Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g22 nke 1 p. 4-6
  • 1 | Na-agba Mbọ Ka Ahụ́ Sie Gị Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 1 | Na-agba Mbọ Ka Ahụ́ Sie Gị Ike
  • Teta!—2022
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE O JI DỊ MKPA
  • Ihe I Kwesịrị Ịma
  • Ihe Ndị I Nwere Ike Ime Ugbu A
  • Ihe Ndị Ị Ga Na-eme Ka Ahụ́ Na-adị Gị Mma
    Teta!—2015
  • Ihe Anyị Ga-eme ma Ọrịa Bịa Anyị na Mberede
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Ụzọ Isi Chebe Ahụ Ike Gị
    Teta!—1999
  • Ahụ́ Ike
    Teta!—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2022
g22 nke 1 p. 4-6
Ebe e dowere nri dị iche iche na-edozi ahụ́ n’elu tebụl.

N’ỤWA A NSOGBU JURU

1 | Na-agba Mbọ Ka Ahụ́ Sie Gị Ike

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Nsogbu ma ọ bụ ọdachi na-akpa ndị mmadụ aka ọjọọ n’ụzọ dị iche iche. O nwedịrị ike ime ka ụfọdụ ndị rịawa ọrịa.

  • Nsogbu na-eme ka obi jọọ ndị mmadụ njọ. Ọ bụrụkwa na nsogbu ekweghị ala ala, o nwere ike ịkpatara ndị mmadụ ọrịa.

  • Ọdachi nwere ike ime ka o siere ndị na-arụ n’ụlọ ọgwụ ike inyere ndị mmadụ aka, meekwa ka ọgwụ kọọ ụkọ.

  • Ọdachi na-eme ka ego kọ ndị mmadụ, mee ka ha ghara ịkwụli ụgwọ ihe ndị dị ha mkpa, dị ka ezigbo nri ma ọ bụ ọgwụ.

Ihe I Kwesịrị Ịma

  • Ọ bụrụ na ọrịa arịasiwe gị ike, gị ana-echegbukwa onwe gị, o nwere ike ime ka ị ghara ịna-echezi echiche echezi. Ihe a nwekwara ike ime ka ị ghara ịna-eme ihe ndị ga-eme ka ahụ́ sie gị ike, ọrịa gị akazie njọ.

  • Ọ bụrụ na e nweghị ezigbo ihe i mere ma ọrịa rịawa gị, nke ka njọ nwedịrị ike ime.

  • Ọ bụrụ na ahụ́ siri gị ike, isi ga-akpakọ gị ọnụ ịma ihe i kwesịrị ime ma nsogbu bịa.

  • Ma ì nwere ego ma ị̀ dara ogbenye, e nwere ihe ndị i kwesịrị ịna-eme ka ahụ́ sie gị ike.

Ihe Ndị I Nwere Ike Ime Ugbu A

Onye ma ihe na-echebara ihe ndị nwere ike ịkpata nsogbu echiche, meekwa ihe ka o zere ha mgbe ọ bụla o kwere omume. Otú ahụ ka anyị kwesịkwara ime ma a bịa n’ihe ndị ga-eme ka ahụ́ sie anyị ike. Ọ bụrụ na ị na-edowe onwe gị na ụlọ gị ọcha, o nwere ike ị gaghị ebute ọrịa. I butegodị ya, o nwere ike ọ gaghị akpa gị aka ọjọọ. Mgbochi ọrịa dị mma karịa ọgwụgwọ ya.

“Ọ bụrụ na anyị ana-adị ọcha, na-emekwa ka ụlọ anyị na-adị ọcha, anyị agaghị na-echu ụlọ ọgwụ ka mmiri, anyị agaghịkwa na-emefusị ego n’ịzụ ọgwụ.”​—Andreas.a

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị na magazin a abụghị ezigbo aha ha.

OTÚ Ị GA-ESI DIE NSOGBU​—Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka

N’oge nsogbu, na-eme ihe ndị a ka ahụ́ sie gị ike

NA-EDOWE ONWE GỊ NA ỤLỌ GỊ ỌCHA

Ebe otu nwoke ji mmiri na ncha na-akwọ aka ya n’èzí.

Na-edowe onwe gị na ụlọ gị ọcha

Baịbụl sịrị: “Onye ma ihe hụ nsogbu, ọ na-aga zoo.” (Ilu 22:3) Gbalịa ka ị mata ihe ndị nwere ike ịkpatara gị ọrịa ma zere ha.

  • Jiri ncha na mmiri na-akwọ aka gị ugboro ugboro, karịchaa, tupu gị emetụ ihe oriri aka ma ọ bụ mgbe ị gachara mposi ma ọ bụ ịnyụ mamịrị.

  • Na-ehicha ụlọ gị ugboro ugboro ma jiri ihe ndị na-egbu nje na-ehicha ya, karịchaa, ebe ndị a na-emetụkarị aka.

  • Ọ bụrụ na o kwere omume, agala ndị na-arịa ọrịa na-efe efe oké nso.

NA-ERI NRI NDỊ NA-EDOZI AHỤ́

Ebe e dowere nri dị iche iche na-edozi ahụ́ n’elu tebụl.

Na-eri nri ndị na-edozi ahụ́

Baịbụl sịrị: “Ọ dịghị mmadụ ọ bụla kpọtụrụla ahụ́ ya asị, kama ọ na-azụ ahụ́ ya, na-elekọtakwa ya.” (Ndị Efesọs 5:29) Anyị na-egosi na anyị ejighị ahụ́ anyị egwu egwu ma anyị na-akpachapụ anya n’ihe anyị na-eri na ihe anyị na-aṅụ.

  • Na-aṅụ mmiri nke ọma.

  • Na-eri ụdị mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri dị iche iche.

  • Selata aka n’iri ihe nwere abụba ma ọ bụ ihe mmanụ, nnu, ma ọ bụ shuga juru.

  • Esela sịga, akpọla ụtaba, aṅụbigala mmanya ókè, aṅụkwala ọgwụ ike.

“Anyị na-agbalị eri ezigbo nri mgbe niile ka anyị ghara ịrịa ọrịa. Á sị na ọ bụghị ya, anyị gaarala emefusị ego anyị na-enweghị enwe n’ịzụ ọgwụ na ịkwụ ndị dọkịta ụgwọ. Ọ kaara anyị mma iji ego anyị zụta ezigbo nri rie.”​—Carlos.

NA-EMEGA AHỤ́, NA-EZUKWA EZIGBO IKE

Ebe otu nwoke na-agba ọsọ n’okporo ụzọ.

Na-emega ahụ́

Baịbụl sịrị: “Mmadụ izurutụ ike dị mma karịa mmadụ ịrụgbu onwe ya n’ọrụ na ịchụ ifufe.” (Ekliziastis 4:6) Anyị kwesịrị ịna-arụ ọrụ, ma anyị kwesịkwara ịna-ezu ike.

  • Na-emega ahụ́. Otú i nwere ike isi bido bụ ịna-eji ụkwụ agagharị ugboro ugboro. Imega ahụ́ nwere ike ime ka ahụ́ sikwuo gị ike, ọ bụrụgodị na i meela agadi ma ọ bụ na i nwere nkwarụ ma ọ bụkwanụ na ị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala.

  • Ebe otu nwaanyị na-ehitụ ụra.

    Na-ezu ike

    Na-ezu ezigbo ike. Ọ bụrụ na ị naghị ehi ụra otú i kwesịrị, ahụ́ agaghị na-eru gị ala, uche gị agaghịkwa na-adịkarị n’ihe ị na-eme. Ka oge na-aga, o nwere ike ime ka ị rịawa ezigbo ọrịa.

  • Kpebie oge kwesịrị ekwesị ị ga na-alaba ụra, gbalịakwa ka ị na-alaba mgbe ahụ. Ka oge i ji alaba ụra na oge i ji eteta bụrụ otu kwa ụbọchị.

  • Elela tiivi ma ọ bụ na-apị ekwentị gị ma i dinara ala ka i hie ụra.

  • Erila oké nri, aṅụla kọfị ma ọ bụ mmanya na-aba n’anya ma ị chọwa ihi ụra.

“Achọpụtara m na ehighị ụra nke ọma na-akpa ahụ́ m niile aka ọjọọ. Ọ bụrụ na ehighị m ụra nke ọma, isi na-awa m mgbe ụfọdụ, ahụ́ niile na-afụkwa m ụfụ. Ma, ọ bụrụ na mụ ehie ezigbo ụra, ahụ́ na-agbasi m ike. Ume na-eju m ahụ́, anaghịkwa m arịakarị ọrịa.”​—Justin.

Foto si na vidio bụ́ “Ihe I Nwere Ike Ime ma E Nwee Ọrịa Na-efe Efe.” Ebe otu nwaanyị mepere ọnụ ụzọ ya, nje abata.

MỤTAKWUO IHE NDỊ ỌZỌ. Lee vidio bụ́ Ihe I Nwere Ike Ime ma E Nwee Ọrịa Na-efe Efe. Gụọkwa isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Ị Ga Na-eme Ka Ahụ́ Na-adị Gị Mma.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya