Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb21 Julaị p. 3
  • Na-eme Ebere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-eme Ebere
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmetụta Ọmịiko—Mkpịsị Ugodi nke Obiọma na Ọmịiko
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Chineke Ọ̀ Na-emetere Anyị Ebere?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
  • Na-enwe Ọmịiko
    Teta!—2020
  • Na-ajụ Ajụjụ
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
mwb21 Julaị p. 3

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA | MEE KA OZI ỌMA NA-ATỌKWU GỊ ỤTỌ

Na-eme Ebere

Onye na-eme ebere na-aghọta otú obi dị ndị ọzọ, ihe ha na-eche, ihe ndị ha ji kpọrọ ihe, na ihe ndị dị ha mkpa. Anyị metere ndị ọzọ ebere, ha ga-ama. Ọ bụrụ na ọ na-agụsi anyị agụụ ike inyere ndị ọzọ aka, ọ ga-eme ka anyị na-emere ha ebere. Anyị metere ndị anyị na-ezi ozi ọma ebere, ọ ga-egosi na anyị na-eṅomi ịhụnanya Jehova. Ọ ga-emekwa ka ha bịa fewe ya.—Fil. 2:4.

Ihe na-egosi ma ànyị na-emetere ndị ọzọ ebere bụ otú anyị si ege ha ntị, otú anyị si agwa ha okwu, otú anyị si akpa àgwà, na otú anyị si emegharị ahụ́ anyị na ihu anyị. Anyị kwesịrị igosi ha na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi. Anyị kwesịkwara ịchọpụta ihe ndị na-amasị ha, ihe ndị ha kweere, na ọnọdụ ha. Anyị ga na-akụziri ha ihe ma na-enyere ha aka. Ma, anyị agaghị amanye ha ịgbanwe. Ma ọ bụrụ na ha anabata enyemaka anyị, ọ na-eme ka anyị na-enwekwu ọṅụ n’ozi anyị.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-ENWE ỌṄỤ A NA-ENWE N’IHI IME NDỊ NA-ESO ỤZỌ—NA-EME KA OTÚ I SI EZI OZI ỌMA KA MMA—NA-EMETERE NDỊ Ị NA-AMỤRỤ IHE EBERE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Foto si na vidio bụ́ ‘Na-enwe Ọṅụ A Na-enwe N’ihi Ime Ndị Na-eso Ụzọ—Na-eme Ka Otú I Si Ezi Ozi Ọma Ka Mma—Na-emetere Ndị Ị Na-amụrụ Ihe Ebere.’ Mgbe Linda na Joy nọ n’ebe a na-ere kọfị, Joy ekwuo ihe mere ha agaghị amụli ihe ụbọchị ahụ.

    Olee otú Linda si metere Joy ebere mgbe Joy na-abịaghị n’oge?

  • Foto si na vidio bụ́ ‘Na-enwe Ọṅụ A Na-enwe N’ihi Ime Ndị Na-Eso Ụzọ—Na-eme Ka Otú I Si Ezi Ozi Ọma Ka Mma—Na-emetere Ndị Ị Na-amụrụ Ihe Ebere.’ Ebe Linda medara obi na-ege Joy ntị.

    Olee otú Linda si metere Joy ebere mgbe ike gwụrụ Joy ịmụ ihe?

  • Foto si na vidio bụ́ ‘Na-enwe Ọṅụ A Na-enwe N’ihi Ime Ndị Na-Eso Ụzọ—Na-eme Ka Otú I Si Ezi Ozi Ọma Ka Mma—Na-emetere Ndị Ị Na-amụrụ Ihe Ebere.’ Ebe Linda na-enyere Joy aka idozi ụlọ ya.

    Anyị metere ndị mmadụ ebere, ọ na-eme ka ha bịa fewe Jehova

    Olee otú Linda si metere Joy ebere mgbe Joy sị na ya amachaghị otú e si ahazị ihe nke ọma?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya