Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g19 nke 3 p. 8-9
  • Ezinụlọ na Ndị Enyi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezinụlọ na Ndị Enyi
  • Teta!—2019
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NA-EME IHE GA-ABARA NDỊ ỌZỌ URU
  • SAA ANYA NÁ MMIRI HỌRỌ EZI NDỊ ENYI
  • IHE NDỊ ỌZỌ BAỊBỤL KWURU
  • Mmetụta Ọmịiko—Mkpịsị Ugodi nke Obiọma na Ọmịiko
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Na-eme Ebere
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Na-enwe Ọmịiko
    Teta!—2020
  • Chineke Ọ̀ Na-emetere Anyị Ebere?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2019
g19 nke 3 p. 8-9
Ebe otu ezinụlọ na ndị enyi ha na-ekpori ndụ

Ezinụlọ na Ndị Enyi

Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ha na ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha ịdị ná mma. Lee ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ka gị na ndị mmadụ na-adịkwu ná mma.

NA-EME IHE GA-ABARA NDỊ ỌZỌ URU

IHE BAỊBỤL KWURU: “Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.”—Ndị Filipaị 2:4.

IHE Ọ PỤTARA: Ọ bụrụ na mkpa anyị abụrụ otú anyị ga-esi meere ndị ọzọ ihe ọma kama ịbụ otú anyị ga-esi nweta ihe n’aka ha, ọ ga-eme ka anyị na ha na-adị ná mma. Ọ bụrụ na ị na-achọ naanị ihe ga-abara gị uru, ọ ga-emebi adịm ná mma gị na ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, di ma ọ bụ nwunye na-achọ naanị ihe ga-abara ya uru nwere ike malite ịgba n’èzí. Ihe ọzọ bụ na o nweghị onye ọ na-amasị ka ya na onye na-eji ihe o nwere ma ọ bụ ihe ọ ma na-etu ọnụ na-akpa. Ọ bụ ya mere otu akwụkwọ aha ya bụ The Road to Character ji kwuo, sị: “Ndị na-eche naanị banyere onwe ha ga-enwe ọtụtụ nsogbu.”

IHE I NWERE IKE IME:

  • Na-enyere ndị ọzọ aka. Ezi ndị enyi na-atụkwasị ibe ha obi ma na-adị njikere inyere ibe ha aka mgbe niile. Nchọpụta ụfọdụ e mere gosiri na ndị na-enyere ndị ọzọ aka anaghị adakarị mbà n’obi. Ọ na-eme ka obi sie ha ike na ha bara uru.

  • Ka ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ gị n’obi. Ihe banyere ndị ọzọ imetụ mmadụ n’obi pụtara onye ahụ inwe mwute n’ihi nsogbu ndị ọzọ na-enwe. Ọ bụrụ na ihe banyere onye ọzọ na-emetụ gị n’obi, ị gaghị na-agwa ya okwu ọjọọ n’ụdị njakịrị.

    Ọ bụrụ na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ gị n’obi, ị ga na-anabata ha. Ọ ga-emekwa ka ị ghara ịna-akpa ókè, meekwa ka ị na-emeta ndị ọzọ enyi n’agbanyeghị obodo ha si ma ọ bụ omenala ha.

  • Gị na ndị ọzọ na-anọrị. Anyị ga na-amatakwu ndị ọzọ nke ọma ma anyị na ha na-anọrị. Ị chọọ imeta ezi ndị enyi, na-ekwu gbasara ihe ndị na-amasị ha na ihe ndị dị ha mkpa. N’ihi ya, na-ege ntị nke ọma. Gosi na ihe na-echu enyi gị ụra, na-echukwa gị ụra. Nchọpụta e mere na nso nso a gosiri na “mmadụ na onye ọzọ ịkparịta ezigbo ụka na-eme ka ha nwee obi ụtọ.”

SAA ANYA NÁ MMIRI HỌRỌ EZI NDỊ ENYI

IHE BAỊBỤL KWURU: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.”—1 Ndị Kọrịnt 15:33.

IHE Ọ PỤTARA: Ndị gị na ha na-akpa nwere ike ime ka ị na-akpa àgwà ọma ma ọ bụ àgwà ọjọọ. Ndị na-amụ banyere àgwà mmadụ kwuru na onye ya na mmadụ na-akpa nwere ike ịgbanwe ọtụtụ ihe ná ndụ onye ahụ. Dị ka ihe atụ, ha kwuru na ọ bụrụ na gị na ndị na-ese sịga ma ọ bụ ndị chọrọ ịgba alụkwaghịm ana-akpa, i nwere ike ibidokwa sewe sịga ma ọ bụkwanụ chọọ ịgba alụkwaghịm.

IHE I NWERE IKE IME: Meta ndị na-akpa àgwà ndị na-amasị gị ma ọ bụ ndị nke ị chọrọ ịna-akpa enyi. Dị ka ihe atụ, gị na ndị dị akọ, ndị na-asọpụrụ ndị ọzọ, ndị na-emesapụ aka, na ndị na-ele ọbịa kwesịrị ịna-akpa.

IHE NDỊ ỌZỌ BAỊBỤL KWURU

Ebe otu nwaanyị na-egosi otu nwata nwaanyị vidio na-ekwu banyere Baịbụl

Lee vidio ndị na-ekwu banyere Baịbụl. Ha ga-enyere ndị di na nwunye, ndị na-eto eto, na ụmụntakịrị aka ịna-akpa àgwà ọma

ZERE ỊGWA NDỊ ỌZỌ OKWU ỌJỌỌ.

“E nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ.”—ILU 12:18.

NA-EMESAPỤ AKA.

“Mkpụrụ obi nke na-emesapụ aka ka a ga-eme ka ọ maa abụba.”—ILU 11:25.

NA-EMESO NDỊ ỌZỌ IHE OTÚ Ị GA-ACHỌ KA E SI MESOO GỊ.

“Ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.”—MATIU 7:12.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya