Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • su isi 9 p. 68-74
  • Ònye Na-eduga n’Ụzọ nke Mgbapụta?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Na-eduga n’Ụzọ nke Mgbapụta?
  • Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • EZI ONYE ỌZỤZỤ ATỤRỤ ỌMA AHỤ
  • Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma na Ogige Atụrụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ogige Atụrụ Ndị ahụ na Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Oké Ìgwè Mmadụ nke Ndị Na-efe Ezi Ofufe—Olee Ebe Ha Si Bịa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Iji Ịdị Nro Na-azụ Atụrụ Jehova Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
su isi 9 p. 68-74

Isi nke 9

Ònye Na-eduga n’Ụzọ nke Mgbapụta?

1. (a) Gịnị ka anyị na-aghaghị ido onwe anyị n’okpuru ya ka e wee napụta anyị gabiga “mkpagbu ukwu” ahụ? (b) Olee otú e si mee ihe atụ nke a site n’ụzọ Chineke si jiri Moses mee ihe?

Ọ GWỤLA ma ànyị nakweere idu ndú Jisọs Kraịst ma gosikwa ihe àmà doro anya na anyị na-ana ya ntị n’ezie, na-ejekwa ije na nzọụkwụ ya nile ka a ga-azọpụta anyị n’ime ụwa nke a na-emebi iwu, bụrụkwa ndị e chebere ndụ gabiga “mkpagbu ukwu” ahụ na-abịanụ. (Ọrụ 4:12) E gosiri nke a nke ọma n’ihe omume nile metụtara nnapụta a napụtara mba Israel anụ ahụ site n’Ijipt na 1513 T.O.A. Site n’ụzọ ọrụ ebube, Jehova duuru Israel gabiga Osimiri Uhie n’enweghị mmerụahụ wee bibie ndị agha Ijipt na-achụso ha. N’ihe a nile, Chineke jiri Moses mee ihe iji duo ndị nke ya.—Joshua 24:5-7; Ọpụpụ 3:10.

2. (a) Olee ndị bụ “ọtụtụ ndị gwara ọgwa” ndị sooro ndị Israel pụọ n’Ijipt? (b) Gịnị bụ ihe na-aghaghị ịdọtaworị ọtụtụ n’ime ha? (ch) N’ihe dị aṅaa ka e tinyere ha n’ule n’oge na-adịghị anya?

2 Mgbe ndị Israel zọọrụ ije pụọ n’Ijipt, na-enwe olileanya ịbanye n’Ala Nkwa ahụ, ndị ọzọ sonyeere ha. Dị ka Moses dere n’ikpeazụ: “Ọtụtụ ndị gwara ọgwa sooro ha rịgoo.” (Ọpụpụ 12:38) Olee ndị bụ ndị a? Ha bụrịị ndị Ijipt ma ọ bụ ndị ala ọzọ ndị sonyeere Israel. Ha ahụwo ihe otiti nile na-atụ egwu ndị Jehova tiri mba Ijipt ndị na-emegbu ha iji gosi na ọ bụ nanị ya bụ ezi Chineke nakwa na chi ndị Ijipt nile bụ chi ụgha, ndị na-apụghịkwa ịnapụta ndị na-efe ha. Obi abụọ adịghịkwa ya na ihe nile ha nụrụ site n’ọnụ ndị Israel maka olileanya nke ndụ n’ala “nke mmiri ara ehi na mmanụ anụ na-eru na ya” tọrọ ha ụtọ ná ntị. (Ọpụpụ 3:7, 8; 12:12) Ma, hà kwenyekwara nke ọma na Moses dị ka onye Chineke guzobere ịbụ onye ọchịchị na onye mgbapụta nke ndị Ya? E tinyere ha n’ule n’oge na-adịghị anya.—Ọrụ 7:34, 35.

3. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa iso ntụziaka Moses? (b) Olee ihe ‘baptism baa n’ime Moses’ pụtara? (ch) N’ihi gịnị ka nke ahụ ji dị ndị Israel ime mmụọ mkpa?

3 Ozugbo Israel, tinyere “ọtụtụ ndị gwara ọgwa,” bịaruru n’ụsọ Osimiri Uhie ahụ, eze lịipt na usuu ndị agha ya chụsoro ha n’azụ iji dọghachi ha azụ banye n’ịbụ ohu. Ka e wee napụta ha, ha aghaghị ịnọkọ ọnụ ma gbasookwa ntụziaka Moses, n’ihi na Jehova ji Moses eme ihe iji duo ha. Site n’iji aluluu nke karịrị ike mmadụ mee ihe, Jehova dọghachiri ndị iro ahụ azụ mgbe o kewara mrniri nke osimiri ahụ n’akụkụ abụọ ma mịkọọ ala mmiri ahụ. N’adịghị ka ihe mesịrị mee ndị Ijipt, n’ụzọ dị ịtụnanya ndị Israel nile na “ọtụtụ ndị gwara ọgwa” ndị ahụ sooro Moses gabigara ala akọrọ ahụ. (Ọpụpụ 14:9, 19-31) Mgbe ha na-azọ ije na-agafe, ka mgbidi mmiri ahụ dịkwa ha n’aka nri na n’aka ekpe na igwe ojii nke na-egosi ọnụnọ Chineke n’elu ha, otu oké ihe mere. Bible na-ekwu banyere ya dị ka baptism—ọ bụghị baptism efu n’ime mmiri, kama nke ihe atụ baa n’ime Moses dị ka onye amụma Jehova, onye Chineke zitere ịbụ onye mgbapụta ha. (1 Ndị Kọrint 10:1, 2) N’otu aka ahụ, ndị Israel ime mmụọ nile, ndị ga-alanarị mbibi nke ụwa ajọ omume nke a aghaghị ime ụdị baptism ahụ baa n’ime Kraịst dị ka onye mgbapụta, nyekwa ihe àmà doro anya na ha na-erubere idu ndú ya isi nke ọma. “Ọtụtụ ndị gwara ọgwa” nke oge a aghaghị isonyere ha.

4. Olee otú ike Jehova nyeworo Kraist hà n’ịdị ukwuu?

4 Jehova enyewo Ọkpara ya, bụ Jisọs Kraịst ike dị ukwuu. Site n’aka ya ka Chineke meworo ka o kwe anyị omume ịbụ ndị ‘a ga-agbapụta pụọ n’usoro ihe ọjọọ nke oge a,’ ka anyị ghara isoro ya nwekọọ ajọ ndakpọ nke na-eche ya ihu. (Ndị Galetia 1:3-5; 1 Ndị Tesalọnaịka 1:9, 10) Site n’aka Moses, Jehova nyere Israel iwu nile metụtara olileanya ha nwere ịdị ndụ mgbe ahụ. Mgbe ha rubeere iwu ndị ahụ isi, ha ritere uru dị ukwuu. Ma n’otu aka ahụ, ụfọdụ n’ime iwu ndị ahụ bukwa ikpe ọmụma nke ọnwụ maka inupụ isi na ha. E mesịa, Jisọs ghọrọ onye amụma ka Moses ukwuu. Ihe ndị o ziri bụ “okwu nke ndụ ebighị ebi,” ịkpachara anya jụ irubere okwu ndị a na-edubakwa n’ọnwụ nke mgbapụta na-adịghị ya. Mgbe ahụ, lee nnọọ otú o si dị mkpa na anyị ga-aṅa ntị n’ihe o kwuru!—Jọn 6:66-69; 3:36; Ọrụ 3:19-23.

5. Gịnị na-eme ka ido onwe onye n’okpuru Jisọs bụrụ ihe na-adọrọ adọrọ?

5 Nye ụfọdụ ndị, echiche nke ido onwe onye n’okpuru onye na-achị achị adịghị eyi ihe dị mma. Ha ahụwo ọtụtụ ndị jiri ike ọchịchị ha mee ihe na-ezighị ezi. Ma okwu Jisụs n’onwe ya na-egosi mmụọ nke ime ka obi ruo mmadụ ala. Ọ na-akpọ anyị òkù n’ụzọ na-ekpo ọkụ, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m, n’ihi na abụ rn onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi, unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Matiu 11:28-30) Lee nnọọ olileanya na-adọrọ mmasị ọ bụ! A gaghị eme ka ihere mee ndị ahụ zara ọkpụkpọ òkù ọma ahụ, bụ́ ndị na-atụkwasị ya obi ha nile. (Ndị Rom 10:11) Ha ga-enweta nchebe dị ka atụrụ ndị nọ n’ime ogige atụrụ nke onye ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya.

EZI ONYE ỌZỤZỤ ATỤRỤ ỌMA AHỤ

6. (a) Olee otú mba Israel si yie ìgwè atụrụ nọ n’ogige atụrụ? (b) Nkwa dị aṅaa ka Jehova kwere maka onye ọzụzụ atụrụ nke “ìgwè atụrụ” nke a, oleekwa otú e si mezuo ya?

6 Mba Israel dịrịị ka otu ìgwè atụrụ Jehova nwere. O nyere ha ọghụgba ndụ Iwu ahụ, nke nọrọ dị ka mgbidi nile nke ogige atụrụ, nke gbochiri ha pụọ n’ụzọ ndụ nke mba ndị Jentaịl na-adịghị asọpụrụ Chineke. O duzikwara ndị na-aṅa ntị ijekwuru Mesaịa. (Ndị Efesọs 2:14-16; Ndị Galetia 3:24) Banyere Eze-Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ, Jehova buru amụma, sị: “M ga-emekwa ka otu onye ọzụzụ atụrụ biliere [ìgwè atụrụ m), ọ ga-azụkwa ha, ọbụna ohu m bụ Devid.” (Ezikiel 34:23, 31) Nke a apụtaghị na Devid onye nwụrụlarịị na mgbe ahụ ga-achịkwa ndị Chineke ọzọ dị ka eze n’onwe ya. Kama nke ahụ, site n’eriri eze Devid, Jehova ga-ewelite eze-onye ọzụzụ atụrụ, onye ọ bụ site n’aka ya ka Chineke ga-enye nchebe. (Jeremaịa 23:5, 6) N’oge dị iche iche, ndị rnmadụ ekwuwo n’ụzọ na-ezighị ezi na ha bụ Mesaịa onye mgbapụta ahụ, ma n’afụ 29 O.A., Jehova jiri Jọn Onye na-eme baptism mee ihe igosi “ìgwè atụrụ” nke Israel Jisọs Kraịst dị ka onye ahụ Chineke zitere n’ezie, Mesaịa ahụ nke bụ eziokwu, onye e bufere mkpụrụ ndụ ya n’akpa nwa nke nwa agbọghọ onye Juu na-amaghị nwoke, ka e wee mụọ ya site n’eriri nke eze Devid. Aha ahụ bụ Devid pụtara “onye a hụrụ n’anya,” ya mere, ọ bụ ihe kwekọrọ ekwekọ, mgbe e mesịrị Jisọs baptism n’ime mmiri, Jehova sitere n’eluigwe kwupuỊa n’ụzọ dara ụda, sị: “Gị onwe gị bụ Ọkpara m, m hụrụ n’anya, ihe gị dị m ezi mma.”—Mak 1:11.

7. (a) Dị ka “onye ọzụzụ atụrụ ọma” ahụ, olee otú Jisọs si gosi ịhụnanya ya dị omimi maka “atụrụ” ya? (b) Olee otú nke ahụ si dị iche n’àgwà ndị Mesaịa ụgha ndị bu ya ụzọ?

7 N’ihe na-erughị ọnwa anọ tupu ọnwụ ya, Jisọs sịrị: “Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ụma; onye ọzụzụ atụrụ ọma na-atọgbọ ndụ ya n’ihi atụrụ ya.” (Jọn 10:11) O mere ka ọrụ ya pụọ iche n’ebe ndị Mesaịa ụgha ahụ ndị buru ụzọ bịa nọ, na-asị: “Onye na-esiteghị n’ọnụ ụzọ baa n’ogige atụrụ, kama o si ebe ọzọ na-arịgo ịba, onye ahụ bụ onye ohi na onye na-apụnara mmadụ ihe. Ma onye si n’ọnụ ụzọ baa bụ onye na-azụ atụrụ. Onye ahụ ka onye ọnụ ụzọ na-emeghere ụzọ, atụrụ ya na-anụkwa olu ya; ọ na-akpọkwa atụrụ nke aka ya n’aha, na-edupụkwa ha. Mgbe ọ bụla ọ chụpụrụ atụrụ nke aka ya nile, ọ na-aga n’ihu ha, atụrụ ahụ na-esokwa ya, n’ihi na ha matara olu ya. Ma ha agaghị eso ọbịa ma ọlị, kama ha ga-agbanarị ya, n’ihi na ha amataghị olu ndị ọbịa.”—Jọn 10:1-5, 8.

8. (a) N’ime “ogige atụrụ’’ ọhụrụ dị aṅaa ka Jisọs dubara ndị Juu sooro ya? (b) Mmadụ ole ka o webataworo n’ime ogige a?

8 Ndị ahụ nọ n’ogige atụrụ ndị Juu, bụ́ ndị ṅara ntị n’idu ndú nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ naara Jisọs dị ka Mesaịa mgbe Jọn Onye na-eme baptism, dị ka “onye ọnụ ụzọ,” kọwara onye ọ bụ. Ha gosiri onwe ha dị ka ‘atụrụ Jisọs’ o wee duru ha gaa n’ogige atụrụ ọhụrụ nke ihe atụ, ma ọ bụ ogige atụrụ nke Jehova. Ogige a na-anọchi anya mmekọrịta dị mma nke mmadụ na Jehova site n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ, bụ nke e sooro ndị Israel ime mmụọ gbaa, meekwa ka ọ dị irè site n’ọbara Jisọs n’onwe ya. Site n’ọgbụgba ndụ nke a, e mere ka o kwe mee ha isoro Kraịst keta ndụ eluigwe dị ka “mkpụrụ” Abraham, nke ọ bụ site na ha ka ngọzi ga-esi bịakwasị ndị nke mba nile. (Ndị Hibru 8:6; 9:24; 10:19-22; Jenesis 22:18) Jisọs Kraịst, onye Chineke mere ka o si n’ọnwụ bilie wee weghachi ya ná ndụ eluigwe, bụ “ọnụ ụzọ” ahụ nke ogige atụrụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. N’ikwekọ ná nzube nna ya, o webatawo nanị ọnụ ọgụgụ a kpaara ókè n’ime ogige nke a—nanị 144,000—mbụ, site n’etiti ndị Juu, e mesịakwa site n’etiti ndị Sameria nakwa ndị Jentaịl. Dị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, Jisọs maara atụrụ ya nke ọ bụla n’aha, na-elekọtakwa, na-aṅakwa ha ntị n’otu n’otu.—Jọn 10:7, 9; Mkpughe 14:1-3.

9. Olee ndị bụ “atụrụ ọzọ” ahụ nke Jisọs zoro aka na ha, oleekwa mgbe a chịkọtara ha?

9 Otú ọ dị, Jisọs akwụsịghị ọrụ ọzụzụ atụrụ ya n’ebe “ìgwè atụrụ nta” nke a nọ, bụ́ ndị ga-eketa Alaeze eluigwe. (Luk 12:32) O kwukwara, sị: “Atụrụ ọzọ ka m nwekwara, ndị na-esiteghị n’ogige atụrụ nke a; aghaghị m idutekwa ndị ahụ, ha ga-anụkwa olu m, otu ìgwè atụrụ ga-adịkwa, otu onye ọzụzụ atụrụ.” (Jọn 10:16) Òle ndị ka ndị a bụ? Ha bụ mmadụ ndị na-anọghị n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ; ha abụghị Israel ime mmụọ. Kama, a kpọbatara ha isoro ndị òtù Israel ime mmụọ nwee mkpakọrịta chiri anya mgbe ndị a ka nọ ndụ n’elu ala, bụrụkwa ndị nwere mkpa nke ụdị ọzụzụ atụrụ ahụ Jisọs kọwara. “Atụrụ ọzọ” ahụ bụ mmadụ ndị a na-achịkọbata n’ime ndokwa Jehova maka ndụ ebighị ebi n’elu ala site n’okwukwe ha n’uru àjà Jisọs jiri ọbara ya chụọ, n’ime ụbọchị ikpeazụ ndị a. Ha bụ otu ihe ahụ dị ka “oké ìgwè mmadụ” nke Mkpughe 7:9, 10, 14, ya mere, ha nwere olileanya nke ịlanarị oké mkpagbu ahụ na-abịanụ.

10. Iji bụrụ otu n’ime “atụrụ ọzọ” ahụ, gịnị ka a chọrọ?

10 Iji kwekọọ ná nkọwa Bible maka “atụrụ ọzọ” ahụ nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ chebere ma debekwa ndụ, onye ahụ aghaghị ‘ịṅa ntị’ olu ya, gosikwa ihe àmà ịbụ akụkụ nke “otu ìgwè atụrụ” ahụ n’ezie, nke gụnyere ezi ndị nketa Alaeze eluigwe. Ị̀ na-eme nke ahụ? Olee otú i si jiri nlezianya na-aṅa ntị olu ya?

11. Gịnị ga-egosi ihe àmà na anyị ‘ṅara ntị’ n’ezie n’ihe Jisọs kwuru na Jọn 15:12?

11 Obi abụọ adịghị ya na ị maara na Jisọs sịrị: “Nke a bụ ihe m nyere n’iwu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya dị ka m hụrụ unu n’anya.” (Jọn 15:12) Olee otú iwu ahụ si emetụta ndụ gị? Ịhụnanya ị na-egosi ọ bụ ụdị ahụ Jisọs gosiri ihe atụ ya? Ọ̀ bụ nke ịchụ onwe onye n’àjà n’ezie? Ihe nile ị na-eme na echiche gị nile hà na-agba àmà maka ụdị ịhụnanya ahụ n’ebe ndị nile nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst na n’ebe ndị nile nke ezinụlọ gị nọ?

12. (a) Ọ bụrụ na ‘e ziri anyị ihe n’ime Jisọs’ n’ezie, mgbanwe hà aṅaa ka ọ ga-eme n’ime anyị? (b) Ya mere, gịnị ka anyị kwesịrị ịdị na-eji ihe anyị na-amụta na Bible na-eme?

12 Pọl onye ozi kwuru na ọ bụrụ na anyị ‘nụrụ’ okwu Jisọs n’ezie, na ‘e zikwara anyị ihe n’ime ya,’ ọdịdị anyị nile ga-agbanwe. Anyị ga-eyipụ ọdịdị mmadụ nke na-ekwenyere ụzọ ndụ mbụ anyị, ma yikwasị “mmadụ ọhụrụ” nke na-egosipụta àgwà ọma nile nke Jehova. (Ndị Efesọs 4:17-24; Ndị Kọlọsi 3:8-14) Mgbe ị na-amụ Bible, ị̀ na-echesi echiche ike metụta akụkụ dị iche iche ebe ọ dị gị onwe gị mkpa ime mgbanwe ụfọdụ iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ? Ị̀ na-agbalịsi ike ime mgbanwe ndị ahụ? Ị̀ na-arịba ọrụ ahụ dị mkpa nke Jisọs nyere n’iwu maka oge anyị a ama—ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke e guzobeworo—ị̀ na-achọkwa ụzọ dị iche iche ị ga-esi kere òkè na ya? Obi ekele maka amara na-erughịrị mmadụ nke Chineke mewooro gị ọ̀ na-akwali gị iji mmetụta sitere n’ala ala obi mee nke a?—Matiu 24:14.

13. (a) Ọ bụrụ na anyị akpachapụghị anya, olee otú obi anyị pụrụ isi rafuo anyị? (b) Mgbe ahụ, ruo n’ókè hà aṅaa ka anyị na-aghaghị iso ije ụkwụ Kraịst?

13 Anyị aghaghị ịkpachara anya ghara ikwe ka obi anyị rafuo anyị. Ọtụtụ nde mmadụ na-ekwupụta na ha kwenyere na Jisọs Kraịst, eleghị anya ha pụkwara ịkpọtụ uche n’ihe ụfọdụ ọ kụziri, kama ha na-etinye nanị ndị dịịrị ha mma n’ọrụ. Ụfọdụ pụrụ izere itinye aka n’omume ha gụrụ n’ihe jọrọ oké njọ. Olileanya maka ndụ n’ime Paradaịs elu ala n’okpuru Alaeze Chineke pụrụ ịdị ha mma ná ntị, ha pụkwara ịdị na-esonyere ndị ahụ ji obi eziokwu na-agbalị itinye ụkpụrụ ndị Kraịst n’ọrụ ná ndụ ha ugbu a. Ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iso n’etiti ndị ga-alanarị baa n’ime “ụwa ọhụrụ” ahụ, anyị aghaghị ịṅasi ntị ike n’ihe nile Jisọs na-ekwu. Ọ dị mkpa ịmata na anyị apụghị iduzi ije ụkwụ anyị nke ọma n’onwe anyị. Anyị aghaghị ige Ọkpara Chineke ntị, bụ́ onye Jehova nyere ọrụ dị ka onye mgbapụta nke ndị ya, ma kpachara anya ịga ije na nzọụkwụ ya nile.—Jeremaịa 10:23; Matiu 7:21-27; 1 Pita 2:21.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya