Ì Nwere Mmụọ Ozi Na-eche Gị Nche?
Ì KWERE na i nwere mmụọ ozi na-eche gị nche? Ọtụtụ ndị mmadụ chere na ha nwere. N’ihi nke ahụ, a sịrị na otu nwanyị bi n’ebe ọdịda anyanwụ Canada nwere onyinye pụrụ iche nke metụtara ndị mmụọ ozi. Ọ bụrụ na i nye ya aha gị nile tinyere $200, ọ na-azọrọ na ọ ga-eme ka i soro mmụọ ozi na-eche gị nche kwurịta okwu. Nke mbụ, ọ ga-atụgharị uche site n’ilekwasị anya n’ire ọkụ kandụl. O mesịa nke ahụ, ọ hụ ọhụụ ebe mmụọ ozi gị ga-ezi ya ozi ọ ga-ezi gị. Dị ka ihe ntụkwasị, nwanyị ahụ ga-esere gị ihe mmụọ ozi gị yiri.
Nye ụfọdụ, nke a pụrụ ịbụ otu ihe ya na akụkọ a kọrọ banyere Eze Louis nke Itoolu nke France. E kwuru na ọ zụtara ábụ́bà ndị dị oké ọnụ ndị a sịrị na ha si na nku Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi bụ́ Maịkael dapụ. Ọ bụ ezie na ọtụtụ na-agbagha akụkọ ahụ, ha agaghị enwetụdị obi abụọ banyere nzọrọ nwanyị Canada ahụ.
Mmasị n’Ebe Ndị Mmụọ Ozi Nọ
N’afọ ndị na-adịbeghị anya, e nwewo mmasị dị ukwuu n’ebe ndị mmụọ ozi nọ. Na telivishọn nakwa n’ihe nkiri sinima, akwụkwọ, na magazin, nakwa n’obere akwụkwọ akụkọ, a na-agwa anyị banyere ndị mmụọ ozi na-akasi ndị na-arịa ọrịa siri ike obi, na-agụgụ ndị mmadụ nwụnahụrụ, na-enye amamihe, na-anapụtakwa ndị mmadụ n’ọnwụ. Na United States, ihe dị ka nde 20 ndị na-ekiri telivishọn na-ekiri ihe omume telivishọn a na-eme kwa izu bụ́ ndị na-egosi ntinye aka ndị mmụọ ozi ná ndụ ndị mmadụ. Otu ụlọ ahịa na-ere akwụkwọ na-edepụta ihe karịrị akwụkwọ 400 ndị na-ekwu banyere ndị mmụọ ozi.
Otu akwụkwọ e bipụtara ná nso nso a na-akọ ahụmahụ banyere otú ndị mmụọ ozi na-eche mmadụ nche siworo zọpụta ndụ ndị soja n’ọgụ. Mpempe akwụkwọ ndị a na-amapawa na bọmpa ụgbọala na-ekwu na ndị mmụọ ozi na-eche mmadụ nche na-echebe ndị ọkwọ ụgbọala. Òtù, nnọkọ nkwurịta okwu, na nzukọ ọmụmụ ihe dị iche iche na-akwalite ọmụmụ ihe banyere ndị mmụọ ozi, a sịkwara na ha na-enyere ndị mmadụ aka isoro ha kwurịta okwu.
Eileen Freeman bụ onye dere akwụkwọ atọ banyere ndị mmụọ ozi bụrụkwa onye bipụtara otu akwụkwọ e kwuru nanị ihe banyere ha. Ọ na-ekwusi ike, sị: “Ekwere m na e nwere ọtụtụ mmụọ ozi na-eche mmadụ nche n’Ụwa dị ka e nwere mmụọ ozi n’eluigwe, ndị ọrụ ha na-abụghị nanị inye Chineke nọ n’eluigwe otuto kama ilekọta nnọọ ụmụ mmadụ na ụdị ndụ ndị ọzọ n’Ụwa. A na-ekenye anyị mmụọ ozi na-eche anyị nche n’otu n’otu mgbe a tụụrụ ime anyị, ọ na-elekọtakwa anyị ka anyị na-eto n’ime akpa nwa, n’oge ọmụmụ anyị, n’oge ndụ anyị n’ụwa a, ruo mgbe mmụọ ozi ahụ ga-eduru anyị site n’ógbè ụwa a gaa n’ebube nke eluigwe.” Nke a na-akọwa nke ọma echiche na-ewu ewu e nwere banyere ndị mmụọ ozi na-eche nche.
N’oge ndị a jupụtara ná nrụgide na ihe isi ike, ọ bụ ihe na-adọrọ mmasị ikwere na anyị nwere mmụọ ozi nke anyị nke na-eche anyị nche, onye ọ bụ ọrụ ya ichebe anyị. Gịnị ka Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-ekwu banyere nke a? Ànyị kwesịrị ịnwa iso ndị mmụọ ozi kwurịta okwu? Hà na-eche banyere ụkpụrụ omume na nkwenkwe okpukpe anyị? Enyemaka dị aṅaa ka anyị pụrụ ịtụ anya n’aka ha? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.