Eziokwu Banyere Ndị Mmụọ Ozi
DỊ KA anyị hụworo, echiche na akụkọ zuru ebe nile banyere ndị mmụọ ozi adịghị ekwekọcha n’ihe Bible na-ezi. Ọ̀ dị ihe enweghị nkwekọ ahụ mere? Ọ̀ dị ihe ọjọọ ọ bụla dị n’ịnakwere nkwenkwe ọtụtụ ndị nwere banyere ndị mmụọ ozi? Eenụnụ.
Dị ka ihe atụ, tụlee àgwà ndị “ọnọdụ ime mmụọ ọhụrụ” na-akwalite. Akwụkwọ ndị nke oge a banyere ndị mmụọ ozi na-akwalite ịnakwere ihe n’ajụghị ase dị ka ụmụaka, ọ bụghị iji ikike iche echiche eme ihe. Ọ na-esi ike ha agbaa ndị na-agụ ha ume idozi nsogbu ha n’onwe ha ma ọ bụ ịchọ ịghọta Bible na ihe ọmụma nke Chineke. Akwụkwọ banyere ndị mmụọ ozi na-emesi anyị obi ike na mmụọ ozi nke dị nwayọọ ma na-ahụ n’anya na-anọ anyị n’akụkụ ka anyị na-adị ndụ nakwa na nsogbu adịghị, ebe ọ bụ na anyị bi na mbara ụwa dị mma bụ́ ebe ihe nile dịcha otú ha kwesịrị ịdị. Mgbe nsogbu bilitere, nanị ihe dị anyị mkpa ime bụ ichere ka ndị mmụọ ozi tinye aka na ya. Otú ọ dị, ya bụrụ otú ahụ ka ọ dị, gịnị mere Bible ji agwa anyị ka anyị “na-agbasi mgba ike n’ihi okwukwe ahụ”?—Jud 3.
Ọtụtụ akwụkwọ banyere ndị mmụọ ozi na-akwado nganga na okomoko nke mmadụ. Ha na-elekwasị anya nanị n’onwe ha. Dị ka akwụkwọ ndị dị otú ahụ si kwuo, ndị mmụọ ozi nke oge a chọrọ ka anyị mara otú anyị maruru ná mma ma na-egbukepụ egbukepụ. Ọ bụ ezie na ọ dị mma ka anyị nwee echiche ziri ezi banyere onwe anyị, ihe bụ́ isi nke “ọnọdụ ime mmụọ ọhụrụ” na-akwalite bụ ịhụ onwe anyị n’anya n’agbanyeghị ihe ọ ga-ewe. Otu onye dere akwụkwọ na-ekwu na iwu mbụ na nke kasịnụ bụ ‘ịhụ Onwe gị n’anya dị ka Onyenwenụ.’ Lee ka nke a si megide okwu Jisọs! O kwuru, sị: “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya. Nke a bụ ihe ukwu na ihe mbụ e nyere n’iwu.” (Matiu 22:36-39) Anyị ga-abụ ndị kasị nwee obi ụtọ ná ndụ ma ọ bụrụ na anyị buru ụzọ chọọ ọdịmma Chineke tupu nke anyị.
Iwere ndị mmụọ ozi dị ka ndị kasị mkpa na-emegide ezi Iso Ụzọ Kraịst. Pọl onyeozi katọrọ ofufe ndị mmụọ ozi. (Ndị Kọlọsi 2:18) Ife ofufe pụtara “ịsọpụrụ ma ọ bụ ịkwanyere ihe ùgwù nke ukwuu dị ka Chineke ma ọ bụ ike karịrị ike mmadụ.” Ma, ịsọpụrụ na ịkwanyere ndị mmụọ ozi ùgwù nke ukwuu bụ kpọmkwem ihe ọtụtụ akwụkwọ ndị a ma ama banyere ndị mmụọ ozi na-agba ndị na-agụ ha ume ime. Otú ọ dị, cheta ihe mere mgbe Setan gwara Jisọs ka ọ kpọọ isi ala otu ugboro nye ya. Jisọs zaghachiri, sị: “Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, ọ bụkwa nanị Ya ka ị ga-ekpere.” (Luk 4:8) N’oge ọzọ, mgbe Jọn onyeozi dara n’ala n’ihu otu mmụọ ozi, mmụọ ozi ahụ gwara ya, sị: “Lezie anya ka ị ghara ime ya: abụ m ohu ibe gị, bụrụkwa ohu ibe nke ụmụnna gị nke nwere àmà nke Jisọs: kpọọ isiala nye Chineke.”—Mkpughe 19:10.
Otú Ndị Mmụọ Ozi Pụrụ Isi Nyere Gị Aka
Onye a ga-ejekwuru maka nduzi na enyemaka bụ Chineke, ọ bụghị ndị mmụọ ozi. Ọ dị njikere ma nwee obi ụtọ igosi mmadụ nile na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume ya, ịhụnanya dị ukwuu. Jọn onyeozi degaara ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ, sị: “Nkwuwa okwu ahụ nke anyị nwere n’ebe Ọ nọ bụ nke a, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọ bụla dị ka ọchịchọ Ya si dị, Ọ na-anụ olu anyị: ọ bụrụkwa na anyị matara na Ọ na-anụ olu anyị n’ihe ọ bụla anyị na-arịọ, anyị matara na anyị nwere ihe arịrịọ ahụ anyị rịọworo n’aka Ya.”—1 Jọn 5:14, 15.
E nwere ọtụtụ ihe anyị na-amaghị banyere ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi nke Chineke. Otú ọ dị, anyị matara na ha na-ejere Chineke ozi, na-arụ ọrụ dị ka nzube na nduzi ya si dị. Ha na-anụ ọkụ n’obi ịkwalite eziokwu banyere Chineke. (Mkpughe 14:6, 7) Ha adịghị achọ ofufe anyị. Ebe ọ bụ na anyị apụghị ịhụ ha anya, anyị amaghị ókè Chineke na-ejiru ha eme ihe n’inyere ndị ya aka n’ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị. Ma anyị maara na Jehova Chineke na-echebe ma na-eduzi ndị ya dị ka otu ìgwè.
Lee ezi ihe nlereanya ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi na-esetịpụrụ anyị! Ha na-enye Chineke otuto. (Abụ Ọma 148:2) Ọ bụ ezie na ha nwere amamihe na ike ime mmụọ dị egwu, ha na-akwanyere ọbụbụeze Jehova ùgwù nke ukwuu. (Jud 9) Ha nwere mmasị dị ukwuu ná mmezu nke nzube Chineke. (1 Pita 1:11, 12) Ọ bụ n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, ka anyị na-amụta ihe ndị a. Ee, Bible bụ akwụkwọ na-agwa anyị eziokwu banyere ndị mmụọ ozi.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 20]
Ndị mmụọ ozi na-anụ ọkụ n’obi ịkwalite eziokwu banyere Chineke
[Foto dị na peeji nke 19]
Mgbe Jọn onyeozi nwara ife otu mmụọ ozi ofufe, mmụọ ozi ahụ kwuru, sị: ‘Emela ya’