Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • su isi 6 p. 46-53
  • Ụwa nke E Bibiri n’Oge Gara Aga

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụwa nke E Bibiri n’Oge Gara Aga
  • Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “HA AMAGHỊKWA”
  • NNAPỤTA MAKA NDỊ NA-ASỌPỤRỤ CHINEKE
  • Ihe Mere Chineke Ji Nwee Mmasị n’Ebe Noa Nọ—Ihe Mere O Ji Gbasa Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Okwukwe Noa Na-ama Ụwa Ikpe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Mgbapụta Dị Nso Nye Ndị Na-asọpụrụ Chineke!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Akụkọ Noa na Iju Mmiri ahụ Bụ Eziokwu, Ọ Bụghị Akụkọ Ifo
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
su isi 6 p. 46-53

Isi nke 6

Ụwa nke E Bibiri n’Oge Gara Aga

1. (a) Ọ̀ diwo mgbe mbibi ụwa chere ihe a kpọrọ mmadụ ihu na mbụ? (b) N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nwee ekele na Noa akwaghị ịdọ aka ná ntị banyere ya emo?

N’OTU mgbe gara aga, mbibi ụwa dị nso. Ndị nke mba nile kwesịrị inwe ekele na n’etiti ndị nna ha ochie, e nwere otu nwoke nke na-akwaghị ịdọ aka ná ntị Chineke banyere iju mmiri ga-ezu ụwa ọnụ emo. N’ihi na Noa gere ntị, rubekwa isi, ya na nwunye ya na ụmụ ya atọ na ndị nwunye ha lanarịrị. Ọ bụ na ha ka anyị nile si pụta.—Jenesis 10:1, 32.

2. N’ihi gịnị ka Chineke jiri bibie ụwa ahụ?

2 Chineke lara ụwa ahụ n’iyi n’ihi na ọ hụrụ na ụwa jupụtara n’ihe ike. “Ihe ọjọọ nke rnrnadụ hiri nne n’ụwa.” (Jenesis 6:3, 5, 13) Ọnọdụ ndị ahụ yiri nnọọ ndị dị na narị afọ nke iri abụọ anyị nke a.

3. Gịnị mere ọnọdụ ahụ ji dị oké njọ?

3 Gịnị kpatara ọnọdụ dị n’ụbọchị Noa ji dị oké njọ? E mere ka a mata otu ihe bụ isi na Jenesis 6:2, nke na-akọ, sị: “Ụmụ ndị ikom nke Chineke hụrụ ụmụ ndị inyom nke mmadụ na ha mara mma; ha wee lụtara onwe ha ndị inyom site ná ndị nile ha họpụtara.” Ma gịnị dị nịọ na nke ahụ? Otú ọ dị, ndị a abụghị ndị ikom efu bụ mmadụ ndị kpebiri ịlụ nwunye. “Ụmụ ndị ikom nke Chineke” ndị a bụ ndị mmụọ ozi, ụmụ mmụọ e kere eke, ndị hụrụ ndị inyom mara mma n’elu ụwa na ihe ụtọ nke alụmdi na nwunye, wee nwoghara ahụ mmadụ. (Tụlee Job 1:6.) Ha inwoghara ahụ mmadụ na ịlụ nwunye bụ omume nnupụisi megide Chineke. Akwụkwụ nsọ sịrị na “ha hapụrụ ebe obibi nke aka ha,” na mmekọrịta ha na ụmụ nwanyị ‘adịghịkwa ka chi si kee ya,’ ọ bụ omume rụrụ arụ. (Jud 6, 7; 1 Pita 3:19, 20) Ụmụ ha gbara ajọ dimkpa. A kpọrọ ha ndị Nefilim, ma ọ bụ “ndị ntigbu,” n’ihi na ha bụ ndị na-emekpọ mmadụ ọnụ.—Jenesis 6:4.

4. (a) N’ihi gịnị ka Chineke ji hụta Noa ihu ọma? (b) Nkwadebe dị aṅaa ka e mere maka nchebe nke ndụ?

4 Ọ bụ ezie na o bi n’etiti ụwa ahụ rụrụ arụ, Noa chọtara amara n’ihu Jehova. N’ihi gịnị? N’ihi na “Noa bụ onye ezi omume.” Ọ maara ihe iseokwu ndị ahụ e welitere n’Iden nke ọma, ọ ghọkwara onye a na-apụghị ịta ụta, “nwoke na-ekwesị ntụkwasị obi.” (Jenesis 6:8, 9; TheJerusalem Bible) N’oli- leanya nke ichebe Noa na ezinụlọ ya, tinyere ụdị anụmanụ na anụ ufe ọ bụla, Jehova nyere ya iwu ka o wuo ụgbọ, bụ ihe owuwu nke yiri igbe buru ibu. Dị ka Chineke kọwara: “Ana m eme ka iju mmiri bịakwasị ụwa, ibibi anụ ahụ nile, nke ume ndụ dị n’ime ya, ka ọ pụọ n’okpuru eluigwe. Ihe nile nke dị n’ụwa ga-ekubi ume.” (Jenesis 6:13-17) Noa jiri amamihe ṅaa Chineke ntị, rubekwa isi.

5. Ruo ókè ha aṅaa ka Iju Mmiri ahụ hà?

5 Iju Mmiri ahụ bịara n’afọ 2370 T.O.A., dị ka ngụkọ oge zuru ezu nke Bible gosiri. Ọ bụrịị ọdachi kachasị njọ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, ọbụna ruo n’oge nke a. Nrikpu ahụ dị ukwuu nke na “[e kpuchiri] ugwu nile dị n’elu nke dị n’okpuru eluigwe.” (Jenesis 7:19) Site n’Iju Mmiri ahụ “ụwa nke dị n’oge ahụ [lara] n’iyi.” (2 Pita 3:6) Ma mmadụ pụrụ ịjụ sị: ‘Ọbụrụ na mmiri kpuchiri ọbụna ugwu ndị kasị elu, olee ebe mmiri ahụ dị ugbu a?’ O doro anya na ọ dị n’elu ala ebe a.

6. Mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, ebee ka mmiri nile ahụ jere?

6 O kwesịrị ka a mata na Bible asịghị na ugwu ọ bụla n’ụbọchị Noa a dị elu dị ka Ugwu Everest. Ndị ọkà mmụta sayensị ekwuwo na n’oge gara aga, ọtụtụ ugwu dị nnọọ ala karị ka ha dị ugbu a, na ọbụna na e nulitewokwa ụfọdụ site n’okpuru oké osimiri. Ọzọkwa, ọ bụ ihe e kwetara na ọ dị mgbe oké osimiri dị iche iche n’onwe ha pere mpe karịa ka ha dị ugbu a, kọntinenti dị iche iche dịkwa ukwuu karịa ka ha dị ugbu a, dị ka ọwa mmiri dị iche iche ndị gbatịpụrụ agbatịpụ n’okpuru oké osimiri si gbaa ama ya. Ma banyere ọnọdụ nke dị ugbu a, magazin National Geographic, ná mbipụta ya nke January 1945, kọrọ, sị: “E nwere mmiri n’oké osimiri okpukpu iri n’ibu ibu karịa otú e nwere ala nke dị n’elu mmiri. Ọ bụrụ na a tụnye ala nile a n’ókè ha nhata n’ime oké osimiri, mmiri ga-ekpuchi ụwa niie ruo otu maịlụ n’ọkara n’ịdị omimi.” Ya mere, mgbe mmiri iju mmiri ahụ zosịrị, ma tupu nnulite nke ugwu dị iche iche na mweda nka ala oké osimiri emee ka mmiri takọrọ n’ala ta tupu mkpụkọta nke ọdọ mmiri ice nke akụkụ ụwa ebe ndị na-ajụbiga oyi ókè, e nwere mmiri zuru ezu iji kpuchie “ugwu nile dị elu,” dị ka Bible kwuru.—Jenesis 7:17-20; 8:1-3; tụlee Abụ Ọma 104:8, 9.

7, 8. Ihe ndekọ ọzọ dị aṅaa nke Iju Mmiri ahụ ka e nwere ma e wezụga Bible?

7 Oké iju mmiri zuru ụwa ọnụ dị otú ahụ aghaghị inweworị mmetụta a na-agaghị echezọ echezọ n’ahụ ndị dịrị ndụ gabiga ya. A gaje ịkọrọ ọgbọ ndị na-abịa n’ọdịnihu banyere ya. Ebe ihe ndekọ Bible sịrị na mba nile si n’otu òtù ahụ nke ndị lanarịrị Iju Mmiri pụta, ezi uche dị ya ịtụ anya na a ga-enwe n’akụkụ nile nke ụwa, ihe àmà nke ncheta mbụ nke oké mbibi ahụ. Ọ̀ dị otú ahụ? Ee, ọ dị otú ahụ!

8 Mgbe ụmụ nke ndị lanarịrị Iju Mmiri ahụ na-eje biri n’ebe ndị dị anya nakwa mgbe oge na-aga, a ghagburu akụkọ ahụ, e mekwara ka akụkọ ahụ kwekọọ ná nkweta okpukpe nke ógbè dị iche iche. Ma o siri ike ịbụ ihe ndaba efu na n’ọtụtụ akụkọ ifo nke mgbe ochie n’akụkụ ụwa nile, e nwere ncheta nke oké iju mmiri nke bibiri ihe a kpọrọ mmadụ ma e wezụga mmadụ ole na ole ndị a zọpụtakọrọ ọnụ. A na-ahụ ihe àmà nke a na Mesopotamia na n’akụkụ ndị ọzọ nke Asia, n’Australia na n’agwaetiti dị iche iche nke Pacific, n’ime ọtutụ ebo dị iche iche nke ndị India n’Ugwu na Ndịda America, n’akụkọ ndị a na-akọ n’etiti ndị Grik oge ochie na ndị Rom, na Scandinavia, na n’etiti ebo dị iche iche n’Africa. Ọtụtụ akụkọ ndị a na-ehota ụmụ anụmanụ ịbụ ndị e chebere n’ime ụgbọ mmiri ha na ụmụ mmadụ. N’iyi ihe ndekọ Bible ahụ, ụfọdụ na-akọ na e zipụrụ ụmụ nnụnụ ịchọpụta ma mmiri ọ̀ talatawo. (Tụlee Jenesis 7:7-10; 8:6-12.) Ọ dịghị ihe omume mgbe ochie ọzọ nke a na-echeta nke ukwuu otú a.

9. Omume ndị dị aṅaa na-egosi ncheta nke ihe mere “n’ọnwa nke abụọ” nke kalenda oge Noa?

9 Akụkọ dị iche iche nke e jikọtara ha na Iju Mmiri ahụ emetụtawo omenala dị iche iche ọbụna ruo oge anyi a. N’ụzọ dị aṅaa? Otú ọ dị, Bible kọrọ na Iju Mmiri ahụ malitere “n’ọnwa nke abụọ, n’ụbọchị nke iri na asaa nke ọnwa” ahụ. “Ọnwa nke abụọ” ahụ kwekọrọ n’akụkụ ikpeazụ nke October na mmalite November na kalenda anyị. (Jenesis 7:11) Ya mere, ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na ọtụtụ mmadụ gburugburu ụwa na-eme ememe ncheta Ụbọchị Ndị Nwụrụ Anwụ ma ọ bụ Oriri nke Ndị Nna Ochie n’oge ahụ n’afọ. Gịnị mere o ji bụrụ mgbe ahụ? N’ihi na omenala ndị a na-egosipụta ncheta nke mbibi Iju Mmiri ahụ kpatara.a

10. Gịnị mere akụkọ Bible nke Iju Mmiri ahụ ji bụrụ ihe a pụrụ nnọọ ịtụkwasị obi, nke bakwara uru onwe onye dị ukwuu?

10 Otú ọ dị, ọ bụ Bible n’onwe ya nwere akụkọ a na-eme- rụghị emerụ nke ihe merenụ. E mere ka ihe Noa hụrụ n’ahụmahụ ya mesịa bụrụ otu akụkụ nke Bible. Mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị, Chineke n’onwe ya, mgbe ọ na-ekwu okwu site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma, zoro aka ná “mmiri nke Noa.” (Aịsaịa 54:9) Ọkpara nke Chineke hụrụ ihe nile mere n’ụbọchị Noa. N’ikpeazụ, mgbe ọ nọ n’elu ụwa, Onye a, bụ́ Jisọs Kraist, kwuru banyere Iju Mmiri ahụ dị ka akụkọ ihe mere eme bụ eziokwu, ọ kọwakwara ihe mere ọtụtụ mmadụ ji nwụọ n’oge ahụ.

“HA AMAGHỊKWA”

11. N’ihi gịnị ka e ji laa ọtụtụ mmadụ n’iyi n’Iju Mmiri ahụ?

11 Jisọs asịghị na mmadụ nile, e wezụga ndị ezinụlọ Noa bụcha ndị na-eme ihe ike. Kama, ọ sịrị: “N’ihi na dị ka ha nọ na mgbe ahụ nke bu oké iju mmiri ahụ ụzọ na-eri ihe na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-alụ nwunye, na-enyekwa n’ọlụlụ di, ruo ụbọchị Noa batara n’ụgbọ ya, ha amaghịkwa ruo mgbe oké iju mmiri ahụ bịara, kpopụ ha nile, otú a ka [ọnụnọ] Nwa nke mmadụ [Jisọs Kraist] ga-adị.”—Matiu 24: 37-39.

12. Gịnị mere ọmụma ‘ha na-amaghị’ ji dị oké njọ?

12 Ọ dịghị njọ ha iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ n’ókè kwesịrị ekwesị ma ọ bụ ịlụ di na nwunye n’ụzọ nsọpụrụ. Ma mgbe a dọrọ ha aka ná ntị maka mbibi ga-ezu ụwa ọnụ, ha ịnọgide na-atụkwasị ndụ ha ná nchụso onwe onye dị otú ahụ gosiri na n’ezie ha ekweghị n’okwu Noa ma ọ bụ nke Jehova, onye Noa kwusara ozi ịdọ aka ná ntị ya. A sị na ha kwere, ha gaara eji obi ha nile chọọ ụzọ nzọpụta ga-esi kwe omume mgbe ahụ, meekwa ihe ọsọ ọsọ imezu ihe a chọrọ ha n’aka. Ma eleghị anya ụfọdụ n’ime ndị ahụ kwetara na e kwesịrị ime ihe iji kwụsị ihe ike juru ebe nile n’ụbọchị ndị ahụ, ma obi abụọ adịghị ya na o yiri ha ka iju mmiri zuru ụwa ọnụ bụ ihe na-agaghị eme eme. Ya mere, dị ka Jisọs kwuru, “ha amaghịkwa [maka ozi Chineke site n’aka Noa] ruo mgbe oké iju mmiri ahụ bịara, kpopụ ha nile.” E dekọrọ nke ahụ dị ka ihe ịdọ aka ná ntị nye anyị.

13. (a) Dị ka e buru n’amụma, olee ụzọ ọtụtụ mmadụ si emeghachi omume taa mgbe a gwara ha na Kraist anọrọworị anọrọ n’ụzọ a na-apụghị ịhụ anya, n’ihi gịnịkwa? (b) Gịnị ka Pita sịrị na ha na-elefuru anya?

13 Pita onyeozi, onye nọ n’okpuru nduzi mmụọ nsọ dọkwara aka ná ntị otú ahụ mgbe o dere sị: “Ndị ọchị ga-eji ịchị ọchị bịa na mgbe ikpeazụ [bụ ebe anyị nọ ugbu a], na-aga dị ka agụụ ihe ọjọọ nke aka ha si dị, na-asịkwa: Olee ebe nkwa nke [ọnụnọ] ya dị? N’ihi na site n’ụbọchị nna anyị hà dara n’ụra ọnwụ, ihe nile na-adịgide dị ka ha dịwọro site ná mmalite nke okike.” Ndị dị otú ahụ achọghị iche na ha ga-aza onye ọ bụla ajụjụ banyere onwe ha. Ya mere, ha na-enuchapụ n’uche ha echiche nke ọnụnọ Kraist na ihe ọ ga-apụtara ndị na-adị ndụ nke a sọpụrụghị Chineke. Ma Pita gara n’ihu na-asị: “N’ihi na nke a mere ha nchefu n’ihi na ha na-achọ ya, na eluigwe dị site na mgbe ochie, ha na ala nke e sitere ná mmiri werekwa mmiri mee ka o guzokọọ n’otu, site n’okwu Chineke; nke e sitere n’aka ha mee ka ụwa nke dị n’oge ahụ laa n’iyi n’ihi na iju mmiri gbara ya. Ma eluigwe nke dị ugbu a ha na ụwa, ka a kpadoworo nye ọkụ site n’otu okwu ahụ, ebe a na-edebe ha nye ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” —2 Pita 3:3-7.

14. N’ihi gịnị ka mmezu nke “okwu Chineke” n’oge okike ihe na n’ụbọchị Noa ga-eji mee ka anyị chee echiche miri emi taa?

14 Ndị na-akwa emo na-elefuru eziokwu ahụ anya na “okwu Chineke” adịghị agafe n’emezughị. Iji megide echiche ha nke a, Pita onyeozi na-ezoro anyị aka laa azụ n’oge okike ihe. N’oge ahụ, Chineke sịrị: “Ka mbara dị n’agbata mmiri ahụ, ka ọ nọọkwa na-akpa ókè n’etiti mmiri na mmiri.” Ebe o kwusịworo nke ahụ, “Chineke wee mee mbara ahụ, kpaa ókè n’etiti mmiri ahụ nke dị n’okpuru mbara ahụ na mmiri ahụ nke dị n’elu mbara ahụ.” Otú a, e mezuru “okwu Chineke,” bụ nkwupụta nke nzube ya. (Jenesis 1:6, 7) E mezukwara okwu ya mgbe o zubere iweta iju mmiri zuru ụwa ọnụ n’ụbọchị Noa, jirikwa mmiri ndị ahụ mebie “ụwa nke dị n’oge ahụ.” Ọ ga-abụkwa site n’otu okwu Chineke ahụ nke a na-apụghị iguzogide eguzogide ka mbibi ga-abịakwasị usoro ihe nke a na-adịghị asọpụrụ Chineke.

15. (a) Gịnị mere na 2 Pita 3:7 adịghị ebu amụma nrechapụ n’ọkụ nke mbara ala bụ ụwa? (b) Ya bụrụ otú ahụ, gịnị bụ “eluigwe” na “ụwa” nke “a kpadoworo nye ọkụ”?

15 Ihe mere n’oge Iju Mmiri ahụ bụ ihe atụ nke ihe gaje ịbịa. Laa azụ n’oge ahụ, e bibighị ala, kama e bibiri ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Mgbe ahụ, gịnị ka okwu ahụ pụtara, nke bụ na “eluigwe nke dị ugbu a ha na ụwa, ka a kpadoworo nye ọkụ”? (2 Pita 3:7; 2:5) Ọ dị mma, mmetụta dị aṅaa ka ọkụ nkịtị ga-enwe n’anyanwụ na kpakpando ndị dị mbụ dị oké ọkụ n’eluigwe nkịtị? Oleekwa ụzọ irechapụ ala nkịtị n’ọkụ ga-esi kwekọọ ná nzube Chineke ime ka ọ ghọọ Paradaịs? N’ụzọ doro anya, “eluigwe nke dị ugbu a ha na ụwa” ndị e zoro aka ebe a aghaghị ịbụ nke ihe atụ. (Tụlee Jenesis 11:1; 1 Ndị Eze 2:1, 2; 1 Ihe Emere 16:31.) “Eluigwe” nọchiri anya ọchịchị dị iche iche e buliri elu karịa ihe a kpọrọ mmadụ n’ọha, “ụwa” bụkwa òtù ụmụ mmadụ na-adịghị asọpụrụ Chineke. N’ime oké ụbọchị Jehova, a ga-ebibi ha kpam kpam dị ka ihe e rechapụrụ n’ọkụ. Ndị nọgidere na-akwa ịdọ aka ná ntị Chineke banyere nke a emo na-etinye ndụ ha n’oké ihe ize ndụ.

NNAPỤTA MAKA NDỊ NA-ASỌPỤRỤ CHINEKE

16. Dị ka e gosiri na 2 Pita 2:9, gịnị bụ ụzọ nke nnapụta?

16 Akụkọ Iju Mmiri ahụ na-egosipụta nke ọma otu ihe nke dị anyị mkpa taa iburu n’obi. Gịnị ka ọ bụ? Mgbe o zosịrị aka n’ihe Chineke mere n’ụbọchị Noa, Pita onyeozi mechiri okwu ya, na-asị: “[Jehova] matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ ndị na-asọpụrụ Chineke, na idebe ndị ajọ omume n’ahụhụ mmehie ruo ụbọchị ikpe.” (2 Pita 2:9) Mgbe ahụ, ụzọ nke nnapụta bụ ịbụ onye na-asọpụrụ Chineke.

17. Olee otú Noa si gosipụta ihe àmà nke nsọpụrụ Chineke?

17 Gịnị ka nke ahụ pụtara? O doro anya na Noa bụrịị nwoke na-asọpụrụ Chineke. “Noa na Chineke yịkọrọ na-ejeghari.” (Jenesis 6:9) Ọ gbasoro ụzọ ndụ nke kwekọrọ ná nzube Jehova e kpughere ekpughe. O nwere mmekọrịta chiri anya nke ya na Chineke. Iwu ụgbọ ahụ na ịchịkọta ụdị nnụnụ na anụmanụ nile bụ oke ọrụ dị ukwuu. Noa emeghị omume nke a hụ n’anya ekwe. O nwere okwukwe. “Noa wee mee ya, dị ka iwu nile nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.” (Jenesis 6:22; Ndị Hibru 11:7) Ọ dị mkpa ichetara ndị mmadụ maka ụzọ ezi omume nile nke Jehova na ịdọ ha aka ná ntị banyere mbibi na-abịanụ nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Noa mekwara nke ahụ dị ka “onye na-ekwusa ezi omume.”—2 Pita 2:5.

18. N’ihi gịnị ka onye ọ bụla nke lanarịrị Iju Mmiri ahụ ga-eji bụrụworịị onye nwere ụdị nsọpụrụ Chineke ahụ?

18 Gịnị banyere nwunye Noa, ụmụ ya na ndị nwunye ha—gịnị ka a chọrọ ha n’aka? Akụkọ Bible kpọtụkarịrị Noa aha n’ụzọ pụrụ iche n’ihi na ọ bụ onyeisi ezinụlọ ahụ, ma ndị ọzọ aghaghị ịbụkwa ndị na-asọpụrụ Chineke. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ? Jehova hotara okwu banyere ụmụ Noa n’ikpeazụ nye onye amụma bụ Ezikiel iji gosi na, ọ bụrụ na Noa dị ndụ n’Israel n’oge ahụ, ụmụ ya agaghị atụ anya nnapụta n’ihi ezi omume nke nna ha. Ha etoruwo irube isi ma ọ bụ inupụ isi, ya mere, ọ dị ha mkpa n’otu n’otu igosipụta ihe àmà nke nsọpụrụ ha nye Jehova na ụzọ ezi omume ya nile.—Ezikiel 14:19, 20.

19. Ya mere, gịnị ka anyị kwesịrị ịdị na-eme, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?

19 N’ihi ịbụ ihe e ji n’aka nke mbibi ụwa na-abịanụ, Bible na-agba anyị ume idebe ya nso n’uche na igosipụtakwa na anyị bụkwa ndị na-asọpụrụ Chineke. (2 Pita 3: 11-13) Site n’etiti ndị si n’eriri Noa pụta, e nwere taa n’akụkụ nile nke ụwa ndị na-erubere ndụmọdụ amamihe ahụ isi, ndị ga-alanarịkwa baa n’ime “ụwa ọhụrụ” ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a The Worship of the Dead (London; 1904), nke Colonel J. Garnier, peji 3-8; Life and Work at the Great Pyramid (Edin- burgh; 1867), Mpịakọta II, nke Prọfesọ C. Piazzi Smyth dere, peji 371-424.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya