Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 12 p. 34
  • Jekọb Ketara Ihe A Na-ekenye Ọkpara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jekọb Ketara Ihe A Na-ekenye Ọkpara
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụmụ Ejima Ndị Na-eyighị
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Na-ekpebi Ime Ihe Ziri Ezi Ka I Nwee Ike Ijidesi Ihe Nketa Gị Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Jekọb na Ịsọ Kpeziri
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 12 p. 34
Ebe Jekọb na-ebunye Ịsọ otu efere ofe ka o nye ya ihe ruuru ya dị ka ọkpara

ISI NKE 12

Jekọb Ketara Ihe A Na-ekenye Ọkpara

Ebe Aịzik na Ribeka na ụmụ ejima ha bụ́ Ịsọ na Jekọb nọ

Aịzik dị afọ iri anọ mgbe ọ lụrụ Ribeka. Ọ hụrụ ya n’anya nke ukwuu. Ha mechara mụta ụmụ nwoke abụọ bụ́ ejima.

Aha nke mbụ bụ Ịsọ. Aha nke abụọ abụrụ Jekọb. Ịsọ na-agakarị n’ọhịa. Ọ makwa otú e si achụ nta. Ma, Jekọb na-anọkarị n’ụlọ.

N’oge ahụ, a na-ekenye ọkpara ala na ego buru ibu karịa ụmụnne ya ma nna ya nwụọ. A na-akpọ ya ihe a na-ekenye ọkpara. Ma, a bịa n’ezinụlọ Aịzik, nkwa ndị Jehova kwere Ebreham so n’ihe ọkpara Aịzik kwesịrị inweta. Ịsọ ejighị nkwa ndị ahụ kpọrọ ihe, ma Jekọb ji ha kpọrọ ihe.

Ịsọ na Jekọb

Otu ụbọchị, Ịsọ si ịchụ nta lọta, ezigbo ike gwụkwara ya. Ọ nụrụ ísì ọmarịcha nri Jekọb nọ na-esi. Ọ sịrị ya: ‘Agụụ agụgbuola m. Kunyetụ m ofe ahụ na-acha ọbara ọbara.’ Jekọb sịrị ya: ‘M ga-ekunye gị ya, ma buru ụzọ nyefee m ihe i kwesịrị inweta dị ka ọkpara.’ Ịsọ zara ya, sị: ‘Olee uru ọ baara m? Werenụ ya, achọrọ m iri nri.’ Ì chere na ihe a Ịsọ mere bụ ihe o kwesịrị ime? Mba. Ịsọ tụfuru ihe dị ezigbo mkpa n’ihi otu efere ofe.

Mgbe Aịzik merela ezigbo agadi, ọ gwara ọkpara ya ka ọ bịa ka ya gọzie ya. Ma, Ribeka nyeere Jekọb, bụ́ nwa ya nke obere aka, Aịzik agọzie ya. Mgbe Ịsọ matara ihe merenụ, ezigbo iwe were ya. Ọ chọwara otú ọ ga-esi egbu nwanne ya. Aịzik na Ribeka achọghị ka Ịsọ gbuo Jekọb. Ọ bụ ya mere ha ji gwa Jekọb, sị: ‘Gakwuru nwanne nne gị Leban ka gị na ya biri ruo mgbe iwe nwanne gị dajụrụ.’ Jekọb mere ihe a nne na nna ya gwara ya.

“Olee uru ọ ga-abara mmadụ ma o nwetachaa ụwa niile ma tụfuo ndụ ya? Ma ọ bụ, gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere ndụ ya?”​—Mak 8:36, 37

Ajụjụ: Olee ụdị onye Ịsọ bụ? Olee ụdị onye Jekọb bụ? Gịnị mere Aịzik ji gọzie Jekọb kama Ịsọ?

Jenesis 25:20-34; 27:1–28:5; Ndị Hibru 12:16, 17

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya