Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 50
  • Ndị Inyom Abụọ Ndị Nwere Obi Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Inyom Abụọ Ndị Nwere Obi Ike
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Ndú Ọhụrụ na Ụmụ Nwaanyị Abụọ Katara Obi
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • “M Biliri Dị Ka Nne n’Izrel”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Site n’Okwukwe, Berak Chụlagara Usuu Ndị Agha Dị ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Na-ewepụta Onwe Gị Ijere Jehova Ozi Ka E Too Ya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 50
Berak amaghị ihe ọ ga-ekwu ekwu mgbe Jel gosiri ya ozu Sisera n’ime ụlọ ntu Jel

AKỤKỌ NKE 50

Ndị Inyom Abụọ Ndị Nwere Obi Ike

MGBE ọ bụla ụmụ Izrel dabara ná nsogbu, ha na-akpọku Jehova. Jehova na-aza ha site n’inye ha ndị ndú nwere obi ike inyere ha aka. Bible na-akpọ ndị ndú ndị a ndị ikpe. Jọshụa bụ onyeikpe mbụ Izrel nwere, ma aha ụfọdụ ndị ikpe ndị sochiri ya bụ Ọtniel, Ihud, na Shamga. Mmadụ abụọ n’ime ndị nyeere Izrel aka bụ ndị inyom a na-akpọ Debọra na Jel.

Debọra na Berak

Debọra bụ onye amụma nwaanyị. Jehova na-agwa ya okwu banyere ọdịnihu, e mesịa ya agwa ndị Izrel ihe Jehova kwuru. Debọra bụkwa onyeikpe. Ọ na-anọdụ ala n’okpuru otu nkwụ nke dị n’otu obodo nta dị n’ugwu, ndị mmadụ na-abịakwutekwa ya ka o nyere ha aka ná nsogbu ha.

N’oge ahụ, Jebin bụ eze ndị Kenan. O nwere narị ụgbọ ịnyịnya itoolu. Ndị agha ya dị nnọọ ike nke na ha manyere ọtụtụ ndị Izrel ịbụ ndị ohu Jebin. Aha onyeisi ndị agha nke Eze Jebin bụ Sisera.

Otu ụbọchị, Debọra ziri ozi ka a kpọọ Onyeikpe bụ́ Berak, ma gwa ya, sị: ‘Jehova sịrị: “Kpọrọ puku ndị ikom iri jee n’Ugwu Tebọ. N’ebe ahụ ka m ga-arara Sisera nye n’aka gị. M ga-emekwa ka i merie ya na ụsụụ ndị agha ya.”’

Berak wee sị Debọra: ‘M ga-eje ma ọ bụrụ na ị ga-eso m jee.’ Debọra wee soro ya jee, ma ọ sịrị Berak: ‘Ị gaghị enwe otuto maka mmeri ahụ, n’ihi na Jehova ga-arara Sisera nye n’aka nwaanyị.’ Nke ahụ bụkwa ihe mere.

Berak wee si n’Ugwu Tebọ rịda izute ndị agha Sisera. Na mberede, Jehova mere ka e nwee idei mmiri nke rikpuru ọtụtụ n’ime ndị agha ahụ bụ́ ndị iro. Ma Sisera rịgooro n’ụgbọ ịnyịnya ya wee gbaa ọsọ.

Mgbe ọ gbatetụrụ aka, Sisera ruru n’ụlọ ntu nke Jel. Jel wee kpọbata ya nye ya mmiri ara ehi. Nke a mere ka ụra tụwa ya, n’oge na-adịghịkwa anya, oké ụra buuru ya. Jel wee were ntu nke ụlọ ntu ahụ kpọnye ajọ nwoke ahụ n’isi. E mesịa, mgbe Berak bịara, o wee gosi ya ozu Sisera! Ị hụzielanụ otú ihe Debọra kwuru si mezuo.

N’ikpeazụ, e gbukwara Eze Jebin, ndị Izrel wee nwee udo ọzọ ruo nwa oge.

Ndị Ikpe 2:14-22; 4:1-24; 5:1-31.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya