n’ezie. Ị pụrụ ịma ihe ndekọ Bible ahụ banyere mgbe mmụọ ozi Gabriel bịakwutere Meri. Ọ gwara ya na ọ bụ ezie na ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, ọ ga-amụ nwa nwoke onye a ga-akpọ Jisọs. (Luk 1:26-33) Otu mmụọ ozi bịakwutekwara ụfọdụ ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’ọhịa. O kwupụtara, sị: “Taa . . . a mụrụ nye unu Onye nzọpụta, Nke bụ́ Kraịst Onyenwe anyị.” (Luk 2:8-11) N’otu aka ahụ, ndị mmụọ ozi ziri Hega, Abraham, Lọt, Jekọb, Mosis, Gideọn, Jisọs, na ndị ọzọ e dekọrọ n’ime Bible, ozi.—Jenesis 16:7-12; 18:1-5, 10; 19:1-3; 32:24-30; Ọpụpụ 3:1, 2; Ndị Ikpe 6:11-22; Luk 22:39-43; Ndị Hibru 13:2.

Ọ bụ ihe dị ịrịba ama na ozi nile a ndị mmụọ ozi ziri kwekọrọ ná mmezu nke nzube Chineke, ọ bụghịkwa nke ụmụ mmadụ ahụ e ziri ha. Ndị mmụọ ozi bịara dị ka ndị nnọchiteanya nke Chineke, dị ka uche ya na ngụkọ oge ya si dị. Ụmụ mmadụ akpọghị ha.

Ànyị Kwesịrị Ịkpọku Ndị Mmụọ Ozi Maka Enyemaka?

Ò ziri ezi ịkpọku ndị mmụọ ozi n’oge nsogbu? Ọ bụrụ otú ahụ, anyị ga-achọ ịmara aha mmụọ ozi pụrụ inyere anyị aka karịsịa. N’ihi ya, ụfọdụ akwụkwọ a na-ere ere na-edepụta ihe e chere na ọ bụ aha nke ọtụtụ ndị mmụọ ozi, ya na ọkwá, utu aha, na ọrụ ha. Otu akwụkwọ depụtara ihe ọ kpọrọ “iri kasị elu n’eluigwe,” “mmụọ ozi ndị a kasị mara n’Ebe Ọdịda Anyanwụ ụwa.” Ihe ya na ihe ndepụta ahụ so bụ ndụmọdụ na-agwa gị ka i mechie anya gị, jiri nwayọọ nwayọọ kpọghachi aha mmụọ ozi ahụ ọtụtụ ugboro, kuru nnọọ ume, jiri nwayọọ nwayọọ na-eku ume, ma “jikere onwe gị inwe ike iso ha kwurịta okwu.”

N’ụzọ megidere nke ahụ, Bible nyere anyị nanị aha ndị mmụọ ozi abụọ n’ime ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi nke Chineke, bụ́ Maịkael na Gebriel. (Daniel 12:1; Luk 1:26) Ikekwe, ihe mere e ji nye aha ndị a bụ iji gosi na mmụọ ozi nke ọ bụla bụ onye bụ́ mmụọ pụrụ iche nke nwere aha, ọ bụghị nanị ike ma ọ bụ ikike na-abụghị onye.

Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na ụfọdụ ndị mmụọ ozi jụrụ ịgwa ụmụ mmadụ aha ha. Mgbe Jekọb rịọrọ otu mmụọ ozi ka o kwuo aha ya, o meghị otú ahụ. (Jenesis 32:29) Mgbe a gwara ya ka ọ kọwaa onwe ya, otu mmụọ ozi nke bịakwutere Joshua kwuru nanị na ya bụ “onyeisi usuu ndị agha Jehova.” (Joshua 5:14) Mgbe nne na nna Samson jụrụ otu mmụọ ozi aha ya, ọ sịrị: “N’ihi gịnịkwa ka ị na-ajụ ajụjụ banyere aha m, ebe aha ahụ dị ebube?” (Ndị Ikpe 13:17, 18) Site n’enyeghị ndepụta nke aha ndị mmụọ ozi, Bible na-echebe anyị pụọ n’inye ndị mmụọ ozi nsọpụrụ na ofufe na-erughịrị ha. Dị ka anyị ga-ahụ, ọ dịghịkwa atụziri anyị ịkpọku ha.

Ịkpọku Chineke

Bible na-agwa anyị ihe nile ọ dị anyị mkpa ịmara banyere ihe ndị na-eme n’ógbè ndị bụ́ mmụọ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe . . . ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.” (2 Timoti 3:16, 17) Ọ bụrụ na Chineke chọrọ ka anyị mara aha ọtụtụ ndị mmụọ ozi, ọ gaara ekpughewo ha n’Okwu ya, bụ́ Bible. Ọ bụrụkwa na Chineke chọrọ ịtụziri anyị otú anyị pụrụ isi jekwuru ndị mmụọ ozi ma gwa ha okwu n’ekpere, ọ gaara enyeworị ihe ọmụma dị otú ahụ n’Akwụkwọ Nsọ.

Kama nke ahụ, Jisọs Kraịst kụziri, sị: “Mgbe ọ bụla ị na-ekpe ekpere, baa n’ime ụlọ nta gị, mgbe i mechisịkwara ụzọ gị, kpeere Nna gị Nke dị na nzuzo . . . Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: Nna anyị Nke bi n’eluigwe, Ka e doo aha Gị nsọ.” (Matiu 6:6, 9) Echiche Akwụkwọ Nsọ bụ nke a: Anyị agaghị akpọku ndị mmụọ ozi ma ọ bụ kpegara ha ekpere, kama anyị kwesịrị iji ekpere jekwuru Onye Okike nke ndị mmụọ ozi, bụ́ Chineke n’onwe ya. Aha ya abụghị ihe omimi, onye na-ahụ ọhụụ adịghịkwa mkpa iji kpughee ya. Ọ bụ ezie na a nwawo izochi aha Chineke, ọ pụtara n’ihe ndekọ Bible ihe karịrị ugboro 7,000. Dị ka ihe atụ, ọ bụ n’izo aka n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ ka ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.”—Abụ Ọma 83:18.

Ọ dịghị mgbe ọ bụla Jehova na-eji ọrụ n’aka gabiga ókè nke na ọ gaghị ege anyị ntị ma ọ bụrụ na anyị abịakwute ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ekpere. Bible na-enye ihe mmesi obi ike a: “N’ihi na Jehova, anya Ya na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.”—2 Ihe E Mere 16:9.

Ndị Mmụọ Ozi na Ụkpụrụ Omume

N’ụzọ megidere ihe a na-egosikarị n’usoro mgbasa ozi, ndị mmụọ ozi adịghị ekpe ndị mmadụ ikpe. Nke ahụ dabara adaba, n’ihi na e nyeghị ndị mmụọ ozi ikike ikpe ụmụ mmadụ ikpe. Jehova bụ “Onyeikpe ọha mmadụ,” ọ bụ ezie na “O werewo ikpe nile nye Ọkpara Ya,” bụ́ Jisọs Kraịst. (Ndị Hibru 12:23; Jọn 5:22) Ka o sina dị, ọ ga-abụ ihie ụzọ iche na otú anyị si ebi ndụ anyị agbasaghị ndị mmụọ ozi. Jisọs sịrị: “Ọṅụ dị n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke n’isi otu onye mmehie nke na-echegharị.”—Luk 15:10.

Otú ọ dị, ndị mmụọ ozi abụghị nanị ndị nkiri. N’oge ndị gara aga, ha jere ozi dị ka ndị ogbu, na-emezu ikpe Chineke. Dị ka ihe atụ, Chineke ji ndị mmụọ ozi mee ihe megide ndị Ijipt oge ochie. Dị ka Abụ Ọma 78:49, si kwuo, “ọ na-ezite ọnụma nke iwe Ya n’etiti ha, nrubiga ókè iwe, na iwe, na mkpagbu, bụ́ [nzipụ] nke ndị mmụọ ozi nke ihe ọjọọ.” N’ụzọ yiri nke ahụ, Bible na-akọ na n’otu abalị otu mmụọ ozi bibiri ndị agha Asiria 185,000.—2 Ndị Eze 19:35.

N’otu aka ahụ, n’ọdịnihu, ndị mmụọ ozi ga-ebibi ndị ahụ na-eyi ọdịmma nke ndị ọzọ egwu site n’ịjụ ikwekọ n’ụkpụrụ ezi omume Chineke. Jisọs ga-abịa “Ya na ndị mmụọ ozi nke ike Ya, n’ime ọkụ na-ere ere, na-abọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị n’ozi ọma.”—2 Ndị Tesalọnaịka 1:7, 8.

Akwụkwọ Nsọ si otú a na-egosi na ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi nke Chineke na-eme uche ya mgbe nile site n’imezu ntụziaka ya na ịkwado ụkpụrụ ezi omume ya. N’ụzọ doro anya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ndị mmụọ ozi Chineke nyere anyị aka, ọ dị anyị mkpa ịmara ihe uche Chineke bụ ma gbalịsie ike ime ya.

Ndị Mmụọ Ozi Na-eche Nche

Ndị mmụọ ozi hà na-elekọta ndị mmadụ ma na-echebe ha? Pọl onyeozi jụrụ, sị: “Hà [ndị mmụọ ozi] nile abụghị ndị mmụọ na-efe ofufe, ndị e zipụtara ije ozi n’ihi ndị gaje iketa nzọpụta?” (Ndị Hibru 1:14) N’ụzọ doro anya, azịza nye ajụjụ Pọl bụ ee.

N’ihi ọjụjụ ha jụrụ ịkpọ isiala n’ihu onyinyo ọlaedo nke Eze Nebukadneza nke Babilọn guzobere, a tụbara ndị Hibru atọ ahụ bụ́ Shedrak, Mishak, na Abednego n’ime oké ọkụ e mere ka ọ dịbiga ọkụ ókè. Otú ọ dị, ọkụ ahụ eresaghị ndị ohu Chineke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. Mgbe eze ahụ lebara anya n’ime oké ọkụ ahụ, ọ hụrụ “ndị ikom anọ,” wee sị na “onye ahụ nke mere ha anọ yiri nwa nke ndị bụ́ chi n’ile ya anya.” (Daniel 3:25) Afọ ụfọdụ mgbe e mesịrị, Daniel chọtara onwe ya n’ime olulu ọdụm n’ihi ikwesị ntụkwasị obi ya. Ya onwe kwa lanarịrị n’emerụghị ahụ wee kwupụta, sị: “Chineke m ezitewo mmụọ ozi Ya, wee kpuchite ọnụ ọdụm ndị a.”—Daniel 6:22.

Mgbe e guzobere ọgbakọ nke ụmụazụ Kraịst na narị afọ mbụ O.A., ndị mmụọ ozi pụtakwara ọzọ, na-atọhapụ ndị ozi n’ụlọ mkpọrọ. (Ọrụ 5:17-24; 12:6-12) Mgbe ndụ Pọl nọkwa n’ihe ize ndụ n’osimiri, otu mmụọ ozi mesiri ya obi ike na ọ ga-eru Rom n’udo.—Ọrụ 27:13-24.

Ndị ohu Jehova Chineke nke oge a kwenyesiri ike na usuu ndị mmụọ ozi a na-adịghị ahụ anya nke Chineke dị adị n’ezie nakwa na ha nwere ikike ichebe ha, dị ka ha chebere Elaịsha na onye na-ejere ya ozi. (2 Ndị Eze 6:15-17) N’ezie, “mmụọ ozi nke Jehova na-ama ụlọikwuu ya gburugburu ndị na-atụ egwu Ya, o wee dọpụta ha.”—Abụ Ọma 34:7; 91:11.

Ozi Ndị Mmụọ Ozi Na-ezi

Ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi na-echegbu onwe ha banyere ọdịmma nke ndị na-ejere Jehova Chineke ozi, ha na-ekerekwa òkè n’ịhụ na ndị mmadụ mụtara banyere ya na nzube ya. Jọn onyeozi dere, sị: “M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efe n’etiti eluigwe, na-enwe ozi ọma ebighị ebi izisara ndị na-anọdụ n’elu ụwa, bụ́ mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla; ọ na-ewerekwa oké olu sị, Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa Ya otuto.”—Mkpughe 14:6, 7.

Ị̀ chọrọ ịma ihe “ozi ọma ebighị ebi” a na-akọ maka ya? Ọ bụrụ otú ahụ, jụọ Ndịàmà Jehova. Ha ga-enwe obi ụtọ iso gị kerịta ya.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Otu mmụọ ozi na-efe n’etiti eluigwe na-ezisa ozi ọma ebighị ebi. Ị̀ chọrọ ịmụ banyere ozi ahụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya