Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • hp isi 12 p. 112-120
  • Ọnwụ Abụghị Onye Iro A Na-apụghị Imeri Emeri

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọnwụ Abụghị Onye Iro A Na-apụghị Imeri Emeri
  • Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MMERI MBỤ ỌNWỤ NWETARA
  • NDỊ NWỤRỤ ANWỤ HÀ MAARA IHE Ọ BỤLA?
  • ỌDỊNIHU DỊ AṄAA DỊỊRỊ NDỊ NWỤRỤ ANWỤ?
  • MMERI SITE NÁ MBILITE N’ỌNWỤ
  • Ndụ Mgbe A Nwụsịrị—Gịnị Ka Bible Na-ekwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Gịnị Na-eme Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Olee Ebe Ndị Nna Nna Anyị Hà Nọ?
    Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
  • Ndị Ajọ Omume Hà Ga-aga Ọkụ Ala Mmụọ?
    Teta!—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
hp isi 12 p. 112-120

Isi 12

Ọnwụ Abụghị Onye Iro A Na-apụghị Imeri Emeri

1-3. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nyochaa “onye iro” bụ ọnwụ? (Job 14:​1, 2)

ỌNWỤ bụ onye iro nke ndụ. Olili ozu ọ bụla na-egosi na ọnwụ dị ka eze nke yiri ka ọ na-emeri mmadụ nile. (Ndị Rom 5:14) Osisi ụfọdụ na-adịru ihe karịrị 1,000 afọ; azụ ụfọdụ na-adịru 150; ma afọ ndụ mmadụ bụ nanị 70 ma ọ bụ 80 tupu ọnwụ elodaa ya.​—⁠Abụ Ọma 90:⁠10.

2 Ezi ihe kpatara Bible ji na-egosi ọnwụ dị ka onye iro. Ọ bụ eziokwu na o yiri ka anyị nwere ọchịchọ ebumpụta ụwa ịdị ndụ ma na-amụ ihe n’akwụsịghị akwụsị, n’agbanyeghị ihe ọ bụla mmadụ mụtara, nkà ndị o nwere, otú ndị enyi na ndị ikwu si ele ya anya dị ka onye dị elu, ọnwụ na-ewere ya. (Eklisiastis 3:11; 7:2) Ọtụtụ ndị, n’ikwere na ọnwụ bụ onye iro, na-agbalịsi ike ime ka mmeri ya ghara ịbịa ngwa ngwa. Ndị ọzọ na-etinye ike ha nile n’ịchọ ihe ụtọ nile ha pụrụ inweta ná ndụ tupu e merie ha.

3 Otú ọ dị, n’akụkọ ihe mere eme nile, ọtụtụ ndị ekwerewo na e nwere ndụ mgbe a nwụsịrị. Onye ọkà mmụta Grik bụ́ Plato kụziri na anyị nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke na-adịgide mgbe anụ ahụ nwụrụ. Ànyị nwere? A kpaliwo mmasị na nke a site n’akụkọ ndị a na-akọ n’oge ndị na-adịbeghị anya banyere ndị a sịrị na ha nwụrụ, bụ́ ndị a tụteghachiri, ndị mesịkwara kọọ ihe ha ‘hụrụ mgbe ha gafere ọnụ ụzọ ọnwụ.’ Ò nwere ebe ndị nwụrụ anwụ nọ ndụ? À pụrụ imeri ọnwụ?

MMERI MBỤ ỌNWỤ NWETARA

4, 5. Olee otú ọnwụ si bịakwasị ihe a kpọrọ mmadụ?

4 Bible na-egosi na e kere ụmụ mmadụ ịdị ndụ, ọ bụghị ịnwụ anwụ. Chineke tinyere Adam na Iv n’ubi mara mma ebe ha pụrụ ịnụ ụtọ ndụ. Ọ kpọrọ otu n’ime osisi ndị ahụ “osisi nke ndụ.” O yiri ka ọ bụ na a sị na Adam na Iv gosipụtara ekele na iguzosi ike n’ihe nye Chineke, ọ gaara ekwe ka ha rie site n’osisi ahụ, na-anọchite anya onyinye ndụ ebighị ebi nke ọ gaara enye ha. (Jenesis 1:30; 2:7-⁠9) Otú ọ dị, Adam na Iv họọrọ inupụrụ Chineke isi. Mmehie ha wetaara ha ọmụma ikpe nke ọnwụ.​—⁠Jenesis 3:​17-⁠19.

5 Ka anyị wee ghọta ma ọnwụ ọ̀ bụ n’ezie onye iro nke a na-apụghị imeri emeri, ọ dị anyị mkpa inyocha ihe si ná mmeri nke ọnwụ meriri Adam na Iv pụta. Hà “nwụrụ” kpam kpam? Ka “ọnwụ” ahụ ọ̀ bụ nanị ngabiga banye n’ụdị ndụ ọzọ?

6, 7. Gịnị ka “ọnwụ” pụtaara Adam?

6 Mgbe Adam zuzuuru mehie, Jehova nọgidesiri ike n’okwu ezi omume ya, nke zikwara ezi. Ọ gwara Adam, sị:

“N’ọsụsọ ihu gị ka ị ga-eri nri, ruo mgbe ị ga-alata n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ; ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.”​—⁠Jenesis 3:⁠19.

Gịnị ka nke ahụ pụtaara Adam nakwa anyị onwe anyị taa?

7 Ihe ndekọ bu ụzọ nke okike Adam na-agwa anyị, sị: “Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, O wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” (Jenesis 2:⁠7) Chee echiche banyere ihe nke ahụ pụtara. Tupu Chineke ekee ya site n’ájá, e nweghị Adam ọ bụla dị. N’ihi nke a, mgbe ọ nwụsịrị ma laghachi n’ájá, a gaghị enwe Adam ọ bụla.​—⁠Jenesis 5:​3-⁠5.

NDỊ NWỤRỤ ANWỤ HÀ MAARA IHE Ọ BỤLA?

8-11. Olee otú ị pụrụ isi gosi mmadụ site na Bible ma ndị nwụrụ anwụ hà maara ihe ọ bụla?

8 Ọtụtụ ndị pụrụ inwe ihe ijuanya n’echiche ahụ bụ na ozugbo Adam nwụrụ, ọ kwụsịrị ịdị adị. Ma ahụhụ e kwuru na a ga-enye n’ihi mmehie​—⁠Adam ịnwụ na ịlaghachi n’ájá​—⁠enweghị ihe ọ bụla na-egosi ịnọgide na-adị ndụ. Ọnwụ bụ ọnọdụ megidere ndụ, ma ọ̀ bụ nye mmadụ ma ọ bụ anụ ọhịa. Ha abụọ nwere otu “mmụọ” ahụ, ma ọ bụ ike ndụ. Ya mere Bible na-ekwu, sị:

“Ihe na-adabara ụmụ mmadụ, ihe na-adabakwara anụmanụ; ọbụna otu ihe ahụ na-adabara ha: dị ka ọnwụ nke anụmanụ si dị, otú a ka ọnwụ nke mmadụ dị; ee, otu mmụọ ka ha nile nwere; ọ dịghịkwa ọkaaka mmadụ nwere karịa anụmanụ: . . . ha nile siri n’ájá pụta, ha nile na-alaghachikwa n’ájá.”​—⁠Eklisiastis 3:​19, 20.

9 Nke ahụ ọ̀ pụtara na ndị nwụrụ anwụ enweghị echiche ma ọ bụ mmetụta ọ bụla? Eklisiastis 9:​4, 5 na-aza, sị: “Ọ dịịrị nkịta dị ndụ mma karịa ọdụm nwụrụ anwụ. N’ihi na ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” Mgbe mmadụ nwụrụ, “echiche ya nile alawo n’iyi,” o nweghị ike ọ bụla nke inwe mmetụta ma ọ bụ ịrụ ọrụ.​—⁠Abụ Ọma 146:3, 4; 31:17.

10 Ebe Bible na-emesi anyị obi ike na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, ha enweghịkwa mmetụta, nke ahụ pụtara na ọnwụ na-akwụsị ahụ mgbu na ahụhụ. Job, bụ́ ohu Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, maara nke a. Mgbe ọ na-ata ahụhụ nke ọrịa na-egbu mgbu, o kwuru, sị:

“N’ihi gịnị ka m na-esighị n’akpa nwa nwụọ? . . . Gịnị mere ikpere abụọ dị n’ihu m ịnara m? Ma ọ bụ ara, ka m wee ṅụọ? N’ihi na ugbu a ka m ga-edinaworị dị jụụ; m ga-arahụworị ụra; mgbe ahụ ka izu ike ga-adịrị m.”​—⁠Job 3:​11-⁠13.

11 Ma nke a ọ̀ na-agụnye mkpụrụ obi?

12, 13. Dị ka Bible si na-ekwu, gịnị bụ “mkpụrụ obi”?

12 N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, Akwụkwọ Nsọ na-akụzi na mkpụrụ obi gị bụ gị. Ihe anyị gụworo na Jenesis 2:7 na-egosi nke ahụ. Cheta na Chineke kpụrụ ahụ mmadụ site n’ájá. Mgbe ahụ Chineke nyere ndụ na ume nke a chọrọ iji kwagide ya. Gịnị si na nke ahụ pụta? Dị ka Okwu Chineke na-ekwu, mmadụ ahụ “wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ [Hibru, nephesh].” (Jenesis 2:7) E nyeghị Adam mkpụrụ obi, o nwetaghịkwa mkpụrụ obi. Ọ bụ mkpụrụ obi. N’ịkụzi nke a, Bible kwekọrọ n’ebe nile. Ọtụtụ narị afọ n’ihu, Pọl onyeozi hotara Jenesis 2:⁠7, na-ede, sị: “Mmadụ mbụ, bụ́ Adam, ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ [Grik, psykhe].”​—⁠1 Ndị Kọrint 15:⁠45.

13 A sụgharịrị okwu Hibru ahụ bụ nephesh na okwu Grik ahụ bụ psykhe bụ́ ndị a na-ahụ n’ihe odide ndị a n’ụzọ dị iche iche. N’Ezikiel 18:4 na Matiu 10:28, ị ga-achọpụta na n’ọtụtụ nsụgharị Bible, e dere ha dị ka “mkpụrụ obi.” N’ebe ndị ọzọ a sụgharịrị otu okwu mbụ ndị ahụ “ihe dị adị,” “ihe e kere eke,” ma ọ bụ “onye.” Ndị a bụ nsụgharị ziri ezi nke okwu mbụ ndị ahụ, iji ha tụnyere ibe ha na-egosikwa na mkpụrụ obi bụ ihe e kere eke ma ọ bụ onye ahụ n’onwe ya, ọ bụghị akụkụ a na-adịghị ahụ anya nke mmadụ. Bible jikwa otu okwu ndị nke asụsụ ndị mbụ ahụ mee ihe n’ebe ụmụ anụmanụ nọ, na-egosi na ha bụ mkpụrụ obi ma ọ bụ na ha nwere ndụ dị ka mkpụrụ obi.​—⁠Jenesis 2:19; Levitikọs 11:46; Mkpughe 8:9.

14-16. Mkpụrụ obi ọ̀ pụrụ ịnwụ anwụ, oleekwa ihe nke a na-egosi?

14 Dị ka mkpụrụ obi, Adam, ma ọ bụ onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ iri ihe, nọrọ n’agụụ, ma nwee ike ọgwụgwụ. N’asụsụ Hibru mbụ, Bible na-asị na mkpụrụ obi na-eme ihe ndị a nile. (Deuterọnọmi 23:24; Ilu 19:15; 25:25) N’ikwupụta mmachibido iwu nke a machibidoro ndị Israel banyere ịrụ ọrụ n’ụbọchị ụfọdụ, Chineke mere ka isi ihe ọzọ dị mkpa banyere mkpụrụ obi pụta ìhè, na-asị: “Ma mmadụ [“mkpụrụ obi,” NW] nke na-eje ozi ọ bụla n’otu ụbọchị ahụ, m ga-eme ka mmadụ [“mkpụrụ obi,” NW] ahụ si n’etiti ndị ya laa n’iyi.” (Levitikọs 23:30) N’ihi nke a, n’ebe a na n’ọtụtụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ, Bible na-egosi na mkpụrụ obi pụrụ ịnwụ anwụ.​—⁠Ezikiel 18:​4, 20; Abụ Ọma 33:19.

15 Ịmara eziokwu Bible ndị dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka ịtụle akụkọ ndị a na-anụ n’oge ndị a banyere ndị a sịrị na ha nwụrụ (n’ihi na a pụghị ịchọpụta obi ịkụ akụ ọ bụla ma ọ bụ ịrụ ọrụ nke ụbụrụ), ma bụrụ ndị a tụteghachiri, ma mesịa kwuo na ha si n’ahụ ha fepụ. Otu ihe pụrụ ịkpata ya bụ na ọ pụrụ ịbụ na ha amụrụwo anya na-arọ nrọ, bụ́ nke ihe kpatara ya bụ ọgwụ ma ọ bụ ọnọdụ nke enwetazughị ikuku ndụ bụ oxygen n’ụbụrụ. Ma nke ahụ ọ̀ bụ nkọwa ya zuru ezu ma ọ bụ na ọ bụghị, anyị maara n’ezie na ọ dịghị mkpụrụ obi ọ bụla anya na-adịghị ahụ nke si n’anụ ahụ pụta.

16 Ọzọkwa, ọ bụrụ na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị, ọ bụrụkwa na ọ dịghị “mkpụrụ obi” nke na-esi n’ahụ fepụ, mgbe ahụ a pụghị inwe hel na-ere ọkụ nke na-echere mkpụrụ obi nke ndị na-emebi iwu, à pụrụ? Ma ọtụtụ chọọchị na-akụzi na a ga-emekpa ndị mmebi iwu ahụ mgbe ha nwụsịrị. Mgbe ha mụtasịrị eziokwu banyere ndị nwụrụ anwụ, n’ụzọ kwere nghọta, o nyewo ụfọdụ ndị nsogbu, ha wee na-ajụ, sị: ‘N’ihi gịnị ka okpukpe anyị na-ejighị gwa anyị eziokwu banyere ndị nwụrụ anwụ?’ Gịnị bụ mmeghachi omume nke gị onwe gị?​—⁠Tụlee Jeremaịa 7:31.

ỌDỊNIHU DỊ AṄAA DỊỊRỊ NDỊ NWỤRỤ ANWỤ?

17-20. Gịnị na-eme mmadụ mgbe ọ nwụsịrị?

17 Ọ bụrụ na nanị ọdịnihu e nwere maka ndị dị ndụ ugbu a bụ ọnọdụ nke amaghị ihe ọ bụla n’ọnwụ, mgbe ahụ ọnwụ ga-abụ onye iro nke a na-apụghị imeri emeri. Ma Bible na-egosi na ọ dịghị otú ahụ.

18 Ọdịnihu mmadụ nwere nke na-esochi ozugbo ọ nwụrụ bụ n’ili. Asụsụ ndị e ji dee Bible nwere okwu ndị e ji eme ihe maka ebe ndị nwụrụ anwụ nọ, ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. Na Hibru a kpọrọ ya Sheol. A kpọrọ ya Hedis na Grik. A sụgharịwo okwu ndị a na Bible ụfọdụ site n’okwu ndị dị ka “ili,” “olulu,” ma ọ bụ “hel”. N’agbanyeghị otú e si dee ha, ihe okwu ndị ahụ nke asụsụ ndị mbụ ahụ pụtara abụghị ebe dị ọkụ nke a na-ata ahụhụ na ya kama ili nke ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị na-amaghị ihe ọ bụla. Anyị na-agụ, sị:

“Ihe ọ bụla aka gị na-ahụ ime, were ike gị mee ya; n’ihi na ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Sheol, NW; hel, Douay Version; ili, Authorized Version], ebe gị onwe gị na-ala.”​—⁠Eklisiastis 9:10.

Pita onyeozi na-emesi anyị obi ike na n’ọnwụ ya, ọbụna Jisọs gara n’ili, na Sheol, Hedis ma ọ bụ hel.​—⁠Ọrụ 2:31; tụlee Abụ Ọma 16:10.

19 N’ezie, onye nwụrụ anwụ enweghị ike ọ bụla ịgbanwe ọnọdụ ya. (Job 14:12) Ya mere amaghị ihe ọ bụla mgbe a nwụsịrị ọ̀ bụ nanị ọdịnihu dịnụ? Nye ụfọdụ ndị, ee. Bible na-akụzi na ndị Chineke jụrụ kpam kpam ga-anọgide n’ọnwụ ruo ebighị ebi.​—⁠2 Ndị Tesalọnaịka 1:​6-⁠9.

20 Ndị Juu oge ochie kwere na ndị na-emebi iwu nke ukwuu enweghị ọdịnihu ọ bụla mgbe ha nwụsịrị. Ndị Juu adịghị eli ndị dị otú ahụ eli. Kama nke ahụ, ha na-atụba ozu ndị ahụ na ndagwurugwu nke dị n’azụ Jerusalem, ebe ọkụ na-enwu mgbe nile iji bibie ihe mkpofu. Nke a bụ Ndagwurugwu nke Hinọm, ma ọ bụ Gehena. Na-adabere n’ihe omume a, Jisọs ji Gehena mee ihe dị ka ihe atụ nke mbibi kpam kpam, n’enweghị olileanya ọ bụla maka ọdịnihu. (Matiu 5:​29, 30) Dị ka ihe atụ, o kwuru, sị:

“Unu atụkwala egwu ndị na-egbu anụ ahụ ma ha apụghị igbu mkpụrụ obi [ma ọ bụ, olileanya ịdị ndụ dị ka mkpụrụ obi]; kama nke ahụ, na-atụnụ egwu onye ahụ [Chineke] nke pụrụ ibibi ma mkpụrụ obi ma anụ ahụ n’ime Gehena.”​—⁠Matiu 10:28, NW.

Otú ọ dị, okwu ndị ahụ nke Jisọs na-enye anyị olileanya na ọtụtụ ndị nwụworo anwụ ga-adị ndụ ọzọ n’ọdịnihu, si otú a na-emeri ọnwụ.

MMERI SITE NÁ MBILITE N’ỌNWỤ

21, 22. Olee otú mmeri n’ebe ọnwụ dị pụrụ isi kwe omume?

21 N’otu n’ime ihe kachasị mkpa mere n’akụkọ ihe mere eme, Chineke kpọlitere Jisọs Kraịst ịdị ndụ mgbe ọ nwụsịrị ruo ụbọchị ole na ole. Jisọs ghọrọ mmụọ e kere eke dị ndụ, dị ka ọ bụwororịị tupu ọ bịa n’ụwa. (1 Ndị Kọrint 15:42-⁠45; 1 Pita 3:18) Ọtụtụ narị ndị mmadụ hụrụ Jisọs mgbe e mesịrị ka o si n’ọnwụ bilie. (Ọrụ 2:22-⁠24; 1 Ndị Kọrint 15:​3-⁠8) Ndị àmà a dị njikere itinye ndụ ha n’ihe ize ndụ n’ịkwado okwukwe ha ná mbilite n’ọnwụ Jisọs. Mbilite n’ọnwụ nke Jisọs na-egosi na ọnwụ abụghị onye iro nke a na-apụghị imeri emeri. Imeri ọnwụ bụ ihe kwere omume!​—⁠1 Ndị Kọrint 15:​54-⁠57.

22 Inwetakwu mmeri n’ebe ọnwụ dị kwekwara omume. Ụmụ mmadụ pụrụ ịbịaghachi ná ndụ mmadụ n’elu ala. Jehova, onye na-apụghị ịgha ụgha, na-emesi anyị obi ike n’Okwu ya “na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume [ndị maara ma mee uche Chineke] na nke ndị ajọ omume kwa [ndị na-emeghị ezi omume] gaje ịdị.”​—⁠Ọrụ 24:15.

23-25. N’ihi gịnị ka ọdịnihu pụrụ iji bụrụ ihe na-akpali akpali?

23 Anyị pụrụ inwe obi ike n’ikike Chineke nwere ịkpọlite ndị mmadụ bịaghachi ná ndụ mmadụ. Ụmụ mmadụ pụrụ iseta ma ọ bụ ichebe onyonyo, olu na àgwà mmadụ na foto ma ọ bụ tepu vidio. Ọ̀ bụ na Chineke apụghị ime karịa nke ahụ? Ikike ncheta ya dị nnọọ ukwuu karịa foto ma ọ bụ tepu ọ bụla, ya mere ọ pụrụ n’ụzọ zuru okè ikegharị ndị ọ chọrọ ịkpọlite n’ọnwụ. (Abụ Ọma 147:4) O gosipụtaworị nke a. Bible nwere ọtụtụ ihe ndekọ nke Chineke iji Ọkpara ya mee ihe n’iweghachite ụmụ mmadụ ná ndụ. Ị pụrụ ịgụ abụọ n’ime ihe ndekọ ndị a na-akpali akpali na Jọn 11:​5-⁠44 na Luk 7:​11-⁠17. E nwere ezi ihe mere ndị fere Chineke n’oge ochie ga-eji lepụ anya n’ọdịnihu gaa n’oge mgbe ọ ga-echeta ma kpọlite ha n’ọnwụ. Ọ ga-adị ka ịkpọlite ha site n’ụra nke amaghị ihe ọ bụla.​—⁠Job 14:​13-⁠15.

24 Mbilite n’ọnwụ ndị ahụ weere ọnọdụ n’oge gara aga aghaghị ịkpataworị oké ọṅụ nye ndị ikwu na ndị enyi. Ma mbilite n’ọnwụ ndị ahụ meriri ọnwụ nanị ruo nwa oge, n’ihi na ndị ahụ a kpọlitere mesịkwara nwụọ ọzọ. Otú o sina dị, ha na-enye anyị ihe àmà na-akpali akpali nke ihe ndị gaje ịbịa, n’ihi na Bible na-ezo aka ná “mbilite n’ọnwụ ka mma” nke na⁠-⁠abịanụ. (Ndị Hibru 11:35) Ọ ga-aka mma nke ukwuu n’ihi na ndị ahụ ga-alọghachi ná ndụ n’elu ala agaghị anwụ ọzọ. Nke ahụ ga-apụta mmeri ka ukwuu n’ebe ọnwụ dị.​—⁠Jọn 11:​25, 26.

25 Ihe Bible na-ekwu banyere otú Chineke ga-esi, ma nwee ike imeri ọnwụ na-egosi n’ezie mmasị ịhụnanya o nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ. O kwesịrị inyere anyị aka ịghọta ụdị onye Jehova bụ ma mee ka anyị bịa ya nso karị. Eziokwu ndị a na-enyekwara anyị aka inwe ezi nguzo, n’ihi na e chebere anyị pụọ n’egwu na-enweghị isi nke ọnwụ bụ́ nke na-ejide ọtụtụ ndị. Anyị pụrụ inwe olileanya obi ụtọ nke ọbụna ịhụ ndị ikwu na ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ, mgbe a ga-emeri ọnwụ site ná mbilite n’ọnwụ.​—⁠1 Ndị Tesalọnaịka 4:13; Luk 23:43.

Igbe dị na peeji nke 117]

‘Ọ dị mma ịmara na n’Agba Ọhụrụ, anyị adịghị ahụ ọkụ ala mmụọ ịbụ akụkụ nkwusa nke oge gboo ahụ. E nwere ihe ndị dị n’Agba Ọhụrụ ndị na-egosi na ihe ga-abịakwasị ndị jụrụ ịnara nzọpụta nke Chineke na-enye pụrụ ịbụ mbibi kama ịbụ ahụhụ ebighị ebi.’​—⁠“A Dictionary of Christian Theology,” nke editọ ya bụ Alan Richardson.

[Foto dị na peeji nke 114]

ÁJÁ

ADAM

ÁJÁ

[Foto dị na peeji nke 119]

Mbilite n’ọnwụ Lazarọs gosiri na a pụrụ imeri ọnwụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya