Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 12/8 p. 21-23
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Nwee Omume Enyi Karị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú M Pụrụ Isi Nwee Omume Enyi Karị?
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kwụsị Iwetu Onwe Gị Ala
  • Nwee Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ
  • Ịhụnanya Na-akwalite Ya
  • Gịnị Mere Apụghị M Inwe Omume Enyi Karị?
    Teta!—1999
  • Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Ịna-eme Ihere?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Ụzọ Isi Mee Ka Nkà Inwe Mkparịta Ụka Ka Mma
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Onye M Ga-eṅomi—Lidia
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 12/8 p. 21-23

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Nwee Omume Enyi Karị?

“Ọ dịtụbeghị mgbe m nwere oké mmasị ná mkparịta ụka. Ana m eche na a ga-agbachi m nkịtị ma m kwuo okwu. Mama m bụ ezigbo onye ihere, echekwara m na ọ bụ ya mere m ji dị otú ahụ.”—Artie.

Ọ̀ NA-ADỊ gị mgbe ụfọdụ ka ya bụrụ na ị bụrughị onye ihere otú ị bụ—na i nwetụrụ omume enyi karị? Dị ka isiokwu anyị bu nke a ụzọ n’usoro isiokwu a kọwara, ihere bụ àgwà ọtụtụ ndị nwere.a Ya mere ọ dịchaghị ihe na-eme gị ma o yie ka ị dị nwayọọ, na-ekechi ihu, ma ọ bụ na-ejichi onwe gị ikwu okwu. Ma ihere gabigara ókè pụrụ ịbụ nsogbu n’ezie. Ọ dịkarịa ala, ọ pụrụ igbochi gị inweta ndị enyi. Ọ pụkwara ime ka o siere gị ike inwe ahụ iru ala ma ọ bụ ime ihe otú dị mma n’etiti ọha na eze.

Ọbụna ndị toworo eto na-alụso ihere ọgụ ọtụtụ mgbe. Barryb bụ okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst. Ma ọ na-emechikarị ọnụ ma ọ nọrọ n’etiti ìgwè mmadụ. Ọ na-ekweta, sị: “Ọ naghị adị m ka m nwere ikike ikwu ihe ọ bụla bara uru.” Nwunye ya, bụ́ Diane, nwere nsogbu yiri nke ahụ. Gịnị ka o ji gwọọ ya? Ọ na-ekwu, sị: “Ọ na-amasị m ịnọ n’etiti ndị nwere omume enyi n’ihi na ọ na-adị m ka ha pụrụ iweghara mkparịta ụka ahụ.” Olee ụzọ ụfọdụ ị ga-esi nwee omume enyi karị n’onwe gị?

Kwụsị Iwetu Onwe Gị Ala

Nke mbụ, ọ pụrụ ịdị gị mkpa ịtụleghachi ihe ị na-eche banyere onwe gị. Ị̀ na-ewetu onwe gị ala mgbe nile, na-agwa onwe gị na ndị ọzọ apụghị inwe mmasị n’ebe ị nọ ma ọ bụ na ọ dịghị ezigbo ihe i nwere ikwu? Inwe echiche na-ezighị ezi banyere onwe gị pụrụ nanị igbochi gị inwe omume enyi. E kwuwerị, Jisọs kwuru, sị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị”—ọ sịghị kama ịhụ onwe gị! (Matiu 19:19, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’ihi ya ọ dị mma ma kwesị ekwesị ịhụ onwe gị n’anya ruo n’ókè ezi uche dị na ya. Ọ pụrụ ime ka i nwee obi ike pụrụ ịdị gị mkpa iji gwa ndị ọzọ okwu.

Ọ bụrụ na ị na-enwe mmetụta nke abachaghị uru, ị pụrụ ịhụ ya dị ka ihe na-enye aka ịgụ isi nke 12, bụ́ “N’ihi Gịnị Ka Onwe M Na-ejighị Amasị M?,” dị n’akwụkwọ Questions Young People Ask—Answers That Work.c Ihe ọmụma ahụ pụrụ inyere gị aka ịhụ na i nwere ọtụtụ ihe ga-amasị ndị mmadụ. Leenụ, eziokwu ahụ bụ́ na ị bụ onye Kraịst na-egosi na Chineke hụrụ ihe dị mma n’ime gị! E kwuwerị, Jisọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m, ọ bụrụ na Nna Nke zitere m adọghị ya.”—Jọn 6:44.

Nwee Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ

Ilu 18:1 na-adọ aka ná ntị, sị: “Ọchịchọ nke ya onwe ya na-achọsi ike ka onye na-ekewapụ onwe ya na-achọ.” Ee, ọ bụrụ na i kewapụ onwe gị iche, o yikarịrị ka ị ga na-achọ ọdịmma nke nanị onwe gị. Ndị Filipaị 2:4 na-agba anyị ume ka anyị ‘ghara ile ihe nke aka anyị anya, kama ka anyị nile n’otu n’otu leekwa ihe nke mmadụ ibe anyị anya.’ Mgbe ị na-elekwasị anya n’ọdịmma na mkpa nke ndị ọzọ, ị gaghị enwekebe ahụ erughị ala. Ka ị na-echekwa banyere ndị ọzọ karị, otú ahụ ka o yikarịrị ka a ga-akpali gị ibute ụzọ n’ịchọ ịmara ha.

Were Lidia dị ka ihe atụ, bụ́ nwanyị e wewooro dị ka ihe nlereanya nke inwe omume enyi na ile ọbịa. Bible na-agwa anyị na mgbe ọ nụsịrị okwu Pọl onyeozi ma bụrụ onye e mere baptism, ọ rịọrọ Pọl na ndị ha na ya so, sị: “Ọ bụrụ na unu atụlewo na abụ m onye kwere n’Onyenwe anyị, batanụ n’ụlọ m.” (Ọrụ 16:11-15) Ọ bụ ezie na ọ dịbeghị anya ọ ghọrọ onye kwere ekwe, Lidia butere ụzọ n’ịmara ụmụnna ndị a—ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na a gọziri ya n’ụba n’ihi ya. Mgbe a tọhapụsịrị Pọl na Saịlas n’ụlọ mkpọrọ, olee ebe ha gara? Ọ dị mma ịmara na ha gaghachiri n’ụlọ Lidia!—Ọrụ 16:35-40.

N’otu aka ahụ, ị ga-ahụ na ihe ka n’ọtụtụ ndị ga-anabata mmasị ị na-egosi n’ebe ha nọ. Olee otú ị pụrụ isi malite nke a? Ndị a bụ aro ole na ole ga-enye aka.

● Malite nke nta nke nta. Inwe omume enyị apụtaghị ịbụ onye na-ekwu ọtụtụ okwu ma ọ bụ ịbụ onye na-eme ka ọha na eze hụ ya. Gbalịa ikwusara ndị mmadụ okwu otu otu. Ị pụrụ ime ya ihe mgbaru ọsọ gị ịmalite mkparịta ụka gị na otu onye ma ọ dịkarịa ala mgbe ọ bụla ị gara nzukọ ndị Kraịst. Gbalịa ịmụmụ ọnụ ọchị. Na-anwa ịdị na-ele onye ị na-agwa okwu anya n’ihu.

● Merie ihe mgbochi mbụ. ‘N’ụzọ dị aṅaa?’ ka ị pụrụ ịjụ. Ọ dị mma, ọ bụrụ n’ezie na i nwere mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ, ọ dịghị esikarị ike ịhụ ihe ndị ị ga-ekwu banyere ha. Otu onye ntorobịa na Spain aha ya bụ Jorge na-ekwu, sị: “Achọpụtawo m na nanị ịjụ ndị ọzọ otú ha dị ma ọ bụ ịjụ ha banyere ọrụ ha ga-enyere gị aka ịmata ha nke ọma karị.” Otu onye ntorobịa aha ya bụ Fred na-atụ aro, sị: “Ọ bụrụ na ị maghị ihe ị ga-ekwu, malite ịjụ ndị mmadụ ajụjụ.” Otú ọ dị, emela ka ndị mmadụ chee na ị na-agba ha ajụjụ. Ọ bụrụ na mmadụ eyie ka ọ chọghị ịza ajụjụ, gbalịa ịkọrọ ya ihe ụfọdụ banyere onwe gị.

Mary, bụ́ nne otu onye ntorobịa, na-ekwu, sị: “Achọpụtawo m na ụzọ kasị mma isi mee ka ahụ ruo ndị mmadụ ala bụ ime ka ha kwuo ihe banyere onwe ha.” Kate na-eto eto na-ekwukwa, sị: “Ịja ndị mmadụ mma banyere uwe ha ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ na-enye aka. Ị na-eme ka ha mara na e nwere mmasị n’ebe ha nọ.” Otú ọ dị, ka o si gị n’obi, zerekwa ịja mma efu. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:5) Ndị mmadụ n’ozuzu ha ga-anabata okwu dị mma sitere n’obi, e kwuru n’ụzọ obiọma.—Ilu 16:24.

● Bụrụ onye na-ege ntị nke ọma. “Bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu,” ka Bible na-ekwu. (Jemes 1:19) E kwuwerị, mkparịta ụka bụ ihe na-adị n’etiti mmadụ abụọ—ọ bụghị ihe otu onye nanị na-eme. N’ihi ya ọ bụrụ na o yie ka ị na-emetụ ihere ikwu okwu, nke a pụrụ n’ezie ịbara gị uru! Ndị mmadụ na-enwe mmasị n’ebe ndị na-ege ntị nke ọma nọ.

● Kere òkè. N’ịbụ onye mụtaworo nkà isoro otu onye kparịta ụka, sorozie ìgwè na-ekwurịta okwu. Ọzọkwa, nzukọ ndị Kraịst bụ ebe dị mma inweta nkà a. Mgbe ụfọdụ ụzọ kasị mfe isi soro ndị ọzọ na-enwe mkparịta ụka bụ isonye na nke maliteworo amalite. Otú ọ dị, nghọta na àgwà ọma dị mkpa na nke a. Etinyela ọnụ n’ụzọ na-adịghị mma ná nkwurịta okwu doro gị anya na a chọghị ka ndị ọzọ tinye ọnụ na ya. Ma mgbe o doro gị anya na otu ìgwè na-enwe mkparịta ụka nkịtị, gbalịa isonyere ha. Dị akọ; anapụla mmadụ okwu n’ọnụ ma chọọ iweghara mkparịta ụka ahụ. Gbalịa ige ntị ruo oge ụfọdụ. Ka ahụ na-eru gị ala, a pụrụ ịkpali gị ikwu ihe ole na ole.

● Atụla anya na ị ga-ekwutecha ihe nile. Mgbe ụfọdụ ndị ntorobịa na-echegbubiga onwe ha ókè banyere ikwuhie ihe. Otu nwa agbọghọ n’Itali nke aha ya bụ Elisa na-echeta, sị: “Ana m atụkarị egwu na ọ bụrụ na m kwuo okwu, agaghị m ekwuzi ya.” Otú ọ dị, Bible na-echetara anyị na anyị nile ezughị okè, ọ bụ ya mere na anyị apụghị ikwutecha ihe nile. (Ndị Rom 3:23; tulee Jemes 3:2.) Elisa na-ekwu, sị: “Echetara m na ndị a bụ ndị enyi m. N’ihi ya ha ga-aghọta ma ọ bụrụ na m kwuhie ihe.”

● Na-eme ihe ọchị. N’eziokwu, ikwuhie ọnụ na-eme ihere. Ma dị ka Fred na-ekwu, “ọ bụrụ na i mee nnọọ ka ahụ ruo gị ala ma chịa onwe gị ọchị, nke ahụ na-agafe n’oge na-adịghị anya. Ị ga-eme ka ihe na-abụghị ihe ghọọ ihe ma ị maa jijiji, nwee nkụda mmụọ, ma ọ bụ nchegbu.”

● Nwee ndidi. Ghọta na ọ bụghị mmadụ nile ga-azaghachi ozugbo ahụ. Mkparịta ụka ịkwụsịtụ apụtaghị na onye ahụ enweghị mmasị n’ebe ị nọ ma ọ bụ na i kwesịrị ịkwụsị ịgbalị ikwu okwu. Mgbe ụfọdụ ọ bụ nanị na ndị mmadụ enweghị ohere—ma ọ bụ ihere na-eme ha otú o si eme gị. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ọ pụrụ inye aka inyetụkwu onye ahụ oge ka ahụ ruo ya ala ikwusara gị okwu.

● Nwalee ikwusara ndị toworo eto okwu. Mgbe ụfọdụ ndị toro eto, nke ka nke ndị Kraịst tozuru okè, na-enwe nnọọ ọmịiko n’ahụ ndị ntorobịa na-alụso ihere ọgụ. N’ihi ya atụla egwu ịgbalị ịmalite mkparịta ụka gị na onye meworo okenye. Kate na-ekwu, sị: “Apụrụ m inwe ahụ iru ala mgbe mụ na ndị toro eto nọ n’ihi na amaara m na ndị toro eto agaghị enyochapụta ebe m na-emezighị, kwaa m emo, ma ọ bụ mee m akaje dị ka ndị ọgbọ m pụrụ ime m.”

Ịhụnanya Na-akwalite Ya

Ọ bụ ezie na aro ndị a pụrụ inye aka, ọ dịghị usoro dị mfe e ji emeri ime ihere. N’ikpeazụ, ọ bụghị okwu banyere inwe nnọọ nkà ma ọ bụ iji usoro ụfọdụ eme ihe. Ọ bụ ‘ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’ (Jemes 2:8) Ee, mụta ichebara ndị ọzọ echiche—karịsịa ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst. (Ndị Galetia 6:10) Ọ bụrụ na i nwere ezi ịhụnanya n’ime obi gị, ị ga-emeri egwu na ejighị onwe gị n’aka ma soro ndị ọzọ na-emekọrịta ihe. Dị ka Jisọs kwuru, “ọnụ site n’ihe nke obi nwebigara ókè na-ekwu okwu.”—Matiu 12:34.

Barry, bụ́ onye e kwuru okwu banyere ya ná mmalite, na-ekwu: “Ka m na-amata ndị ọzọ karị, otú ahụ ka ọ na-adịrị m mfe karị isoro ha kwurịta okwu.” Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ka ị na-agbalị inwe omume enyi karị, otú ahụ ka ọ ga-adịrị gị mfe karị. Ka ị na-enwetakwa ndị enyi ọhụrụ ma na-abụ onye ndị ọzọ na-enwe mmasị n’ebe ọ nọ karị, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-amata na ihe ndị si na ha pụta kwesịrị mgbalị i tinyere!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Gịnị Mere Apụghị M Inwe Omume Enyi Karị?” ná mbipụta anyị nke November 8, 1999.

b A gbanwewo aha ụfọdụ.

c Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 23]

Na-ebute ụzọ, na-esonyekwa ná mkparịta ụka!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya