Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g19 nke 3 p. 4-5
  • Ahụ́ Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ahụ́ Ike
  • Teta!—2019
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NA-ELEKỌTA ONWE GỊ NKE ỌMA
  • ZERE ÀGWÀ NDỊ NA-ADỊGHỊ MMA
  • IHE NDỊ ỌZỌ BAỊBỤL KWURU
  • 1 | Na-agba Mbọ Ka Ahụ́ Sie Gị Ike
    Teta!—2022
  • Nhọrọ Ndị Na-emetụta Ahụ́ Ike Gị
    Teta!—2003
  • Nke 5—Hụ na Gị na Ezinụlọ Gị Na-eme Ihe Ndị Unu Mụtara
    Teta!—2011
  • Na-ele Ahụ́ Ike Anya Otú Akwụkwọ Nsọ Si Ele Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2019
g19 nke 3 p. 4-5
Ebe otu nwoke na-eri akwụkwọ nri

Ahụ́ Ike

Baịbụl abụghị akwụkwọ ahụ́ ike. Ma, ihe ndị o kwuru na-enyere mmadụ aka inwe ezigbo ahụ́ ike. Lee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-eme ka mmadụ nwee ezigbo ahụ́ ike.

NA-ELEKỌTA ONWE GỊ NKE ỌMA

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ọ dịghị onye kpọtụworo anụ ahụ́ ya asị; kama ọ na-azụ ya, na-elekọtakwa ya.”—Ndị Efesọs 5:29.

IHE Ọ PỤTARA: Amaokwu Baịbụl a na-agba anyị ume ka anyị na-elekọta ahụ́ anyị nke ọma. Otu nchọpụta e mere gosiri na ihe na-akpata ọtụtụ ọrịa ndị mmadụ na-arịa bụ otú ha si ebi ndụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ ana-elekọta onwe ya nke ọma, ọ ga-eme ka o nwee ezigbo ahụ́ ike.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Nri. Na-eri nri ndị na-edozi ahụ́, na-aṅụkwa mmiri nke ọma.

  • Na-emega Ahụ́. Mmega ahụ́ ga-eme ka ahụ́ na-adị gị mma n’agbanyeghị afọ ole ị dị. Ọ sọgodị ya ya bụrụ na i nwere nkwarụ ma ọ bụ na ị na-arịa ọrịa, ọ ka ga-abara gị uru. Ndị ezinụlọ gị, ndị enyi gị, ma ọ bụkwanụ ndị na-ahụ banyere ahụ́ ike nwere ike ịgwa gị ka ị na-emega ahụ́. Ma, ọ bụ gịnwa ga-agba mbọ na-eme ya.

  • Na-ehi Ụra Nke Ọma. Ọ bụrụ na mmadụ anaghị ehi ụra nke ọma, o nwere ike ịda ọrịa. Ọtụtụ ndị anaghị ehi ụra nke ọma n’ihi ihe ndị ha kpebiri iji oge ha na-eme. Ma, ọ bụrụ na mmadụ ana-ehi ụra nke ọma, ọ ga na-enwe ezigbo ahụ́ ike.

ZERE ÀGWÀ NDỊ NA-ADỊGHỊ MMA

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ.”—2 Ndị Kọrịnt 7:1.

IHE Ọ PỤTARA: Ọ bụrụ na anyị ezere iji ihe ndị dị ka ụtaba ma ọ bụ sịga na-emebi ahụ́ anyị, anyị ga-enwe ezigbo ahụ́ ike. A ma ihe ndị a ama na ha na-akpata ọrịa na ọnwụ.

IHE I NWERE IKE IME: Họrọ ụbọchị ị ga-akwụsị ịṅụ sịga ma dee ya na kalenda gị. Ọ fọ ntakịrị ka ụbọchị ahụ ruo, tụfuo sịga niile i nwere, ihe ndị i ji etinye ha na ihe ndị ọzọ metụtara ya. Zere ịga n’ebe ndị na-aṅụ sịga na-anọ. Gwa ndị enyi gị ị tụkwasịrị obi banyere mkpebi gị.

IHE NDỊ ỌZỌ BAỊBỤL KWURU

Ebe otu nwoke na-agụ Baịbụl

Ị chọọ inweta Baịbụl, gwa Ndịàmà Jehova bi gị nso

ZERE IHE GA-EMERỤ GỊ NA NDỊ ỌZỌ AHỤ́.

“Ọ bụrụ na ị na-ewu ụlọ ọhụrụ, rụnye ihe nrụbichi n’elu ụlọ gị, ka i wee ghara ime ka ikpe ọbara ma ụlọ gị n’ihi na mmadụ nwere ike isi na ya dapụ.”—DIUTERỌNỌMI 22:8.

NA-ACHỊKWA IWE GỊ.

“Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ jupụtara ná nghọta, ma onye na-adịghị enwe ndidi na-ebuli nzuzu elu.”—ILU 14:29.

ZERE IRIBIGA NRI ÓKÈ.

“Anọla . . . n’etiti ndị na-eribiga anụ ókè.”—ILU 23:20.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya