Isi 13
Isoro Ógbè Ndị Bụ Mmụọ Na-ekwurịta Okwu
1-3. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee mmasị n’isoro Onye Okike ahụ na-ekwurịta okwu?
“MKPALI maka inwe nkwurịta okwu na-adị omimi.” Akwụkwọ ahụ bụ́ Machines ji okwu ndị a malite otu isiokwu na redio. Site na redio, anyị pụrụ isoro ndị nọ gburugburu ụwa kwurịta okwu ma ọ bụ ọbuna nụta ozi site n’ọnụ ndị na-aga na mbara igwe.
2 Iji redio zirịta ozi bụ akụkụ ndụ nke a na-anabata ugbu a. Ma ọtụtụ ndị na-eleghara anya ma ọ bụ na-aghọtahie ụdị nkwurịta okwu ka mkpa—nke iso ógbè ndị bụ mmụọ.
ỊGWA ONYE OKIKE AHỤ OKWU
3 Ọtụtụ narị afọ tupu e mepụta redio, Eze Devid dere, sị:
“Gee ntị n’okwu ọnụ m, Jehova . . . Ṅaa ntị n’olu ntiku m na-etiku gị, Eze m, na Chineke m: n’ihi na ọ bụ gị ka m na-ekpere.”—Abụ Ọma 5:1, 2.
Ọ̀ bụ na o yighị ihe ezi uche dị na ya na onye kasị nwee ọgụgụ isi n’eluigwe na ala pụrụ ‘ige ntị’ n’ihe anyị na-ekwu n’ekpere ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ime otú ahụ? Ọ̀ bụkwa na ezi uche adịghị n’anyị ịchọ enyemaka site n’aka Chineke, onye pụrụ inye anyị nduzi kasị mma?—Abụ Ọma 65:2.
4, 5. Gịnị ka a chọrọ maka ekpere ndị a na-anabata? (1 Pita 3:12)
4 Ígwè na-ezipụ ozi na nke na-anata ozi dị mkpa n’iji redio zirịta ozi. Ma gịnị dị anyị mkpa iji bịakwute Jehova n’ekpere? Ihe mbụ a chọrọ bụ okwukwe. “Onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na Ọ dị, na Ọ na-egosikwa Onwe ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ọzọ, mmadụ aghaghị ikwekọ n’ụkpụrụ omume na ụzọ nile nke Chineke. Ma ọ bụghị otú ahụ, Chineke ga-akwụsị ige ya ntị dịkwa ka onye ziri ezi na-agaghị ege ntị n’ihe omume redio o lere anya dị ka nke jọgburu onwe ya n’ụzọ omume.—1 Jọn 3:22; Aịsaịa 1:15.
5 Jehova enweghị usoro a na-aghaghị ịgbaso maka ekpere ndị ọ na-anabata. Ma ì kpere ekpere n’olu dara ụda ma ọ bụ n’ime obi, ọ pụrụ “ịnụ.” Ị pụrụ ikpe ekpere mgbe i guzo ọtọ, nọdụ ala, gbuo ikpere n’ala ma ọ bụ dina n’àkwà. (1 Samuel 1:12, 13; 1 Ndị Eze 8:54) Ọ dịghị okwu ndị pụrụ iche ma ọ bụ asụsụ okpukpe a chọrọ. Ihe ka mkpa bụ inwe obi eziokwu na mmụọ dị umeala. Rịba ama otú Jisọs si gosi nke a na Luk 18:10-14.
6-8. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’ime Bible banyere ọdịdị nke ekpere anyị?
6 N’otu n’otu, anyị pụrụ ịgakwuru Jehova n’ekpere n’oge ọ bụla. Otú ọ dị, ọ na-anabatakwa ekpere ndị e kpekọrọ ọnụ, dị ka nke sitere n’ọgbakọ nke ndị Kraịst. Site n’ige ntị n’ekpere a na-ekpe ná nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ, ụfọdụ ndị na-ekpetụbeghị ekpere amụtawo otú a pụrụ isi jiri ụzọ nkwurịta okwu a dị mkpa mee ihe. Ìgwè ezinụlọ dị iche iche kwa pụrụ ma kwesị ikpekọ ekpere ọnụ. Otu ohere e nwere bụ n’oge nri, na-agbaso ihe ilereanya Jisọs n’ikele Chineke maka nri nke o mere ka e nweta.—Mak 8:6.
7 Ị pụrụ ịma banyere ndị kpeworo ekpere ma na-eme mkpesa na ha adịghị enweta azịza. N’ihi gịnị? Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu ga-arịọ Nna m ihe ọ bụla, Ọ ga-enye unu ya n’aha m.” Ọ dịghị onye ọzọ ma e wezụga Jisọs Kraịst nke bụ ụzọ a ga-esi gakwuru Chineke. Nsogbu ahụ ọ̀ pụrụ ịbụ n’ihi amataghị nke a? (Jọn 16:23; 14:6) Gịnịkwa ka Jisọs bu n’uche n’ikwu “ihe ọ bụla”? Jọn onyeozi na-egosi na ọ bụ “ihe ọ bụla” nke ‘dị ka ọchịchọ Jehova si dị.’ Anyị agaghị ele anya na Chineke nke ezi omume ga-anabata ekpere maka nzube dị njọ, nke rụrụ arụ ma ọ bụ nke anyaukwu. (1 Jọn 5:14) Ma ọtụtụ ndị na-ekpe ekpere maka inweta akụ̀ na ụba ozugbo ma ọ bụ inweta ike n’ebe ndị ọzọ nọ. Mgbe ahụ ka a sịkwa ihe mere na Chineke adịghị aza ekpere ndị dị otú ahụ. Arịrịọ maka mkpa onwe anyị ndị ziri ezi kwesịrị ịbịa ma e kwusịa banyere ihe ndị dị ka ime uche Chineke n’ụwa.—Matiu 6:9-11.
8 Ekpere na-enye anyị ohere nke ịgwa Chineke okwu dị ka nna na-ahụ n’anya, igosipụta ọṅụ anyị, nsogbu na mkpa anyị. Ọ bụrụ na ị dịghị emebu otú ahụ mgbe nile, elegharala ya anya. Gị iso Chineke nwee mmekọrịta nke a tụkwasịrị obi na inwe ike iso ya kwurịta okwu n’oge ọ bụla ga-enye gị udo dị ukwuu nke uche ma weta obi ụtọ. Ị pụrụ ibutu ibu arọ gị, na-ejide mmasị o nwere n’ebe ị nọ n’aka.—Abụ Ọma 86:1-6; Ndị Filipaị 4:6, 7.
NZAGHACHI SITE N’ÓGBÈ NDỊ BỤ MMỤỌ
9, 10. Olee otú anyị pụrụ isi nweta ozi site n’aka Chineke?
9 Otu n’ime isiokwu ndị bụ isi nke ekpere kwesịrị ịbụ maka mkpa amamihe na nduzi sitere n’aka Chineke dị anyị. (Abụ Ọma 27:11; 119:34-36; Jemes 1:5) N’ụzọ dị aṅaa ka Chineke ga-esi zaghachi? N’oge ochie, o ziri ozi mgbe ụfọdụ n’okwu ọnụ, na-ekwu okwu site n’ọnụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ndị amụma bụ́ mmadụ. Ma Pọl onyeozi na-asị na ugbu a Chineke ‘agwawo anyị okwu site n’Ọkpara’ ya, bụ́ onye e setịpụrụ ozizi na ụzọ ndụ ya nile n’ime Bible. (Ndị Hibru 1:1, 2; 2:1-3; Jọn 20:31) Ya mere, kama ịtụ anya ka Chineke gwa anyị okwu kpọmkwem, anyị kwesịrị ịchọ enyemaka site n’ụzọ ahụ ọ họrọwooro iji mee ihe, bụ́ Bible. N’iburu nke a n’uche, anyị kwesịrị iji ịmụsi Okwu ya ike sochie ekpere maka nduzi. (Ilu 2:1-5) E nwekwara enyemaka ọzọ site n’aka ndị Kraịst nyefere onwe ha, bụ́ ndị na-ezukọ mgbe mgbe ịmụ na ịtụle Bible.—2 Timoti 2:1, 2.
10 N’ịzaghachi n’ekpere anyị, Chineke pụkwara inyere anyị aka n’onwe anyị site na mmụọ ya. Ọ na-eji nke a na-enyere ndị Kraịst aka ịghọta Okwu ya na itinye ya n’ọrụ. (Jọn 16:7-13) Devid kpere ekpere, sị: “Zi m ime ihe dị Gị ụtọ . . . Mmụọ Gị dị mma; duru m n’ala dị larịị.”—Abụ Ọma 143:10.
È NWERE NDỊ ỌJỌỌ N’ÓGBÈ NDỊ BỤ MMỤỌ?
11-15. Ànyị pụrụ isi aṅaa mara na Setan dị adị? Gịnịkwa bụ mmalite ya?
11 Ọ bụghị nanị na Bible na-emesi anyị obi ike na Jehova, Ọkpara ya na ndị mmụọ ozi bi n’ógbè ndị bụ mmụọ, na anyị pụkwara isoro Chineke kwurịta okwu site n’ekpere. N’ụzọ kwesịkwara ndabere, Akwụkwọ Nsọ na-egosikwa na e nwere ndị mmụọ nwere ọgụgụ isi bụ́ ndị dị njọ ugbu a, bụ́ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya kpọmkwem.
12 Ụfọdụ ndị na-eche na “Ekwensu” bụ nanị ihe e nwetara site na nkwenkwe oge ochie na-enweghị isi ma ọ bụ akụkọ ifo. Ndị ọzọ na-eche na mgbe Bible na-ekwu banyere “Setan,” ọ na-ezo aka nanị n’ihe ọjọọ.
13 Otú ọ dị, Matiu 4:1-11 na-agwa anyị banyere otu oge mgbe Setan nwara Jisọs ọnwụnwa atọ kpọmkwem. N’ezie, Setan e kwuru okwu ya n’ebe a abụghị ụkpụrụ ọjọọ nke dị n’ime Jisọs, n’ihi na Ọkpara Chineke enweghị ihe ọjọọ na mmehie. (Ndị Hibru 7:26; 1:8, 9) Ee e, Setan bụ onye dị adị n’ezie. E mekwara ka nke a pụta ìhè n’ihe ndekọ dị na Job 1:6-12, nke na-ekwu banyere Setan ịbịa n’ihu Jehova.
14 Ma gịnị bụ mmalite nke Setan? Anyị maara na Jehova bụ Onye Okike nke ihe nile nakwa na “ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ.” (Deuterọnọmi 32:4; Mkpughe 4:11) N’ihi nke a, ọ̀ bụ na ezi uche adịghị na ya na n’otu oge, Setan aghaghị ịbụworị ezi onye bụ mmụọ Jehova kere eke tinyere mmụọ ozi ndị ọzọ? Mgbe ahụ, olee otú o si ghọọ onye rụrụ arụ? Jemes 1:14, 15 na-agwa anyị ihe ga-enyere anyị aka ịghọta ya, sị:
“A na-anwa onye ọ bụla mgbe agụụ ihe ọjọọ nke aka ya na-adọkpụfu ya, e wee rafuo ya. Mgbe ahụ agụụ ihe ọjọọ ahụ, mgbe ọ tụrụwooro ime, o wee mụpụta mmehie.”
15 Site n’ihe meworo n’etiti ụmụ mmadụ, anyị maara na ọbụna onye a tụkwasịrị obi n’otu ọkwá pụrụ ịhụ otú ọ pụrụ isi jiri otu ọnọdụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi iji nwetakwuo ike. O yiri ka nke a ọ bụ ihe mere otu n’ime ndị mmụọ ozi Chineke. N’ịbụ onye nweere onwe ya ime nhọrọ, mmụọ a e kere eke họọrọ ụzọ ọjọọ, ikekwe na-ekwere na ya pụrụ ịdị ka Chineke, ụmụ mmadụ ana-agbaso ya. Ihe àmà na-egosi na a pụrụ iji ihe merenụ tụnyere ahụmahụ nke eze Taịa, dị ka a kọrọ ya n’Ezikiel 28:1-19. Nwoke a nọ n’ọnọdụ amara n’ihe metụtara Israel oge ochie, ma o ji mpako fụlie onwe ya elu, na-eduje n’ọdịda ya. N’ụzọ yiri nke ahụ, mpako dujere ná ndakpọ nke onye ahụ mere onwe ya Setan, bụ́ onye nguzogide nke Chineke.
16, 17. Olee otú anyị ịmara banyere Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya si enyere anyị aka?
16 Ịghọta ịdị adị Setan na-eme ka ihe ndị mere n’ubi Iden nke mere ka anyị bụrụ ndị na-ezughị okè, ndị mmehie, ndị nọ n’okpuru ọrịa na ọnwụ doo anya. Site n’ọgụgụ isi ya karịrị nke mmadụ, Setan jiri agwọ kwee Iv nkwa ụgha nke na-akpata ọnwụ. (Jenesis 3:1-5) N’ụzọ ziri ezi, Mkpughe 12:9 na-akpọ Setan “agwọ ochie ahụ.” Jisọs kwukwara na onye a ‘eguzoghị n’eziokwu,’ kama ọ ghọrọ ‘nna nke ụgha’ na “ogbu mmadụ.”—Jọn 8:44.
17 Ọ bụghị nanị Setan bụ mmụọ e kere eke nke nupụrụ isi. Akụkọ ihe mere eme dị na Jenesis 6:1-3 na-akọwa na n’ụbọchị Noa, ndị mmụọ ozi ụfọdụ—ikekwe ndị a kpaliri site na nnupụisi Setan—nwoghatara ahụ mmadụ ka ha wee soro ndị inyom nwee mmekọahụ. Nke a ekwekọghị n’okike ma bụrụ ihe rụrụ arụ. (Jud 6, 7) Mgbe Chineke kpochapụrụ ihe ọjọọ dị n’ụwa site n’iju mmiri zuru ụwa ọnụ, ndị mmụọ ozi a nupụrụ isi laghachiri n’ógbè ndị bụ mmụọ, ma ha nọ n’akụkụ nke Setan ugbu a, dị ka ndị mmụọ ọjọọ. (2 Pita 2:4, 5) Akụkọ ifo ndị a ma ama nke ndị Gris na ndị Rom banyere chi dị iche iche gara n’eluigwe ma gbadata n’ụwa pụrụ ịbụ ngwagbu nke ihe ndị mere eme banyere ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi dị ka a kọrọ ya na Bible.
MMETỤTA ỌJỌỌ SITE N’ÓGBÈ NDỊ BỤ MMỤỌ
18-20. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị mmụọ ọjọọ siworo nwee mmetụta n’ahụ ụmụ mmadụ? (2 Ndị Kọrint 11:13-15)
18 Ndị mmụọ ọjọọ ahụ enweghị mmasị n’ọdịmma anyị, kama ha tinyere uche ha nile n’ịrafu na iduhie ụmụ mmadụ, na-eche ha ihu pụọ n’ebe Chineke nọ. Pọl onyeozi kpọrọ Setan “chi nke oge a” onye “mere ka anya nke uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì n’etiti ha,” ka ha wee ghara ịmụta banyere “ozi ọma” nke Kraịst. (2 Ndị Kọrint 4:4) O nwewo ihe ịga nke ọma na nke a.
19 Otu atụmatụ o jiworo mee ihe bụ site n’ịkwalite echiche ahụ bụ na ọ dịghị Ekwensu ma ọ bụ Setan dịnụ. Ọ dị ka onye omekome nke na-agbasa echiche bụ na ọ dịghị ìgwè ndị mpụ dịnụ, si otú a na-arafu ụmụ mmadụ ịnọ ná ntụkwasị obi ụgha. Atụmatụ ọzọ bụ nke pụtara ìhè n’ihe omume ndị ahụ jọgburu onwe ha nke ndị na-anụbiga ọkụ ókè n’obi banyere okpukpe mere—agha ntụte, agha njụta okwukwe, ịgọzi agha. Nke a emewo ka ọtụtụ ndị na-enwekarị mmetụta gbakụta Jehova Chineke azụ, na-eche n’ụzọ na-ezighị ezi na chọọchị ndị ahụ na-anọchite anya ya.
20 Chetakwa na Pọl onyeozi sịrị na Setan bụ “chi nke oge a.” Ụfọdụ na-akwa echiche ahụ bụ na Setan na-eduhie mba nile emo. Ma mgbe Setan nyere Kraịst ikike n’ebe mba nile dị, Jisọs arụghị ụka na Ekwensu nwere ikike n’ebe alaeze ọchịchị ndị ahụ dị. (Luk 4:5-8) Ọ̀ bụkwa na ọ dịghị eyi ka e nwere ikike ọjọọ nke na-eduzi ihe ndị na-eme n’ụwa taa? N’iburu nke a n’uche, gụọ ihe Mkpughe 12:9, 12 na-ekwu banyere mgbalị nile nke Setan.
IZERE ISORO NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ NWEE MMEKỌ
21-23. Omume ndị dị aṅaa pụrụ ijikọta mmadụ na ndị mmụọ ọjọọ?
21 Ndị ọkà mmụta sayensị emewo nnyocha n’ihe a maara dị ka ESP (ịghọta ihe karịrị echiche mmadụ). Nke a gụnyere ihe omume ndị dị ka mmadụ ịmara echiche ndị ọzọ, ịkọwa ihe omume ma ọ bụ ihe ndị ọ pụrụ ịbụ na ọ hụtụbeghị ma ọ bụ mụọ banyere ha mgbe ọ bụla, na iji itinye ‘uche n’ihe’ nwee mmetụta n’ihe ndị dị ka ndagharị nke mkpụrụ òkwè. Ndị na-eme nnyocha n’ihe banyere ikike ndị mmụọ ọjọọ agbalịwo ịgụpụ aghụghọ ịdị na ya, ma ha apụghị ịkọwa oké ihe omume ndị a karịrị ikike mmadụ. Ọ̀ pụrụ ịbụ na ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu bụ nkọwa ya?
22 Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya pụrụ inwe mmetụta kpọmkwem n’ahụ ụmụ mmadụ na n’ihe omume ha. Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ na Filipaị oge ochie, nke dị na Gris, nwere ikike nke ịkọ ọdịnihu. N’ụzọ dị aṅaa? Ihe ndekọ ahụ mere eme na-asị na “otu mmụọ, bụ́ mmụọ nke ịjụ ase,” na-ekwu okwu site n’ọnụ nwa agbọghọ ahụ. Pọl onyeozi nyeere ya aka inwere onwe ya pụọ n’aka mmụọ ọjọọ ahụ.—Ọrụ 16:16-18, NW.
23 N’ihi na ndị mmụọ ọjọọ dị adị ma dị ike, Okwu Chineke na-adọ anyị aka ná ntị ugboro ugboro megide iso ha mekọọ ihe. Ọ na-akagbu ịkọ mmadụ ọgwụ (dị ka ọ dị na majik ojii ma ọ bụ voodoo), ịgakwuru ndị na-ajụ ndị mmụọ ọjọọ ase ma ọ bụ mmadụ ịnwa isoro ndị nwụrụ anwụ mekọọ ihe. (Deuterọnọmi 18:10-12; Levitikọs 20:6, 27; Ndị Galetia 5:19-21) Ịdọ aka ná ntị ndị ahụ ka bakwara uru. Ọ pụrụ ịbụ na ị hụwo mmasị gbasazuru ebe nile e nwere n’ihe ndị metụtara ikike ndị mmụọ ọjọọ na mgbaasị. Ọtụtụ ihe nkiri na akwụkwọ ọgụgụ ekwuwo banyere ‘ndị mmụọ’ ma ọ bụ mgbalị mmadụ mere iji chụpụ ndị mmụọ ọjọọ. Iji Ouija board ma ọ bụ ịgụ kpakpando mee ihe maka nduzi bụ ihe a na-ahụ n’ebe nile.
24-28. Ị̀ pụrụ isi aṅaa chebe onwe gị pụọ ná mmekọrịta na-emerụ ahụ nke ógbè ndị bụ mmụọ?
24 Isoro ndị mmụọ ọjọọ na-ekwurịta okwu dị ize ndụ. Akụkọ dị iche iche na-egosi na ozugbo ndị mmụọ ọjọọ nwere ike n’ahụ mmadụ, ha pụrụ iweta mmerụ ahụ dị ukwuu—n’anụ ahụ, echiche na ná mmetụta uche. (Tụlee Matiu 8:28-33.) Ha enyewo ụfọdụ ndị nsogbu, na-eme mkpọtụ n’abalị, na-eme ka ihe na-emegharị, na-apịtụgasị aka n’akụkụ ahụ e ji enwe mmekọahụ ma na-akpata ọrịa. Ọbụna na “olu” ha akpataworo ụfọdụ ndị isi mgbaka, igbu mmadụ ma ọ bụ igbu onwe onye.
25 N’ezie, ihe “mgbagwoju anya” ụfọdụ pụrụ ime n’ihi nsogbu anụ ahụ, dị ka nsogbu n’usoro nke mmiri ọgwụ dị n’ahụ ji arụ ọrụ, bụ́ nke pụrụ imetụta uche na echiche. Ma ọ ga-abụ ihe nzuzu ikwu na Setan na ndị mmụọ ọjọọ adịghị. Eledala ịdị mkpa nke ịdọ aka ná ntị nke Bible banyere ha anya.
26 Ọ bụrụ na ndị mmụọ ọjọọ na-enye mmadụ nsogbu, ọ̀ dị ụzọ ọ pụrụ isi nwere onwe ya? Ugbu a Chineke adịghị ejikwa ụmụ mmadụ eme ihe n’ịgwọ ndị ọrịa, ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ ma ọ bụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ, dị ka o ji ndị ozi mee. Ma ọ ga-enyere mmadụ aka inwere onwe ya pụọ “n’ike Setan.” (Ọrụ 26:18; Ndị Efesọs 6:12) Ọ dị mkpa ichigharịkwuru Jehova n’ekpere, na-eji aha ya eme ihe ma na-achọsi enyemaka ya ike. (Ilu 18:10) Ọzọ, mmadụ aghaghị iguzogide aro nke ndị mmụọ ọjọọ, dị ka Jisọs mere, na-akwụsị ihe omume mgbaasị na isoro ndị na-agbaso ofufe ndị mmụọ ọjọọ na-enwe mkpakọrịta na-enweghị isi.—Matiu 4:1-11; 2 Ndị Kọrint 6:14-17.
27 Tụkwasịkwa, akụkọ na-egosi na ndị mmụọ ọjọọ na-esokarị mmadụ na-emekọ ihe site n’otu ihe, ya mere ọ dị mkpa ibibi ihe ọ bụla e jibu mee ihe ná mgbaasị (ọgwụ, ihe ndị e ji ahụ ọdịnihu, na ihe ndị ọzọ). Bible na-agwa anyị na ndị meworo majik n’Efesọs oge ochie mere nke ahụ.—Ọrụ 19:18-20.
28 Ma ọ dịghị mkpa ịnọ n’ụjọ mgbe nile banyere ndị mmụọ ọjọọ. Kama nke ahụ, Bible na-agba anyị ume ka anyị yikwasị onwe anyị ihe agha ime mmụọ:
“Ya mere guzonụ, mgbe unu weresịịrị EZIOKWU kee úkwù unu, werekwa ihe agha nke na-egbochi obi yikwasị, bụ́ EZI OMUME, werekwa nkwadebe nke bụ OZI ỌMA NKE UDO yikwasị n’ụkwụ unu; tụkwasị ihe nile ndị a welienụ ọta nke bụ OKWUKWE, nke unu ga-apụ imenyụ akụ̀ ụta nile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ n’ime ya. Narakwanụ okpu agha nke bụ NZỌPỤTA, ya na mma agha nke mmụọ nsọ nke bụ OKWU CHINEKE: sitekwanụ n’EKPERE . . . na-ekpe ekpere n’oge nile.”—Ndị Efesọs 6:14-18.
Dị ka Okwu Chineke na-ekwu n’ebe a, ihe nchebe magburu onwe ya megide iso ndị mmụọ ọjọọ nwee nkwurịta okwu a na-achọghị bụ isoro Jehova na-ekwurịta okwu mgbe nile site n’ekpere. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Bible na-asị: “Doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma guzogidenụ Ekwensu; ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.”—Jemes 4:7.
[Foto dị na peeji nke 123]
Kwa ụbọchị, anyị pụrụ isoro Chineke kwurịta okwu site n’ekpere