ISI NKE 19
Ahụhụ Atọ Mbụ A Tara Ndị Ijipt
Mgbe ndị Izrel na-agba ohu n’Ijipt, a manyere ha ịrụ ọrụ ike. Jehova zigara Mosis na Erọn ka ha gaa gwa Fero, sị: ‘Hapụ ndị m ka ha gaa fee m n’ala ịkpa.’ Mpako mere ka Fero jiri olu ike gwa ha, sị: ‘Agaghị m eme ihe Jehova kwuru, agakwanụghị m ahapụ ndị Izrel ka ha laa.’ Fero maliteziri ịmanye ha ka ha rụsiwekwuo ọrụ ike. Jehova ga-eme Fero ihe. Ị̀ ma otú ọ ga-esi eme ya? Ọ tara ndị Ijipt Ahụhụ Iri. Jehova gwara Mosis, sị: ‘Fero achọghị ige m ntị. N’ụtụtụ, ọ ga-aga n’Osimiri Naịl. Gaa gwa ya na ebe ọ bụ na ọ hapụghị ndị m ka ha laa, Osimiri Naịl ga-aghọ ọbara.’ Mosis gakwuuru Fero otú Jehova gwara ya. Fero hụrụ ka Erọn kụrụ mkpara ya n’Osimiri Naịl. Osimiri ahụ ghọrọ ọbara ma malite isi ísì, azụ̀ ndị dị na ya nwụkwara. E nweghịzi ike inweta mmiri ọṅụṅụ n’osimiri ahụ. Ma, Fero ekweghị ahapụ ndị Izrel ka ha laa.
Mgbe abalị asaa gachara, Jehova zigara Mosis ọzọ ka ọ gaa zie Fero, sị: ‘Ọ bụrụ na ị hapụghị ndị m ka ha laa, m ga-eme ka mbàrá ju ebe niile n’Ijipt.’ Erọn weliri mkpara ya elu, mbàrá amalite iju ebe niile n’Ijipt. Ha banyere n’ụlọ ndị mmadụ, n’àkwà ha, nakwa n’efere ha. Ha jukwara ebe niile. Fero gwara Mosis ka ọ rịọ Jehova ka o mee ka ahụhụ a kwụsị. Fero kwere nkwa na ọ ga-ahapụ ndị Izrel ka ha laa. N’ihi ya, Jehova mere ka mbàrá ndị ahụ nwụchaa, ndị Ijipt ekpokọta ha n’ikpo n’ikpo. Ala ahụ maliteziri isi ísì. Ma, Fero jụkwara ịhapụ ụmụ Izrel ka ha laa.
Jehova gwaziri Mosis, sị: ‘Erọn ga-akụ mkpara ya n’ala, ájá ga-aghọkwa anwụnta ma ọ bụ ụmụ ahụhụ ndị na-ata ata n’Ijipt.’ Ozugbo Erọn mere ihe a, anwụnta eju ebe niile. Ụfọdụ ndị Ijipt gwara Fero, sị: ‘Ahụhụ a si n’aka Chineke.’ Ma, Fero ka jụrụ ịhapụ ndị Izrel ka ha laa.
“M ga-eme ka ha mara ike m, marakwa otú m siruru ike. Ha ga-amarakwa na aha m bụ Jehova.”—Jeremaya 16:21