Isi 80
Ogige Atụrụ Ndị ahụ na Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ
JISỌS abịawo na Jerusalem maka Ememe Nraranye, ma ọ bụ Hanukkah, bụ́ ememe a na-eme iji rara ụlọ nsọ ahụ nyeghachi Jehova. Na 168 T.O.A., bụ́ ihe dị ka 200 afọ tupu mgbe ahụ, Antiochus nke Anọ Epiphanes meriri Jerusalem ma merụọ ụlọ nsọ ahụ na ebe ịchụàjà ya. Otú ọ dị, mgbe afọ atọ gasịrị, e weghachitere Jerusalem, ma raraghachi ụlọ nsọ ahụ nye. Mgbe nke a gasịrị, e mere ememe nraraghachi nye, bụ́ nke a na-eme kwa afọ.
A na-eme Ememe Nraranye nke a na Chislev 25, bụ́ ọnwa ndị Juu nke kwekọrọ n’akụkụ ngwụsị nke November ná mmalite December nke kalenda ọgbara ọhụrụ anyị. Otú a, nanị ihe karịtụrụ otu narị ụbọchị fọdụrụ tupu ememe Ngabiga ahụ dị oké mkpa nke 33 O.A. N’ihi na ọ bụ oge oyi, Jọn onyeozi kpọrọ ya “mgbe oyi.”
Ugbu a Jisọs ji ihe atụ mee ihe, bụ́ nke o hotara ìgwè atụrụ atọ n’ime ya nakwa ọrụ ya dị ka Ezi Onye Ọzụzụ Atụrụ. E jikọrọ ìgwè atụrụ mbụ nke o kwuru okwu ya na ndokwa ọgbụgba ndụ Iwu Mosis. Iwu ahụ jere ozi dị ka ogige, na-ekewapụ ndị Juu site n’omume rụrụ arụ nke ndị ahụ na-anọghị n’ọgbụgba ndụ nke a pụrụ iche nke ha na Chineke. Jisọs na-akọwa, sị: “N’ezie, n’ezie, asị m unu, onye na-esiteghị n’ọnụ ụzọ baa n’ogige atụrụ, kama o si n’ebe ọzọ na-arịgo iba, onye ahụ bụ onye ohi na onye na-apụnara mmadụ ihe. Ma onye si n’ọnụ ụzọ baa bụ onye na-azụ atụrụ.”
Ndị ọzọ abịawo ma na-asị na ha bụ Mesaịa, ma ọ bụ Kraịst, ma ọ bụghị ha bụ ezi onye ọzụzụ atụrụ ahụ, onye Jisọs gara n’ihu ikwu banyere ya, sị: “Onye ahụ ka onye ọnụ ụzọ na-emeghere ụzọ; atụrụ na-anụkwa olu ya: ọ na-akpọkwa atụrụ nke aka ya n’aha, na-edupụkwa ha. . . . Ma ha agaghị eso ọbịa ma ọlị, kama ha ga-agbanahụ ya: n’ihi na ha amataghị olu ndị obịa.”
“Onye ọnụ ụzọ” nke ogige atụrụ mbụ ahụ bụ Jọn Onye Na-eme Baptism. Dị ka onye ọnụ ụzọ, Jọn ‘megheere’ Jisọs ụzọ site n’igosipụta ya nye ndị bụ atụrụ ihe atụ ahụ ndị ọ ga-eduje n’ebe ịta nri. N’ikpeazụ a nabatara atụrụ ndị a Jisọs na-akpọ n’aha ma na-edupụkwa n’ime ogige atụrụ ọzọ, dị ka ọ kọwara, na-asị: “N’ezie, n’ezie, asị m unu, Mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ nke atụrụ,” ya bụ, ọnụ ụzọ nke ìgwè atụrụ ọhụrụ. Mgbe Jisọs guzobesịrị ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke ya na ndị na-eso ụzọ ya ma sikwa n’eluigwe wụkwasị ha mmụọ nsọ n’Ememe Pentikọst nke na-eso, a nabatara ha n’ime ogige atụrụ ọhụrụ nke a.
Ka ọ na-aga n’ihu n’ịkọwa ọrụ ya, Jisọs sịrị: “Mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ ahụ: ọ bụrụ na onye ọ bụla esi na mụ baa, a ga-azọpụta ya, ọ ga na-abatakwa na-apụkwa, na-ahụkwa nri ọ ga-ata. . . . Mụ onwe m bịara ka ha wee nwee ndụ, ka ha nwebigakwa ya ókè. . . . Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma; amakwaara m atụrụ nke m, atụrụ nke m makwaara m, dị ka Nna m maara m, dị ka mụ onwe m makwaara Nna m; ana m atọgbọkwa ndụ m n’ihi atụrụ m.”
N’oge na-adịbeghị anya, Jisọs ka kasichara ndị na-eso ụzọ ya obi, na-asị: “Atụla egwu, ìgwè atụrụ nta; n’ihi na ọ dị Nna unu ezi mma inye unu alaeze ya.” Ìgwè atụrụ nta nke a, nke ọnụ ọgụgụ ha mesịrị bụrụ 144,000, batara n’ime ogige atụrụ ọhụrụ ma ọ bụ nke abụọ nke a. Ma Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Atụrụ ọzọ ka m nwekwara, ndị na-esiteghị n’ogige atụrụ nke a: aghaghị m idutekwa ndị ahụ, ha ga-anụkwa olu m; otu ìgwè atụrụ ga-adịkwa; otu onye ọzụzụ atụrụ.”
Ebe ọ bụ na “atụrụ ọzọ” ahụ ‘esiteghị n’ogige atụrụ nke a,’ ọ ghaghị ịbụ na ha sitere n’ogige ọzọ, bụ́ nke atọ. Ogige abụọ ndị ikpeazụ a nwere olileanya dịgasị iche iche. “Ìgwè atụrụ nta” ahụ nọ n’ime otu ogige ga-esoro Kraịst chịa achị n’eluigwe, “atụrụ ọzọ” ahụ nke nọkwa n’ogige nke ọzọ ga-ebi n’ụwa nke bụ paradaịs. Ma, n’agbanyeghị na ha nọ n’ogige abụọ, atụrụ ndị ahụ enweghị ekworo n’ebe ibe ha nọ, ha adịghịkwa ele onwe ha anya dị ka ndị e kewara ekewa, n’ihi na dị ka Jisọs sịrị, ha ga-aghọ “otu ìgwè atụrụ” n’okpuru “otu onye ọzụzụ atụrụ.”
Ezi Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, nyere ndụ ya n’afọ ofufo maka ogige atụrụ abụọ ndị ahụ. Ọ na-ekwu sị, “Mụ onwe m na-atọgbọ ya n’onwe m. Enwere m ike ịtọgbọ ya, e nwekwara m ike ịnara ya ọzọ. Ihe e nyere n’iwu ka m natara n’aka Nna m.” Mgbe Jisọs kwuru nke a, nkewa bilitere n’etiti ndị Juu ahụ.
Ọtụtụ n’ime ìgwè mmadụ ahụ sịrị: “O nwere mmụọ ọjọọ, anya adịghịkwa ya mma; gịnị mere unu na-anụ olu ya?” Ma ndị ọzọ zaghachiri, sị: “Ndị a abụghị okwu onye mmụọ ọjọọ ji.” Mgbe ahụ, na-ezo aka n’ụzọ doro anya n’ọgwụgwọ ọ gwọrọ nwoke bụ onye ìsì site n’ọmụmụ ọnwa ole na ole gara aga, ha kwukwara, sị: “Mmụọ ọjọọ ọ̀ pụrụ imeghe anya ndị kpuru ìsì?” Jọn 10:1-22; 9:1-7; Luk 12:32; Mkpughe 14:1, 3; 21:3, 4; Abụ Ọma 37:29.
▪ Gịnị bụ Ememe nke Nraranye, oleekwa mgbe a na-eme ya?
▪ Gịnị bụ ogige atụrụ mbụ ahụ, ònye bụkwa onye ọnụ ụzọ ya?
▪ N’ụzọ dị aṅaa ka onye ọnụ ụzọ ahụ si emeghere Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ ụzọ, n’ime gịnịkwa ka e mesịrị nabata atụrụ ndị ahụ?
▪ Olee ndị mejupụtara ìgwè atụrụ abụọ nke Ezi Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ, ìgwè atụrụ olekwa ka ha ghọrọ?