Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g23 nke 1 p. 12-14
  • Ikuku

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikuku
  • Teta!—2023
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndị Na-emebi Ikuku
  • E Kere Ụwa Anyị A Ka Ọ Dịgide
  • Ihe Ndị Mmadụ Na-eme Ka Nsogbu A Kwụsị
  • Ihe Mere Obi Ga-eji Sie Anyị Ike​—Ihe Baịbụl Kwuru
  • Ewo, Ka M Kurutụ Ikuku Dị Ọcha!
    Teta!—1996
Teta!—2023
g23 nke 1 p. 12-14
Ebe otu di na nwunye na-aga ná mkpọda ugwu snoo kpuchiri. Ha na-ekiri ọdọ mmiri ugwu gbara gburugburu. Ọhịa tojuru n’ugwu ndị ahụ, ihu eluigwe gbachapụkwara agbachapụ.

ỤWA ANYỊ A Ọ̀ GA-ADỊGIDE?

IKUKU

IKUKU dị anyị mkpa, mana ọ bụghị naanị ka anyị nwee ike ịna-eku ume. Ikuku na-eme ka okpomọkụ na-esi n’anyanwụ apụta ghara imerụ anyị ahụ́. Ọ bụrụ na ikuku adịghị, ụwa anyị ga-ajụ ezigbo oyi, kpụkọtakwa.

Ihe Ndị Na-emebi Ikuku

Mmebi e ji anwụrụ ọkụ na ihe ndị ọzọ emebi ikuku nwere ike ime ka a ghara inwe ihe ndị dị ndụ n’ụwa. Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na e kee mmadụ niile nọ n’ụwa ụzọ otu narị (100), naanị otu ụzọ n’ime ha na-ekuru ezigbo ikuku.

E kwuola na ọ bụ mmebi a na-emebi ikuku na-akpata ọrịa na-eme ka mmadụ ghara iku ume nke ọma, ọrịa kansa akpa ume, na ọrịa obi. Ikuru ikuku na-adịghị mma na-eme ka ihe dị ka nde mmadụ asaa (7,000,000) nwụchuo ọnwụ kwa afọ.

E Kere Ụwa Anyị A Ka Ọ Dịgide

E kere ụwa anyị a ka o nwee ike iji aka ya na-emepụta ezigbo ikuku ga-ezuru ihe ọ bụla na-eku ume. Ma naanị mgbe ọ ga-emeli ihe a bụ ma ọ bụrụ na ụmụ mmadụ anaghị emebi ụwa anyị a gafee ókè. Legodị ihe atụ ole na ole.

  • O doro onye ọ bụla anya na oké ọhịa na-esi n’ikuku amịkọrọ kabọn dayọgzaịd (carbon dioxide). Mana, ọtụtụ ndị amaghị na ala mmiri ndị dị n’akụkụ osimiri, nke osisi juru na ha, na-eme ihe a karịadị oké ọhịa. Osisi ndị ahụ na-akpa ezigbo ike n’isi n’ikuku ewepụ kabọn dayọgzaịd. Ha nwere ike iwepụ ya okpukpu ise karịadị otú oké ọhịa na-eme.

  • Nchọpụta ndị e mere na nso nso a gosiri na ahịhịa ụfọdụ na-eto ná mmiri, dị ka nke a na-akpọ kelp, na-amịkọrọ kabọn dayọgzaịd dị n’ikuku. Ahịhịa kelp na-enwe ụmụ obere oghere ikuku na-adị n’ime ha nke na-eme ka ha na-ese n’elu mmiri ruo n’ebe dị ezigbo anya. Ha si n’akụkụ osimiri ruo n’ime osimiri, oghere ndị ahụ na-agbawa. Ahịhịa kelp eburuzie kabọn ndị ahụ ọ mịkọọrọ gbadaa n’ala oké osimiri. Ọ ga-abụ na ha na-anọ ebe ahụ ruo ọtụtụ narị afọ.

  • Ihe ndị mere mgbe e tiri iwu onye apụtala èzí n’oge ọrịa koronavaịrọs gosiri na ikuku anyị nwere ike ịdịghachi mma ma e mebie ya. N’afọ 2020, mgbe ọtụtụ ụlọ ọrụ kwụsịrị ịrụ ọrụ, ọtụtụ ụgbọala akwụsịkwa ịgba, nke mere ka ọ fọ obere ka anwụrụ ọkụ niile ha na-ewepụta kwụsị, ikuku ndị mmadụ na-ekuru bịaziri ka mma. N’afọ ahụkwa, otu nchọpụta e mere gbasara ikuku kwuru na e kee mba ndị e mere nchọpụta ahụ na ha ụzọ iri, ụzọ asatọ sịrị na a malitere inwe ikuku ka mma obere oge e tichara iwu onye apụtala èzí.

    Ị̀ MAARA?

    Ikuku Anyị Ga-ejili Aka Ya Dịghachi Mma

    Chaatị na-egosi otú ihe ndị na-emebi ikuku si ju n’ikuku na Niu Deli dị n’India. Otú ha si ju n’ikuku na Jenụwarị afọ 2020 nwere ike ịkpatara onye ọ bụla ọrịa. Ma, ha belatara n’Ọgọst afọ 2020.

    N’oge e tiri iwu onye apụtala èzí n’ihi ọrịa koronavaịrọs, ọtụtụ ụlọ ọrụ kwụsịrị ịrụ ọrụ, ọtụtụ ụgbọala akwụsịkwa ịgba. Ihe a mere ka mmebi a na-emebi ikuku belata na Niu Deli dị n’India. Ụmụ irighiri ihe na-emebi ikuku ejughịzi n’ikuku otú ha juru na mbụ. Ụmụ irighiri ihe ndị ahụ nwere ike ịkpata ọrịa na-eme ka mmadụ ghara iku ume nke ọma na ajọ ọrịa ndị ọzọ. Ikuku a dịtụ mma adịteghị aka. Ma, o gosiri na ikuku ga-ejili aka ya dịghachi mma ozugbo a kwụsịrị imetọ ya.

    Ná ngwụcha afọ 2019, a naghị ahụcha ụzọ nke ọma na Niu Deli dị n’India n’ihi otú ihe ndị na-emebi ikuku si ju n’ikuku.

    © Amit kg/Shutterstock

    Ngwụcha afọ 2019

    N’oge e tiri iwu onye apụtala èzí n’ihi ọrịa koronavaịrọs, a na-ahụ ụzọ nke ọma na Niu Deli dị n’India n’ihi na mmebi a na-emebi ikuku belatara.

    © Volobotti/Shutterstock

    Oge e tiri iwu onye apụla èzí

Ihe Ndị Mmadụ Na-eme Ka Nsogbu A Kwụsị

Ebe otu nwoke na-adọsa ígwè ya mgbe o ruru n’ebe ọ na-arụ ọrụ.

Iji ígwè aga ọrụ ma ọ bụ aga akwụkwọ nwere ike ime ka mmebi a na-emebi ikuku belata

Ndị ọchịchị ka na-agwa ụlọ ọrụ dị iche iche ka ha belata otú ha si emebi ikuku. Ndị ọkà mmụta sayensị ka na-achọpụta ụzọ ọhụrụ ha ga-esi eme ka e dozie nsogbu mmebi a na-emebi ikuku kpatarala. Dị ka ihe atụ, a na-eme ka ụmụ irighiri ihe dị ndụ mikọrọ ikuku ọjọọ ndị ahụ, wepụtazie ikuku ọma. Ndị ọkachamara na-agwakwa ndị mmadụ ka ha jiri ụkwụ ma ọ bụ ígwè na-aga ebe ndị ha chọrọ ịga kama iji ụgbọala, nakwa ka ha belata ihe ndị na-akwụ anwụrụ ọkụ n’ụlọ ha.

Ebe otu nwaanyị nọ ọdụ n’ala na-esi nri n’ụlọ ya nke na-amachaghị oké mma. Ekwú o ji na-esi nri abụghị nke ndị oké ozu, ma ọ naghị akwụ oké anwụrụ ọkụ.

Gọọmentị obodo ụfọdụ na-enye ndị ha na-achị ekwú ọgbara ọhụrụ na-anaghị akwụ oké anwụrụ ọkụ. Ma n’ọtụtụ obodo, ndị mmadụ enwebeghị ụdị ekwú a

Ma, akụkọ ụlọ ọrụ dị ná mba dị iche iche jikọtara aka wepụta n’afọ 2022, nke Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike na Ụlọ Akụ Ụwa so wepụta, gosiri na a ka kwesịrị imekwu ihe.

Akụkọ ahụ kwuru na n’afọ 2020, ihe otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ndị bi n’ụwa na-ejikarị esi nri bụ ihe ndị na-emebi ikuku. N’ọtụtụ ebe, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole nwere ike ịzụta ihe ọgbara ọhụrụ ndị e ji esi nri.

Ihe Mere Obi Ga-eji Sie Anyị Ike​—Ihe Baịbụl Kwuru

“Jehova bụ ezi Chineke, Onye kere eluigwe . . . Ọ bụ ya kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya. Ọ bụ ya na-eme ka ndị mmadụ na-eku ume.​—Aịzaya 42:5.

Ọ bụ Chineke kere ikuku anyị na-ekuru, keekwa ya otú ọ ga na-eji aka ya na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha. Ike Chineke enweghị nsọtụ, ọ hụkwara ụmụ mmadụ n’anya. N’ihi ya, ọ̀ bụ na i cheghị na ọ ga-eme ka mmebi a na-emebi ikuku kwụsị? Gụọ isiokwu bụ́ “Chineke Kwere Nkwa na Ụwa Anyị A Ga-adịgide.”

MỤTAKWUO IHE NDỊ ỌZỌ

Otú ụwa dị ma e si na mbara igwe lee ya anya.

Olee otú ikuku si malite ịdị? Lee vidio bụ́ È Kere Eluigwe na Ụwa Eke? Ọ dị na jw.org.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya