Ị̀ Na-eso Jehova n’Azụ n’Ụzọ Zuru Ezu?
“NDỊ ezi omume nwere ntụkwasị obi dị ka ọdụm.” (Ilu 28:1) Ha na-egosipụta okwukwe, na-eji obi ike na-adabere n’Okwu Chineke, na-aga n’ihu n’ozi Jehova n’agbanyeghị n’atụghị egwu ihe ize ndụ ọ bụla.
Ka ndị Israel nọ na Saịnaị mgbe Chineke gbapụtasịrị ha n’agbụ Ijipt n narị afọ nke 16 T.O.A., ndị ikom abụọ karịsịa gosiri na ha nwere nnọọ obi ike dị ka ọdụm. Ha gosipụtakwara ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ n’okpuru ọnọdụ ndị na-adịghị mma. Otu n’ime ndị ikom ndị a bụ Joshua onye Efraim, bụ́ onye jeere Mosis ozi na onye e mesịrị họpụta dị ka onye nọchiri anya ya. (Ọpụpụ 33:11; Ọnụ Ọgụgụ 13:8, 16; Deuterọnọmi 34:9; Joshua 1:1, 2) Onye nke ọzọ bụ Keleb, nwa Jefune nke sitere n’agbụrụ Juda.—Ọnụ Ọgụgụ ;13:6; 32:12.
Keleb ji ịnọgidesi ike n’ihe na ịnụ ọkụ n’obi mee uche Jehova. Ogologo ndụ ya nke ije ozi n’ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke mere o ji kwuo na ya ‘esowo Jehova n’azụ n’ụzọ zuru ezu.’ (Joshua 14:8) “Anọgidesiri m ike n’ihe n’ụzọ zuru ezu nye ONYENWE anyị, Chineke m,” ka The New American Bible kwuru. Keleb “ji ikwesị ntụkwasị obi rube isi,” ma ọ bụ “ji ịnọgidesi ike n’ihe mezuo nzube nke,” Jehova Chineke. (Today’s English Version; The New English Bible) N’itinye ya n’ụzọ ọzọ, Keleb kwupụtara, sị: ‘Esoro m ONYENWE anyị Chineke m n’azụ site n’obi m nile.’ (New International Version) Gịnị banyere gị? Ị̀ na-eso Jehova n’azụ n’ụzọ zuru ezu?
Iledo Ala Ahụ
Weregodị onwe gị dị ka onye nọ n’etiti ndị Israel n’oge na-adịghị anya mgbe Jehova tọhapụrụ ha n’ịgba ohu nye ndị Ijipt. Lee ụzọ Mosis onye amụma si jiri ikwesị ntụkwasị obi gbasoo ntụziaka nile nke Chineke nyere. Ee, rịbakwara ama ntụkwasị obi Keleb nke na Jehova nọnyeere ndị Ya.
Ọ bụ n’afọ nke abụọ mgbe Ọpụpụ ha pụrụ n’Ijipt gasịrị, ndị Israel makwara ụlọ ikwuu ha na Kedesh-banea dị n’ọzara nke Peran. Ha adịwo njikere ịbanye n’ókèala nke Ala Nkwa ahụ. Dị ka Chineke nyere iwu, Mosis na-achọ iziga ndị nledo 12 gaa na Kenean. Ọ sịrị: “Rịgoonụ n’ụzọ a n’ime Negeb, rịgookwanụ n’ugwu: wee hụ ala ahụ, ihe ọ bụ; na ndị ahụ ndị bi na ya, ma ọ bụ ndị dị ike ka ha bụ, ma ọ bụ ndị na-adịghị ike, ma ọ bụ mmadụ ole na ole ka ha dị, ma ọ bụ ọtụtụ mmadụ; na ihe ala ahụ bụ nke ndị ahụ na-ebi n’ime ya, ma ọ bụ ezi ala ka ọ bụ ma ọ bụ ala ọjọọ; na ihe obodo nile bụ nke ndị ahụ na-ebi n’ime ha, ma ọ bụ na ha bi n’ọmụmụ ụlọikwuu, ma ọ bụ n’ebe e wusiri ike; na ihe ala ahụ bụ, ma ọ bụ osisi dị n’ime ya, ma ọ bụ na ọ dịghị. Meekwa onwe unu ka unu dị ike, wetakwa ụfọdụ n’ime mkpụrụ ala ahụ.”—Ọpụpụ 13:17-20.
Ndị ikom 12 ahụ malitere njem ha dị ize ndụ. Njem ha were 40 ụbọchị. Na Hebron ha hụrụ ndị ikom gbara agba. Ná ndagwurugwu Eshkol, ha rịbara ama otú ala ahụ si emepụta ihe oriri wee kpebie iwere ụfọdụ n’ime mkpụrụ osisi ya. Otu ụyọkọ mkpụrụ vine ahụ dị arọ nke ukwuu nke na mmadụ abụọ aghaghị iburu ya n’okporo osisi!—Ọnụ Ọgụgụ 13:21-25.
N’ịlaghachi n’ebe ndị Israel mara ụlọikwuu ha, ndị nledo ahụ kọọ, sị: “Anyị bara n’ala ahụ ebe i zigara anyị, ọzọkwa, n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru n’ime ya ka ọ bụ; nke a bụkwa mkpụrụ ya. Otú ọ dị, ndị bi n’ala ahụ dị ike, e wusikwara obodo nile ha ike, ha dịkwa ukwuu hie nne: ọzọkwa, ụmụ Anak ka anyị anyị hụrụ n’ebe ahụ. Amalek bi n’ala Negeb: ndị Het na ndị Jebus na ndị Amọraịt bi n’ugwu: ndị Kenean bi n’ụsọ oké osimiri, na n’akụkụ Jọdan.” (Ọnụ Ọgụgụ 13:26-29) Ndị nledo iri adịghị njikere ịnakwere iwu Chineke ma zọrọ ije banye n’Ala Nkwa ahụ.
“Jehova Nọnyeere Anyị”
Otú ọ dị, site n’okwukwe o nwere n’ebe Jehova Chineke nọ, Keleb ahụ na-adịghị atụ egwu gbara ume, sị: “Ka anyị rịgoo nnọọ, nweta ya; n’ihi na anyị pụrụ ime ya nke ọma.” Ma ndị nledo iri ahụ ekwetaghị, na-ekwu na ndị bi na Kenean dị ike karịa ndị Israel. Ndị nledo ahụ ụjọ ji, ndị na-enweghịkwa okwukwe, lere onwe ha anya dị ka nanị ogugu ná ntụnyere.—Ọnụ Ọgụgụ 13:30-33.
“Jehova nọnyeere anyị: ;unu atụla egwu ha,” ka Keleb na Joshua gbara ume, Ihe ha kwuru abaghị ha ntị. Mgbe ndị ahụ kwuru okwu banyere iji nkume tụgbuo ha, Chineke batara n’okwu ahụ wee maa ndị ntamu ahụ ikpe, sị: “Unu onwe unu agaghị aba n’ala ahụ ma ọlị, nke m buliri aka m ime ka unu biri n’ime ya, ma ọ bụghị Keleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun. Ma ụmụntakịrị unu . . . m ga-emekwa ka ha baa, ha ga-amakwa ala ahụ nke unu jụrụ ajụ. . . . Ụmụ unu ga-abụkwa ndị ọzụzụ atụrụ n’ọzara [iri ụbọchị anọ], . . . ruo mgbe ozu unu ga-agwụsị n’ọzara. Dị ka ọnụ ọgụgụ ụbọchị nke unu ji ledo ala ahụ anya si dị, bụ́ [iri ụbọchị anọ], otú a ka unu ga-ebu ajọ ajọ omume nile unu, [iri afọ anọ], unu ga-ama ịjụ ajụ m.”—Ọnụ Ọgụgụ 14:9, 30-34.
Ka Kwesịkwa Ntụkwasị Obi Mgbe Ọtụtụ Afọ Gasịrị
Ọmụmụ ikpe ahụ were 40 afọ gwụsịrị, ọnwụ gbukwara otu ọgbọ nile nke ndị ntamu. Ma Keleb na Joshua ka na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke. N’ala iha na-adịghị nke Moab, Mosis na Onye Isi Nchụàjà bụ́ Eleeza agụwo ndị ikom ruru ogo ije agha ọnụ, bụ́ ndị dị 20 afọ na karịa. Site n’agbụrụ ọ bụla nke Israel, Chineke kpọrọ aha otu nwoke nke a ga-atụkwasị nkewa nke Ala Nkwa ahụ n’aka ya. Keleb, Joshua, na Eleeza so n’ime ha. (Ọnụ Ọgụgụ 34:17-29) Ọ bụ ezie na ọ dị 79 afọ ugbu a, Keleb gbasiri ike, na-anọgidesi ike n’ihe, bụrụkwa onye na-adịghị atụ egwu.
Mgbe Mosis na Erọn gụrụ ọnụ ọgụgụ nke ndị ha na Saịnaị n’oge na-adịghị anya tupu ha ejiri ịtụ egwu jụ ịbanye n’ala Kenean, ọnụ ọgụgụ ndị na-alụrụ Israel agha dị 603,550. Mgbe iri afọ anọ gasịrị n’ọzara ahụ, e nwere ndị agha dị ala karị nke bụ 601,730. (Ọnụ Ọgụgụ 1:44-46; 26:51) Ma, site na Joshua ịnọ n’isi ha nakwa Keleb na-ekwesị ntụkwasị obi ịnọ n’etiti ha, ndị Israel banyere n’Ala Nkwa ahụ, nweekwa mmeri mgbe mgbe. Dị ka Joshua na Keleb tụworo anya ya mgbe nile, Jehova na-emeriri ndị ya agha dị iche iche.
Site n’ịkpọrọ ndị ikom na-alụrụ Israel agha gafee Osimiri Jọdan, Joshua na Keleb ahụ meworo agadi buru ibu ọrụ ha n’agha ndị e mesịrị lụọ. Otú ọ dị, mgbe afọ isii nke ịlụ agha gasịrị, ọtụtụ ala ndị a ga-enweta ka fọdụrụ. Jehova gaje ịchụpụ ndị bi na ha, ma ugbu a o nyere iwu ka e kee ala ahụ site n’ife nzà n’etiti agbụrụ ndị dị n’Israel.—Joshua 13:1-7.
O Soro Jehova n’Azụ n’Ụzọ Zuru Ezu
Dị ka aka ochie n’ịlụ ọtụtụ agha, Keleb guzoro n’ihu Joshua wee kwuo, sị: “[Iri afọ anọ] ka m gbara mgbe Mosis, bụ́ ohu Jehova, si na Kedesh-banea zipụ m iledo ala nke a; m wee weghachiri ya okwu dị ka o si dị n’obi m. Ma ụmụnne m ndị mụ na ha rịgoro mere ka obi lọọ ndị Israel mmiri: ma mụ onwe m sozuru Jehova, bụ́ Chineke m, n’azụ.” (Joshua 14:6-8) Ee, Keleb esowo Jehova n’azụ n’ụzọ zuru ezu, na-anọgidesi ike n’ihe n’ime uche Chineke.
Keleb kwukwara, sị, “Mosis wee ṅụọ iyi n’ụbọchị ahụ, sị, Ala nke ị zọkwasịrị ụkwụ aghaghị ịbụrụ gị na ụmụ gị ihe nketa ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na i sozuwo Jehova, bụ́ Chineke m, n’azụ. Ma ugbu a, lee, Jehova emewo ka m dị ndụ, dị ka o kwuru, [iri afọ anọ na ise] ndị a, site na mgbe Jehova gwara Mosis okwu a, mgbe Israel jere ije n’ọzara: ma ugbu a, lee, mụ onwe m gbara [iri afọ asatọ na ise] taa. Ruo ugbu a m dị ike taa dị ka m dị n’ụbọchị Mosis zigara m: dị ka ike m si dị mgbe ahụ, otú a ka ike m dịkwa ugbu a, ibu agha, na ịpụ apụ, na ịbata abata. Ma ugbu a, nye m ugwu a, nke Jehova kwuru okwu banyere ya n’ụbọchị ahụ; n’ihi na ị nụrụ n’ụbọchị ahụ na ndị Anak nọ n’ebe ahụ, na obodo dị ukwuu nke e wusiri ike: eleghị anya Jehova ga-anọnyere m, m ga-anapụkwa ha ala ha, dị ka Jehova kwuru.” Ugbu a Keleb nwetara Hebron dị ka ihe nketa.—Joshua 14:9-15.
Keleb ahụ meworo agadi anatawo ọrụ kasị sie ike—ógbè nke jupụtara ná ndị ikom gbara agba nke ukwuu. Ma nke a esighị oké ike nye dike n’agha nke a dị 85 afọ. N’oge na-adịghị anya e meriri ndị mmekpa ahụ bi na Hebron. Ọtniel, bụ́ nwa nwanne nwoke Keleb nke ọ tọrọ na onye ikpe n’Israel, meriri Debia. Obodo abụọ abụ mesịrị bụrụ ebe ndị Livai bi, Hebron wee ghọọ obodo mgbaba maka ndị na-amaghị ụma gbuo mmadụ.—Joshua 15:13-19; 21:3, 11-16; Ndị Ikpe 1:9-15, 20.
Nọgide Na-eso Jehova n’Azụ n’Ụzọ Zuru Ezu
Keleb na Joshua bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Otú o sina dị, ha ji ikwesị ntụkwasị obi mee uche Jehova. Okwukwe ha adaghị n’oge 40 afọ nke ihe isi ike n’ọzara bụ́ nke sitere n’ọdịda Israel dara n’irubere Chineke isi. N’otu aka ahụ, ndị ohu Jehova nke oge a adịghị ekwe ka ihe ọ bụla gbochie ozi ha na-eji enye Chineke otuto. Ebe ha maara na ọgụ dị n’etiti nzukọ Chineke na nke Setan bụ́ Ekwensu, ha na-eguzosi ike, nọgide na-achọ ime ihe ga-atọ Nna ha nke eluigwe ụtọ n’ihe nile.
Dị ka ihe atụ, ọtụtụ n’ime ndị Jehova anọwo n’ihe ize ndụ nke mmeso obi ọjọọ na ọbụna ọnwụ iji mee ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, ma ọ bụ Ememe Ncheta nke ọnwụ Jisọs Kraịst. (1 Ndị Kọrint 11:23-26) N’ihe banyere nke a otu onye Kraịst bụ́ nwanyị nke a tụbara n’otu ogige ịta ahụhụ ndị Nazi n’oge Agha Ụwa nke Abụọ na-akọ, sị:
A gwara mmadụ nile ka ha nọrọ n’ebe a na-asa ákwà n’elekere 11 nke oge abalị. Kpọmkwem n’elekere 11 nke oge abalị, anyị zukọrọ, na-eru 105 n’ọnụ ọgụgụ. Anyị guzoro okirikiri n’ụzọ dịkọrọ ọnụ, n’etiti anyị [e nwere] otu oche stool e kpuchiri ákwà ọcha nke a dọkwasịrị ihe nnọchianya ndị ahụ. Otu ọkụ kandụl na-enwu n’ụlọ ahụ, ebe ọ bụ na ọkụ eletrik gaara ekpughe anyị. Anyị nwere mmetụta yiri nke ndị Kraịst oge ochie ahụ nọ n’oghere dị n’ime ala. Ọ bụ ememe dị jụụ. Anyị kwupụtaghachiri nkwa nyị sitere n’ezi obi nye Nna anyị iji ume anyị nile mee ihe maka iwepụ aha nsọ Ya n’ụta, iji ikwesị ntụkwasị obi na-eguzosi ike maka Ọchịchị Chineke.”
N’agbanyeghị ọnwụnwa anyị nile dị ka ndị ohu Jehova a na-akpagbu, anyị pụrụ ịdabere n’ume nke Chineke na-enye iji jeere ya ozi n’obi ike ma wetara ha nsọ ya otuto. (Ndị Filipaị 4:13) Ka anyị na-agba mbọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ, ọ ga-abụ ihe dị mma nye anyị icheta Keleb. Ihe nlereanya ya n’iso Jehova n’azụ n’ụzọ zuru ezu kpaliri nnọọ mmasị nke otu nwa okorobịa nke banyere n’ọrụ nkwusa oge nile laa azụ na 1921. O dere, sị:
“Ọ bụ ezie na ịghọ onye ọsụ ụzọ pụtara ịhapụ ezigbo ọrụ m na-arụ n’ebe a na-ebipụta akwụkwọ n’ụzọ ọgbara ọhụrụ dị na Coventry [England], adịghị m akwa arịrị ọ bụla. Nraranye m akwụwo ụgwọ nke ahụ; ndụ m bụ nke a raara nye Chineke. Echetara m Keleb, bụ́ onye so Joshua banye n’Ala Nwa ahụ na onye e kwuru banyere, sị, ‘O sozuru Jehova n’azụ.’ (Joshua 14:8) Nke ahụ na-eyi m ka ọ bụ àgwà dị mma. Amaara m na ijere Chineke ozi ‘n’ụzọ zuru ezu’ ga-eme ka ndụ m nke m raara nye bụrụ ihe dị mkpa karị; ọ ga-enyekwu m ohere ịmịpụta mkpụrụ ahụ nke na-aka onye Kraịst akara.”
N’ezie a gọzịrị Keleb maka iji ịnọgidesi ike n’ihe na-eso Jehova n’azụ n’ụzọ zuru ezu, na-achọ ime uche Chineke mgbe nile. Dị ka ya, ndị ọzọ enwewo ọṅụ dị ukwuu na ngọzi bara ụba n’ozi Chineke. Ka nke ahụ bụrụ ahụmahụ gị dị ka onye nọgidere na-eso Jehova n’azụ n’ụzọ zuru ezu.
[Foto dị na peeji nke 26]
Keleb na Joshua kwesịrị ntụkwasị obi nye Jehova n’okpuru ule. Ị̀ na-eme otú ahụ?