Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 23
  • Nrọ Fero

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nrọ Fero
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ọ́ Bụghị Chineke Nwe Ịkọwa Ihe?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Jehova Echefughị Josef
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • “Agụụ Agaghị Agụkwa Ha Ọzọ”
    Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
  • Ò Nwere Mgbe Ị Na-enwere Ndị Mmadụ Anyaụfụ? Ụmụnne Josef Nweere Ya Anyaụfụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 23
Ebe Fero na-arọ nrọ

AKỤKỌ NKE 23

Nrọ Fero

AFỌ abụọ agafeela, Josef ka nọkwa n’ụlọ mkpọrọ. Onye ahụ na-eburu Fero ihe ọṅụṅụ echetaghị ya. N’otu abalị, Fero rọrọ nrọ abụọ pụrụ nnọọ iche, o wee na-eche ihe nrọ ahụ pụtara. Ị̀ na-ahụ ya ka ọ na-arahụ ụra n’ebe a? N’ụtụtụ echi ya, Fero kpọrọ ndị amamihe ya wee kọọrọ ha ihe ọ rọrọ ná nrọ. Ma ha apụghị ịkọrọ ya ihe nrọ ya pụtara.

Ọ bụ ugbu a ka onye ahụ na-eburu ya ihe ọṅụṅụ chetara Josef. O wee sị Fero: ‘Mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ dị otu nwoke nke pụrụ ịkọwa nrọ.’ Ngwa ngwa, Fero mere ka a kpọpụta Josef n’ụlọ mkpọrọ.

Ehi asaa buru ibu, na ehi asaa tara ahụ́

Fero kọọrọ Josef nrọ ya niile, sị: ‘Ahụrụ m ehi asaa ndị buru ibu, maakwa mma. Ahụkwara m ehi asaa ndị tara ahụ́, bụrụ naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ. Ma ehi ndị ahụ tara ahụ́ riri ndị ahụ buru ibu.

‘Ná nrọ m nke abụọ, ahụrụ m ogbe ọka asaa gbara agba bụ́ ndị na-eto n’otu úkwù ọka. Ahụkwara m ogbe ọka asaa fịkpọrọ afịkpọ, bụ́ ndị anyanwụ chakpọrọ. Ma ogbe ọka ndị ahụ fịkpọrọ afịkpọ malitere ilo ogbo ọka asaa ndị ahụ dị mma.’

Ogbe ọka asaa fịkpọrọ afịkpọ, na ogbe ọka asaa gbara agba

Josef wee sị Fero: ‘Nrọ abụọ ahụ pụtara otu ihe. Ehi asaa ndị ahụ buru ibu na ogbe ọka asaa ndị ahụ buru ibu pụtara afọ asaa, ma ehi asaa ndị ahụ tara ahụ́ na ogbe ọka asaa ndị ahụ fịkpọrọ afịkpọ pụtara afọ asaa ọzọ. A ga-enwe afọ asaa mgbe ala Ijipt ga-emepụta ọtụtụ ihe oriri. A ga-enwekwa afọ asaa ọzọ mgbe ala Ijipt ga-emepụta obere ihe oriri.’

Josef gwara Fero, sị: ‘Họpụta nwoke maara ihe ma mee ya onye ga na-achịkọta ihe oriri n’ime afọ asaa ọma ahụ nri ga-adị. Mgbe ahụ, agụụ agaghị egbu ndị mmadụ n’ime ajọ afọ asaa ọzọ ahụ ala ga-emepụta obere ihe oriri.’

Aro ahụ dị Fero mma. O wee họpụta Josef ịchịkọta ihe oriri na ichekwa ya. Josef ghọrọ nwoke kachasị mkpa n’Ijipt, ma a gụpụ Fero.

Mgbe afọ asatọ gasịrị, mgbe a banyere n’oge ụnwụ, Josef hụrụ ndị ikom ụfọdụ ka ha na-abịa. Ị̀ ma ndị ha bụ? Ha bụ ụmụnne ya iri ndị tọrọ ya! Nna ha bụ́ Jekọb zitere ha n’Ijipt n’ihi na ihe oriri nke ha nwere na Kenan na-agwụ. Josef matara ụmụnne ya, ma ha amataghị ya. Ị̀ ma ihe kpatara ya? Ọ bụ n’ihi na Josef etoola, o yikwa uwe dị iche.

Josef chetara na mgbe ya bụ nwatakịrị na ya rọrọ nrọ ebe ụmụnne ya na-akpọ isiala nye ya. Ì chetara mgbe ị gụrụ ihe banyere ya? O doola Josef anya na ọ bụ Chineke zitere ya n’Ijipt, nakwa na e nwere ezi ihe mere o ji mee otú ahụ. Gịnị ka i chere Josef mere? Ka anyị hụ.

Jenesis 41:1-57; 42:1-8; 50:20.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya