Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 38
  • Ndị Nledo Iri na Abụọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Nledo Iri na Abụọ
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Nnyopụta Iri na Abụọ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ị̀ Na-eso Jehova n’Azụ n’Ụzọ Zuru Ezu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Jọshụa Aghọọ Onye Ndú
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Mozis Etie Nkume Ihe
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 38
Mgbe Jọshụa na Keleb na ndị nledo ndị nke ọzọ na-egosi Mozis ọtụtụ mkpụrụ osisi ha si n’ala Kenan weta

AKỤKỌ NKE 38

Ndị Nledo Iri na Abụọ

LEE mkpụrụ osisi ndị ikom ndị a bu. Legodị ka ụyọkọ vaịn nke a si dị ukwuu. Ọ chọrọ ndị ikom abụọ iji buru ya n’okporo osisi. Leekwa mkpụrụ fig na mkpụrụ pọmigranet ndị ahụ. Ebee ka ọmarịcha mkpụrụ osisi ndị a si? Ha si n’ala Kenan. Cheta na Kenan bụ ebe Ebreham, Aịzik, na Jekọb biri na mbụ. Ma n’ihi ụnwụ nri nke dara n’ebe ahụ, Jekọb na ezinụlọ ya kwagara Ijipt. Mgbe ihe dị ka narị afọ abụọ na afọ iri na isii gasịrị, Mozis duuru ụmụ Izrel na-alaghachi Kenan. Ha abịarutewo otu ebe n’ọzara, nke a na-akpọ Kedesh.

Ndị ajọ mmadụ bi n’ala Kenan. N’ihi ya, Mozis zigara ndị nledo iri na abụọ, wee sị ha: ‘Chọpụtanụ mmadụ ole bi n’ebe ahụ, na otú ha siruru n’ike. Chọpụtanụ ma ala ahụ ọ dị mma ịkụ ihe ọkụkụ. Hụkwanụ na unu wetara ụfọdụ mkpụrụ osisi ndị na-amị n’ala ahụ.’

Mgbe ndị nledo ahụ laghachiri Kedesh, ha gwara Mozis, sị: ‘Ọ bụ ala mara mma n’ezie.’ Iji gosi na ihe ha kwuru bụ eziokwu, ha gosiri Mozis mkpụrụ osisi ụfọdụ. Ma mmadụ iri n’ime ndị nledo ahụ sịrị: ‘Ndị bi n’ebe ahụ gbara dimkpa ma dị ike. Ha ga-egbu anyị ma anyị nwaa iwere ala ha.’

Ụmụ Izrel tụrụ egwu mgbe ha nụrụ nke a. Ha sịrị: ‘Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ n’Ijipt ma ọ bụ n’ọzara ebe a. Ha ga-egbu anyị n’agha, dọrọkwa ndị inyom anyị na ụmụ anyị n’agha. Ka anyị họpụta onye ndú ọhụrụ ga-anọchi Mozis, ka o duru anyị laghachi Ijipt!’

Ma mmadụ abụọ n’ime ndị nledo ahụ tụkwasịrị Jehova obi, ha gbalịkwara ịgba ha ume. Aha ha bụ Jọshụa na Keleb. Ha gwara ha, sị: ‘Unu atụla egwu. Jehova nọnyeere anyị. Ọ ga-adị mfe iwere ala ahụ.’ Ma ụmụ Izrel egeghị ntị. Ha chọrọ ọbụna igbu Jọshụa na Keleb.

Nke a were Jehova iwe nke ukwuu, o wee sị Mozis: ‘Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha site n’onye gbara afọ iri abụọ gaa n’ihu, nke ga-aba n’ala Kenan. Ha ahụwo ọrụ ebube niile m rụrụ n’Ijipt nakwa n’ọzara nke a, ma ha atụkwasịghị m obi. N’ihi ya, ha ga-awagharị n’ime ọzara afọ iri anọ, ruo mgbe onye ikpeazụ ha nwụrụ. Ọ bụ naanị Jọshụa na Keleb ga-aba n’ala Kenan ahụ.’

Ọnụ Ọgụgụ 13:1-33; 14:1-38.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya