Site n’Okwukwe, Berak Chụlagara Usuu Ndị Agha Dị ike
WERE ya na ị na-eche ìgwè ndị agha bụ́ ndị iro ihu. Ha ji ngwá agha kasị bụrụ nke ọgbara ọhụrụ, ha dịkwa njikere iji ha mee ihe. Ọ fọrọ nnọọ nke nta ka ọ bụrụ na gị na ndị gị na ha so enweghị ihe ọ bụla unu ji echebe onwe unu.
N’oge ndị ikpe Izrel, Berak, Debọra, na ndị Izrel ibe ha dị 10,000 nwere ahụmahụ dị otú ahụ. Usuu ndị agha ndị iro ahụ bụ ndị Kenan, bụ́ ndị ọchịagha bụ́ Sisera bụ onye ndú ha. Ngwá agha ha gụnyere ụgbọ ịnyịnya, bụ́ ndị e tinyere ígwè na-egbu mmadụ na wiil ha. Ebe ọ ga-akpọtụ bụ n’Ugwu Teboa na na ndagwurugwu mmiri iyi Kaịshọn. Ihe mere n’ebe ahụ mere ka a mata Berak dị ka nwoke nwere okwukwe kwesịrị nṅomi. Tụlee ihe omume ndị dugara ná mburịta agha a.
Izrel Etikuo Jehova
Akwụkwọ Ndị Ikpe na-ekwu banyere mgbahapụ Izrel gbahapụrụ ezi ofufe ugboro ugboro na ọdachi ndị omume dị otú ahụ kpatara. N’ọnọdụ nke ọ bụla, Chineke ịhọpụta onye nzọpụta, ntọhapụ, sochiri arịrịọ e ji ezi obi rịọ maka ebere Chineke, mgbe ahụkwa, nnupụisi amaliteghachi. Dị ka usoro ahụ si dị, “ụmụ Izrel wee meekwa ọzọ ihe ọjọọ n’anya Jehova, mgbe Ihud [onye ikpe nke zọpụtara ha site ná mmegbu nke ndị Moab] nwụsịrị.” N’ezie, “ha họpụtara chi ọhụrụ dị iche iche.” Gịnị si na ya pụta? “Jehova wee renye ha n’aka Jebin, bụ́ eze Kenan, onye bụ eze n’ime Hezoa; onyeisi usuu ndị agha ya bụkwa Sisera . . . Ụmụ Izrel wee tikuo Jehova: n’ihi na [Sisera] nwere [narị ụgbọala ígwè itoolu]; ya onwe ya wee megbusie ụmụ Izrel ike afọ [iri abụọ].”—Ndị Ikpe 4:1-3; 5:8.
Banyere ihe ndụ dị ka ya n’Izrel, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “[N’ụbọchị ndị ahụ] okporo ụzọ nile ghara ịdị, ndị na-eje ije n’ụzọ wee jee n’okporo ụzọ gbagọrọ agbagọ. Obodo nta wee ghara ịdị.” (Ndị Ikpe 5:6, 7) Egwu tụrụ ndị mmadụ n’ihi ìgwè ndị ịnyịnya na-agbagharị ma na-akwakọrọ ihe ndị mmadụ. “Egwu chịkwara ndụ ndị Izrel,” ka otu ọkà mmụta na-ekwu, “ógbè ahụ dum yiri ndị ike gwụrụ na ndị na-apụghị inyere onwe ha aka.” Ya mere, dị ka ha meworo ọtụtụ ugboro tupu mgbe ahụ, ndị Izrel ahụ dara mbà tikuru Jehova maka enyemaka.
Jehova Ahọpụta Onye Ndú
Oge mmegbu nke ndị Kenan ghọọrọ mba Izrel oge ọgba aghara. Chineke ji onye amụma nwanyị bụ́ Debọra mee ihe iji mee ka a mata amamikpe na ntụziaka ya. Jehova si otú a nye ya ihe ùgwù nke ije ozi dị ka nne ihe atụ n’Izrel.—Ndị Ikpe 4:4; 5:7.
Debọra kpọrọ Berak ma sị ya: “Ó nyeghị gị iwu, bụ́ Jehova, Chineke nke Izrel, sị, Jee, dọrọ ruo n’ugwu Teboa, chịrịkwa n’onwe gị [puku ndị ikom iri] sitere n’ụmụ Naftalaị, sitekwa n’ụmụ Zebulọn? M ga-adọkwa Sisera, bụ́ onyeisi usuu ndị agha Jebin, ruo gị ahụ́, ruo mmiri iyi Kaịshọn, ya na ụgbọala ya na ìgwè ndị ya; M ga-enyekwa ya n’aka gị.” (Ndị Ikpe 4:6, 7) Site n’ịsị “ó nyeghị gị iwu, bụ́ Jehova”? Debọra mere ka ọ pụta ìhè na ya enweghị ikike ịchịkwa Berak. O jere ozi nanị dị ka onye Chineke si n’aka ya nye iwu. Olee otú Berak si zaghachi?
“Ọ bụrụ na i soro m jee,” ka Berak kwuru, “m ga-ejekwa: ma ọ bụrụ na i soghị m jee, m gaghị eje.” (Ndị Ikpe 4:8) N’ihi gịnị ka Berak ji na-ala azụ ịnakwere ibu ọrụ Chineke nyere ya? Ọ̀ na-eme ihe dị ka onye ụjọ? Ọ̀ bụ na ọ tụkwasịghị nkwa Chineke obi? Ee e. Berak ajụghị ọrụ ahụ, o nupụrụghịkwa Jehova isi. Kama nke ahụ, nzaghachi ya gosiri na o nwere mmetụta nke ịbụ onye na-erughị eru imezu iwu Chineke n’ike nke aka ya. Ọnụnọ nke onye nnọchiteanya Chineke ga-eme ka o jide n’aka na Chineke ga-eduzi ya, meekwa ka ya na ndị ikom ya nwee obi ike. N’ihi ya, kama ịbụ ihe àmà nke adịghị ike, ihe ahụ Berak kwuru bụ ihe na-egosipụta na o nwere okwukwe siri ike.
A pụrụ iji mmeghachi omume Berak tụnyere nke Mozis, Gidiọn, na Jeremaịa. Ndị ikom a atụkwasịghịkwa ikike nke onwe ha obi iji rụzuo ọrụ Chineke nyere ha. Ma e leghị ha anya dị ka ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi n’ihi nke ahụ. (Ọpụpụ 3:11-4:17; 33:12-17; Ndị Ikpe 6:11-22, 36-40; Jeremaịa 1:4-10) Gịnịkwa ka a pụrụ ikwu banyere àgwà Debọra? Ọ nwaghị iweghara ọrụ ahụ. Kama nke ahụ, ọ nọgidere bụrụ ohu Jehova maara ebe ike ya ruru. “Aghaghị m isoro gị jee,” ka ọ gwara Berak. (Ndị Ikpe 4:9) Ọ dị njikere ịhapụ ebe obibi ya—ebe dị nchebe karị—iji sonyere Berak maka agha nke na-achọ ịda. Debọra gosikwara okwukwe na obi ike kwesịrị nṅomi.
Ha Ejiri Okwukwe Soro Berak
Ebe ndị agha Izrel ga-ezukọta bụ n’ugwu a ma ama nke a na-akpọ Teboa. Ebe ahụ bụ ebe kwesịrị ekwesị. Ọ bụ nnọọ ebe nzukọ kwesịrị ekwesị maka ebo Naftalaị na Zebulọn bụ́ ndị bi nso ebe ahụ. Ya mere, dị ka Chineke nyere n’iwu, puku ndị ikom iri ahụ bụ́ ndị nyere onwe ha n’afọ ofufo—na Debọra—sooro Berak gbagoo n’ugwu a.
A chọrọ okwukwe n’aka ndị nile sonyeere Berak. Jehova ekwewo Berak nkwa na ọ ga-emeri ndị Kenan, ma olee ngwá agha ndị Izrel nwere? Ndị Ikpe 5:8 na-ekwu, sị: ‘A hụghị ọta ma ọ bụ ube n’etiti iri puku mmadụ anọ n’Izrel.’ Ya mere, ndị Izrel ejighị ngwá agha zuru ezu. Ya bụrụgodị na ha ji ngwá agha, a pụghị iji ọta na ube tụnyere ụgbọ ịnyịnya ígwè e ji ebu agha. N’ịnụ na Berak arịgowo Ugwu Teboa, Sisera chịkọtara ụgbọ ịnyịnya na ìgwè ndị agha ya nile ozugbo gawa na ndagwurugwu mmiri iyi Kaịshọn. (Ndị Ikpe 4:12, 13) Ihe Sisera na-aghọtaghị bụ na ọ na-aga ịlụso Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile ọgụ.
Berak Achụlaga Usuu Ndị Agha Sisera
Mgbe oge nzute ahụ ruru, Debọra gwara Berak, sị: “Bilie; n’ihi na nke a bụ ụbọchị nke Jehova nyeworo Sisera n’aka gị: Jehova, Ọ́ pụghị wee jee n’ihu gị?” Berak na ndị ikom ya ga-esi n’elu Teboa na-agbadata na ndagwurugwu, ma n’ebe ahụ, ụgbọ ịnyịnya Sisera ga-anọ n’ọnọdụ ka mma imeri ha. Olee otú ọ gaara adị gị ma a sị na i so n’usuu ndị agha Berak? Ị̀ gaara erube isi ozugbo, na-echeta na ntụziaka ahụ sitere n’aka Jehova? Berak na puku ndị ikom iri ya rubere isi. “Jehova wee were ọnụ mma agha chụsaa Sisera, na ụgbọala ya nile, na ọmụma ụlọikwuu ya nile, n’ihu Berak.”—Ndị Ikpe 4:14, 15.
Site n’enyemaka Jehova, Berak chụlagara ndị agha Sisera. Ihe ndekọ nke agha ahụ akọwaghị ihe nile merenụ. Otú ọ dị, abụ mmeri Berak na Debọra na-ekwu na ‘eluigwe na igwe ojii bụrụ mmiri.’ O yiri nnọọ ka oké mmiri ozuzo ò mere ka ụgbọ ịnyịnya Sisera mie n’apịtị, wee mee ka Berak merie. Ngwá agha bụ́ isi nke ndị Kenan si otú ahụ ghọọrọ ha ibu arọ. Banyere ozu ndị ikom Sisera, abụ ahụ na-ekwu, sị: “Mmiri iyi Kaịshọn bupụrụ ha.”—Ndị Ikpe 5:4, 21.
Ihe a ò mere eme n’ezie? Mmiri iyi Kaịshọn bụ ndagwurugwu ebe e nwere obere iyi na-asọ asọ. Mgbe e nwere oké mmiri ozuzo ma ọ bụ mgbe mmiri zoro ruo ogologo oge, o yikarịrị ka ụdị iyi ndị ahụ hà ga-etoju ngwa ngwa ma ghọọ iyi ndị na-ekwo ekwo na ndị dị ize ndụ. N’oge Agha Ụwa Mbụ, e kwuru na nanị mmiri ozuzo zokwasịrị n’ájá ụrọ dị n’otu ebe ahụ ruo ihe dị ka minit 15 mere ka ngafe siere ụgbọ ịnyịnya agha nile ike. Ihe ndekọ nke agha Napoleon na ndị Turkey lụrụ n’Ugwu Teboa n’April 16, 1799, kọrọ na “mmiri riri ọtụtụ ndị Turkey ka ha na-anwa isi n’otu akụkụ nke ala ahụ dị larịị bụ́ ebe mmiri Kaịshọn tojuru gbalaga.”
Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Flavius Josephus na-ekwu na ka usuu ndị agha Sisera na Berak na-achọ izute, “oké ifufe malitere ife, ya na oké mmiri ozuzo na akụ́ mmiri igwe, ifufe ahụ buuru mmiri kpuchie ndị Kenan ihu, nke na akụ́ na ebe ha abaghịrị ha uru ọ bụla.”
“N’eluigwe ka ha si buo agha,” ka Ndị Ikpe 5:20 na-ekwu, “kpakpando si n’ụzọ nile ha a tụliri atụli buso Sisera agha.” Olee otú kpakpando si buso Sisera agha? Ụfọdụ na-ele okwu a anya dị ka ihe na-ezo aka n’enyemaka Chineke. Ndị ọzọ na-atụ aro na ọ na-ezo aka n’enyemaka ndị mmụọ ozi, iberibe nkume ndị si n’eluigwe na-ada, ma ọ bụ ná ndabere Sisera dabeere n’ihe ndị na-agụ kpakpando kwuru ga-eme bụ́ ndị na-emezughị. Ebe ọ bụ na Bible akọwaghị kpọmkwem otú kpakpando si lụọ ọgụ n’agha a, o yiri ka ọ ga-ezu iwere okwu a dị ka ihe na-egosi na e nwere otú Chineke si tinye aka n’ihi usuu ndị agha Izrel. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, ndị Izrel ji ọnọdụ ahụ mee ihe n’ụzọ zuru ezu. “Berak chụrụ ụgbọala ya nile n’azụ . . . ọmụma ụlọikwuu nile nke Sisera wee daa n’ọnụ mma agha; ọ dịghị otu nwoke fọdụrụ.” (Ndị Ikpe 4:16) Gịnị mere onyeisi usuu ndị agha ahụ bụ́ Sisera?
Onye Mmegbu ahụ Adaba “n’Aka Nwanyị”
“Ma Sisera,” ka Bible na-ekwu, “[hapụrụ agha ahụ ma gbalaga] n’ụkwụ ya ruo ụlọikwuu Jael, bụ́ nwunye Heba onye Kinaịt, n’ihi na udo dị n’etiti Jebin, bụ́ eze Hezoa, na ụlọ Heba, bụ́ onye Kinaịt.” Jael kpọbatara Sisera n’ụlọikwuu ya, nye ya mmiri ara ehi ka ọ ṅụọ, ma kpuchie ya ákwà, o wee hie ụra. Mgbe ahụ, Jael “wee were ntú ụlọikwuu, jidekwa otùtù n’aka ya,” bụ́ ihe onye bi n’ụlọikwuu na-eji eme ihe mgbe mgbe. “Bakwuru ya nwayọọ, kpọba ntú ahụ n’akụkụ egedege ihu ya, ntú ahụ wee kpọpuo baa n’ala; n’ihi na nwoke ahụ dị n’oké ụra, ike gwụkwara ya; o wee nwụọ.”—Ndị Ikpe 4:17-21.
Mgbe ahụ Jael pụtara izute Berak ma sị ya: “Bịa, m ga-emekwa ka ị hụ nwoke ahụ nke gị onwe gị na-achọ.” Ihe ndekọ ahụ na-agbakwụnye, sị: “O wee bakwuru ya; ma, lee, Sisera adawo nwụọ, ntú ahụ dịkwa n’akụkụ egedege ihu ya.” Lee ahụmahụ na-ewusi okwukwe ike nke ahụ na-aghaghị ịbụworo Berak! Tupu mgbe ahụ, onye amụma nwanyị ahụ bụ́ Debọra gwara ya, sị: “Ọjịja gị agaghị adị n’ije nke gị onwe gị na-eje; n’ihi na ọ bụ n’aka nwanyị ka Jehova ga-erenye Sisera.”—Ndị Ikpe 4:9, 22.
À pụrụ ile ihe ahụ Jael mere anya dị ka aghụghọ? Jehova eleghị ya anya otú ahụ. “Karịa ndị inyom n’ụlọikwuu ka a ga-agọzi ya,” ka abụ mmeri Berak na Debọra kwuru. Abụ ahụ gosiri otú e kwesịrị isi lee ọnwụ Sisera anya. A kọwara nne ya dị ka onye nọ na-echesi ike ka ọ lọta n’agha. “Gịnị mere ụgbọala ya na-anọ ọdụ ịbịa?” ka ọ nọ na-ajụ. “Ndị isi ya ndị inyom ndị maara ihe” gbalịrị ime ka ụjọ ghara ịtụ ya site n’ikwu na ọ ghaghị ịbụ na ọ nọ na-ekere ndị ikom ya ihe ha kwatara n’agha—uwe ndị mara mma a kpara nke ọma na ụmụ agbọghọ. Ndị inyom ahụ jụrụ, sị: “Hà achọtaghị? hà ekeghị ihe nkwata? Otu nwa agbọghọ, ụmụ agbọghọ abụọ, ga-adịrị nwoke ọ bụla, n’isi n’isi; ihe nkwata bụ́ uwe e sijiri esiji, dịịrị Sisera . . . Uwe . . . a kpara nke ọma, bụ́ uwe e sijiri esiji nke a kpara nke ọma n’akụkụ abụọ, nke dịịrị olu ndị a kwatara.”—Ndị Ikpe 5:24, 28-30.
Ihe Anyị Na-amụta
Ihe ndekọ banyere Berak na-akụziri anyị ihe ndị dị mkpa. Ndị wepụrụ Jehova ná ndụ ha ga-enwerịrị nsogbu na nkụda mmụọ. Ndị ji nchegharị chigharịkwuru Chineke ma nwee okwukwe n’ebe ọ nọ pụrụ inwere onwe ha pụọ n’ụdị mmegbu dịgasị iche iche. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghịkwa ịzụlite mmụọ nke nrubeisi? Ọbụna mgbe ihe ndị Chineke chọrọ yiri ka hà megidere echiche mmadụ, anyị pụrụ inwe obi ike na ntụziaka ya na-abụ mgbe nile maka abamuru anyị. (Aịsaịa 48:17, 18) Ọ bụ nanị inwe okwukwe na Jehova na irube isi ná ntụziaka Chineke mere ka Berak nwee ike ‘ịchụlaga usuu ndị agha ndị mba ọzọ.’—Ndị Hibru 11:32-34.
Mmechi na-emetụ n’ahụ́ nke abụ Debọra na Berak bụ: “Otú a ka ndị iro Gị nile ga-ala n’iyi Jehova: ma ndị na-ahụ Ya n’anya ga-adị ka anyanwụ mgbe ọ na-anapụta n’ike ya.” (Ndị Ikpe 5:31) Lee ka nke a ga-esi bụrụ eziokwu mgbe Jehova ga-eweta ajọ ụwa Setan ná njedebe!
[Foto dị na peeji nke 29]
Jehova si n’aka Debọra kpọọ Berak
[Foto dị na peeji nke 31]
Mmiri Iyi Kaịshọn etojuo ikperé mmiri ya
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Foto dị na peeji nke 31]
Ugwu Teboa