Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 43
  • Jọshụa Aghọọ Onye Ndú

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jọshụa Aghọọ Onye Ndú
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Họọrọ Joshụa
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ihe Jọshụa Chetara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Mozis Etie Nkume Ihe
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ndị Nledo Iri na Abụọ
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 43
Jọshụa, Mozis, na Elieza onye nchụàjà

AKỤKỌ NKE 43

Jọshụa Aghọọ Onye Ndú

MOZIS chọrọ iso ụmụ Izrel baa n’ala Kenan. N’ihi ya, ọ rịọrọ, sị: ‘Jehova, kwe ka m gafee Osimiri Jọdan ma hụ ala ahụ mara mma.’ Ma Jehova sịrị ya: ‘O zuworo gị! Ekwula ya ọzọ!’ Ị̀ ma ihe mere Jehova ji kwuo otú ahụ?

Ọ bụ n’ihi ihe mere mgbe Mozis tiri nkume ahụ ihe. Cheta na ya na Erọn asọpụrụghị Jehova. Ha agwaghị ụmụ Izrel na ọ bụ Jehova ga-enye ha mmiri site na nkume ahụ. N’ihi nke a, Jehova sịrị na ya agaghị ekwe ka ha baa n’ala Kenan.

Ọnwa ole na ole mgbe Erọn nwụsịrị, Jehova gwara Mozis, sị: ‘Kpọrọ Jọshụa, guzo ya n’ihu Elieza onye nchụàjà na n’ihu ndị Izrel. N’ihu ha niile, gwa mmadụ niile na Jọshụa bụ onye ndú ọhụrụ ha.’ Mozis mere ihe Jehova kwuru, dị ka ị pụrụ ịhụ na foto a.

Jehova wee sị Jọshụa: ‘Dị ike, atụla egwu. Ị ga-eduru ụmụ Izrel baa n’ala Kenan nke m kwere nkwa inye ha, m ga-anọnyekwara gị.’

N’ikpeazụ, Jehova gwara Mozis ka ọ rịgoro n’elu Ugwu Nebo nke dị n’ala Moab. Site n’ebe ahụ, Mozis lere anya n’ofe Osimiri Jọdan wee hụ ala Kenan ahụ mara mma. Jehova sịrị ya: ‘Nke a bụ ala ahụ m kwere nkwa inye ụmụ Ebreham, Aịzik, na Jekọb. Ekwewo m ka ị hụ ya, ma m gaghị ekwe ka ị baa na ya.’

Mozis nwụrụ n’elu Ugwu Nebo ahụ. Ọ gbara otu narị afọ na iri afọ abụọ. Ọ ka dị ike, na-ahụkwa ụzọ nke ọma. O wutere ụmụ Izrel nke ukwuu, ha wee kwaa ákwá n’ihi ọnwụ Mozis. Ma obi tọrọ ha ụtọ inwe Jọshụa dị ka onye ndú ọhụrụ ha.

Ọnụ Ọgụgụ 27:12-23; Deuterọnọmi 3:23-29; 31:1-8, 14-23; 32:45-52; 34:1-12.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya