Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 17
  • Ụmụ Ejima Ndị Na-eyighị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụmụ Ejima Ndị Na-eyighị
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jekọb Ketara Ihe A Na-ekenye Ọkpara
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Jekọb na Ịsọ Kpeziri
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Na-ekpebi Ime Ihe Ziri Ezi Ka I Nwee Ike Ijidesi Ihe Nketa Gị Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 17
Mgbe Jekọb ka dị obere, ya ana-elekọta atụrụ

AKỤKỌ NKE 17

Ụmụ Ejima Ndị Na-eyighị

ỤMỤNTAKỊRỊ nwoke abụọ ndị a eyighị, ọ́ bụghị ya? Ị̀ ma aha ha? Nke na-achụ nta bụ Ịsọ, ebe nke na-azụ atụrụ bụ Jekọb.

Ịsọ na Jekọb bụ ụmụ ejima ndị Aịzik na Ribeka mụtara. Nna ha, bụ́ Aịzik, hụrụ Ịsọ n’anya nke ukwuu n’ihi na ọ bụ ezigbo ọchụnta, na-ewelatara ezinụlọ ha ihe oriri. Ma Ribeka hụrụ Jekọb n’anya karịsịa n’ihi na ọ bụ nwata dị nwayọọ, na-emekwa udo.

Ebe Ịsọ na-agba ụta na akụ́ mgbe ọ ka dị obere

Nna nna ha bụ́ Ebreham ka nọ ndụ, ọ ga-abụkwa na Jekọb na-enwe mmasị ige ya ntị mgbe ọ na-agwa ha banyere Jehova. Ebreham mesịrị nwụọ mgbe ọ gbara otu narị afọ na afọ iri asaa na ise, bụ́ mgbe ụmụ ejima ahụ gbara afọ iri na ise.

Mgbe Ịsọ gbara afọ iri anọ, ọ lụụrụ ndị inyom abụọ n’ala Kenan. Nke a wutere Aịzik na Ribeka nke ukwuu n’ihi na ndị inyom ahụ adịghị efe Jehova.

Otu ụbọchị, otu ihe mere, nke mere ka Ịsọ wesa Jekọb nwanne ya ezigbo iwe. Oge ruru mgbe Aịzik chọrọ inye diọkpara ya ngọzi. Ebe ọ bụ Ịsọ tọrọ Jekọb, Ịsọ tụrụ anya inweta ngọzi ahụ. Ma Ịsọ ebuwo ụzọ resị Jekọb ikike nke inweta ngọzi ahụ. Mgbe a mụkwara ụmụntakịrị abụọ ahụ, Chineke kwuru na ọ bụ Jekọb ga-enweta ngọzi ahụ. Nke ahụkwa bụ ihe merenụ. Aịzik nyere nwa ya Jekọb ngọzi ahụ.

Mgbe Ịsọ mesịrị nụ ihe merenụ, o wesara Jekọb iwe. O were iwe dị ukwuu nke na ọ sịrị na ya ga-egbu Jekọb. Mgbe Ribeka nụrụ nke a, o nyere ya nnọọ nsogbu n’obi. N’ihi ya, ọ gwara di ya bụ́ Aịzik, sị: ‘Ọ ga-ajọgbu onwe ya ma Jekọb lụrụkwa otu n’ime ndị inyom Kenan.’

Ya mere, Aịzik kpọrọ Jekọb nwa ya, sị ya: ‘Alụla nwaanyị na Kenan. Kama jee n’ụlọ nna mama gị bụ́ Betuel nke bi na Heran. Lụrụ otu n’ime ụmụ Leban bụ́ nwa Betuel.’

Jekọb gere nna ya ntị, wee malite ogologo njem gawa n’ebe ndị ikwu ya bi na Heran.

Jenesis 25:5-11, 20-34; 26:34, 35; 27:1-46; 28:1-5; Ndị Hibru 12:16, 17.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya