Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • hp isi 10 p. 96-102
  • Ahụ Ike Ka Mma na Ndụ Ka Ogologo—n’Ụzọ Dị Aṅaa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ahụ Ike Ka Mma na Ndụ Ka Ogologo—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
  • Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NDỤMỌDỤ NKE NA-AKWALITE EZI AHỤ IKE
  • ỤTABA, IHE ỌṄỤṄỤ NA-ABA N’ANYA NA ỌGWỤ ỌJỌỌ
  • IHE MERE NA ỤZỌ A GA-EJI TINYE NDỤMỌDỤ CHINEKE N’ỌRỤ
  • Nsọpụrụ Maka Onyinye nke Ndụ
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Ịṅụ Sịga Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ọ̀ Na-ewute Chineke na M Na-aṅụ Sịga?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Azịza Ndị Na-enye Aka!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
hp isi 10 p. 96-102

Isi 10

Ahụ Ike Ka Mma na Ndụ Ka Ogologo​—⁠n’Ụzọ Dị Aṅaa?

1-6. Olee ihe ndị mere ị ga-eji mara na Chineke nwere mmasị n’ebe ahụ ike gị dị?

EZI ahụ ike pụrụ itinye ihe dị ukwuu n’obi ụtọ mmadụ. Ma anyị nile na-arịa ọrịa mgbe ụfọdụ. Ọrịa siri ike pụkwara iduje n’ọnwụ. A tụlere nsogbu ndị a n’ime Bible, bụ́ nke na-enye nduzi ndị pụrụ inyere mmadụ aka inwe ahụ ike ka mma na ndụ ka ogologo.

2 Akwụkwọ Nsọ na-echetara anyị na Jehova Chineke bụ Isi Iyi nke ndụ. N’ihi ya “ka anyị na-adị ndụ, na-ejegharịkwa, na-adịkwa.” (Abụ Ọma 36:9; Ọrụ 17:​25, 28) Ọ na-agwakwa anyị ihe dị ukwuu banyere otú anyị ga-esi lekọta onwe anyị. E nwere ọrịa ndị na-eri oké ego na ndị na-akụ ngwụrọ, bụ́ ndị a pụrụ izere site n’ige ntị na ndụmọdụ nke dị n’Okwu ya. Ndị meworo otú ahụ nwere ihe mere ha ga-eji kwenyere onye ahụ so dee Bible, bụ́ onye kwuru, sị: “Iwu ọnụ [Chineke] dị mma karịa ọlaedo na ọlaọcha na-adịghị ịgụta ọnụ.”​—⁠Abụ Ọma 119:72; 73:28; Ilu 4:​20-⁠22.

NDỤMỌDỤ NKE NA-AKWALITE EZI AHỤ IKE

3 Bible n’ụzọ bụ isi abụghị akwụkwọ nduzi banyere ahụ ike. Ma o nwere ndụmọdụ ndị na-akwalite ezi ahụ ike. A pụrụ ịhụ nke ahụ n’ụzọ pụtara ìhè n’iwu ndị Chineke nyere mba Israel. Ndị a bụ ihe atụ ụfọdụ: Ogologo oge tupu nkà mmụta ọgwụ ọgbara ọhụrụ amalite, iwu Chineke nyere Israel chọrọ na a ga-edebe onye ọ bụla nke nwere, ma ọ bụ yie ka o nwere, ọrịa na-efe efe iche. (Levitikọs 13:​1-⁠5) A ga-ekpofu nsị́ n’ebe dị anya pụọ n’ebe mmadụ bi, si otú a na-egbochi mgbasa nke ọrịa ma ọ bụ mmetọ mmiri. (Deuterọnọmi 23:​12-⁠14) Ọ bụrụ na uwe ma ọ bụ arịa ụlọ emetụ n’ahụ anụ nwụrụ n’onwe ya (ma eleghị anya site n’ọrịa), a ga-asa ha mmiri tupu e jiri ha mee ihe ọzọ ma ọ bụ bibie ha. (Levitikọs 11:​27, 28, 32, 33) Ndị nchụàjà Israel ga-asa ahụ tupu ha amalite ije ozi n’ebe ịchụ àjà, si otú a na-ebute ụzọ n’ịdị ọcha.​—⁠Ọpụpụ 30:​18-⁠21.

4 Ndị ọkà mmụta ọgwụ na ahụ ike amụtawo uru nke ime ihe ndị dị otú a eri oge dị anya, bụ́ ndị a pụrụ ịnọgide na-etinye n’ọrụ ma na-enweta uru na ha: Ibelata mmekọrịta nke gị na ndị ọzọ mgbe o yiri ka gị ma ọ bụ ha bu ọrịa nke pụrụ ịdị na-efe efe. Ịkpachara anya iji hụ na nsị́ na mamịrị mmadụ ma ọ bụ ihe mkpofu emerụghị mmiri ọṅụṅụ ma ọ bụ nri. Idebe arịa ndị e ji esi nri na ndị e ji eri nri ọcha. Ịhụ maka ịdị ọcha onwe onye site n’ịsa ahụ mgbe nile, sitekwa ná mmadụ ịsa aka mgbe o jesịrị mposi.

5 A na-ebutekarị ọrịa mmekọahụ site n’omume rụrụ arụ, bụ́ nke Chineke na-ama ikpe. (Ndị Hibru 13:4; Ndị Efesọs 5:5) Ma site n’ịdị ọcha tupu alụmdi na nwunye na ịhụ na mmekọahụ bụ nanị n’etiti mmadụ na di ma ọ bụ nwunye ya mgbe agbamakwụkwọ gasịrị, a na-echebe ndị Kraịst pụọ n’ọrịa ndị a jọgburu onwe ha.

6 Ọzọ, a na-enweta ahụ ike ka mma site n’itinye ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ banyere ụzọ mmadụ si ebi ndụ n’ozuzu ya. Dị ka ihe atụ, Bible na-aja ịrụsi ọrụ ike mma. Ọ na-ekwu na onye rụsiri ọrụ ike n’ụbọchị na-ehi ụra nke ọma karị. O kwukwara okwu dị mma banyere ịnụ ụtọ nri na ihe ọṅụṅụ ị pụrụ inweta n’ọrụ gị, ka ị na-ezere iribiga ihe ókè. Ọ̀ bụ na i kwenyeghị na ọ bụrụ na ị rụsie ọrụ ike, hie ụra n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu, nụ ụtọ nri gị ma bụrụ “onye nwere anya udo,” ị ga-enwe ahụ ike na obi ụtọ karị?​—⁠Eklisiastis 2:24; 5:12; 9:7-⁠9; Ndị Efesọs 4:28; 1 Timoti 3:​2, 11.

ỤTABA, IHE ỌṄỤṄỤ NA-ABA N’ANYA NA ỌGWỤ ỌJỌỌ

7, 9. Ndụmọdụ dị aṅaa nke Bible na-emetụta iji ụtaba eme ihe?

7 Dr. Joel Posner na-akọ na dị ka ihe atụ, na United States 60 pasent nke ego a na-emefu maka ilekọta ahụ ike bụ n’ihi ọrịa ndị metụtara iji ụtaba na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-eme ihe. Olee ụzọ Bible si na-enye aka n’akụkụ nke a?

8 N’ikwekọ n’okwu ndụmọdụ Chineke banyere ịdị ọcha ma ọ bụ enweghị ntụpọ, Pọl onyeozi degaara ndi Kraịst akwụkwọ, sị: “Ezi ndị enyi m, ka anyị debenụ onwe anyị ọcha pụọ n’ihe nile na-emerụ ahụ ma ọ bụ mmụọ.” (2 Ndị Kọrint 7:1, Twentieth Century New Testament) Ọtụtụ ndị ahụwo na iji ụtaba na-eme ihe na-emegide ndụmọdụ ahụ. Ikuru anwụrụ ọkụ banye n’ime akpa ume ekwekọghị n’okike. Ọ na-emetọ ahụ ma na-egbubilata ogologo afọ ndụ mmadụ. Nchọpụta egosiwo na ndị na-ese siga na-arịakarị ọrịa obi, cancer akpa ume, ọbara mgbali elu na ọrịa oyi ịba mmadụ n’ahụ, bụ́ nke na-ewetakarị ọnwụ.

9 Ọzọ, tụlee mmetụta ọ na-enwe n’ebe ndị nọ onye ahụ na-ese siga gburugburu nọ​—⁠ezinụlọ na ndị ha na ya na-akpakọrịta. Jisọs Kraịst sịrị na ihe nke abụọ n’iwu Chineke nyere Israel bụ: “Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Mak 12:31) Nke ahụ ọ́ bụghị ihe ị na-achọ ime? Ma gịnị bụ mmetụta ndị ise siga na-enwe? Ọ na-emerụ onye ahụ na-ese ya ahụ ma na-ebibi ahụ ike nke ndị ọzọ na-ekuru anwụrụ ọkụ ya.

10, 11. Olee otú Bible si enyere anyị aka n’ụzọ anyị si ele ihe na-aba n’anya anya? Ụzọ anyị si ele ọgwụ ọjọọ anya?

10 Olee banyere iji ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya na-eme ihe? Ọtụtụ ndị na-ahụ ha dị ka ihe na-atọ ụtọ ma na-enye ntụsara ahụ. Bible adịghị akagbu ihe ọṅụṅụ ndị nwere ihe na-aba n’anya, bụ́ nke ahụ pụrụ “ịgbari” dị ka mmanụ ma ọ bụ nri. (Abụ Ọma 104:15; Eklisiastis 9:⁠7) Ma ọ na-adọ aka ná ntị, sị: “Onye na-akwa emo ka mmanya vine bụ, onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ nke na-aba n’anya bụ; onye ọ bụla nke na-awagharị site na ya amaghị ihe.” (Ilu 20:1) Bible na-akagbukwa ịṅụbiga mmanya ókè n’ụzọ pụtara ìhè. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10; 1 Pita 4:3) N’ezie, onye ọ bụla nke na-aṅụbiga mmanya ókè mgbe mgbe “amaghị ihe” ma ọlị, dị ka akwụkwọ nsọ na-ekwu. Ka oge na-aga, onye dị otú ahụ pụrụ ibibi imeju ya, na-akpata ọnọdụ ndị siri ike, ma ọ bụ ọbụna ọnwụ. Ha pụrụ ibibi ime afọ. Onye na-eji ihe na-aba n’anya na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi pụrụ ighebe onwe ya oghe nye obi nkuchi na ahụ mkpọnwụ. Ma ike ncheta ma usoro ịrụ ọrụ nke uru ahụ pụkwara ịbụ ndị e mebiri.

11 Ndụmọdụ Bible n’ịṅụbiga mmanya ókè na-enyekwa aka banyere ọgwụ ọjọọ ndị dị ka heroin, cocaine, akị betel, wii wii, na LSD. A na-ejikarị ndị a na-eme ihe, ọ bụghị dị ka “ihe oriri” ma ọ bụ nzube nke ịgwọ ọrịa, kama n’ụzọ bụ isi iji nweta mkpali “dị elu,” ịmụ anya na-arọ nrọ ma ọ bụ ịghara ịma ihe na-aga. Ọ pụrụ ịbụ na e jighị ọgwụ ndị dị otú ahụ mee ihe n’oge Bible. Ma Bible na-ekwu okwu n’ụzọ siri ike megide ịṅụbiga mmanya ókè na “ndụ ịla n’iyi” nke ya na ya na-agakọ. Ọ̀ bụ na ndụmọdụ dị otú ahụ agaghị arụ ọrụ n’ihe ọ bụla ọzọ nke pụrụ ime ka mmadụ ghọọ onye na-amaghị onwe ya ma na-eme omume n’ụzọ a na-achịkwaghị achịkwa ma ọ bụ n’omume nke ịla n’iyi? (Ndị Efesọs 5:18) Mgbe mgbe ndị nọ n’okpuru mmetụta nke ọgwụ ọjọọ na-emerụ onwe ha ahụ ma ọ bụ ndị ọzọ emerụọ ha ahụ. (Tụlee Ilu 23:​29, 35.) E jikọkwara ọgwụ ndị a na ihe ize ndụ ndị ọzọ nke ahụ ike, gụnyere ọrịa akpa ume, ụbụrụ na mbibi nke usoro mkpụrụ ndụ, erighị ihe ndị na-edozi ahụ na ịba ọcha n’anya. Ya mere ihe ịrụ ụka adịghị ya na itinye ndụmọdụ a dị na Bible n’ọrụ pụrụ ịkpata uru nke ahụ ike.

IHE MERE NA ỤZỌ A GA-EJI TINYE NDỤMỌDỤ CHINEKE N’ỌRỤ

12-16. Olee ihe ndị i nwere mere ị ga-eji tinye ndụmọdụ Chineke n’ọrụ ná ndụ gị? Enyemaka dị aṅaa ka e nwere?

12 Olileanya nke inwe ahụ ike karị na ibi ndụ ka ogologo na-amasị onye ọ bụla isi zuru okè. Nke ahụ bụ otu ihe ziri ezi mere a ga-eji nabata ma na-etinye ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ nke anyị tụleworo n’ọrụ. (Abụ Ọma 16:11) Ma nke ahụ ọ̀ bụ ihe zuru ezu? O yikarịrị ka ị maara ndị ga-anabata ihe ize ndụ n’ihi ihe ụtọ ma ọ bụ mkpali ndị ha nwere olileanya inweta. Otú ọ dị, o kwesịrị ịdị iche n’ebe ndị nwere okwukwe na Chineke nọ, bụ́ ndị matakwara na o kpughewo onwe ya site na Bible. Ebe ndụ anyị sitere n’aka ya, anyị kwesịrị itinye uche anyị nile n’iji ya mee ihe n’ụzọ kwekọrọ ná nduzi ọ na-enye na Bible. Anyị ga-abụ ndị na-enweghị ekele ma ọ bụrụ na anyị natara ndụ site n’aka Jehova ma kpachara anya leghara ndụmọdụ amamihe na nke ịhụnanya banyere otú anyị ga-esi jiri ndụ anyị mee ihe anya.

13 Ọzọkwa, dị ka Onye Na-enye ndụ, ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe ruuru Chineke iduzi otú anyị kwesịrị isi bie ndụ? Ọ bụ Onyeisi Kachasị n’eluigwe na ala. Onye ahụ so dee Bible, bụ́ Jemes, kpọrọ ya ‘Onye na-enye iwu na onyeikpe.’ (Jemes 4:12; tụlee Aịsaịa 45:9.) N’ihi nke a, n’ihe banyere àgwà onwe onye, anyị kwesịrị ịbụ ndị a kpaliri itinye ihe Chineke na-ekwu n’ọrụ n’ihi na O kwuru ya.

14 Echiche nke a enyewo ọtụtụ ndị na-enwetaghị ihe ịga nke ọma ruo ogologo oge n’ịkwụsị ịbụ ndị ihe na-emerụ ahụ riri ahụ nkwali dị ike. Ihe ha na-eme ghọrọ nke siri ike karị mgbe ha hụrụ na ọ dị ha mkpa ime mgbanwe, ọ bụghị nanị n’ihi ahụ ike ha, kama n’ihi na o kwekọrọ n’uche Chineke. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na iwu kachasị bụ na “ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum” hụ Jehova n’anya. (Matiu 22:37) Iji mee nke ahụ, mmadụ aghaghị inwere onwe ya pụọ n’ihe ndị na-etinye nsí n’uche ma na-ebibi ya ma ọ bụ na-emetọ ahụ.

15 Enyemaka ọzọ bụ isoro ndị na-agbasi mbọ ike ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ndụmọdụ Chineke na-akpakọrịta. Pita onyeozi dere na ụfọdụ ndị, tupu ha aghọọ ndị Kraịst, ‘jegharịrị n’ime agụụ ịkwa iko, agụụ ihe ọjọọ nile, mmanya ogbugbu nile, [oriri oké mkpọtụ nile, NW] ịṅụbiga mmanya ókè nile, ikpere arụsị nile jọgburu onwe ha.’ (1 Pita 4:3) Ka ha na-arụ ọrụ iji gbanwee, a pụrụ ime ka ha siwanye ike site n’isoro ndị Kraịst ibe ha na-ezukọ. A ga-esi otú a gbaa ha ume ịmụ na itinye Okwu Chineke n’ọrụ. Ọ bụrụkwa na, ka ha na-eme mgbanwe ndị ahụ dị mkpa, ha adaa mbà ma ọ bụ nwee nrụgide ọzọ, ha pụrụ inweta enyemaka. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịgakwuru na isoro ndị Kraịst tozuru okè kwurịta okwu, bụ́ ndị ga-enwe ọmịiko, nghọta ma na-ewuli elu.​—⁠Eklisiastis 4:​9, 10; Job 16:⁠5.

16 Ọ bụrụ na ị ga-achọ enyemaka dị otú ahụ, a na-anabata gị ịbịa nzukọ Ndịàmà Jehova. Ndị Kraịst nwerela ahụmahụ bụ́ ndị nọ n’ebe ahụ ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịmụta na itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ. Ka ị na-enwe ọganihu n’ime otú ahụ, ị ga-enwe afọ ojuju nke ịmata na ị na-agba mbọ ime ihe na-atọ Onye Okike gị ụtọ. Ị ga-anọkwa n’ụzọ nke na-eduje n’ahụ ike ka mma na ndụ nke ka ogologo, ya na obi ụtọ.

Igbe dị na peeji nke 99]

“E nwewo ihe àmà ọzọ na anwụrụ siga adịghị emerụ nanị onye ahụ na-ese ya ahụ kama ndị nọ ya gburugburu. . . . Ọ bụrụ na ị na-ese siga, i kwesịrị ịtụle mmetụta ndị ọ na-enwe n’ụzọ anụ ahụ na n’ụzọ akparamàgwà n’ebe nwa gị nakwa gị onwe gị nọ. Ise siga bụ oké ihe ize ndụ n’ebe ahụ ike nwa gị dị.”​—⁠Onye na-ede banyere ahụ ike n’akwụkwọ akụkọ, bụ́ Dr. Saul Kapel.

Igbe dị na peeji nke 101]

“Nnyocha na-ejikọ wii wii na ọtụtụ nsogbu ahụ ike ndị pụrụ isi ike. Ha gụnyere mbibi akpa ume na ma eleghị anya ọrịa cancer, nsogbu nke uche na usoro ụbụrụ, nkwarụ n’ikike ahụ nwere ịlụso ọrịa ọgụ, ibibi ikike nke inwe mmekọahụ na ihe iyi egwu nke ibibi mkpụrụ ndụ chromosome na nkwarụ site n’ọmụmụ.”​—⁠“Newsweek.”

[Foto dị na peeji nke 97]

Ịdị ọcha bụ ihe enyemaka maka ezi ahụ ike

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya