Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 180
  • Gịnị Ga-enyere M Aka Ịna-enwe Olileanya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ga-enyere M Aka Ịna-enwe Olileanya?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Olee otú Baịbụl si eme ka anyị nwee olileanya?
  • Olileanya gịnị ka Baịbụl gwara ụmụ mmadụ ka ha nwee?
  • Mee Ka Olileanya Gị Na-esikwu Ike
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ihe Mere Anyị Ga-eji Nwee Olileanya n’Afọ 2023—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Na-ele Anya Jehova Ma Nwee Obi Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Olee Ebe Ị Pụrụ Inweta Olileanya Bụ́ Ezigbo Ya?
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 180
Ebe otu nwaanyị na-ele mbara ígwé na oké osimiri otú gosiri na o nwere olileanya.

Gịnị Ga-enyere M Aka Ịna-enwe Olileanya?

Ihe Baịbụl kwuru

Baịbụl kwuru na Chineke ‘chọrọ ka ihe dịrị anyị ná mma n’ọdịnihu nakwa ka anyị nwee olileanya.’a (Jeremaya 29:11) N’eziokwu, otu n’ime ihe mere Chineke ji nye anyị Baịbụl bụ ka “nkasi obi anyị na-enweta n’Akwụkwọ Nsọ wee mee ka anyị nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) Isiokwu a ga-eme ka anyị mata na ihe bara uru Baịbụl na-agwa anyị ga-enyere anyị aka ịna-emeri nsogbu anyị na-enwe kwa ụbọchị. Nkwa ndị dị na ya na-emekwa ka anyị nwee nchekwube na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.

Ihe ndị e kwuru gbasara ha n’isiokwu a

  • Olee otú Baịbụl si eme ka anyị nwee olileanya?

  • Olileanya gịnị ka Baịbụl gwara ụmụ mmadụ ka ha nwee?

  • Amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere anyị aka inwe olileanya

Olee otú Baịbụl si eme ka anyị nwee olileanya?

Baịbụl gwara anyị ihe ndị anyị ga-eme ka ndụ anyị nwee ike ịka mma. O si otú a eme ka anyị nwee olileanya. Ka anyị kwuo ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ ọ gwara anyị.

  • Kwe ka Baịbụl na-eduzi gị. Abụ Ọma 119:105 kwuru, sị: “Okwu gị bụ ọkụ m ji ahụ ebe m na-azọnye ụkwụ.” Ọkụ na-enwusi ike nwere ike ime ụzọ ihe abụọ. O nwere ike ime ka anyị hụ ihe dị gburugburu anyị, meekwa ka anyị hụ ihe dị ebe dịtụ anya. Otú ahụkwa ka ọ dị Baịbụl, ihe ndị o kwuru nwere ike inyere anyị aka imeri nsogbu ndị anyị nwere ugbu a, nke ga-emezi ka anyị na-enwe olileanya kwa ụbọchị na ihe ga-aka mma. Ihe ndị Baịbụl kwuru ga-emeli ka anyị nweghachi ume ma mee ‘ka obi anyị ṅụrịa ọṅụ.’ (Abụ Ọma 19:7, 8) Baịbụl na-emekwa ka anyị mara ihe magburu onwe ya Chineke bu n’obi ime n’ọdịnihu gbasara ụmụ mmadụ na ụwa. Ihe a anyị nwere olileanya ya nwere ike ime ka anyị na-enwe ọṅụ mgbe niile, obi eruokwa anyị ala.

  • Kwe ka ndị ọzọ nyere gị aka. Ihe siere anyị ezigbo ike, o nwere ike ịdị anyị ka ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị hapụ anyị ka anyị nọọrọ onwe anyị. Baịbụl gwara anyị na anyị ekwesịghị ime otú ahụ, maka na o nwere ike ime ka anyị mee ihe na-abaghị uru. (Ilu 18:1) Ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị nwere ike inyere anyị aka ịna-eche echiche nke ọma. Ha nwekwara ike ịtụrụ anyị aro nwere ike inyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme gbasara nsogbu anyị. (Ilu 11:14) Ọ bụrụgodị na e nweghị ihe ọzọ ha meere anyị, ha ga-akasi anyị obi ma gbaa anyị ume, si otú ahụ mee ka anyị nwee ike ịna-atachi obi ruo mgbe ihe ga-aka mma.​—Ilu 12:25.

  • Kọọrọ Chineke nsogbu gị n’ekpere. Baịbụl kwuru, sị: “Bunye Jehova ibu na-anyịgbu gị. Ọ ga-enyere gị aka. E nweghị mgbe ọ ga-ahapụ onye ezi omume ka ọ daa.”b (Abụ Ọma 55:22) Ọ dabara adaba na a kpọrọ Jehova “onye na-eme ka anyị nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:13) I nwere ike ịkọrọ ya ‘ihe niile na-echegbu gị,’ maka na ị ma na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi. (1 Pita 5:7) Baịbụl kwudịrị, sị: “Ọ ga-eme ka [ị] kwụsie ike. Ọ ga-eme ka [i] sie ike, meekwa ka [ị] kwụrụ chịm.”​—1 Pita 5:10.

  • Kwe ka nsogbu ndị bịaara gị mee ka olileanya gị sikwuo ike. Baịbụl kwuru, sị: “obi ga-eru onye na-ege [Chineke] ntị ala. Ụjọ ọdachi agaghịkwa atụ ya.” (Ilu 1:33) Ọtụtụ ihe otu nwaanyị bi n’Ọstrelia aha ya bụ Margaret nwere funahụrụ ya mgbe ajọ ifufe mebiri ụlọ ya. Ma, ihe a emeghị ka ike ụwa gwụ ya, kama, o si na ya mụta otu ihe bara uru, ya bụ, na ihe niile mmadụ nwere nwere ike ịla n’iyi n’otu ntabi anya. Mgbe ihe ahụ mechara, o kpebisikwuru ike iji ihe ndị ka mkpa kpọrọ ihe, ya bụ, ndị ezinụlọ na ndị enyi ya, adịm ná mma ya na Chineke, na ihe ndị na-eme ka e nwee olileanya Baịbụl kwuru.​—Abụ Ọma 37:34; Jems 4:8.

Olileanya gịnị ka Baịbụl gwara ụmụ mmadụ ka ha nwee?

Baịbụl kwuru na ihe ga-adịrị ụmụ mmadụ mma n’ụwa a n’ọdịnihu. Oge ihe a ga-eme eruokwala eruo. N’eziokwu, nsogbu ndị na-ezoro ụmụ mmadụ ka mmiri taa na-egosi na oge anyị bi na ya ugbu a n’ụwa bụ “oge ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5) N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ka ihe niile na-eme n’ụwa dịrị ya n’aka, meekwa ka mmegbu na ịta ahụhụ kwụsị. Ọ ga-eji Alaeze Chineke, bụ́ ọchịchị ga na-achị ụwa niile, mee ya. (Daniel 2:44; Mkpughe 11:15) Ọ bụ ọchịchị a ga-esi n’eluigwe na-achị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ kụziiri anyị ka anyị n’ekpere ekpere, sị: “Ka Alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa.”​—Matiu 6:9, 10.

Baịbụl kwuru hoo haa ihe Chineke bu n’obi banyere ụmụ mmadụ. Legodị ụfọdụ nsogbu ndị Alaeze Chineke ga-akwụsị:

  • Ụkọ nri agaghịzi adị. “Ala ga-emepụta nri nke ọma.”​—Abụ Ọma 67:6.

  • Ọrịa agaghịzi adị. “O nweghị onye bi n’ala a ga-asị: ‘Ahụ́ adịghị m.’”​—Aịzaya 33:24.

  • Ọnwụ agaghịzi adị. Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị [ụmụ mmadụ] n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị. Ihe mbụ niile agafeela.”​—Mkpughe 21:3, 4.

a Olileanya bụ obi isi anyị ike na anyị ga-enwetali ihe na-agụ anyị agụụ. O nwekwara ike ịbụ ihe anyị na-atụ anya na ọ ga-eme ma ọ bụ ihe anyị na-atụ anya inweta.

b Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.​—Abụ Ọma 83:18.

Amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere anyị aka inwe olileanya

Job 5:16: “Ka onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya nwee olileanya.”

Ihe ọ pụtara: Obi kwesịrị isi onye ọ bụla na-eche na e nweghị ihe e ji ya kpọrọ n’ụwa taa ike na Chineke ga-enyere ya aka ma ọ kpọkuo ya.

Abụ Ọma 27:14: “Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ. Nwee obi ike, ka obi siekwa gị ike. Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ.”

Ihe ọ pụtara: Ọ bụrụ na anyị tụkwasị Jehova obi, anyị ga-enweta ume, obi esiekwa anyị ike. Ọ gaghị agbahapụ ndị tụkwasịrị ya obi.

Abụ Ọma 62:5: “M nwere ndidi, na-echere Chineke, n’ihi na ọ bụ ya na-eme ka m nwee olileanya.”

Ihe ọ pụtara: Obi kwesịrị isi ndị tụkwasịrị Chineke obi ma nwee ndidi ka ha na-edi nsogbu dị iche iche ike na Chineke ga-akwụsị nsogbu ha n’oge kwesịrị ekwesị.

Ilu 20:22: “Asịla: ‘M ga-emegwara ihe ọjọọ e mere m.’ Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ, ọ ga-azọpụta gị.”

Ihe ọ pụtara: Mmadụ mejọọ anyị ma ọ bụ kpasuo anyị iwe, anyị agaghị achọwa imegwara ya ma ọ bụrụ na anyị enwee olileanya n’ebe Jehova nọ. Ọ dị ike, ọ na-agụkwa ya agụụ ịnapụta anyị nakwa imezi ihe niile nsogbu kpataara anyị.

Ndị Hibru 6:19: “Olileanya [Ndị Kraịst] anyị nwere ji ndụ anyị otú nko e ji ejide ụgbọ mmiri si ejide ụgbọ mmiri. O siri ike, e jikwa ya n’aka.”

Ihe ọ pụtara: Otú ahụ nko si eme ka ụgbọ mmiri kwụrụ chịm mgbe ifufe na-efe ka olileanya e ji n’aka anyị nwere na Chineke ga-akwụ anyị ụgwọ si eme ka anyị belata ichegbu onwe anyị, meekwa ka obi ruo anyị ala, isi akpakọọ anyị ọnụ, okwukwe anyị esiekwa ike. Olileanya na-emekwa ka anyị nwee ike idi nsogbu ndị na-abịara anyị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya