Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 31
  • Mozis na Erọn Ejee Ịhụ Fero

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mozis na Erọn Ejee Ịhụ Fero
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ahụhụ Atọ Mbụ A Tara Ndị Ijipt
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Mosis na Erọn—Ndị Nkwusa Nwere Obi Ike nke Okwu Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ahụhụ nke Anọ Ruo nke Itoolu
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ònye Bụ Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 31
Mgbe Mozis na Erọn gara hụ Fero

AKỤKỌ NKE 31

Mozis na Erọn Ejee Ịhụ Fero

MGBE Mozis laghachiri Ijipt, ọ gwara nwanne ya bụ́ Erọn banyere ọrụ ebube ndị ahụ. Mgbe Mozis na Erọn gosiri ụmụ Izrel ọrụ ebube ndị ahụ, ha niile kweere na Jehova nọnyeere ha.

Mgbe ahụ, Mozis na Erọn wee jee ịhụ Fero. Ha gwara ya, sị: ‘Jehova Chineke nke Izrel sịrị, “Hapụ ndị m ka ha mee njem ụbọchị atọ iji wee fee m ofufe n’ime ọzara.”’ Ma Fero zara, sị: ‘Ekweghị na Jehova. M gaghị ekwe ka Izrel jee.’

Fero were iwe n’ihi na ha chọrọ ka e nye ha oge ịhapụ ọrụ ha ije fee Jehova ofufe. Ọ manyere ha ịrụsi ọrụ ike karị. Ụmụ Izrel tara Mozis ụta n’ihi mmeso ọjọọ a na-emesozi ha, o wee wute Mozis. Ma Jehova gwara Mozis ka ọ ghara ichegbu onwe ya. ‘M ga-eme ka Fero hapụ ndị m ka ha laa,’ ka Jehova kwuru.

Mgbe agwọ Erọn na-elo agwọ ndị nke ọzọ

Mozis na Erọn jere ịhụ Fero ọzọ. Na nke ugbu a, ha rụrụ ọrụ ebube. Erọn tụpụrụ mkpanaka ya n’ala, o wee ghọọ nnukwu agwọ. Ndị amamihe Fero tụpụkwara mkpanaka ha, mkpanaka ha aghọọkwa agwọ. Ma lee! Agwọ Erọn na-elo agwọ nke ndị amamihe ahụ. Ma Fero ekweghị ahapụ ụmụ Izrel ka ha laa.

Oge wee ruo ka Jehova kụziere Fero ihe. Ị̀ ma ụzọ o si mee ya? Ọ bụ site n’iwetara ndị Ijipt ihe otiti iri, ma ọ bụ ajọ nsogbu.

Mgbe ha nwetasịrị ọtụtụ n’ime ihe otiti ndị ahụ, Fero ziri ozi ka a kpọọ Mozis. Mgbe Mozis bịara, ọ sịrị ya: ‘Kwụsị ihe otiti ndị a, m ga-ahapụkwa ụmụ Izrel ka ha laa.’ Ma mgbe a kwụsịrị ihe otiti ahụ, Fero gbanwere obi ya. O kweghị ka ụmụ Izrel laa. Ma n’ikpeazụ, mgbe ihe otiti nke iri gasịrị, Fero zipụrụ ụmụ Izrel ka ha laa.

Ị̀ ma ihe otiti iri ahụ n’otu n’otu? Sapeta peeji na-esonụ ka anyị mụọ banyere ha.

Ọpụpụ 4:27-31; 5:1-23; 6:1-13, 26-30; 7:1-13.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya