Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g22 nke 1 p. 13-15
  • 4 | Na-enwe Olileanya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 4 | Na-enwe Olileanya
  • Teta!—2022
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE O JI DỊ MKPA
  • Ihe I Kwesịrị Ịma
  • Ihe Ndị I Nwere Ike Ime Ugbu A
  • Baịbụl Kwuru na Ihe Ga-adị Mma n’Ọdịnihu
  • Gịnị Ga-enyere M Aka Ịna-enwe Olileanya?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Baịbụl Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Baịbụl Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Malite Ịmụ Baịbụl
  • Ihe Ga-eme Ka I Nwee Olileanya n’Afọ 2024—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2022
g22 nke 1 p. 13-15
Baịbụl a sapere asape dị n’akụkụ ihe e tinyere okooko osisi.

N’ỤWA A NSOGBU JURU

4 | Na-enwe Olileanya

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Nsogbu ndị juru n’ụwa na-eme ka ndị mmadụ na-echegbu onwe ha. Nchegbu a nwere ike ịkpatara ha ọrịa, meekwa ka obi koro ha n’elu. Ọtụtụ ndị nsogbu ndị a kparala aka ọjọọ enweghị olileanya. Gịnịzi ka ihe ndị a kpataara ha?

  • Ụfọdụ n’ime ha anaghịdị achọ iche gbasara ọdịnihu.

  • Ndị ọzọ na-aṅụ oké mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike iji chefuo ụwa ha.

  • E nwere mmadụ ole na ole chere na ọnwụ kaara ha mma karịa ndụ. Ha na-ajụ, sị, “Oleezi ihe m nọ ndụ eme?”

Ihe I Kwesịrị Ịma

  • Nsogbu ụfọdụ i nwere ga-adị naanị obere oge, ihe nwekwara ike ịka mma mgbe ị na-atụghị anya ya.

  • Ọ bụrụgodị na nsogbu gị akwụsịghị, e nwere ihe ndị i nwere ike ịna-eme ga-enyere gị aka idi nsogbu gị.

  • Baịbụl kwuru na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu, na nsogbu niile ndị mmadụ nwere ga-ebi.

Ihe Ndị I Nwere Ike Ime Ugbu A

Baịbụl sịrị: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na a ga-enwe ihe unu ga-eche banyere ya echi. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuorola ya.”​—Matiu 6:34.

Echegbula onwe gị maka echi. Ekwela ka ihe ndị ga-eme echi chuwe gị ụra nke na ị gaghịzi emeli ihe ndị i kwesịrị ime taa.

Naanị ihe ichegbu onwe gị maka ihe ọjọọ ndị nwere ike ime ga-eme bụ ikowekwu gị obi n’elu, meekwa ka obi gharazie isi gị ike na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu.

OTÚ Ị GA-ESI DIE NSOGBU​—Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka

TINYERE ỤWA GỊ OBIỌMA

Ebe otu nwaanyị si na windo na-ele anya n’èzí, ihe o nwere jukwara ya afọ.

Baịbụl sịrị: “Ụbọchị niile na-abụrụ onye na-ata ahụhụ nsogbu nsogbu, ma onye obi na-adị mma na-enwe obi ụtọ mgbe niile.” (Ilu 15:15) Ọ bụrụ na i kwe ka nsogbu ndị i nwere na-eme gị obi ọjọọ mgbe niile, o nwere ike ime ka ị ghara ịhụ ihe ndị ga-enyere gị aka. Ma, ọ bụrụ na ị na-etinyere ụwa gị obiọma, o nwere ike inyere gị aka ịma otú ị ga-esi merie nsogbu gị.

  • Belata oge i ji ege akụkọ ụwa. Etinyekwala obi gị niile n’ihe ị na-anụ na ya.

  • Ná ngwụcha ụbọchị ọ bụla, dee ihe ọma abụọ ma ọ bụ atọ meere gị n’ụbọchị ahụ.

  • Dee ihe ndị ị ga-eme n’ụbọchị, ka ihe ndị ị ga-ede bụrụkwa ihe ị ga-emeli. Kebisịa ihe ndị ị chọrọ ime n’ụbọchị ntakịrị ntakịrị. Ọ ga-eme ka obi tọọ gị ụtọ maka ihe ọ bụla i mechara n’ụbọchị ọ bụla.

KWE KA E NYERE GỊ AKA

Ebe otu agadi nwoke na-akasi nwoke ọzọ obi.

Baịbụl sịrị: ‘Onye na-anọ iche anaghị anabata ezigbo amamihe.’ (Ilu 18:1) Ị gaghị apụtali n’olulu dị omimi n’onwe gị. Ma, ị ga-apụtali ma onye ọzọ nyere gị aka.

  • Gwa ndị ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị enyi gị ka ha nyere gị aka.

  • Na-agbalịkwa ka ị chọta otú gịnwa ga-esi enyere ha aka. Imere ndị ọzọ ihe ọma ga-eme ka ị ghara ịna-echekarị gbasara nsogbu nke gị.

  • Ọ bụrụ na obi adaa gị mbà, gị ana-echekwa na ndụ ị dị enweghịzi isi, ọ ga-adị mma ka ị gaa ụlọ ọgwụ. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ ọrịa na-akpata ya. E nyerela ọtụtụ ndị ọ dị otú a aka mgbe ha gara ụlọ ọgwụ.a

a Teta! anaghị agwa mmadụ otú ọ ga-ahọrọ ka e si gwọọ ya.

Baịbụl Kwuru na Ihe Ga-adị Mma n’Ọdịnihu

Otu ọbụ abụ nke dịrị ndụ n’oge ochie sịrị: “Okwu gị bụ ọkụ m ji ahụ ebe m na-azọnye ụkwụ, bụrụkwa ìhè nke na-enwu n’ụzọ m.” (Abụ Ọma 119:105) Ka anyị hụ otú Baịbụl, bụ́ Okwu Chineke, si bụrụ ọkụ na ìhè.

N’abalị, ọ bụ ọkụ na-eme ka anyị hụ ebe anyị ga-azọnye ụkwụ. Baịbụl na-emekwara anyị ihe yiri ya. Ọ na-enye anyị ezigbo ndụmọdụ ga-enyere anyị aka mgbe ọ na-esiri anyị ike ikpebi ihe anyị ga-eme.

Ìhè na-eme ka anyị hụ ihe ndị dị anya dị anyị n’ihu. Otú ahụ ka Baịbụl na-emekwa ka anyị mata ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.

Ihe Akwụkwọ Nsọ bụ́ Baịbụl kọọrọ anyị abụghị naanị otú ụmụ mmadụ si malite, kama ọ kọkwaara anyị ihe ndị ga-eme ka anyị nwee ezigbo olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Ọ kọwaara anyị ihe ndị a:

Otú ahụhụ si malite: Baịbụl sịrị na “mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.”​—Ndị Rom 5:12.

Ihe mere ọchịchị ụmụ mmadụ enweghị ike ime ka nsogbu anyị kwụsị: Baịbụl sịrị na ‘mmadụ enweghị ikike iduzi nzọụkwụ ya mgbe ọ na-eje ije.’ (Jeremaya 10:23) Nsogbu ndị juru n’ụwa gosiri na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu.

Ihe Chineke ga-eme ka nsogbu ụmụ mmadụ kwụsị: Baịbụl kwuru na “ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị ha n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.”​—Mkpughe 21:4.

Foto si na vidio bụ́ “Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?” Ebe otu nwaanyị na-akọrọ di ya ihe ọ gụtara na Baịbụl.

MỤTAKWUO IHE NDỊ ỌZỌ. Lee vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya