Ịnwale Akụkọ Ndị Ahụ
NDỊ mmadụ na-emeghachi omume n’ọtụtụ ụzọ nye akụkọ ndị a na-akọ n’oge a banyere nzute e zutere ndị mmụọ ozi. Nke mbụ, e nwere ndị kwenyere na ha bụ eziokwu. Ha na-arụ ụka na ebe ọ bụ na akụkọ ndị ahụ dị nnọọ ọtụtụ ma zuokwa ebe nile, ha aghaghị ịbụ eziokwu. Nke abụọ, e nwere ndị na-agbagha ha. Ha na-akọwa na e nweghị ihe àmà dị ike iji kwado nzọrọ ndị ahụ. Nkweta zuru ebe nile, ka ha na-arụ ụka, adịghị eme ka ihe bụrụ eziokwu. E kwuwerị, ọ dị mgbe ndị mmadụ kwenyere na mamịwọta. Nke atọ, e nwere ndị na-adịghị ebe ha kwụ. N’ikwupụta echiche a na-adịghị akwado nke ọ bụla, akwụkwọ bụ́ Angels—Opposing Viewpoints (Ndị Mmụọ Ozi—Echiche Ndị Na-emegide Onwe Ha) na-ekwu, sị: “Ọtụtụ ndị mmadụ na-azọrọ na ha ahụwo ndị mmụọ ozi. A pụghị ịnwapụta ọhụhụ ndị a; e kwenyesiri ike na ha bụ eziokwu n’enweghị ihe nnwapụta. Otú ọ dị, ndị na-agbagha ha apụghịkwa igosi na ha bụ ụgha, ole na ole na-agbalịkwa ime otú ahụ.”
Ọtụtụ ndị kwetara na Bible bụ akwụkwọ a pụrụ ịdabere na ya iji nweta ihe ọmụma banyere ógbè ndị bụ́ mmụọ.a Ọ pụrụ inyere anyị aka inyocha akụkọ oge a banyere ndị mmụọ ozi. Dị ka ị pụrụ ịma, Bible na-emesi anyị obi ike na ndị mmụọ ozi bụ ndị mmụọ e kere eke dị adị, siri ike, dị ebube. Bible nwere ihe ndekọ ndị na-ekwu banyere ndị mmụọ ozi na-eweta ozi ma na-anapụta ndị ohu Chineke ná mmerụahụ.—Abụ Ọma 104:1, 4; Luk 1:26-33; Ọrụ 12:6-11.
Bible na-egosikwa na e nwere ndị mmụọ ozi ọjọọ. Ndị mmụọ a e kere eke na-aghọgbu ma na-eduhie ndị mmadụ, na-echigharị ha pụọ n’ebe Chineke nọ. (2 Ndị Kọrint 11:14) Bible nwere ezi ihe mere o ji na-adọ aka ná ntị, sị: “Unu ekwela okwu mmụọ nile, kama nwapụtanụ ndị mmụọ ahụ, ma ha bụ ndị siri na Chineke pụta.” (1 Jọn 4:1) Dị ka ihe atụ, tupu anyị ekwere amụma ndị onye kpọrọ onwe ya onye amụma buru, anyị ga-eji amamihe were Okwu Chineke, bụ́ nke ọ pụrụ ikwu na ya na-akọwapụta, tụọ ihe ọ na-ekwu n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. N’ezie, anyị kwesịrị ịtụ anya ka ihe ndekọ ndị nke oge a banyere mpụta ndị mmụọ ozi na-apụta ịbụ eziokwu ma a tụọ ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’otu ụzọ ahụ. Oleezi otú akụkọ banyere nzute ndị e zutere ndị mmụọ ozi n’oge a si dị ma e jiri ya tụnyere ihe e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ?
Ndị Mmụọ Ozi Abụghị Ihe Ọtụtụ Ndị Chere
Ka anyị malite site n’ịgbazi echiche abụọ na-ezighị ezi zuru ebe nile banyere ndị mmụọ ozi. N’adịghị ka nkwenkwe e nwere ebe nile, ndị mmụọ ozi amaliteghị ịdị ndụ dị ka ụmụ mmadụ. Ha adịwo n’eluigwe ogologo oge tupu Chineke ekee ndụ n’ụwa. Bible na-ekwu na mgbe Chineke ‘tọrọ ntọala ụwa, ụmụ Chineke nile [bụ́ ndị mmụọ ozi] tisiri mkpu ọṅụ ike.’—Job 38:4-7.
Echiche ọzọ na-ezighị ezi e nwere n’oge a bụ na ndị mmụọ ozi na-anakwere ihe ọ bụla ma na-ekwenyere ihe ọjọọ. Kama nke ahụ, ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi na-ejigide ụkpụrụ ezi omume Chineke ma na-eme ihe dị ka ntụzi Ya si dị. Ha na-ejere Chineke ozi, ọ bụghị mmadụ.—Abụ Ọma 103:20.
Ndị Mmụọ Ozi Nwere Mmasị n’Ọdịmma Ime Mmụọ Anyị
E nwere ọtụtụ ihe ndekọ banyere nnapụta, n’akụkọ ndị a na-akọ ugbu a banyere ndị mmụọ ozi. N’otu akwụkwọ kasị aga ahịa, anyị na-agụ banyere otu nwata nwanyị bụ́ onye aka ọ na-ahụghị anya jiri nwayọọ kpọpụta ya n’ime ụlọ na-agba ọkụ. Akwụkwọ ọzọ na-ekwu banyere ụmụ akwụkwọ kọleji abụọ ụgbọala ha tọrọ n’ime snow. Na mberede, otu gwongworo apụta ma dọkpụrụ ụgbọala ha gaa n’ebe dị mma, a hụghịkwa ebe o si gafee! N’ebe ọzọ, akụkọ ọzọ na-akọ banyere Ann, bụ́ onye ọrịa cancer jidere. Ụbọchị atọ tupu ọ gaa ụlọ ọgwụ ka a waa ya ahụ, otu onye ọ na-amabughị nke topụrụ etopụ bịara n’ụlọ ya. Ọ kọwara onwe ya dị ka Thomas ma kwuo na ọ bụ Chineke zitere ya. Thomas weliri aka ya elu, ya adị Ann ka ìhè ọkụ, nke na-acha ọcha ò si n’ime ahụ ya gafere. Mgbe o rutere ka a waa ya ahụ, o juru ndị dọkịta ahụ anya. Ọrịa cancer ya alaala!
Akụkọ ndị a na-akpata otu ezigbo ajụjụ, Ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere mmụọ ozi na-echebe ya, gịnị mere e ji anapụta ụfọdụ ndị ma hapụ ọtụtụ ndị? Ọtụtụ nde mmadụ anwụwo n’ọrịa, agha, ụnwụ nri, na ọdachi ndị na-emere onwe ha. N’ezie, ọtụtụ kpesiri ekpere ike maka enyemaka. Gịnị mere na mmụọ ozi na-echebe mmadụ azọpụtaghị ha?
Bible na-enye aka ịza ajụjụ a. Ọ na-akọwa na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu. (Ọrụ 10:34) Ọzọkwa, ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi Chineke na-eguzosi ike n’ihe nwere mmasị n’ọdịmma anụ ahụ anyị, ha na-enwe mmasị n’ọdịmma ime mmụọ anyị karị. Pọl onyeozi tụrụ aro nke a n’ụdị ajụjụ: “[Ọ̀ bụ na ndị mmụọ ozi] nile abụghị ndị mmụọ na-efe ofufe, ndị e zipụtara ije ozi n’ihi ndị gaje iketa nzọpụta?” (Ndị Hibru 1:14) Enyemaka anụ ahụ na-aba uru ruo nwa oge, ma enyemaka ime mmụọ pụrụ ịba uru ruo mgbe ebighị ebi.
Ọtụtụ akụkọ banyere ndị mmụọ ozi na-atọ ọchị. A na-ekwu na ndị mmụọ ozi na-enyere nne ike gwụrụ aka ịgbanwe ákwà ihe ndina, na-echetara onye gara ịzụ ihe ka ọ zụta mkpaọkụ, na-enyekwara ndị ọkwọ ụgbọala aka ịchọta ebe ha ga-adọba ụgbọala ha. Otu nwa agbọghọ na Scotland jiri ọchị kwuo, sị: “Adọbawo m ụgbọala m n’ebe na-ekwesịghị ekwesị n’Okporo Ámá St Mary kemgbe izu atọ gara aga ma gwa mmụọ ozi m ka o jiri ịhụnanya na ọmịiko gbaa ya gburugburu. Ọ bụrụ na ndị uwe ojii abịa, ha ga-ejupụta n’ịhụnanya nke na ha ga-ahapụ ụgbọala m. Enwetabeghị m tiketi ma ọlị.” Ka a sịkwa ihe mere ụfọdụ ndị ji eji mmụọ ozi na-echebe mmadụ nke oge a atụnyere omepụrụ onye ọ dịịrị ma ọ bụ Santa Claus nke ndị toworo eto.
Ndị Mmụọ Ozi Kwesịrị Ntụkwasị Obi Adịghị Emegide Okwu Chineke
Akwụkwọ ndị na-ekwu banyere ndị mmụọ ozi jupụtara n’ilu na ndụmọdụ ndị a na-eche na ha si n’ógbè ndị bụ́ mmụọ. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ na-ekwu na ihe dị na ya bụ ozizi nke Maịkael onyeisi ndị mmụọ ozi nyefere otu nwanyị na Colorado, U.S.A. N’ime “okwu ndị” Maịkael kwuru, e nwere: “Ụzọ nile na-eduga n’ebe Chineke nọ. Nkwenkwe nile, eziokwu nile nke ìhè na-eduga n’ebe Chineke nọ.” N’ụzọ dị iche, Jisọs kwuru na e nwere nanị ụzọ okpukpe abụọ nakwa na ọ bụ nanị otu n’ime ha na-eduga n’inweta ihu ọma Chineke na ndụ ebighị ebi. Nke ọzọ na-eduga n’enweghị ihu ọma Chineke na mbibi ebighị ebi. (Matiu 7:13, 14) N’ụzọ doro anya, okwu abụọ a apụghị ịbụcha eziokwu.
Olee ebe “ndị mmụọ ozi” nke “ọnọdụ ime mmụọ ọhụrụ” kwụ n’ihe banyere alụmdi na nwunye na omume ọma? N’otu akwụkwọ, onye na-agụ ya ga-agụta ihe banyere Roseann, bụ́ onye “mmụọ ozi” ya gwara, sị: “E nwere ọtụtụ ndị gị na ha ga-akparịta ụka, gị na [di gị] ibi abụghịzikwa ụzọ ndụ gị. Ị hụrụ ya n’anya, ọ hụkwara gị n’anya, ma oge eruwo mgbe unu ga-ekewa.” Ọ gbara alụkwaghịm. Ma, Bible na-egosi na Chineke kpọrọ ịgba alụkwaghịm na-enweghị ezi ihe kpatara ya asị. (Malakaị 2:16) Akụkọ ọzọ na-ekwu banyere di na nwunye na-akwa iko, na-ekwere na ndị mmụọ ozi na-ekiri ha n’obi aṅụrị ma gbaa ha gburugburu. Ma Bible na-ekwu, sị: “Gị akwala iko.”—Ọpụpụ 20:14.
Ọ̀ pụrụ ịbụ na ozi ndị a nke oge a na-etinye ihe ọhụrụ na Bible? Ee e, Okwu Chineke adịghị agbanwe agbanwe. Pọl onyeozi degaara ụfọdụ ndị na narị afọ mbụ akwụkwọ, sị: “Ọ na-eju m anya na unu na-esi n’aka Onye kpọrọ unu n’amara Kraịst gbabiga ọsọ ọsọ otú a n’ozi ọma dị iche; nke na-abụghị ozi ọma ọzọ: ọ bụ nanị na ụfọdụ dị ndị na-eme ka obi lọọ unu mmiri, ndị na-achọkwa ịtụgharị ozi ọma Kraịst. Ma a sịkwa na anyị onwe anyị, ma ọ bụ mmụọ ozi nke sitere n’eluigwe, ga-ezi unu ozi ọma ọzọ tụkwasị ozi ọma nke anyị ziri unu, ya bụrụ anathema.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Ndị Galetia 1:6-8.
“Ịkpọku Ndị Mmụọ Ozi Nile!”
Ànyị kwesịrị ịdị na-akpọku ndị mmụọ ozi maka enyemaka iji nagide nsogbu na ihe ize ndụ ndị dị ná ndụ? Nke a bụ isiokwu ọtụtụ akwụkwọ. E nwere ihe atụ abụọ. A na-ekwu na akwụkwọ bụ́ Ask Your Angels (Jụọ Ndị Mmụọ Ozi Gị) na-egosi ndị na-agụ ya ‘otú ha pụrụ isi nweta ike site n’ike ndị mmụọ ozi iji nwetaghachi mmetụta ha ndị miri emi na iji mezuo nzube ha.’ Akwụkwọ yiri ya bụ Calling All Angels!: 57 Ways to Invite an Angel Into Your Life (Ịkpọku Ndị Mmụọ Ozi Nile: Ụzọ 57 Isi kpọbata Mmụọ Ozi ná Ndụ Gị).
Otú ọ dị, ọ dịtụghị mgbe Bible gbara anyị ume ịkpọku ndị mmụọ ozi. Jisọs mere ka nke a doo anya n’ekpere nlereanya ahụ. O kwuru, sị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: Nna anyị Nke bi n’eluigwe, . . . ” (Matiu 6:9, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) N’otu aka ahụ, Pọl onyeozi dere, sị: “N’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.)—Ndị Filipaị 4:6.
N’aha Ndị Mmụọ Ozi
“Ọnọdụ ime mmụọ ọhụrụ” na-emesi ike ka a mụta aha ndị mmụọ ozi. Akwụkwọ ndị na-ewu ewu nwere aha ndị e chere na ha bụ aha ọtụtụ puku ndị mmụọ ozi. N’ihi gịnị? Ọ bụghị iji mejuo ọchịchọ efu nke ịmata ha; ọ bụ iji kpọọ ha. Nke a na majik nwere njikọ chiri anya. Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Angels na-ekwu na tinyere ememe ọgọ mmụọ, ọtụmọkpọ, na ịgba afa, “ịkpọ ‘aha nke ike,’ ma ọ bụ aha mmụọ ụfọdụ, na-akpata oké ịma jijiji nke na-emeghe ọnụ ụzọ dị n’etiti ógbè ndị mmadụ na ógbè ndị bụ́ mmụọ, na-enyere onye ahụ na-eme majik aka . . . isoro ndị bụ́ mmụọ kwurịta okwu.” Ma, Bible na-ekwu hoo haa, sị: “Gị emekwala majik.”—Levitikọs 19:26, NW.
Bible n’onwe ya kpughere nanị aha abụọ nke ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Maịkael na Gebriel. (Daniel 12:1; Luk 1:26) N’ikwu aha ndị a, Bible na-egosi na ndị mmụọ ozi bụ ndị mmụọ pụrụ iche. Gịnị mere na e kwughịkwa aha ndị ọzọ? O yiri ka ihe kpatara ya bụ iji mee ka ndị mmadụ ghara ibugo ndị mmụọ ozi n’ọnọdụ inye ha nsọpụrụ gabigara ókè—ihe ndị mmụọ ozi n’onwe ha na-adịghị anwa anwa achọ inweta. N’ihi ya, mgbe Jekọb gwara otu mmụọ ozi ka o kwuo aha ya, mmụọ ozi ahụ jụrụ. (Jenesis 32:29) Ka e mesịrị, mmụọ ozi ahụ Joshua hụrụ kọwara onwe ya ọ bụghị site n’ikwu aha ya kama dị ka “onyeisi usuu ndị agha Jehova.” (Joshua 5:14) N’otu aka ahụ, mgbe nna Samson jụrụ otu mmụọ ozi aha ya, ọ gwara ya, sị: “N’ihi gịnịkwa ka ị na-ajụ ajụjụ banyere aha m, ebe aha ahụ dị ebube?” (Ndị Ikpe 13:17, 18) Ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi nke Chineke chọrọ ka anyị na-asọpụrụ Chineke ma na-akpọku Ya, ọ bụghị ha.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nweta ihe ọmụma na-egosi ihe mere Bible ji bụrụ akwụkwọ a pụrụ ịdabere na ya, lee broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, bipụtara.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 16]
“Nye ndị na-eche na Chineke na iwu ya na-egbochi ha ime ihe, . . . ndị mmụọ ozi nke [Ọgbọ Ọhụrụ] bụ ndị ọ dị mfe ichigharịkwuru . . . bụ́ ndị nwere obiọma, na-adịghị ekpe mmadụ ikpe. Onye ọ bụla pụrụ inweta ha, dị ka a pụrụ inweta mkpụrụ ọgwụ aspirin.” —Magazin Time
[Igbe dị na peeji nke 15]
“Nzute Ndị E Zutere” Ndị Mmụọ Ozi na Ndị Si n’Ụwa Ọzọ
Ọtụtụ ndị taa na-ekwu na ha ahụwo ndị mmụọ ozi ma soro ha kwurịta okwu. Ndị ọzọ na-ekwu na ha ezutewo ndị si n’ụwa ọzọ. Akwụkwọ bụ́ Angels—An Endangered Species (Ndị Mmụọ Ozi—Ndị Na-adịwanye Ụkọ) depụtara myirịta dị n’etiti akụkọ abụọ a, na-ekwu na ha abụọ pụrụ inwe otu nkọwa.b Ihe ndị na-esonụ bụ nchịkọta nke ụfọdụ myirịta ndị e depụtara n’akwụkwọ ahụ.
1. Ma ndị mmụọ ozi ma ndị si n’ụwa ọzọ na-esi esi abịa.
2. Ha abụọ bụ ụdị ihe ndị dị ndụ dị elu n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụ n’ụzọ nkà na ụzụ.
3. Ụdị ndị nke nwere omume enyi na-eyi ndị ntorobịa ma maa mma ile anya, ha nwekwara obiọma ma jupụta n’ọmịiko.
4. Asụsụ adịghị enye ha abụọ nsogbu, ha na-ekwu okwu n’ụzọ a pụrụ ịghọta aghọta n’asụsụ nke onye na-ege ha ntị.
5. Ha abụọ bụcha ndị ọkà n’ife efe.
6. Ìhè na-enwu nke ọma na-esonyere ma ndị mmụọ ozi ma ndị si n’ụwa ọzọ ma ha pụta.
7. Ha abụọ na-ejizu ejiji ma ha pụta, ha na-eyikarị uwe mwụda ma ọ bụ uwe na-enweghị aka nke na-eru n’ikpere. Uwe na-acha ọcha ma ọ bụ nke na-acha anụnụ anụnụ kasị amasị ha.
8. Ha abụọ na ụmụ mmadụ na-ahakarị n’ogo.
9. Ha abụọ na-ekwupụta nchegbu ha nwere banyere ọnọdụ ọjọọ nke ihe a kpọrọ mmadụ na mbara ụwa.
10. Nnwapụta nke nzute e zutere ma ndị si n’ụwa ọzọ ma ndị mmụọ ozi bụ ihe àmà nke onye hụrụ ha nyere.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
b Nkọwa a na-enyekarị banyere ha abụọ bụ na ndị ajọ mmụọ, ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ bụ ndị na-akpata ọtụtụ “nzute” ndị dị otú ahụ. Dị ka Bible na-ekwu, “Setan onwe ya na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.” (2 Ndị Kọrint 11:14)—Lee Teta! (Bekee), July 8, 1996, peji nke 26.
[Foto dị na peeji nke 17]
Bible nwere ihe ndekọ bụ́ eziokwu nke ndị mmụọ ozi bịakwutere ndị mmadụ