Inwe Oké Mmasị n’Ebe Ndị Mmụọ Ozi Nọ
“Anyị ‘nile’ nwere ndị mmụọ ozi na-eduzi ma na-echebe anyị . . . Ọ bụrụ na anyị aghara igbochi ha ma hapụrụ ha onwe anyị dị ka ụmụaka, na-atụkwasị ha obi kpam kpam, na-ahụkwa ha n’anya ma jiri obi dị umeala na-enwe ekele n’ebe ha nọ, mgbe ahụ ha ga-agọzi anyị n’ụba. Ha na-eso anyị egwuri egwu. Ha na-elekọta anyị. Ha na-agwọ anyị, na-emetụ anyị aka, na-eji aka ọma ha a na-adịghị ahụ anya akasi anyị obi, ọtụtụ mgbe ha na-agbalịkwa inye anyị ihe anyị chọrọ.”—Site n’akwụkwọ bụ́ “Angel Letters.”
Ị GHAGHỊ ikweta na echiche a ọtụtụ ndị nwere banyere ndị mmụọ ozi na-akpali mmasị. Dị ka echiche nke ụfọdụ ndị na-akpọ “ọnọdụ ime mmụọ ọhụrụ” na-egosi, e kenyewo onye ọ bụla n’ime anyị ma ọ dịkarịa ala otu mmụọ ozi, bụ́ mmụọ ozi ọrụ ya bụ ịkasi anyị obi na ichebe anyị pụọ ná mmerụ ahụ. A sịrị na mmụọ ozi gị siri ike ma na-ahụ n’anya. Ọ dịghị achọ nrubeisi ma ọ bụ ofufe, ọ dịghịkwa ihe ga-eme ka o kpee gị ikpe ma ọ bụ baara gị mba. Ọ na-anọ n’akụkụ gị mgbe nile, na-etinye oge ya nile maka ọdịmma gị, na-achọsikwa ike imere gị ihe nile ị chọrọ. Ọtụtụ ndị taa ji ezi obi kwenye n’ihe ndị a.
Otú ọ dị, ikwenye ná ndị mmụọ ozi abụghị ihe ọhụrụ. Ha ekerewo òkè dị ukwuu na nkwenkwe okpukpe ndị mmadụ eri oge ochie. Nke a na-apụta ìhè n’ihe ọkpụkpụ. E ji ihe oyiyi ndị cherub, bụ́ otu ụdị ndị mmụọ ozi, chọọ ụlọikwuu na ụlọ nsọ mgbe ochie nke ndị Juu mma. E ji ndị mmụọ ozi achọ chọọchị na katidral ndị dị na Krisendọm nile mma. Ebe ngosi ihe mgbe ochie dịgasị iche jupụtara ná ndị mmụọ ozi e sere ese na ndị a kpụrụ akpụ.
Iwu Ewu nke Ndị Mmụọ Ozi
N’oge ndị a, ndị mmụọ ozi na-ewuzi nnọọ ewu n’ala ụfọdụ. Ihe nkiri sinima na-egosikarị ndị mmụọ ozi dị ka ndị mmadụ nwụworo anwụ ma lọghachite n’ụwa ịrụ ọrụ ọma. N’otu ihe nkiri, ndị mmụọ ozi nyeere otu òtù egwuregwu baseball a na-emeri emeri aka. N’ọzọ, mmụọ ozi na-eche otu nwata nwoke nọ n’afọ iri na ụma nche nyeere ya aka ịbọ ọ́bọ̀ ogbugbu e gburu enyi ya nwanyị. A na-egosikarịkwa mmụọ ozi na-enyere mmadụ aka n’otu usoro ihe omume a ma ama nke a na-egosi na telivishọn na United States.
Abụ ndị na-ekwu banyere ndị mmụọ ozi juru eju. N’ime iri afọ ndị na-adịbeghị anya na United States, 1 abụ n’ime abụ 10 ọ bụla a ma ama kpọrọ mmụọ ozi aha. Mgbe ọ na-erule etiti afọ ndị 1990, e mepewo “ụlọ ahịa ndị mmụọ ozi” karịrị 120 na America. Ụlọ ahịa ndị a na-ere ndị mmụọ ozi a kpụrụ akpụ, ịyagba olu na ihe ndị e ji ede ihe nwere ndị mmụọ ozi—ọbụna nwa bebi ndị e ji ndị mmụọ ozi chọọ mma. E kwenyere na nzukọ ọmụmụ ihe na obere akwụkwọ akụkọ dịgasị iche na-akụziri ndị mmadụ ụzọ ha ga-esi zute ndị a bi n’eluigwe. Magazin, akwụkwọ akụkọ, na mkparịta ụka TV na-akọ akụkọ banyere nzute ndị mmadụ zutere ndị mmụọ ozi.
Ọtụtụ Narị Akwụkwọ
Ọzọkwa, e nwere ọtụtụ akwụkwọ na-ekwu banyere ha. Otu nnukwu ụlọ ahịa na-ere akwụkwọ na New York City nwere ihe karịrị akwụkwọ 500 dịgasị iche na-ekwu banyere ndị mmụọ ozi, nke ka nke ndị mmụọ ozi na-echebe mmadụ. Akwụkwọ ndị dị otú ahụ na-ekwe nkwa na ha ga-egosi ndị na-agụ ha otú ha ga-esi zute ndị mmụọ ozi na-echebe mmadụ, mụta aha ha, soro ha kwurịta okwu, nwetakwa enyemaka ha. Akwụkwọ ndi a nwere ọtụtụ akụkọ ifo ndị na-ekwu banyere otú ndị mmụọ ozi siworo pụta n’oge a nọ ná mkpa, na-ebupụ ndị mmadụ n’ụzọ mgbe ụgbọala na-abịa, na-agwọ ọrịa ọjọọ, na-akasi ndị nọ n’ahụhụ obi, na-echebekwa ndị soja n’ọgbọ agha. Ndị mmụọ ozi dị otú ahụ na-emere mmadụ ihe “n’achọghị ihe ngosi ọ bụla nke nchegharị, ntọghata, ma ọ bụ ikwenyesi ike ná nkụzi ahụ.” Ma ọ na-esi ike “nzute” ndị dị otú ahụ nke oge a ịkpali ndị mmadụ ime mgbanwe ná ndụ ha. Ndị na-azọrọ na ha enwewo ahụmahụ ndị dị otú ahụ na-enwekarị nanị obi ụtọ.
N’ọgbọ nke nchegbu na ọgba aghara, akụkọ ndị a pụrụ iyi akụkọ ọma ndị magburu onwe ha. Ma à pụrụ ịtụkwasị ha obi? Ọ̀ dị ihe o mere?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]
Ọtụtụ ndị na-eche na ha ezutewo ndị mmụọ ozi n’onwe ha