Isi nke 10
“Agụụ Agaghị Agụkwa Ha Ọzọ”
1. Ruo n’ókè ha aṅaa ka nchegbu ụwa nwere maka nri siruru ike?
OTU n’ime nsogbu ndị bụ isi, ndị na-eche ụwa ihu taa metụtara nri. Ihe ịda oké ọnụ na-eme ka ihe siere ọtụtụ ndị ike. Agụụ na-agụgbu ndị ọzọ. E kwuru na nso nso a na n’ime afọ ọbụla, 40 nde mmadụ—n’afọ ụfọdụ ihe ruru 50 nde—na-anwụ n’ihi ahụghị ihe ha ga-eri. Ihe ruru okpu-kpu iri nke ọnụ ọgụgụ ahụ nọ n’ọnụdụ dị oké njọ nke erighị ihe ahụ ha chọrọ. Ọ bụ ezie na mba ụfọdụ na-arụpụta nri karịrị nke ha pụrụ iricha, nsọrịta mpì ndọrọ ndọrọ ọchịchị na anya ukwu nke azụmahịa na-emekarị ka mgbalị a na-eme ime ka nri mapụtara amapụta ruo ndị ahụ ọ dị mkpa karịsịa ghara inwe isi.—Tụlee Mkpughe 6:5, 6.
2. Ọbụna ná mba ndị nwere nri n’ụba, n’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji nwee ezi ihe kpatara ha ga-eji na-echegbu onwe ha?
2 Ọbụna ala ndị o yiri ka hà nọ n’uju nri na-eche ọdịnihu dị njọ ihu. N’ihi gịnị? Ụzọ a na-esi arụ ọrụ ubi n’oge a na-adaberekarị ná mmanụ petrol, ọ naghị eruchakwara mmadụ nile n’ụwa. Ịdaberekarị n’ihe e ji azụ ala bụ fertilizer ndị a na-azụta n’ahịa na-emetọ mmiri ndị ha nwere. Iji ọgwụ ụmụ ahụhụ eme ihe, bụ́ nke e zubere iji chebe ihe ndị a kụrụ n’ala, na-egbusịkwa ụmụ irighiri ihe bi n’ime ala, ndị ga-eme ka ala mepụta ihe n’ọdịnihu. N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’akụkụ nile nke ihe omume mmadụ, ajọ nsogbu anọgidewo na-amụba. Aurelio Peccei, bụ́ onyeisi oche nke nzukọ ndị oké mmụta nke mba nile mere, ji ụwa tụnyere “mgbọ a gbapụrụ n’égbè, nke na-adagharị adagharị, nke na-esite n’otu ọdachi gaa n’ọdachi ọzọ.” Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị n’ime ya mmadụ ịtụkwasị olileanya ya maka ọdịnihu n’ụwa nke nwere ihe ndekọ dị otú ahụ?—Jeremaịa 10:23; Ilu 14:12.
3. Ònye nwere ike ikwe nkwa inye ihe nile a kpọrọ mmadụ nri n’uju, gịnịkwa nyere gị ụdị obi ike ahụ?
3 N’ụzọ amamihe, ọtụtụ nde mmadụ aghọtawo na ọ bụ nanị Chineke pụrụ igbo mkpa ha maka enyemaka. Ebe ha nyochaworo Bible, ha matara na Jehova Chineke edokwasịwo Ọkpara ya nke eluigwe, bụ́ Jisọs Kraịst n’ocheeze, nyekwa ya ụwa nile dị ka ihe onwunwe ya. (Abụ Ọma 2:7, 8) O nwere amamihe na ikike nke ịhụ na ihe a kpọrọ mmadụ ga-enweta ihe ala na-emepụta n’ụzọ bara ụba. (Abụ Ọma 72:7, 8, 16; Ndị Kọlọsi 1:15-17) Mgbe e wepụrụ usoro ihe nke a na-achọ ọdịmma nke aka ya, Kraịst ga-eduzi mgbalị nile nke ụmụ mmadụ lanarịrịnụ, ka ụwa nile wee ghọọ paradaịs na-amị mkpụrụ n’ụju.
4. Iji rite uru n’onyinye anụ ahụ ndị ahụ, gịnị ka o kwesịrị ka anyị mee ugbu a?
4 Otú ọ dị, ndị ga-erite uru na-adịgide adịgide site n’ọchịchị ya bụ ndị ahụ ghọtara na ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, ndị ghọtara mkpa ihe ime mmụọ dị na mkpa ọ dị inweta ike site n’ịmụta na ime uche Chineke. Bible kwusiri okwu ike banyere mkpa nke a dị. (Jọn 4:34; 6:27; Jeremaịa 15:16) Jisọs mesiri ya ike mgbe ọ sịrị: “E dewo ya n’Akwụkwọ nsọ, sị, Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ [Jehova] pụta.” (Matiu 4:4) Ụdị nri ime mmụọ ahụ dị anyị mkpa ugbu a ka anyị wee lanarị ọgwụgwụ ụwa nke a. E gosiri ụzọ anyị pụrụ isi nweta ya n’ihe ndekọ Bible banyere Josef na ụmụnna ya.
“JEKWURUNỤ JOSEF”
5. Olee otú Josef si ghọọ ohu n’Ijipt?
5 Chineke mere ka Josef, bụ́ nwa nwa Abraham, rọọ nrọ ndị na-egosi na Josef ga-arụ ọrụ dị mkpa ná ndụ. N’ihi nke a, nakwa n’ihi na nna ya hụrụ ya n’anya n’ụzọ pụrụ iche, ụmụnna ndị ikom iri nke Josef kpọrọ Josef asị. Ha gbara izu igbu ya, ma n’ikpeazụ ha renyere ya n’ịbụ ohu, e wee kpọga ya n’ljipt. Olee otú nzube Chineke banyere Josef ga-esi mezuo ugbu a?—Jenesis 37:3-11, 28.
6. (a) Olee otú e si mee ka Fero mata banyere Josef? (b) Nrọ ndị dị aṅaa nyere Fero nsogbu?
6 Mgbe Josef gbara iri afọ atọ, Jehova mere ka Fero, onye na-achị Ijipt rọọ nrọ abụọ ndị nyere ya nsogbu. Na nke mbụ, ọ hụrụ ehi asaa, “mara mma ile anya maakwa abụba n’anụ ahụ ha,” hụkwa ehi asaa ọzọ “jọrọ njọ ile anya, taakwa ahụ n’anụ ahụ ya.” Ehi ndị ahụ tara ahụ richapụrụ ndị ahụ mara abụba. Ná nrọ ọzọ, Fero hụrụ òkó ọka asaa na-awapụta n’otu okporo, “ha bujuru ebuju dịkwa mma,” na òkó ọka asaa ọzọ ndị “fikpọrọ afikpọ, nke ifufe ihu anyanwụ chakpọkwara achakpọ.” Ọzọkwa, ndị ahụ fikpọrọ afikpọ richapụrụ ndị ahụ bujuru ebuju. Gịnị ka ihe ndị a nile pụtara? Ọ dịghị onye amamihe ọ bụla nke Ijipt pụrụ ịkọwa isi nrọ nile ahụ. Ma onye na-eburu Fero ihe ọṅụṅụ chetara na mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, otu onye mkpọrọ ibe ya, bụ́ Josef, kọọrọ ha isi nrọ ha n’ụzọ ziri ezi. Ozugbo, Fero nyere iwu ka a kpọpụta Josef.—Jenesis 41:1-15.
7. (a) Olee otú Josef si ghọọ onye na-elekọta ibe oriri n’Ijipt? (b) Mgbe oké ụnwụ ahụ siri ike, gịnị ka ndị ljipt ahụ mere iji nọgide na-adị ndụ?
7 N’enyeghị onwe ya otuto ọ bụla, Josef gwara Fero, sị: “Nrọ Fero, otu ka ọ bụ: Ihe nke Chineke gaje ime, nke ahụ ka o gosiworo Fero.” (Jenesis 41:16, 25) Josef kọwara na nrọ nke mbụ na nke abụọ pụtara otu ihe ahụ, mesiekwa ịbụ eziokwu ya ike. Mgbe afọ asaa nke uju nri n’Ijipt gasịrị, a ga-enwe afọ asaa nke ụnwụ nri. Ọ dụrụ Fero ọdụ ka o doo nwoke ruru eru ịbụ onyeisi nke ịchịkọta rakpụrụ n’afọ asaa nke uju nri iji mee nkwadebe maka mgbe ụnwụ. Ebe ọ ghọtara na o doro anya na Chineke n’onwe ya kpugheere Josef ihe a nile, Fero họpụtara Josef ịbụ onyeisi na-elekọta nri, nye ya ọkwa nke abụọ, ịbụ onye na-esochi Fero n’Ijipt. Dị ka e bu ụzọ kwuo, e nwere afọ asaa nke uju nri pụrụ iche, Josef kwakọbakwara ihe oriri bara ụba nke ukwuu. E mesịa, ụnwụ nri ahụ e buru n’amụma jisiri ala ahụ ike. Mgbe ndị mmadụ rịọrọ Fero ka o nye ha achịcha, ọ zara ha, sị: “Jekwurunụ Josef; ihe ọ sị unu mee, rneenụ ya.” Ya mere Josef resịrị ha ọka—na mbụ ha ji ego kwụọ ụgwọ, e mesịa ha jiri ìgwè anụ ụlọ ha, n’ikpeazụkwa ha jiri onwe ha na ala ha gbanwere ihe oriri. Ka ha wee nọgide na-adị ndụ, ha nyefere onwe ha kpam kpam n’ijere Fero ozi.—Jenesis 41:26-49, 53-56; 47:13-26.
8. (a) Iji nweta ihe oriri dị ha mkpa, gịnị ka a chọrọ n’aka ụrnụnna Josef? (b) N’ihi gịnị ka e ji chebe ihe ndekọ nke akụkọ a?
8 Ụnwụ nri ahụ metụtakwara ala nile gbara ijipt gburugburu. N’ikpeazụ, ụmụnna ndị ikom iri nke Josef n’onwe ya si Kenean bịa. Ọ gafeela ihe karịrị iri afọ abụọ kemgbe ha refuru ya ịbụ ohu, ha amataghịkwa ya. Ha kpọrọ isiala nye ya, dị ka nrọ abụọ nke Josef bu ụzọ gosi n’ogologo mgbe gara aga, ha wee chọọ inweta ihe oriri. (Jenesis 37:6, 7; 42:5-7) Josef ji ụzọ nke a lee ha ule, hụkwa ihe àmà doro anya nke gosiri na omume ha n’ebe ọ nọ na n’ebe nna ha nọ agbanwewo n’ezie. N’ikpeazụ, ọ kọwara onye ọ bụ, kọwaakwa na ọ bụ n’ezie n’ihi ‘ichebe ndụ’ ka Chineke ji buru ụzọ zite ya n’Ijipt tupu ha abịa. Site ná ntụziaka ya, ha kpọfetara nna ha na ezinụlọ ha n’Ijipt. (Jenesis 45:1-11) E dekọrọ ihe a nile n’ihi ọdịmma anyị, ihe a o sere onyinyo ya n’ụzọ amụma gụnyere ọtụtụ ihe na-eme n’oge anyị a.—Ndị Rom 15:4.
IGBO MKPA AGỤỤ NA AKPỊRỊ ỊKPỌ NKỤ ANYỊ UGBU A
9. (a) Gịnị kpatara ụnwụ nri ime mmụọ nke dị n’ụwa taa? (b) N’ihi gịnị ka nke a ji bụrụ otu n’isi ihe na-akpata ọtụtụ nsogbu nye ndị mmadụ?
9 Otu n’ime isi ihe na-akpatara ihe a kpọrọ mmadụ ọtụtụ nsogbu bụ ụnwụ nri nke ime mmụọ. N’ihi na ha agbakụtawo Jehova azụ, ọ dịghị egosi ha ihu ọma nke ịghọta Okwu ya, n’ihi ya, ha na-ezute “oké ụnwụ . . . , ọ bụghị oké ụnwụ nke nri, ọ bụghịkwa akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri, kama ọ bụ nke ịnụ okwu nile nke Jehova.” (Emọs 8:11) Ndị agụụ nri ime mmụọ na-agụ na-asọgharị ìsì inweta azịza nye ajụịụ ndị dị mkpa, dị ka ndị a: Gịnị ka ndụ pụtara? N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji anwụ anwụ? Ọ dị ezi olileanya ọ bụla dị maka ọdịnihu? N’ihi isi mgbaka nke agụụ ime mmụọ kpataara ha, ụdị mmadụ ahụ na-emejọ onwe ha na ndị ọzọ mgbe mgbe, ka ha na-emikpu onwe ha n’ịkwa iko na imempụ iji mejupụta ọchịchọ ọjọọ ha nile.
10. (a) N’imezu Aịsaịa 65:13, 14, olee ọnọdụ dị n’etiti ndị ohu Jehova? (b) Olee mgbe e nwere ụnwụ nri ime mmụọ na uju nri ime mmụọ?
10 N’ụzọ megidere nke a, Jehova enyewo ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi nri ime mmụọ n’ụba, ha nwekwara ezi ịhụnanya n’etiti onwe ha. O mewo ka ha ghọta eziokwu ime mmụọ na-eju afọ ndị dị n’ime Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ, nyekwa ha ọrụ ha ga-arụ dị ka ndịàmà ya. Ha ji ọnụ na-ekesara ndị agụụ ime mmụọ na-agụ eziokwu ahụ, bụ ndị na-achọkwa isoro Chineke na-emekọrịta ihe iji dị ndụ. (Aịsaịa 65:13, 14; Luk 6:21) N’Ijipt oge ochie, afọ asaa ụnwụ nri sochiri afọ asaa nke uju. Ma n’oge anyị a, oge ụnwụ nri ime mmụọ na uju nri ime mmụọ na-aga ụkwụ na ụkwụ.
11. (a) Olee ndị Fero na Josef sere onyinyo ha, ọ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee otú ihe “oké ìgwè mmadụ” ahụ meworo si yie nke ndị Ijipt ahụ nọ n’ụnwụ nri mere?
11 Taa, ọ bụghị Fero na-achị isi. Jehova Chineke, bụ́ Fero Ka Ukwuu, bụ Eze Onyenwe Eluigwe na Ala. O nyewo Jisọs Kraịst ọkwa ọchịchị nke na-esochi nanị nke ya. Dị ka Josef Ka Ukwuu, Jisọs bụzi Onye Jehova nyefere ibu ọrụ nke ikesa nri ime mmụọ na-enye ndụ. Ihe ọmụma nke okpukpe na amamihe ụwa emewo ka ndị mmadụ nọrọ n’agụụ ime mmụọ dị egwu. Ka ha nwee ike ịdị ndụ, ha aghaghị ichigharịkwuru Jisọs Kraịst, nwetakwa nri ime mmụọ site ná ntụziaka ya. Ọtụtụ nde mmadụ, nke ndị ụnwụ nri dakwasịrị n’Ijipt sere onyinyo ha, na-eme otú ahụ. Site na Jisọs Kraịst, ha na-arara ndụ ha kpam kpam nye Jehova ruo mgbe nile, sikwa otú ahụ bụrụ ndị a gụnyere n’ime oké ìgwè mmadụ na-atụ anya ịlanarị ụbọchị iwe Chineke nke na-abịa.
12. (a) Olee otú Jisọs onye nọ n’eluigwe si eme ka anyị nweta nri ime mmụọ n’ụwa ebe a? (b) N’ihi gịnị ka o ji doo gị anya ndị bụ “ohu ahụ kwesịri ka a tụkwasị ya obi nke nwekwara uche”?
12 Ma Jisọs nọ n’eluigwe. Olee otú o si na-ekesa nri ime mmụọ ahụ ka o rute anyị aka n’ụwa ebe a. O buru amụma na ya ga-eme nke a site n’aka “ohu [ya] kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Nke a bụ “ohu,” nke ndị mejupụtara ya bụ nzukọ Kraịst nke ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ mgbe ha ka nọ n’ụwa. (Tụlee Aịsaịa 43:10.) Ihe fọdụrụ n’etiti ndị a ka nọkwa n’ụwa taa. A pụrụ ịchọpụta ezi ọgbakọ Kraịst nke a n’ụzọ dị mfe site n’iji Bible tụlee ozizi na omume ha nile. Ọ na-akụzi n’ezie ihe Jisọs nyere n’iwu. N’ihi ya, ọ dịghị etinye aka n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa, kama ndị òtù ya nile bụ ndị nkwusa ihu ọha nke Alaeze Chineke. E kewasịghị ha n’etiti òtù dị iche iche nke Krisendọm. Ha dị n’otu dị ka Jisọs sịrị na ha ga-adị—ha nile bụ Ndịàmà Jehova n’iṅomi Onyenwe ha. (Lee Jọn 17:16, 20, 21; Matiu 24:14; 28:19, 20; Mkpughe 1:5.) Ha na-enwe nri ime mmụọ n’ụba, na-achọsikwa ike iso ndị ọzọ kerịta ya.
13. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ọtụtụ ndị siworo gosipụta na ha dị ka ụrnụnna iri nke Josef? (b) Olee otú anyị nile pụrụ isi rite uru site ná nri ime mmụọ nke Kraịst na-enye site n’òtù “ohu” ahụ?
13 Ọtụtụ ndị akwawo ndị Kraịst ndị a e tere mmanụ emo, na-asị: ‘Ùnu chere na unu ka anyị mma? Ùnu chere na ọ bụ nanị unu na-agazi agazi?’ Ma mgbe oge na-aga, ụfọdụ na-eji obi umeala ghọta na Jehova nwere ndịàmà n’elu ụwa n’ezie, na ha na-akpọsakwa Okwu Ya n’ezie. Ha na-aghọta na Bible gosiri na a ga-enwe nanị otu ezi ọgbakọ nke ndị Kraịst na ndị mejupụtara ya ga-adịkwa n’otu. (Ndị Efesọs 4:5; Ndị Rom 12:5) Nnyocha e ji ezi obi na obi dị umeala nyochaa ihe ndị mere eme edujewo ha ná nzukọ ahụ. Ụmụnna ndị ikom iri nke Josef sere onyinyo ndị ahụ, ndị na-esogbu ndị e tere mmanụ bụ ụmụazụ Jisọs na mbụ, ma ọ bụ ndị na-akwadobu ndị ahụ na-esogbu ha ma mesịa gosipụta ezi mgbanwe nke obi ugbu a. (Jọn 13:20) Ha ji obi ekele na-anara nri ime mmụọ nke Jisọs Kraịst na-enye site n’òtù nke ‘ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi.’ Ha na-enweta ikike ime mmụọ mgbe a na-azụ ha site n’eziokwu Bible nke a kọwara n’akwụkwọ nile ndị Watch Tower bipụtara, na-abịachikwa nzukọ nile nke Ndịàmà Jehova anya, na-ekerekwa òkè n’ụzọ chiri anya n’ime uche Chineke. Ị̀ bụ otu n’ime ndị ahụ dị umeala n’obi?—Ndị Hibru 10:23-25; tụlee Jọn 4:34.
14. Ọnọdụ ime mmụọ dịgasị aṅaa ka ndị ahụ na-adị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị a mụtara n’akụkọ Bible nke a nọ na ya?
14 Ndị nile sitere n’ụzọ ịhụnanya dị otú a nyefee Onye Kere ha ndụ ha site na Jisọs Kraịst, na-enwe ntụrụ ndụ n’obi ụtọ. N’ụzọ ime mmụọ, “agụụ agaghị agụ ha ọzọ, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ ọzọ, . . . n’ihi na Nwa Atụrụ ahụ [Jisọs Kraịst] nke nọ n’etiti ocheeze ahụ ga-azụ ha dị ka atụrụ, ọ ga-edurukwa ha gaa n’isi iyi nke mmiri nke ndụ.”—Mkpughe 7:16, 17; Aịsaịa 25:6-9.